Atụmatụ ahụ nke Ebere
Onyenwe anyị dị ebere ma atụmatụ nke nzọpụta nke Nna anyị nke Eluigwe nʻezie nʻezie bụ atụmatụ nke ebere.
Ịkpọ oku nke Onye amụma
Na Eprel gara aga, ozugbo amara ọkwa ọn̄ụ ahụ na Nzukọ nsọ anyị azụrụwo Tempụl Kirtland, Onyeisi Russell M. Nelson kpokuru anyị ịmu ekpere nraranye nke Tempụl Kirtland edekọrọ niime nkeji 109 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile. Ekpere nraranye ahụ, ka Onyeisi Nelson kwuru, “bụ ihe nkuzi maka otu tempụl si enye mụ na gị ike ime mmụọ iji zute aka mgba niile nke ndụ n’ụbọchị niile nke ikpeazụ a.”
O doro m anya na ọmụmụ gị nke nkeji 109 ahụ nweteere gị nghọta omimi niile nke gọziworo gị. Na mgbede nke a, A na m ekesara unu ụfọdụ ihe ole na ole nke m mụtara dịka m sooro ịkpọ okù nke onye amụma anyị. Ụzọ nke udo obi ahụ mjere nihi ọmụmụ m chetara m na Onyenwe anyị dị ebere nakwa na atụmatụ nke nzọpụta nʻezie nʻezie bụ atụmatụ nke ebere.
Ndị Mgbasa Ozi ọma Akpọrọ Ọhụrụ Na-eje Ozi na Tempụl
Enwere ike dị ka ịmara, “ndị mgbasa ozi ọma akpọrọ ọhụrụ ka a na-agba ume ka ha nata onyinye dị nsọ nke tempụl ozugbo ahụ o kwere omume ma gaa tempụl mgbe na mgbe dịka ọnọdụ kwere ha.” Ozugbo he natara onyinye dị nsọ, ha nwekwara ike “ije ozi dịka ndị ọrụ … nke tempụl tupu ha amalite ije ozi mgbasa ozi ọma ha.”
Oge ahụ a nọ niime tempụl tupu abanye ụlọ ọzụzụ ndị mgbasa ozi ọma (MTC) nwere ike bụrụ otu ngọzi dị ịtụnaanya nye ndị mgbasa ozi ọma ọhụrụ dịka ha na a mụtakwu banyere ọgbụgba ndụ tempụl tupu ikesara ngọzi niile nke ọgbụgba ndụ ahụ nye ụwa.
Mana na-ịmụ nkeji 109, A mụtawom na, niime tempụl, Chineke na-enye ndị mgbasa ozi ọma ọhụrụ ndịa ike—nʻezie, anyị niile—nʻụzọ ọzo dị nsọ. Niime ekpere nraranye ahụ, nke enyere site na mkpughe, Onye amụma Josef Smit kpere na “mgbe ndị odibọ gị ga-apụ, site n’ụlọ gị … igba-ama nke aha gị” ka “obi ha niile” nke “ndị mmadụ niile” “wee dị nro”—ma “ndị ukwu nile nke ụwa” na “ndị ogbenye nile, ndị nwere mkpa, na ndị [ahụ] nile nọ na mkpagbu.” Ọ kpere ekpere “ka ikpe n’ezigh ezi ha wee nye-ohere n’iru ezi-okwu, ka ndị nke gị wee nata iru-ọma n’iru anya nke ndị nile; ka nsọtụ nile nke ụwa wee mara na anyị, ndị odibo gị, a nụwo olu gị, nakwa na ọ bụ gị zipụrụ anyị.”
