Ọgbakọ Zuru ọha
Atụmatụ ahụ nke Ebere
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


11:5

Atụmatụ ahụ nke Ebere

Onyenwe anyị dị ebere ma atụmatụ nke nzọpụta nke Nna anyị nke Eluigwe nʻezie nʻezie bụ atụmatụ nke ebere.

Ịkpọ oku nke Onye amụma

Na Eprel gara aga, ozugbo amara ọkwa ọn̄ụ ahụ na Nzukọ nsọ anyị azụrụwo Tempụl Kirtland, Onyeisi Russell M. Nelson kpokuru anyị ịmu ekpere nraranye nke Tempụl Kirtland edekọrọ niime nkeji 109 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile. Ekpere nraranye ahụ, ka Onyeisi Nelson kwuru, “bụ ihe nkuzi maka otu tempụl si enye mụ na gị ike ime mmụọ iji zute aka mgba niile nke ndụ n’ụbọchị niile nke ikpeazụ a.”

O doro m anya na ọmụmụ gị nke nkeji 109 ahụ nweteere gị nghọta omimi niile nke gọziworo gị. Na mgbede nke a, A na m ekesara unu ụfọdụ ihe ole na ole nke m mụtara dịka m sooro ịkpọ okù nke onye amụma anyị. Ụzọ nke udo obi ahụ mjere nihi ọmụmụ m chetara m na Onyenwe anyị dị ebere nakwa na atụmatụ nke nzọpụta nʻezie nʻezie bụ atụmatụ nke ebere.

Ndị Mgbasa Ozi ọma Akpọrọ Ọhụrụ Na-eje Ozi na Tempụl

Enwere ike dị ka ịmara, “ndị mgbasa ozi ọma akpọrọ ọhụrụ ka a na-agba ume ka ha nata onyinye dị nsọ nke tempụl ozugbo ahụ o kwere omume ma gaa tempụl mgbe na mgbe dịka ọnọdụ kwere ha.” Ozugbo he natara onyinye dị nsọ, ha nwekwara ike “ije ozi dịka ndị ọrụ … nke tempụl tupu ha amalite ije ozi mgbasa ozi ọma ha.”

Oge ahụ a nọ niime tempụl tupu abanye ụlọ ọzụzụ ndị mgbasa ozi ọma (MTC) nwere ike bụrụ otu ngọzi dị ịtụnaanya nye ndị mgbasa ozi ọma ọhụrụ dịka ha na a mụtakwu banyere ọgbụgba ndụ tempụl tupu ikesara ngọzi niile nke ọgbụgba ndụ ahụ nye ụwa.

Mana na-ịmụ nkeji 109, A mụtawom na, niime tempụl, Chineke na-enye ndị mgbasa ozi ọma ọhụrụ ndịa ike—nʻezie, anyị niile—nʻụzọ ọzo dị nsọ. Niime ekpere nraranye ahụ, nke enyere site na mkpughe, Onye amụma Josef Smit kpere na “mgbe ndị odibọ gị ga-apụ, site n’ụlọ gị … igba-ama nke aha gị” ka “obi ha niile” nke “ndị mmadụ niile” “wee dị nro”—ma “ndị ukwu nile nke ụwa” na “ndị ogbenye nile, ndị nwere mkpa, na ndị [ahụ] nile nọ na mkpagbu.” Ọ kpere ekpere “ka ikpe n’ezigh ezi ha wee nye-ohere n’iru ezi-okwu, ka ndị nke gị wee nata iru-ọma n’iru anya nke ndị nile; ka nsọtụ nile nke ụwa wee mara na anyị, ndị odibo gị, a nụwo olu gị, nakwa na ọ bụ gị zipụrụ anyị.”

Nke a bụ nkwa mara mma maka ndị mgbasa ozi ọma akpọrọ ọhụrụ—ịme ka ikpe na-ezighi ezi nye-ohere n’iru ezi-okwu,” iji “nata iru-ọma n’iru anya nke ndị nile,” ma iji mee ka ụwa mata na ọ bụ Onyenwe anyị zipụrụ ha. Onye ọbụla n’ime anyị chọsịrị ike ụdị ngọzi ndị ahụ. Ụdị ngọzi nke a ga-abụ ịnwe obi emere ka ọ dị nro dịka anyị na-akparịta anyị na ndị agbata obi na ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ. Ekpere nraranye ahụ akọwaghị kpọmkwem otu oge anyị na tempụl ga-esi eme ka obi ndị ọzọ dịrị nro, mana ekwere m na ọ na-ebidokwa nihi oge ahụ anyị gburu nʻụlọ nke Onyenwe anyị na-eme ka obi anyị dị nro nihi na edobere anyị nʻetiti Jizọs Kraịst na nʻebere Ya.

