Ọgbakọ Zuru ọha
Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst Na-ewete Nnapụta Kachasị elu
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


14:15

Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst Na-ewete Nnapụta Kachasị elu

Dị ka anyị na-atụgharị nʻebe Jizọs Kraịst nọ, Onye Nzọpụta nke ụwa, Ọ na-anapụta anyị site na oke ifufe niile nke ndụ site na Aja mgbaghara mmehie Ya.

Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na-ewete nnapụta kachasị elu site na mnwale anyị na-ezute niime ndụ nke a. Onyeisi Russell M. Nelson nyere m ọrụ ịranye Tempụl Casper Wyoming na ngwụcha afọ gara aga. Ọ bụ nhụmiihe ime mmụọ, miri emi, na-emetụta uche. O webatara na nleruanya doro anya ọrụ tempụl niile na-arụ na-ịnapụta ụmu nke Chineke site na Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta.

Stek niile dị niime distrikt Tempụl Casper Wyoming gụnyere akụkụ ụzọ ụkwụ gafere okporo ụzọ nke ndị ogbughere ụzọ Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a jere site nʻetiti 1847 na 1868. Na-ịkwado maka nraranye tempụl, a gụgharịrị m ụfọdụ niime agụgụala nke ụzọ ụkwụ dị nʻụzọ Osimiri Platte nʻakụkụ Casper ma na-aganiihu ruo Obodo ukwu Salt Lake. Ụzọ ụkwụ ahụ abụrụworịị ụzọ maka narị puku kwuru puku nke ndị njem ọdịda anyanwụ. Isi nkwusi ike m bụ ndị ahụ karịrị 60,000 ndị ogbughere ụzọ Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a ndị mere njem na ụzọ ụkwụ ahụ.

Ọtụtụ niime ndị ogbughere ụzọ anyị bịara site na wagọn, mana ihe ruru 3,000 gafere na igwe ndị ụgbọ aka 10. Asatọ niime igwè ụgbọ aka ndị a mere ka njem ncheta ahụ nwee ọganiihu pụrụiche na ọnwụ ole ma ole. Igwè ụgbọ aka Willie na Martin nke 1856 bụụrụ nke agụpụrụ.

Enyochagharịrị m nkọwapụta niile nke igwè ụgbọ aka Willie na Martin bido nʻoge ahụ ọnọdụ ihu eluigwe jọgburu onwe ya malitere. Abịara m matazie nke ọma maka ịma aka niile ha zutere oge ikufe Osimiri Sweetwater, Cove nke Martin, Rocky Ridge, na Rock Creek Hollow.

Ndị mbu ụzọ ụgbọaka nọ na sno.

Nʻetiti Oke Ifufe, site naka Albin Veselka

Ababeghị m niime Tempụl Casper tupu nraranye ahụ. Mgbe m banyere niime foyer, a dọọrọ uche m ozugbo ruo agba ụgbọ aka isimbụ etere a na-akpọ Nʻetiti Oké ifufe. Agba ahụ etere doro anya na ọ bụghị ihe ebunuche iji gosi ihe ọjọọ niile ha gabigaworo. Dị ka m lere anya na ya, e chere m, “Agba nke a etere ziri ezi; imerime ọtụtụ ndị ogbughere ụzọ ụgbọ aka agabigaghị ihe ọjọọ.” Enweghị ihe m nwere ike ime na-abụghị iche na nke a dị ka ndụ gburugburu. Mgbe ụfọdụ anyị nọ nʻetiti oke ifufe ma mgbe ụfọdụ nʻetiti urukpuru na anyanwụ.

Osimiri Sweetwater.

Heaven’s Portal, site nʻaka Jim Wilcox

Mgbe m tụgharịrị nʻagba isimbụ ahụ etere na mgbidi nke ọzọ, a na-akpọ Heavenʻs Portal, a matara m na agba summer nke a etere nke ihe nke akpọrọ “Devilʻs Gate,” ebe Osimiri Sweetwater dị jụụ ma dị ụcha na-asọ asọ site na ya, gosipụtara ịma mma nke okike nke Onyenwe anyị, ọbụghị naanị ịma aka niile ndị isimbụ gabigara noge winta ahụ jọgburu onwe ya.

