Ọgbakọ Zuru ọha
“Bịaruo Mụ Nso.”
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


17:4

“Bịaruo Mụ Nso.”

Jizọs Kraịst hụrụ onye ọbụla niime anyị naanya. Ọ naenye anyị ohere ịbịaru Ya nso.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ọ bụ ihe ọn̄ụ nye m ị nọnyere unu n’ọgbakọ zuruọha nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a. Nke a bụ Nzukọ nsọ Ya. Anyị gbakọtara nʻụlọ ndị arụrụ na ebe obibi niile na gburugburu ụwa nʻaha Ya.

Anyị na-ewekwasị onwe anyị aha Ya mgbe anyị na-abata n’alaeze Ya site nʻogbụgba ndụ. Ọ bụ Ọkpara Chineke si nʻọnwụ bilie ma dị ebube. Anyị bụ mmadụ na-anwụ anwụ, ma nọ nʻokpuru mmehie na ọnwụ. Otu ọ dị, n’ịhụnaanya Ya n’ebe onye ọbụla niime anyị nọ, Onye Nzọpụta na-akpọku anyị ịbịakwute Ya nso.

Onye Nzọpụta si nʻili na-apụta.

Nke a bụ ọkpụkpọ oku Ya nye anyị: “Biakwutenụ m nso ma aga m abịakwute unu nso; chọsienụ m ike ma unu ga-achọta m; rịọ nụ, ma unu ga-anata; kụọ aka, ma a ga-emeghere unu ya.”

E nwere oge ndị anyị na-anọ Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst nso. Ma otu ọ dị, mgbe ụfọdụ nʻoge mnwale nke ndụ anụ ahụ anyị, anyị nwere ike chee na anyị anọghị Ya nso ma na-achọ mmasi obi ike na Ọ maara ihe dị anyị nʻobi ma hụ anyị naanya nʻotu nʻotu.

Mkpọku nke Onye Nzọpụta gunyere otu anyị si ahụta mmasi obi ike ahụ. Bịarute Ya nso site nʻịdị na-echeta Ya mgbe niile. Chọsie Ya ike site nʻọmụmụ akwụkwọ nsọ. Jiri obi gị niile site nʻekpere rịọ Nna nke Eluigwe ka ịbịakwute Ọkpara Ya Ọ hụrụnaanya nso.

E nwere ụzọ dị mfe iji chee gbasara ya. Ọ bụ ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ekewapụrụ gị obere oge site nʻebe ndị ezi enyi nọ. Ị ga-achọta ụzọ ị ga-esi ekwuru ha okwu, ozi ọbụla ịnatara site nʻaka ha ga-amasị gị, ị gakwa eme ihe niile i nwere ike ime iji nyere ha aka.

Ka nke ahụ na-akacha eme, ka ọ na-akacha anọte aka, otu ahụ ka ịdị omimi nke njikọ ịhụnaanya ga-adị ike karịa, ma unu ga-ahụta onwe unu ịnọgide na-erute onye na ibe ya nso karịa. Ọ bụrụ na oge agaa nnukwu na-enweghị nzikọrịta ozi na ohere inyere onye na ibe ya aka dị mmasị, njikọ ahụ ga-atụnwụ.

Jizọs Kraịst hụrụ onye ọbụla niime anyị naanya. Ọ na-enye ohere ahụ ịbịarute Ya nso karịa. Dị ka esi emere enyi dị ịhụnaanya, ị ga-emekwa ya nʻotu ụdị ụzọ ahụ, site na ikwurịta okwu site na ekpere nye Nna nke Eluigwe nʻaha Jizọs Kraịst, ịn̄a ntị maka nduzi eji kpọrọ ihe site na Mmụọ Nsọ, na ijere ndị ọzọ ozi maka Onye Nzọpụta nʻihu ọcha. Mgbe na-adịghị anya ị ga-enwe mmetụta ngọzi ahụ nke ịbịarute Ya nso.

Nʻoge okoroọbịa m, e nwetere m an̄ụrị nke ịbịakwute Onye Nzọpụta nso karịa—na nke Ya ịbịakwute m nso karịa, site na omume ihe ndị dị mfe nke irube isi n’iwu nsọ niile. Mgbe m bụ nwata, a naara enye oriri nsọ n’oge nzukọ nke mgbede. Anọkwa m na-echeta otu abalị kpọmkwem, ihe karịrị afọ 75 gara aga, mgbe ọchịchịrị gbara ma oyi a na-atụ nʻezi. E chetara m mmetụta nke ihè na ekpomọkụ mgbe m matara na edebewo m iwu nsọ mụ na Ndị nsọ ịgbakọ iri oriri nsọ, na-agba ndụ mụ na Nna anyị nke Eluigwe icheta Ọkpara Ya mgbe niile ma dobe iwu nsọ Ya niile.