Onyenwe anyị Zara Arịrịọ nke Josef Smit Maka Ebere

Dịka m mụrụ ekpere nraranye nke Kirtland, ọ metụrụ m na Josef ugboro ugboro rịọrọ maka ebere—maka ndị otù nke Nzukọ nsọ, maka ndị iro nke Nzukọ nsọ, maka ndị ndu nke obodo, maka mba niile nke ụwa. Na, nke metụtara ya nnọọ, ọ rịọrọ Onyenwe anyị ka ọ cheta ya ma ka ọ nwere ebere nʻisi Emma ya ọ hụrụ naanya na ụmụ ha.

Onye maara ụdị mmetụta Josef nwetere, mgbe otu izu ụka gasịrị, nʻụbọchị Ista ahụ, Eprel 3, 1836, na Tempụl Kirtland, Onye Nzọpụta apụtakwuru ya na Oliver Cowdery ma, dịka edekọrọ na nkeji 110 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, kwuo, “A nabatawo m ụlọ nke a, na aha nke m ga-anọ ebe a; na a ga m egosi onwe m nye ndị nke m n’ebere n’ụlọ nke a.” Nkwa nke ebere nke a ga-enwerịrị nkọwa pụrụiche nye Josef. Ma dịka Onyeisi Nelson kuziri na Eprel gara aga, nkwa nke a nʻotu aka ahụ “metụtara tempụl ọbụla araranye taa.”

Ịchọta Ebere niime Ụlọ nke Onyenwe anyị

Enwere ọtụtụ ụzọ anyị niile nʻotu nʻotu nwere ike iji chọta ebere niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Nke a abụrụwo eziokwu kemgbe Onyenwe anyị buru ụzọ nye ndị Izrel iwu ka ha wuo tabanakụl ma ka ha debe ya nʻetiti nke “oche ebere.” ahụ Niime tempụl, anyị na-achọta ebere niime ọgbụgba ndụ niile ndị anyị na-agba. Ọgbụgba ndụ ndị ahụ, na mgbakwunye nye ọgbụgba ndụ nke baptizim, na-ekedo anyi na Nna na Ọkpara ahụ ma na-enye anyị nnukwu ohere ruo na ihe ahụ Onyeisi Nelson kuziworo bụ “ụdị ịhụnaanya na ebere pụrụiche … akpọrọ hesed” na asụsụ Hibru.

Anyị na-achọta ebere niime ohere ahụ dị niime nrachi nye ezinaụlọ anyị maka ebighi ebi. Anyị na-abịakwa ghọta nʻụzọ dokwuru anya, na Okike ahụ, Ọdịda ahụ, aja mgbaghara nke Onye Nzọpụta, na ike anyị iji banye ọzọ nʻirụ nke Nna anyị nke Eluigwe—nʻezie akụkụ ọbụla nke atụmatụ nzọpụta ahụ—bụ ngosipụta niile nke ebere. Enwere ike ikwu na atụmatụ nke nzọpụta bụ atụmatụ nke an̄ụrị nihi kpọmkwem ọ bụ “atụmatụ nke ebere.”

Ịchọ Mgbaghara Na-emepee Ụzọ nye Mmụọ Nsọ ahụ

Enwere m obi ekele maka ọmarịcha nkwa ahụ dị na nkeji 110 na Onyenwe anyị ga-egosipụta Onwe Ya nʻebere niime tempụl niile nke Ya. Enwekwara m obi ekele maka ihe ọ na-ekpughe banyere otu Onyenwe anyị ga-esi gosipụta Onwe Ya nʻebere mgbe ọbụla anyị, dịka Josef, rịọrọ maka ebere.