Mgbe ahụ eleruru m anya, nʻazụ desk rekọmendị, ma hụ ọmarịcha agba nke Onye Nzọpụta etere. Nke a ozugbo kpalitere mmetụta dị ukwuu nke obi ekele. Niime ụwa nke oke ịma mma, enwekwara imerime ihe ịma aka niile. Dị ka anyị na-atụgharị nʻebe Jizọs Kraịst nọ, Onye Nzọpụta nke ụwa, Ọ na-anapụta anyị site na oke ifufe niile nke ndụ site na Aja mgbaghara mmehie Ya dị ka otu atụmatụ nke Nna si dị.

Maka mụ, foyer ahụ bụ nkwado zuru oke maka ọnụ ụlọ niile nke emume nsọ tempụl nke na-ekwe anyị ịnata emume nsọ niile nke mbuli elu, iji gbaa ọgbụgba ndụ niile dị nsọ, na ịnabata nʻuju na inwete nhụmiihe ngọzi niile nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta. Atụmatụ obi ụtọ nke Nna dabeere na nnapụta aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta.

Nhụmiihe ndị isimbụ ahụ na-ewetere Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a omenaala nke agụgụala pụrụiche na nchịkọta ihe nketa ime mmụọ dị ike. Maka ụfọdụ, mbugharị ahụ eruwo ọtụtụ afọ mgbe achụpụchasịrị nʻike site ma na Missouri ma na Nauvoo. Maka ndị ọzọ, ọ malitere mgbe Onyeisi Brigham Young machara ọkwa atụmatụ ụgbọ aka ahụ, nke ebunuuche ya bụ ime ka mbugharị ahụ dịrịtụ ọnụ ala. Ụgbọ aka ahụ dị ọnụ ala karịa wagọn niile na ehi.

Otu onye mgbasa ozi ọma na Ingland, Millen Atwood, kwuru si na mgbe a mara ọkwa atụmatụ ụgbọ aka ahụ, “Ọ gbara ọsọ dị ka ọkụ nʻahịhịa kpọrọ nkụ, ma obi Ndị nsọ dị umeala n̄ụrịrị ọnụ nʻobi ụtọ.” Ọtụtụ “ekpewo rịị ekpere ma buo ọnụ kwa ụbọchị, na kwa abalị, ka ha wee nwete ohere nke ijikọta ha na ụmụnne ndị nwoke na ụmụnne ndị nwanyị nebe ugwu niile [ahụ].”

Ọtụtụ niime Ndị nsọ ụgbọ aka gabigara ihe isi ike mana zeere nnukwu ihe omume niile nwere nsonazụ. Mana igwè ụgbọ aka abụọ, igwè Willie na igwè Martin, gabigara agụụ, ịnọdụ nʻokpuru ihu eluigwe oke oyii, na ọtụtụ ọnwụ.

Ọtụtụ niime ndị njem ndị a gbara ụgbọ mmiri site na Liverpool, Ingland, na Me nke 1856, nʻụgbọ mmiri abụọ. Ha bịaruru nʻebe njikere ụgbọ aka dị na Obodo ukwu Iowa na Jun na Julaị. Agbanyeghị ịdọ aka na ntị niile, igwè abụọ ahụ pụkwara mgbe oge gara site na Ndagwurugwu Salt Lake nʻoge ahụ.

Onyeisi Brigham Young na mbụ bịara mata maka ọnọdụ ize ndụ nke igwè ndị a na Ọktoba 4, 1856. Ụbọchị nke na-esote o guzooro nihu Ndị nsọ na Obodo Salt Lake ma kwuo sị, “Ọtụtụ niime ụmụnne ndị nwoke na ụmụnne nwanyị nọ na ala larịị nʻụgbọ aka, … ma aga akpọtarịrị ha ebe a; anyị ahaghị izigara ha enyemaka … tupu oge winta ebido.”