Nke a bụ nkwa mara mma maka ndị mgbasa ozi ọma akpọrọ ọhụrụ—ịme ka ikpe na-ezighi ezi nye-ohere n’iru ezi-okwu,” iji “nata iru-ọma n’iru anya nke ndị nile,” ma iji mee ka ụwa mata na ọ bụ Onyenwe anyị zipụrụ ha. Onye ọbụla n’ime anyị chọsịrị ike ụdị ngọzi ndị ahụ. Ụdị ngọzi nke a ga-abụ ịnwe obi emere ka ọ dị nro dịka anyị na-akparịta anyị na ndị agbata obi na ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ. Ekpere nraranye ahụ akọwaghị kpọmkwem otu oge anyị na tempụl ga-esi eme ka obi ndị ọzọ dịrị nro, mana ekwere m na ọ na-ebidokwa nihi oge ahụ anyị gburu nʻụlọ nke Onyenwe anyị na-eme ka obi anyị dị nro nihi na edobere anyị nʻetiti Jizọs Kraịst na nʻebere Ya.
Onyenwe anyị Zara Arịrịọ nke Josef Smit Maka Ebere
Dịka m mụrụ ekpere nraranye nke Kirtland, ọ metụrụ m na Josef ugboro ugboro rịọrọ maka ebere—maka ndị otù nke Nzukọ nsọ, maka ndị iro nke Nzukọ nsọ, maka ndị ndu nke obodo, maka mba niile nke ụwa. Na, nke metụtara ya nnọọ, ọ rịọrọ Onyenwe anyị ka ọ cheta ya ma ka ọ nwere ebere nʻisi Emma ya ọ hụrụ naanya na ụmụ ha.
Onye maara ụdị mmetụta Josef nwetere, mgbe otu izu ụka gasịrị, nʻụbọchị Ista ahụ, Eprel 3, 1836, na Tempụl Kirtland, Onye Nzọpụta apụtakwuru ya na Oliver Cowdery ma, dịka edekọrọ na nkeji 110 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, kwuo, “A nabatawo m ụlọ nke a, na aha nke m ga-anọ ebe a; na a ga m egosi onwe m nye ndị nke m n’ebere n’ụlọ nke a.” Nkwa nke ebere nke a ga-enwerịrị nkọwa pụrụiche nye Josef. Ma dịka Onyeisi Nelson kuziri na Eprel gara aga, nkwa nke a nʻotu aka ahụ “metụtara tempụl ọbụla araranye taa.”
Ịchọta Ebere niime Ụlọ nke Onyenwe anyị
Enwere ọtụtụ ụzọ anyị niile nʻotu nʻotu nwere ike iji chọta ebere niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Nke a abụrụwo eziokwu kemgbe Onyenwe anyị buru ụzọ nye ndị Izrel iwu ka ha wuo tabanakụl ma ka ha debe ya nʻetiti nke “oche ebere.” ahụ Niime tempụl, anyị na-achọta ebere niime ọgbụgba ndụ niile ndị anyị na-agba. Ọgbụgba ndụ ndị ahụ, na mgbakwunye nye ọgbụgba ndụ nke baptizim, na-ekedo anyi na Nna na Ọkpara ahụ ma na-enye anyị nnukwu ohere ruo na ihe ahụ Onyeisi Nelson kuziworo bụ “ụdị ịhụnaanya na ebere pụrụiche … akpọrọ hesed” na asụsụ Hibru.
Anyị na-achọta ebere niime ohere ahụ dị niime nrachi nye ezinaụlọ anyị maka ebighi ebi. Anyị na-abịakwa ghọta nʻụzọ dokwuru anya, na Okike ahụ, Ọdịda ahụ, aja mgbaghara nke Onye Nzọpụta, na ike anyị iji banye ọzọ nʻirụ nke Nna anyị nke Eluigwe—nʻezie akụkụ ọbụla nke atụmatụ nzọpụta ahụ—bụ ngosipụta niile nke ebere. Enwere ike ikwu na atụmatụ nke nzọpụta bụ atụmatụ nke an̄ụrị nihi kpọmkwem ọ bụ “atụmatụ nke ebere.”
Ịchọ Mgbaghara Na-emepee Ụzọ nye Mmụọ Nsọ ahụ
Enwere m obi ekele maka ọmarịcha nkwa ahụ dị na nkeji 110 na Onyenwe anyị ga-egosipụta Onwe Ya nʻebere niime tempụl niile nke Ya. Enwekwara m obi ekele maka ihe ọ na-ekpughe banyere otu Onyenwe anyị ga-esi gosipụta Onwe Ya nʻebere mgbe ọbụla anyị, dịka Josef, rịọrọ maka ebere.