Arịrịọ maka ebere nke Josef Smit dị niime nkeji 109 abụghị arịrịọ ebere nke mbụ ya akpalitere nihi mkpughe. Nʻebe Ọdọ osisi Dị nsọ, Josef nta kpere ekpere nʻabụghị naanị ka ọ mata Nzukọ nsọ nke bụ eziokwu, mana o kwukwara na ọ “bere akwa nye Onyenwe anyị maka ebere, niihi enweghi onye ọzọ m [ga-agakwuru] ga-enwete ebere nʻaka ya.” Nʻụzọ ụfọdụ, mmata ọ matara na ọ chọsịrị ike ebere ahụ nke naanị Onyenwe anyị nwere ike ịnye, nyere aka mepee mpio niile nke eluigwe. Mgbe afọ atọ gara, mmụọ ozi Moronaị pụtakwuru nihi ihe Josef kwuru na ọ bụ maka “ekpere na arịrịọ nye Chineke Pụrụ Ime Ihe niile maka mgbaghara maka njọ m na nzuzu m niile.”

Usoro nke mkpughe nke a nke na-esote arịrịọ maka ebere bụ nke ama ama niime akwụkwọ nsọ. Ịnos nụrụ olu nke Onyenwe anyị naanị mgbe ọ kpere ekpere maka mgbaghara. Mgbanwe nke nna Eze Lamoni bidoro nʻekpere ya, “Aga m ahapụ njọ m niile iji mara gị.” Enwere ike a gaghị ejiri ụdịrị nhụmihe ndị dị ike otu a gozie anyị, mana maka ndị ahụ ndị mgbe ụfọdụ na-adọlị ị nata azịza ekpere ha, ị dị na-achọ ebere nke Onyenwe anyị bụ otu niime ụzo kacha eji enwete aka ebe nke Mmụọ Nsọ ahụ.

Itule uche na Ebere nke Chineke Na-emepe Ụzọ ahụ eji enwete Ịgba ama banyere Akwụkwọ nke Mọmọn.

Otu ụdị ụkpụrụ ahụ ka akuziri nke ọma niime Moronaị 10:3–5. Mgbe ụfọdu anyị na-egbukarị amaokwu ndịa na nkenke iji kuzie na, site nʻekpere obi ọcha, anyị nwere ike ịmụta ma Akwụkwọ nke Mọmọn ọ bụ eziokwu. Mana nkenke nke a na-ahapụ oke nʻọrụ dị mkpa nke ebere. Gee ntị otu Moronaị jiri malite okwu mgbam ume ya: “A ga m agba unu ume nke ọ ga-abụ na mgbe unu ga-agụ ihe ndị a, … na unu ga-echeta otu Onyenwe anyị siri nwee obi ebere nʼebe ụmụ mmadụ nọ, site nʼokike nke Adam ọbụna gbadaa ruo nʼoge nke unu ga-anata ihe ndị a, ma tụgharịa uche na ya nʼime obi unu.”

Moronaị gbara ume ka anyị ghara naanị ịgụ ihe ndịa—ndekọihe ahụ ọ na-achọ ịrachi—makwa ka anyị tụgharịa niime uche anyị ihe Akwụkwọ nke Mọmọn kpughere banyere “otu Onye-nwe siri nwe obi ebere nʼebe ụmụ nke mmadụ nọ.” Ọ bụ ịtụgharịa uche nʻebere nke Onyenwe anyị na-akwado anyị ị “rịọ Chineke, Nna nke Ebighi ebi, nʼaha nke Kraịst, ma ọ bụ na ihe ndị a abụghị eziokwu.”

Dịka anyị na-atụgharị uche nʻAkwụkwọ nke Mọmọn, anyị nwere ike jụọ: Ọ bụ ezi nʻezie, dịka Alma kuziri, na atụmatụ nke ebere nke Chineke na-emesi obi ike na onye ọbụla biworo nʻụwa nke a ga-ebilite nʻọnwụ na a “ga-eweghachi ha … n’ezigbo ọnọdụ na okporo-arụ zuru oke”? Amulek o kwuru eziokwu—ebere nke Onye Nzọpụta o nwere ike metazuo ihe niile kwesịrị-ime nke ikpe zịrị ezi chọrọ nke naara ịnọ nʻaka anyị ịkwụ ma kama “[ma gbagide anyị] gburu-gburu n’aka nile nke nchekwa”?