Na ngwụcha nke nzukọ ahụ, anyi gụrụ abụ “Nọọnyere M; ’O Ruwo Anyasị,” jiri mkpụrụokwu ndị na-enweghị nchefu “O Onye Nzọpụta, nọnyere m n’abalị a.”

Mkpụrụokwu ndị a weteere m echiche nke Mmụọ karịrị akarị, ọbụna dị ka nwata nwoke. E nwetere m mmetụta ịhụnanya na ịnọ nso nke Onye Nzọpụta na mgbede ahụ site na nkasi obi nke Mmụọ Nsọ.

Ka ọtụtụ afọ gasịrị a chọọrọ m ịkpalitegharịkwa otu ụdị mmetụta nke ịhụnaanya Onye Nzọpụta na ịnọ nso nke m metụtaworo nʻebe Onyenwe anyị nọ n’oge nzukọ oriri nsọ ahụ mgbe m bụ nwaokoroọbịa. Ya mere e dobere m iwu nsọ ọzọ dị mfe: Enyochasịrị m akwụkwọ nsọ.

Niime akwụkwọ nke Luk, agụtara m banyere ụbọchị nke atọ mgbe mkpọgbu nʻobe na olili Ya gasịrị, mgbe ndị odibo kwesịrị ntụkwasị obi bịaworo, niihi ịhụnaanya maka Onye Nzọpụta, ite ahụ̀ Ya mmanụ. Mgbe ha bịaruru, ha hụrụ na ebupụwo okwute site nʻili ahụ ma hụkwa na ahụ Ya anọghị n’ebe ahụ.

Onye mmụọ ozi nọ na mpụta ebe ili nke Kraịst.

Ndị Mmụọ ozi abụọ guzoro n’akụkụ ma jụọ ihe kpatara egwu jiri na-atụ ha:

“Gịnị mere unu jiri na-achọ onye dị ndụ n’etiti ndi nwụrụ anwụ?

“Ọ nọghị n’ebe a, mana o biliwo: cheta otu o siri gwa unu okwu mgbe ọ ka nọrịị na Galili,

“Na-asị, Nwa nke mmadụ ka a ga-enyeferịrị n’aka nke ndi mmehie, ma a ga-akpogide ya n’obe, ma n’ụbọchị nke atọ ọ ga-ebilite kwa ọzọ.”

Kraịst na ndị na-eso ụzọ nọ nụzọ na-aga Emmaus.

Na mgbede ahụ oge uhuruchi, ndị na-eso ụzọ abụọ sitere na Jerusalem jee ruo na Emmaus, ma Onyenwe anyị sitere nʻọnwụ bilite pụtara niihu ha ma soro ha jee ije.

Akwụkwọ nke Luk nyere anyị ohere isoro ha na-eje ije na mgbede ahụ:

“Ma o wee ruo, na, dị ka ha na-akparịkọta ụka ma na-atụgharịkọta uche, Jizọs n’onwe Ya bịaketere nso, ma soro ha na-aga.

“Mana ejidere anya ha ka ha ghara ịmata ya.

“Ma ọ sịrị ha, Kedụ ụdị mkparịta ụka ndị a bụ nke unu na-enwe otu onye na ibe ya, dị ka unu na-aga, ma na-enwe mwute?

“Ma otu niime ha, nke aha ya bụ Cleopas, zara sị ya, Ọ bụ naanị gị bụ onye ọbịa na Jerusalem, ma ọ bụ na ị matabeghị ihe ndị na-abịawo na mmezu ebe ahụ n’ụbọchị ndị a?”

Ha gwara Ya maka mwute ha na Jizọs anwuwo rịị n’oge ha tụkwasiworo obi na Ọ ga-abu Onye Mgbapụta nke Izrel.

Ọ ga-abụrịrị na enwere ịhụnaanya n’olu Onyenwe anyị biliteworo n’ọnwụ dị ka Ọ naara agwa ndị na-eso ụzọ abụọ ndị a nọọrọ na mwute na nʻiru uju okwu.

Dị ka m garaniihu na-agụ, okwu ndị a bịara nke tọrọ m ụtọ nʻobi, dị nnọọ ka ọ dịịrị m mgbe m bụ obere nwata nwoke:

“Ma ha bịarutere nso n’obodo ahụ, nke ha naara aga: ma o mere dị ka ọ ga-agafe.

“Mana ha kwagidere ya, na-asị, Nọnyere anyị: niihi na o ruwego mgbede, ma ụbọchị agamiwo. Ma ọ gabara ịnọnyere ha.”

Kraịst nọ ọdọ ya na ndị na-eso ụzọ.