Ọ rịọrọ ndị bishọp iwete otu inyinya ibu 60, wagọn 12 ma ọ bụ karịa, na tọnụ flọ 12 (10,886 kg) ma maa ọkwa, “Gaanụ ma kpọbata ndị mmadụ ahụ nọ na ala larịị niile.”

Ọnụọgụgụ ndị ogbughere ụzọ agwakọtara nʻigwè ụgbọ aka Willie na Martin bụ ihe dị ka 1,100. Ụfọdụ 200 nke ọmarịcha Ndị nsọ ndị a nwụrụ nʻụzọ ụkwụ ahụ. Ewezuga nnapụta ahụ bịara ọsọ ọsọ, ọtụtụ ndị ọzọ gaara ala nʻiyi.

Oke ifufe winta malitere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ izu ụka abụọ mgbe ndị nnapụta nke mbụ hapụrụ Obodo ukwu Salt Lake. Nkọwapụta niile nke ndị otù nke igwè Willie na Martin kọwara ihe ịma aka na-agbawa obi mgbe oke ifufe ahụ malitesịrị. Nkọwapụta ndị a gosikwara oke ọn̄ụ mgbe ndị nnapụta niile bịaruru.

Ịkọwa ọnọdụ nrute ha, Mary Hurren kwuru: “Anya mmiri sọdara na nti ụmụ mmadụ, ma ụmụ ntakịrị gbara egwu ọn̄ụ. Ozugbo ozugbo ndị ahụ nwere ike ijigide mmetụta ha niile, ha niile sekpuuru ala na sno ma nye Chineke ekele.”

Mgbe abalị abụọ gasịrị, igwè Willie bịara mee njem nakụkụ ụzọ ụkwụ kachasị raa ahụ, na-agafe Riiji Rocky, nʻoke ifufe na-atụ oke oyi. Nke ikpeazụ niime ha erughị kampụ tutu ruo 5:00 ụtụtụ sotere. Mmadụ iri na atọ nwụrụ ma eliri ha nʻotu ili.

Na Nọvemba 7, igwè Willie nọ na-erute Ndagwurugwu Salt Lake, mana nʻụtụtụ ahụ aka nwekwara mmadụ atọ nwụrụ. Mgbe ụbọchị abụọ gasịrị, igwè nke Willie nikpeazụ rutere Salt Lake, ebe ha nweburu ekele dị ịtụnaanya ma anabatara ha nʻebe obibi niile nke Ndị nsọ.

Nʻotu ụbọchị ahụ kwa, igwè nke Martin ka nọkwa maịlụ 325 (523 km) nʻazụ nʻụzọ ụkwụ ahụ, na-ata ahụhụ esepụghị aka site na oyi na enweghị ihe oriri zuru ezu. Ụbọchị ole ma ole nʻisimbụ, ha akụfewo Osimiri Sweetwater irute ebe akpọrọ ugbua Cove nke Martin, ebe ha tụrụ anya ịchọta nchekwa site na ụmụ ihe. Otu niime ndị ogbughere ụzọ kwuru, “Ọ bụ nkụfe osimiri kacha njọ nke njem ahụ.” Ụfọdụ ndị nnapụta ahụ—dị ka mpa nnukwu ukwu m David Patten Kimball, onye gbara naanị afọ 17, ya na ndị enyi ya “George W. Grant, Allen Huntington, Stephen Taylor, na Ira Nebeker—gburu ọtụtụ awa niime mmiri oke oyi ahụ,” nʻobi dike na-enyere igwe ahụ aka kufee Sweetwater ahụ.

Ebe ihe omume nke a dọtaworo ọtụtụ uche, dị ka m mụtara ọzọ banyere ndị nnapụta ahụ, a matara m na ha niile naara eso onye amụma ma rụọ ọrụ dị oke mkpa na-ịzọpụta Ndị nsọ tọrọ atọ. Ndị nnapụta ahụ niile bụụrụ dike, dị ka kwa ndị njem ahụ.