Ọ bụ eziokwu, dịka Alma gbara ama, na Kraịst tara ahụhụ na-abụghị naanị maka njọ anyị niile makwa maka “mgbu nile na mkpagbu” ka ọ wee “mata … otu ọ ga-esi nyere ndị ya aka dịka adịghị ike ha nile siri dị.”? Ọ bụ eziokwu na Onyenwe anyị nwere ụdị obi ebere ahụ, dịka Eze Benjamin kuziiri, na, dịka onyinye na-efughi ego, Ọ tụrụ aja “maka mmehie nile nke ndị ahụ … ndị nwụworo na-amaghị uche nke Chineke gbasara ha, ma-ọbụ ndị mehieworo na-amaghị-ama”?

Ọ bụ eziokwu, dịka Lehi kwuru, na “Adam dara ka mmadụ wee dịrị; ma mmadụ dị, ka ha wee nwee ọn̄ụ”? Ma ọ bụ eziokwu nʻezie, dịka Abinadaị gbara ama, na-en̄ọmi Aịzaya, na Jizọs Kraịst ka “e merụrụ ya arụ n’ihi njehie anyị nile, e tirụrụ ya arụ n’ihi ajọọ-omume anyị nile; ịta nnukwu ahụhụ nke udo anyị dị n’isi ya, ma n’ihi ụfụ arụ ya a gwọwo anyị”?

Na nchịkọta okwu, ọ bụ nʻezie na atụmatụ nke Nna dịka otu esi wee kuzie niime Akwụkwọ nke Mọmọn dị nnọọ ebere otu a? A na m agba ama na ọ dị, nakwa na nkuzi niile ahụ banyere ebere nke na-enye udo na olileanya nọ niime Akwụkwọ nke Mọmọn bụ eziokwu.

Agbanyeghi nke ahụ, A na m eche na ụfọdụ nwere ike na-adọlị nagbanyeghi ọgụgụ na ekpere niile unu na-adigide, iji mata nkwa nke Moronaị na Nna nke Eluigwe “ga-egosipụta eziokwu maka ya nye unu, site nʼike nke Mmụọ Nsọ.” A maara m maka ndọlị nke a nihi na ọ metụtawom na mbụ, ọtụtụ afọ gara aga, mgbe ọgụgụ Akwụkwọ nke Mọmọn ndị isi mbụ m enyeghị m ozugbo aziza doro anya maka ekpere m.

Ọ bụrụ na ị na-adọlị ndọlị, ka m kpokuo gị isoro ndụmọdụ nke Moronaị itule ọtụtụ ụzọ ahụ Akwụkwọ nke Mọmọn ji akuzi “otu Onyenwe anyị siri nwee obi ebere [nʼebe] ụmụ mmadụ nọ”? Na ndabere na nhụmihe nkem, enwere m olile anya na mgbe unu mere nke a, udo nke Mmụọ Nsọ ga-abanye niime obi unu ma unu ga-abịa mata, kwere, ma nwee mmetụta na Akwụkwọ nke Mọmọn ya na atụmatụ nke ebere ọ na-akuzi bụ eziokwu.

A na m ekwuputa obi ekele m maka nnukwu atụmatụ ebere nke Nna na maka njikere nke Onye Nzọpụta dị ị metazu ya ruo nʻisi. A maara m ma Ọ ga-egosipụta Onwe Ya nʻebere niime tempụl Ya dị nsọ ma niime akụkụ ọbụla nke ndụ anyị ma ọ bụrụ nʻanyị chọọ Ya. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Russell M. Nelson, “N̄ụrịa ọńụ niime Onyinye nke Ntụghe niile nke Ọkwa nchụaja,” Liahona, Mee 2024, 121.

  2. Russell M. Nelson, “N̄ụrịa ọńụ niime Onyinye nke Ntụghe niile nke Ọkwa nchụaja,” 121.

  3. Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazu a, 24.5.1, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  4. Dịka ọ dị na ngozi nile nke tempụl, Chineke ịnye ngọzi ndị a dabere na anyị idobe ọgbụgba ndụ ndị anyị na-eme niime temple. Lee Russell M. Nelson, “Merie Ụwa ahụ ma Chọta Ezumike,” Liahona, Nov. 2022, 96: “Onye ọbụla nke mere ọgbụgba ndụ niile … niime tempụl niile—ma na-edobe ha—nwere ụzọ bara ụba esi enweta ike nke Jizọs Kraịst.”