Arịrịọ maka ebere nke Josef Smit dị niime nkeji 109 abụghị arịrịọ ebere nke mbụ ya akpalitere nihi mkpughe. Nʻebe Ọdọ osisi Dị nsọ, Josef nta kpere ekpere nʻabụghị naanị ka ọ mata Nzukọ nsọ nke bụ eziokwu, mana o kwukwara na ọ “bere akwa nye Onyenwe anyị maka ebere, niihi enweghi onye ọzọ m [ga-agakwuru] ga-enwete ebere nʻaka ya.” Nʻụzọ ụfọdụ, mmata ọ matara na ọ chọsịrị ike ebere ahụ nke naanị Onyenwe anyị nwere ike ịnye, nyere aka mepee mpio niile nke eluigwe. Mgbe afọ atọ gara, mmụọ ozi Moronaị pụtakwuru nihi ihe Josef kwuru na ọ bụ maka “ekpere na arịrịọ nye Chineke Pụrụ Ime Ihe niile maka mgbaghara maka njọ m na nzuzu m niile.”
Usoro nke mkpughe nke a nke na-esote arịrịọ maka ebere bụ nke ama ama niime akwụkwọ nsọ. Ịnos nụrụ olu nke Onyenwe anyị naanị mgbe ọ kpere ekpere maka mgbaghara. Mgbanwe nke nna Eze Lamoni bidoro nʻekpere ya, “Aga m ahapụ njọ m niile iji mara gị.” Enwere ike a gaghị ejiri ụdịrị nhụmihe ndị dị ike otu a gozie anyị, mana maka ndị ahụ ndị mgbe ụfọdụ na-adọlị ị nata azịza ekpere ha, ị dị na-achọ ebere nke Onyenwe anyị bụ otu niime ụzo kacha eji enwete aka ebe nke Mmụọ Nsọ ahụ.
Itule uche na Ebere nke Chineke Na-emepe Ụzọ ahụ eji enwete Ịgba ama banyere Akwụkwọ nke Mọmọn.
Otu ụdị ụkpụrụ ahụ ka akuziri nke ọma niime Moronaị 10:3–5. Mgbe ụfọdu anyị na-egbukarị amaokwu ndịa na nkenke iji kuzie na, site nʻekpere obi ọcha, anyị nwere ike ịmụta ma Akwụkwọ nke Mọmọn ọ bụ eziokwu. Mana nkenke nke a na-ahapụ oke nʻọrụ dị mkpa nke ebere. Gee ntị otu Moronaị jiri malite okwu mgbam ume ya: “A ga m agba unu ume nke ọ ga-abụ na mgbe unu ga-agụ ihe ndị a, … na unu ga-echeta otu Onyenwe anyị siri nwee obi ebere nʼebe ụmụ mmadụ nọ, site nʼokike nke Adam ọbụna gbadaa ruo nʼoge nke unu ga-anata ihe ndị a, ma tụgharịa uche na ya nʼime obi unu.”
Moronaị gbara ume ka anyị ghara naanị ịgụ ihe ndịa—ndekọihe ahụ ọ na-achọ ịrachi—makwa ka anyị tụgharịa niime uche anyị ihe Akwụkwọ nke Mọmọn kpughere banyere “otu Onye-nwe siri nwe obi ebere nʼebe ụmụ nke mmadụ nọ.” Ọ bụ ịtụgharịa uche nʻebere nke Onyenwe anyị na-akwado anyị ị “rịọ Chineke, Nna nke Ebighi ebi, nʼaha nke Kraịst, ma ọ bụ na ihe ndị a abụghị eziokwu.”