Ị na-amụ akụkọ ha, e nwere m obi mmasị maka mmekọrịta oke ọnụ ahịa niile na ebumnuuche ebighị ebi ogologo oge dị nʻetiti ndị njem ahụ. John na Maria Linford na ụmụ ha ndị nwoke atọ bụụrụ ndị otù igwè Willie. John nwụrụ ọtụtụ awa tupu ndị nnapụta mbụ abịaruo. Ọ gwawororịị Maria na obi dị ya ụtọ na ha mere njem ahụ. “Agaghị m adị ndụ ruo Salt Lake,” ka o kwuru, “mana gị na ụmụ anyị ndị nwoke ga-eru, ma anaghị m enwe obi mmakwara niihi ihe niile anyị gabigaworo ọ bụrụ na ụmụ anyị ndị nwoke ga-etolite ma zulite ezi na ụlọ ha niime Zayọn.”

Onyeisi James E. Faust wetere nchịkọta nke a dị ebube: “Na mgbalị dị ike nke ndị ogbughere ụzọ ụgbọ aka, anyị na-amụta eziokwu dị ukwuu. Onye niile garịrị esite na ọkụ nke onye nnụcha agafe, ma ihe ndị na-abaghị uru na ndị na-adịghị mkpa niime ndụ anyị pụrụ ịgbazepụ dị ka irighiri ihe ma mee okwukwe anyị amụkee, ghara imebi, ma sie ike. O yiri ka enwere uju atụ nke nhujuanya, mwute, na mgbe ụfọdụ obi mgbawa nye onye ọbụla, gụnyere ndị ahụ na-achọsike ime ezi ihe ma kwesị ntụkwasị obi. Otu ọ dị nke a bụ akụkụ nke nsacha iji matazie Chineke.”

Niime Aja mgbaghara mmehie na Mbilite n’ọnwụ Ya na-ahazi ebighị ebi, Onye Nzọpụta dọbiri “agbụ niile nke ọnwụ, ebe o nweteworo mmeri megide ọnwụ” nye onye niile. Maka ndị ahụ chegharịworo site mmehie niile, O “wekwasiwo onwe ya ajọọ omume ha na njehie ha niile, ebe ọ gbapụtaworo ha, ma metazuo ihe niile ikpe ziri ezi chọrọ.”

Ewezuga Aja mgbaghara mmehie, anyị enweghị ike azọpụta onwe anyị site na mmehie na ọnwụ. Ebe mmehie nwere ike ịrụ ọrụ ahụrụ anya niime mnwale anyị niile, mkpagbu niile nke ndụ ka mmejọ, mkpebi ọjọọ niile, omume ọjọọ niile na-achịkọta site naka ndị ọzọ, na ọtụtu ihe ndị ọzọ na-adịghị nʻokpuru ike anyị.

Kwusaa Ozi ọma M na-akuzi: “Dị ka anyị na-adabere na Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya, O nwere ike inyere anyị aka nagide mnwale, nrịa nrịa, na ihe mgbu anyị niile. Anyị nwere ike ijupụta n’ọn̄ụ, udo, na nkasi obi. Ihe niile na-adịchaghị mma banyere ndụ ka enwere ike imezi site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist.”

Nʻoge Ista nke a, nlekwasị anya anyị dị na Onye Nzọpụta na aja mgbaghara mmehie Ya. Aja mgbaghara mmehie na-ewete olileanya na ìhè nʻoge ndị ahụ gbara ọchịchịrị ma na-atụ egwu nye ọtụtụ ndị mmadụ. Onyeisi Gordon B. Hinckley mara ọkwa, “Mgbe enyochasịrị agụgụala niile, … [ọ] dịghị ihe … magburu onwe ya, dị ebube, dị egwu dị ka omume amara nke a.”

Ana m ekesa nkwanye atọ nke m na-eche bara uru kpọmkwem maka ụbọchị anyị.

Nke mbụ, eledakwala mkpa nke ime ihe anyị pụrụ ime iji nwee ike napụta ndị ọzọ site na ihe ịma aka niile nke anụ ahụ na nke ime mmụọ.