    Dịka ọmụmatụ ọzọ, cheegodi maka nkwuputa nke Ndịisi nke Mbụ banyere iyi gamentị nke tempụl: “Dị ka i na-edebe ọgbụgba ndụ gị niile, gụnyere ohere nsọ iyi gamentị dị ka akuziri n’emume nsọ nkwado niile, ị ga-enwe ohere karịa ruo na ebere, nchekwa, ume, na ike nke Onye Nzọpụta.” (Akwụkwọ ntụziaka Izugbe, 26.3.3.2; Ọba Akwụkwọ maka Ozi ọma; agbakwunyere okwu doro anya).

  5. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:55–57.

  6. Lee Russell M. Nelson, “Onyenwe anyị Jizọs Kraịst Ga-abịa Ọzọ,” Liahona, Nọv. 2024, 121–22: “Nke a bụ nkwa m na-ekwe unu: Onye ọbụla ji obi ọcha achọ Jizọs Kraịst ga-achọta Ya nime tempụl. Ị ga-enweta mmetụta ebere Ya.”

  7. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:34: “Nwee-ebere n’ebe ndị a nọ, na dịka mmadụ nile na-eme mmehie gbaghara njehie nile nke ndị gị, na ka ehichapụ ha ruo mgbe nile.”

  8. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:50.

  9. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:54. Josef rịọkwara Onyenwe anyị “ka ọ mee-ebere n’isi ụmụ nke Jekọb, ka Jerusalem, site na awa nke a, wee malite i bụ ndị agbapụtara; na ibu-arụ nke ịbụ oru wee malite ịbụ ihe anyakwasịrị site n’ụlọ nke Devid; na ka ụmụ nke Juda wee malite ilọghachi n’ala nile nke ị nyere Abraham, nna ha” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 109:62–64).

  10. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:68.

  11. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:69. Oxford English Dictionary ahụ na-akọwa ebere dị ka “obi ebere na ọmịiko a na-emere onye nọ n’ọnọdụ nke enweghị ike ma ọlị.” (“mercy,” oed.com). Ebere, dị nnọọ ka amara, bụ ngosipụta nke ịhụnaanya na obi ọma nke Chineke— hesedYa. Ebe ebere lekwasịrị anya na-igbochi ntaram ahụhụ kwesịrị anyị, amara na-arụtụkarị aka otu Chineke si enye anyị ngọzi na-erughịrị anyị na n’agbanyeghị nanyị ekwesịghị irite ha.

  12. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:7.

  13. Iji gosipụta ebere nke ebu mmadụ nʻobi gosi, Josef na Oliver ka agwara, “Lee, agbagharawo unu mmehie nile unu; unu dị ọcha n’iru m; ya mere, welite nụ isi unu na n̄ụrịa ọn̄ụ.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:5).

  14. Russell M. Nelson, “N̄ụrịa ọńụ niime Onyinye nke Ntụghe niile nke Ọkwa nchụaja,” 119. Onyeisi Nelson kwuru, “A na m akpọku unu ka unu tulee ihe nkwa nke Onyenwe anyị pụtara nye unu onwe unu.”

  15. Lee Ọkọwa okwu Baịbụl, “Tabernacle”: “Ebe Nsọ ahụ kacha Dị nsọ nwere naanị otu ngwa ụlọ: Igbe ọgbụgba ndụ ahụ. … N’elu Igbe ahụ ma na-akpụ ihe mkpuchi ahụ oche nke udo. Ọ na-arụ ọrụ dịka, ya na igbe ahụ dị n’okpuru ya, ebe ịchụàjà nelu ebe a na-atụ aja mgbaghara mmehie nke ndị Juu kachasị mara. N’elu ya ka e fesa ọbara nke àjà-nmehie nke ụbọchị nke Aja mgbaghara mmehie (Lev. 16:14–15). Oche udo ahụ bụ ebe nke ngosipụta nke ebube Chineke (Ọp. 25:22).”