Dịka anyị na-atụgharị uche nʻAkwụkwọ nke Mọmọn, anyị nwere ike jụọ: Ọ bụ ezi nʻezie, dịka Alma kuziri, na atụmatụ nke ebere nke Chineke na-emesi obi ike na onye ọbụla biworo nʻụwa nke a ga-ebilite nʻọnwụ na a “ga-eweghachi ha … n’ezigbo ọnọdụ na okporo-arụ zuru oke”? Amulek o kwuru eziokwu—ebere nke Onye Nzọpụta o nwere ike metazuo ihe niile kwesịrị-ime nke ikpe zịrị ezi chọrọ nke naara ịnọ nʻaka anyị ịkwụ ma kama “[ma gbagide anyị] gburu-gburu n’aka nile nke nchekwa”?
Ọ bụ eziokwu, dịka Alma gbara ama, na Kraịst tara ahụhụ na-abụghị naanị maka njọ anyị niile makwa maka “mgbu nile na mkpagbu” ka ọ wee “mata … otu ọ ga-esi nyere ndị ya aka dịka adịghị ike ha nile siri dị.”? Ọ bụ eziokwu na Onyenwe anyị nwere ụdị obi ebere ahụ, dịka Eze Benjamin kuziiri, na, dịka onyinye na-efughi ego, Ọ tụrụ aja “maka mmehie nile nke ndị ahụ … ndị nwụworo na-amaghị uche nke Chineke gbasara ha, ma-ọbụ ndị mehieworo na-amaghị-ama”?
Ọ bụ eziokwu, dịka Lehi kwuru, na “Adam dara ka mmadụ wee dịrị; ma mmadụ dị, ka ha wee nwee ọn̄ụ”? Ma ọ bụ eziokwu nʻezie, dịka Abinadaị gbara ama, na-en̄ọmi Aịzaya, na Jizọs Kraịst ka “e merụrụ ya arụ n’ihi njehie anyị nile, e tirụrụ ya arụ n’ihi ajọọ-omume anyị nile; ịta nnukwu ahụhụ nke udo anyị dị n’isi ya, ma n’ihi ụfụ arụ ya a gwọwo anyị”?
Na nchịkọta okwu, ọ bụ nʻezie na atụmatụ nke Nna dịka otu esi wee kuzie niime Akwụkwọ nke Mọmọn dị nnọọ ebere otu a? A na m agba ama na ọ dị, nakwa na nkuzi niile ahụ banyere ebere nke na-enye udo na olileanya nọ niime Akwụkwọ nke Mọmọn bụ eziokwu.
Agbanyeghi nke ahụ, A na m eche na ụfọdụ nwere ike na-adọlị nagbanyeghi ọgụgụ na ekpere niile unu na-adigide, iji mata nkwa nke Moronaị na Nna nke Eluigwe “ga-egosipụta eziokwu maka ya nye unu, site nʼike nke Mmụọ Nsọ.” A maara m maka ndọlị nke a nihi na ọ metụtawom na mbụ, ọtụtụ afọ gara aga, mgbe ọgụgụ Akwụkwọ nke Mọmọn ndị isi mbụ m enyeghị m ozugbo aziza doro anya maka ekpere m.
Ọ bụrụ na ị na-adọlị ndọlị, ka m kpokuo gị isoro ndụmọdụ nke Moronaị itule ọtụtụ ụzọ ahụ Akwụkwọ nke Mọmọn ji akuzi “otu Onyenwe anyị siri nwee obi ebere [nʼebe] ụmụ mmadụ nọ”? Na ndabere na nhụmihe nkem, enwere m olile anya na mgbe unu mere nke a, udo nke Mmụọ Nsọ ga-abanye niime obi unu ma unu ga-abịa mata, kwere, ma nwee mmetụta na Akwụkwọ nke Mọmọn ya na atụmatụ nke ebere ọ na-akuzi bụ eziokwu.
A na m ekwuputa obi ekele m maka nnukwu atụmatụ ebere nke Nna na maka njikere nke Onye Nzọpụta dị ị metazu ya ruo nʻisi. A maara m ma Ọ ga-egosipụta Onwe Ya nʻebere niime tempụl Ya dị nsọ ma niime akụkụ ọbụla nke ndụ anyị ma ọ bụrụ nʻanyị chọọ Ya. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.