Nke abụọ, jiri obi ekele nabata Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta. Anyị niile kwesịrị ịgbalị igosiputa ọn̄ụ na an̄ụrị ọbụna dị ka anyị na-ezute ihe ịma aka niile nke ndụ. Ebumnuuche anyị kwesịrị ịbụ ibi ndụ na nchekwube nʻakụkụ okporo ama ìhè dị. Ahụtawo m ọmarịcha onye nsiso m, Mary, ime nke a gburugburu ndụ ya. Obi ọma na-eme m maka omume ya na-amụke amụke, na-ebuli mmụọ ọbụna dị ka anyị na-ezute nsogbu gburugburu afọ niile.

Ndụmọdụ m nke atọ bụ idobe iche oge agbanwe agbanwe iji nwee ike na nkwesị ntụkwasị obi tụlee Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta. E nwere ọtụtụ ụzọ ime nke a na emume okpukperechi nke onwe anyị. Kosiladị, ịga nzukọ oriri nsọ na iri oriri nsọ dị ezigbo mkpa.

Dị kwa mkpa nonwe ya bụ ịdị na-aga tempụl mgbe niile ebe o kwere omume. Tempụl na-ewete ncheta na-aganiihu nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta na ihe ndị ọ na-emeri. Ma, ọbụna dị mkpa karịa, ịga tempụl na-ekwe anyị iwete nnapụta ime mmụọ maka ndị anyị hụrụ naanya nwụrụ anwụ na ndị nna nna ndị nọ ebe dị anya.

Onyeisi Russell M. Nelson, nʻọgbakọ zuru ọha ikpeazụ anyị mere, kwusiri ike ụkpụrụ nke a ma gbakwunye, “Ngọzi [tempụl] niile … na-enye aka ikwado ndị mmadụ ndị ga-enye aka kwado ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị”

Anyị ahaghị ma ọlị ichefu aja niile na ọmụmaatụ niile nke ndudugandu tupu niile, mana nkwanye ùgwù anyị, nnakwere, na ofufe kwesịrị ịdabere na Onye Nzọpụta nke ụwa na aja mgbaghara mmehie Ya. Ana m agba ama na ntụghe atụmatụ obi ụtọ nke Nna bụ Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst wetere. Ọ dị ndụ ma na-edu Nzukọ nsọ Ya. Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na-ewete nnapụta kachasị elu site na mnwale anyị na-ezute niime ndụ nke a. Site nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba ama

  1. Nraranye Tempụl Casper Wyoming bụ na Nọvemba 24, 2024.

  2. Abịara m mata igwe Willie na Martin na ihe ike ọjọọ ha gabigara mgbe m dị ezigbo nta. Mpa nnukwu ukwu m David Patten Kimball bụ onye otu otu sitere Ndagwurugwu Salt Lake ndị Onyeisi Brigham Young zigara ịga napụta Ndị nsọ ndị a. (Lee Ndị nsọ: Akụkọ ahụ nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst niime Ụbọchị Ikpeazụ niile, vol. 2, Enweghị Aka Rụrụ Arụ, 1846–1893 [2020], 237.)

  3. Albin Veselka, Between Storms, original painting in the Casper Wyoming Temple (lee “Casper Wyoming Temple Open House Commences,” Newsroom, Aug. 26, 2024, newsroom.ChurchofJesusChrist.org).

  4. “Site n’igwe ojii na anyanwụ, Onyenwe M, nọnyere m!” (“Abide with Me!,” Abụ, no. 166).

  5. Jim Wilcox, Heaven’s Portal, agba isimbụ etere na Tempụl Casper Wyoming (lee “Casper Wyoming Temple Open House Commences,” newsroom.ChurchofJesusChrist.org).

  6. Joseph Brickey, Risen Hope, giclée of original painting (lee “Casper Wyoming Temple Open House Commences,” newsroom.ChurchofJesusChrist.org).

  7. William G. Hartley, “The Place of Mormon Handcart Companies in America’s Westward Migration Story,” The Annals of Iowa, vol. 65, nos. 2, 3 (Spring/Summer 2006), 107–9.