  16. Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị ebighị ebiLiahona, Oct. 2022, 5. Dịka Onyeisi Nelson siri rụtụ aka, hesed enweghị ezi bekee dabara na ya, mana ntụgharị asụsụ ya kachasị dị niime Agba Ochie bụ ebere N’ime ugboro 248 okwu ahụ bụ hesed pụtara na King James Version nke Agba Ochie, akpọrọ, ebere ugboro 149, obiọma ugboro 40, na obi ebere dị ịhụnaanya ugboro 30 (lee Blue Letter Bible, blueletterbible.org/lexicon/h2617/kjv/wlc/0-1/).

  17. Lee General Handbook, 27.2. Jọn Onyeozi kuziri anyị na o nweghị onye n’ime anyị nwere ike ịbịakwute Nna ma ọbụghị site n’aka Onye nzọpụta (lee Jọn 14:6). Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, Onye Nzọpụta rọpụtara ọmarịcha nkọwa nke a nke arịrịọ Ya maka ebere nʻisi anyị:

    “Gee ntị nye ya onye bụ onye-nkwuchita ọnụ n’ebe Nna nọ, onye na-arịọtara unu n’ihu ya—

    “Na asi: Nna, lee ahụhụ niile na onwu nke onye ahụ na emeghị njọ ọbụla, onye nke ihe ya na amasi; lee obara Ọkpara gị nke awusara, obara nke onye ahụ ị mere ka eji nye gị otịto;

    “Ya mere, Nna, mere ụmụ-nne m ndị ebere, ndị nke kwere na aha m, ka ha were biakwutem ma nweta ndụ ebighị-ebị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:3–5).

  18. Onyeisi Jeffrey R. Holland kwuru otu oge: “N’ezie ihe kacha amasị Chineke gbasara ịbụ Chineke bụ obi ụtọ nke ime ebere, ọkachasị ndị na-atụghị anya ya ma na-echekarị na ha erughị eru ya” (“Ndị Ọrụ ike na Ubi vaịn,” Liahona, Mee 2012, 33). Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 128:19: “Ugbu a, gịnị ka anyị na-anụ n’ozi ọma nke anyị nataworo? Olu nke obi-ụtọ! Olu nke ebere sitere n’elu-igwe; na olu nke ezi-okwu site n’ụwa; ozi nile nke obi-ụtọ maka ndị nwụrụ-anwụ; olu nke obi-ụtọ maka ndị dị ndụ na ndị nwụrụ-anwụ; ozi nile nke obi-ụtọ nke oke ọn̄ụ.”

  19. Alma 42:15. Ebere nọ nnọọ mgbe niile nʻetiti atụmatụ nke nzọpụta. Akwụkwọ nsọ na-akụzi nke a nke ọma. Nefi chikọtara isi nke mbụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn site na-ikwu, “Ma lee, mụ, Nifaị, ga egosị unu na obi ebere nke Onye-nwe ka a na-enye ndị nile ọ họpụtaworo, n’ihi okwukwe ha, ime ka ha bụrụ dike ọbụna ruo n’ike nke nnapụta” (1 Nefi 1:20).

    Niime Ọpụpụ 34:6, Onyenwe anyị kwuputara aha Ya nye Moses dịka “Chineke Onyenwe, onye obi ebere na onye amara, onye nwere ogologo ntachi obi, na juputa na ịdị mma na eziokwu.” Ụfọdụ ndị mmadụ atuwo aro na amaokwu nke a nwere ike bụrụ nke ahụ ndị amụma ochie Agba Ochie kacha arụtụ aka na ya karịa amaokwu ọ bụla ọzọ dị n’ime Agba Ochie. (lee, maka ọmụmatụ, Bible Project, “The Most Quoted Verse in the Bible,” bibleproject.com/podcast/most-quoted-verse-bible/).