  8. Millen Atwood, “Nkọwapụta Ozi mgbasa ozi ọma Ya,” Deseret News, Nọv. 26, 1856, 300; ekwuru niime Andrew D. Olsen, na Jolene S. Allphin, Soro Mruo Zayọn: Akụkọ niile nke sitere na Ndị ogbughere ụzọ Ụgbọ aka Willie (2013), xi.

  9. Wagọn igwe Hodgetts na Hunt mere njem nakụkụ igwe ụgbọ aka Martin ma chọkwara ka anapụta ha.

  10. Ọtụtụ niime igwe Willie hapụrụ Liverpool, England, nʻụgbọ mmiri Thornton na Me 4, 1856. Ọtụtụ niime igwe Martin hapụrụ Liverpool, England, nʻụgbọ mmiri Thornton na Me 4, 1856.

  11. Lee “Handcart Camp Dedicated in Iowa as Historic Site,” Church News, Aug. 9, 1980, 3, 5.

  12. Brigham Young, “Remarks,” Deseret News, Oct. 15, 1856, 252; punctuation modernized.

  13. Brigham Young, “Okwu niile,” 252.

  14. Lee Olsen na Allphin, Soro M ruo Zayọn, 217.

  15. Mary Hurren, niime Olsen na Allphin, Soro M ruo Zayọn, 131.

  16. Na Julaị 23, 1994, Onyeisi Gordon B. Hinckley raara nye Mọnumentị Rock Creek Hollow ma kwụọ ụgwọ nye Ndị nsọ kwesịrị ntụkwasị obi ndị nwụrụ site na njem ụkwụ ahụ gafee Rocky Ridge (lee Julie Dockstader Heaps, “Trail of Handcart Pioneers Sanctified by Sacrifice,” Church News, July 30, 1994, 8–9, 11). Onyeisi Robert Scott Lorimer sonyere Onyeisi Hinckley na nraranye ahụ. Dị ka onyeisi nke Riverton Wyoming stek, ọ rụrụ ọrụ dị mkpa nʻịchọpụta na ilekọta omume niile nke agụgụala na nke ime mmụọ maka ndị ahụ gabigara ihe ike ọjọọ.

  17. Lee James G. Willie emigrating company journal, Nov. 7, 1856, Church History Library, Salt Lake City.

  18. John Jaques, “Some Reminiscences,” Salt Lake Daily Herald, Dec. 15, 1878, 1.

  19. Ndị nsọ, 2:237. Mpa nke ukwu m Crozier, nwa nwoke nke David Patten, kuziiri m ihe ọmụmụ ndị a dị mkpa. O kwusiri ike na David nọ na-eso onye amụma, ma anyị kwesịrị isoro ndụmọdụ nke onye amụma nʻụbọchị anyị.

  20. John Linford, in Golden C. Linford, Linford Family Heritage (1995), 214; see also Val Parrish, “President’s Message,” Pioneer, vol. 71, no. 3 (Fall 2024), 1.

  21. James E. Faust, in “Okwukwe niime Nzọụkwụ Ọbụla: The Epic Pioneer Journey” (video presentation in general conference, Apr. 6, 1997), Ensign, May 1997, 63.

  22. Mozaya 15:8.

  23. Mozaya 15:9; lee kwa Alma 34:16.

  24. Lee Alma 22:12–15.

  25. Kwusaa Ozi ọma M: Odudu iji Kwusaa Ozi ọma nke Jizọs Kraịst (2023), 56.

  26. Gordon B. Hinckley, “Ezigbo Akụkọ dị ịtụnaanya nke Ekeresimesi,” Liahona, Dec. 2000, 4.

  27. Onyeisi Thomas S. Monson kuziri ma bie ndụ ụkpụrụ nnapụta (lee Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Thomas S. Monson [2020], 67–76).

  28. Russell M. Nelson, “Onyenwe anyị Jizọs Kraịst Ga-abịa Ọzọ,” Liahona,, Nọv. 2024, 121.