    N’ime Agba Ọhụrụ, n’akwụkwọ nke Luk, cheta na e tiri Zakarayas “ogbu, ma o nweghị ike ikwu okwu” mgbe ọ na-enwe obi abụọ maka nkwa ahụ nke mmụọ ozi ahụ na Elizabet n’oge agadi ya ga-amụ nwa nwoke, onye ga-abụ Jọn Ome Baptizim (Luk 1:20). Mgbe a tọhapụrụ olu Zakarayas n’ikpeazụ, o “jupụtara na Mmụọ Nsọ” na, na nkwupụta ihu ọha mbụ na oge Mesaịa ahụ abịawo n’ikpeazụ, o “buru amụma” na Onyenwe anyị ga-abịa “imere ebere ahụ e kwere nna anyị hà ná nkwa, na icheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ; iyi nke Ọ ṅụụrụ nna anyị Ebreham” (Luk 1:67, 72–73; okwu doro anya ka agbakwunyere).

  20. Lee Isiokwu niile nke Ozi ọma, “Akụkọ niile nke Ọhụ Mbụ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; lee tụmadị akụkọ nke afọ 1832.

  21. Joseph Smith—Agụgụala 1:29. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:5–6 na-arọpụta nkọwa ọzọ maka ọrụ nke nchegharị niime ọhụ abụo dị ike. Josef kwuru na “ka onye ọbụla ghara iche na m nwere, ikpe ọmụma nke oke mmehie ma-ọbụ ime oke ajọọ omume nile,” mana ọ nwetere “amamikpe maka adịghị ike na etozughị-oke [ya] nile” ma nwee mkpa mgbaghara (Joseph Smith—Agụgụala 1:28, 29).

  22. Lee Inọs 1:1–8.

  23. Alma 22:18. Ekpere Alma bụ, “O Jizọs, gị Ọkpara nke Chineke, meere m ebere,” na-ebute ide mmiri nke ihè na enyemaka site na ihe mgbu (lee Alma 36:17–20). Onyeisi Jeffrey R. Holland kwuru otu oge maka arịrịọ nke Alma: “Ikekwe ụdị ekpere ahụ, ọ bụ nʻezie na ọ dị nkenke, bụ nke kachasị mkpa nke enwere ike ikpe n’ime ụwa dara ada. Ekpere ọ bụla ọzọ anyị na-ekpe, mkpa ọ bụla ọzọ anyị nwere, ha niile na-alaghachi n’arịrịọ ahụ: ‘O Jizọs, gị Ọkpara nke Chineke, meere m ebere’” (Our Day Star Rising: Exploring the New Testament with Jeffrey R. Holland [2022], 170–71).

  24. Okenye Kyle S. Mckaya kuziri nke ọma, “Omume Joseph nke ịchegharị mgbe na mgbe na-enye m obisike iji ʻbịaruo oche eze nke amara jiri obisike, ka [m] wee nwee ike nwete obi ebere.’” (“Nwoke ahụ Onye ya na Jehova Kwuru,” Liahona, Nov. 2024, 61).

  25. Moronaị 10:3.

  26. Arịrịo nke Moronaị bụ okwu mgbakwunye nye nkwuputa nke Nefi na mmalite nke Akwụkwọ nke Mọmọn, ebe o kwuru nzube nke ya nʻodide nʻelu epekele niile: “Ma lee, mụ, Nifaị, ga egosị unu na obi ebere nke Onye-nwe ka a na-enye ndị nile ọ họpụtaworo, n’ihi okwukwe ha, ime ka ha bụrụ dike ọbụna ruo n’ike nke nnapụta” (1 Nephi 1:20).

  27. Moronaị 10:4.

  28. Lee Mọmọn 9:13.

  29. Alma 40:23: “A ga eweghachi mkpụrụ obi ahụ nye ahụ, ma ahụ nye mkpụrụ obi; ee, na ụkwụ na aka niile na njikọ ha a ga-eweghachi ha nye ahụ ya; ee, ọbụna otu mkpụrụ agịrị isi nke isi ahụ agaghị efu; kama a ga-eweghachi ihe niile n’ezigbo ọnọdụ na okporo ahụ zuru oke.”

  30. Alma 34:16. Dịka anyị na-atụle etu Onyenwe anyị siri nwee obi ebere, enwere ike ịnwa anyị ịwepụ ebere site na ikpe ziri ezi—iche na naanị ịhụnanya ebere nke Nna anyị nke Eluigwe nwere ike imeri ikpe ziri ezi. Mana dịka Alma kuziri, “Atụmatụ ahụ nke ebere agaraghị ewebata atụmatụ nke ebere ma ọbụghị na aga achụ aja-nzọpụta; ya mere Chineke n’onwe ya na-achụ maka aja mgbaghara mmehie nile nke ụwa, iwebata atụmatụ nke ebere, imeju ọchịchọ nile nke ikpe ziri-ezi, ka Chineke wee bụrụ onye zuru-oke, Chineke ikpe ziri-ezi, na kwa Chineke nke ebere” (Alma 42:15; okwu doro anya ka agbakwụnyere).

    Ịhụnaanya ebere niile nke Onye nzọpụta nwere n’ebe anyị nọ enweghị ike ịzọpụta anyị. Kama, ọ bụ ahụhụ Ya nke ahụ di irè, na ihe na-egbu mgbu nke ikpe ziri ezi chọrọ na-azọpụta anyị. N’ezie nke a adịghị ebelata ịdị mkpa nke ịhụnaanya Ya. N’ezie, ọ bụ ịhụnanya Ya n’ebe anyị nọ—na ọchịchọ Ya ime uche nke Nna, onye hụkwara anyị naanya—mere Ya ka ọ dị njikere ịta ahụhụ (lee Jọn 3:16; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 34:3). Mana ịhụnaanya nʻonwe ya naanị enweghi ike ịrụ ọrụ.

    Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ilekwasị anya nke ukwuu n’ịhụnaanya Ya n’ebe anyị nọ niihi otu anyị siri dị, nke mere na anyị echefuo eziokwu ahụ na otu ahụ anyị dị—dị ka ndị nwoke na ụmụ nwanyị anụ ahụ ndị omume ha ezughị oke na-idebe iwu-nsọ—chọrọ ka emetazuo ọchịchọ niile nke ikpe ziri ezi. Ọ bụrụ na anyị aghọtahie ma were ịhụnanya Ya dị ka ihe na-ewepụ ọchịchọ niile nke ikpe ziri ezi, anyị na-ebelata onyinye nke aja mgbaghara mmehie Ya na ahụhụ O tara iji kwụọ ụgwọ ikpe ziri ezi. Ọ ga-abụ ihe na-akụda mmụọ ma ọ bụrụ na a ghọtara ịhụnanya Ya n’ebe anyị na ọ bụ ihe na-eme ka a ga-asị na aja mgbapụta Ya adịghị mkpa. Lee ka o si ka mma ileba anya kpọmkwem nʻọchịchọ niile nke ikpe ziri ezi ma emesịa ị nwee ekele na Ọ hụrụ anyị naanya nke ọma iburu ibu ọchịchọ ndị ahụ nʻaha anyị.

  31. Alma 7:11–12.

  32. Mosaịa 3:11.

  33. 2 Nifaị 2:25.

  34. Mosaịa 14:5.

  35. Moronaị 10:4.

  36. Moronaị 10:3.

  37. Onyeisi M. Russell Ballard gbara anyị ume ka anyị “gbaa ama maka ihe anyị maara na kwnyere na ihe anyị na-enwe mmetụta ya” (“Chetakwa Ihe ahụ Kachasị Dị Mkpa,” Liahona, Mee 2023, 107).

  38. Na-inye ntụnye nke a, achọghị m ịnye ihe “usoro” ọzọ maka ịgba ama nke eziokwu nke Akwụkwọ nke Mọmọn ma ọ bụ ozi-ọma. Dị ka Okenye David A. Bednar kuziri, mkpughe nwere ike ịbịa dịka “ihè agbanyere n’ime ụlọ gbara ọchịchịrị,” ebe a na-anata mkpughe ahụ “ngwa ngwa, kpam kpam na otu mgbe.” Ọ nwekwara ike ịbịa dịka “mmụba nke nta nke nta nke ìhè na-enwu site n’ọwụwa anyanwụ, … ʻahịrị n’elu ahịrị, ozizi n’elu oziziʻ (2 Nefi 28:30). … Mkparịta ndị dị otu ahụ sitere n’aka Nna nke Eluigwe na-eji nwayọọ nwayọọ na ‘atasa na [mkpụrụ obi anyị] dịka igirigi site n’elu-igweʻ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:45]. Ụdị usoro mkpughe nke a na-abụkarị ndị ahụ na-emekarị karịa nke na-adịghị emekarị” (“Mmụọ nke Mkpughe,” Liahona, Mee 2011, 88)