Onye Nzọpụta nabatara n’abalị ahụ ọkpụkpọ oku ịba n’ụlo nke ndị na-eso ụzọ Ya. Ọ nọdụrụ soro ha rie nri. O weere achịcha, gọzie ya, nyawaa ya, ma nye ha ya. Emeghere anya ha, nke na ha matara Ya. Mgbe ahụ o furu site n’anya ha.

Luk dekotaara anyị mmetụta niile nke ndi ahụ dị ngọzi na-eso ụzọ ya: “Ma ha kwuru otu onye nye ibe ya, Ọ bụ na obi anyị ekpoghị ọkụ niime anyị, mgbe ahụ ọ naara agwa anyị okwu n’akụkụ ụzọ, na mgbe o megheere anyị akwụkwọ nsọ?”

Ndị na-eso ụzọ abụọ ahụ mapụrụ laghachi azụ na Jerusalem ịgwa Ndịozi iri na otu ahụ ihe meworo. Dị ka ha nọ na-akọrịta nhụmiihe ha, Onye Nzọpụta pụtakwara ọzọ.

Ma O guzooro n’etiti ha ma “sị ha, Udo dịrị unu.” O mechara lebagharịa anya na amụma niile nke ozi ya ịchụ aja mgbaghara mmehie nke ụmụ nke Nna Ya niile na ịdọbi agbụ niile nke ọnwụ.

“Ma sị ha, Otu a ka e dere ya, ma otu a ka ọ dịịrị Kraịst ezi mkpa ịta ahụhụ, na ibilite site na ndi nwụrụ anwụ n’ụbọchị nke atọ:

“Ma na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie n’aha Ya n’etiti mba niile, malite na Jerusalem.

“Ma unu bụ ndi mgbaama banyere ihe ndị a.”

Alma na-akuzi ihe nʻebe Mmiri niile nke Mọmọn.

Dị nnọọ ka ndị na-eso Ya ọ hụrụ naanya, nwa Nna nke Eluigwe ọbụla nke na-ahọrọwo ịbanye site nʻọnụ ụzọ ama nke baptizim nọ nʻokpuru ọgbụgba ndụ ịbụ ndị aka ebe nke Onye Nzọpụta ma nwee nletaanya maka ndị ahụ nọ na mkpa nʻoge niile nke ndụ anụ ahụ anyị. Mkpebi nke a bụ ihe e mere ka o doo anyị anya site nʻaka nnukwu onye amụma Alma nke Akwụkwọ nke Mọmọn ọtụtụ narị afọ gara aga nʻebe Mmiri niile nke Mọmọn:

“Dị ka unu na-achọsi ike ịbata niime otù nke Chineke, ma akpọọ unu ndị nke ya, ma dị na njikere iburịta ibu nke onye na ibe ya, ka ha wee dị mfe;

“Ee, ma dị na njikere isoro ndị na-eru uju ruo uju; ee, ma kasie ndị ahụ obi bụ ndị chọrọ nkasi obi, na iguzo dị ka ndị mgbaama nke Chineke n’oge niile na niihe niile, na n’ebe niile … , ọbụna ruo nʻọnwụ, ka unu wee nwee mgbapụta site na Chineke, … ka unu wee nwee ndụ ebighị ebi.”

Dị ka unu sị kwesị ntụkwasị obi nye nkwa ndị a, unu ga-achọpụta na Onyenwe anyị na-edobe nkwà Ya unu na ya ịbụ otu nʻije ozi unu, na-eme ka ibu arụ unu dị mfe. Unu ga-abịa mata Onye Nzọpụta, ma nʻoge na-adịghị anya unu ga-abịa dị ka Ya ma “zuo oke niime ya.” Site nʻinyere ndị ọzọ aka niihi Onye Nzọpụta, unu ga-achọpụta na unu na-abịarute Ya nso karịa.

Ọtụtụ niime unu nwere ndị unu hụrụ naanya ndị na-akpafu nʻụzọ na-aga na ndụ ebighị ebi. Unu na-eche ihe ọzọ unu nwere ike ime iji kpọghachi ha azụ Unu nwere ike ịdabere n’Onyenwe anyị ịbịakwute ha nso dị ka unu na-ejere Ya ozi n’okwukwe.

Unu nwere ike icheta nkwà nke Onyenwe anyị kwere Josef Smit na Sidney Rigdon mgbe ha nọ n’ebe dị anya site n’ebe ezi na ụlọ ha nọ na-eje ozi Ya: “Ndi enyi M Sidney na Josef, ndị ezi na ụlọ unu dị mma; ha nọ n’ọba aka m, ma aga m emere ha otu o siri masị m, niihi na niime m e nwere ike niile.”

Dị ka unu na-ekechi ọnya nke ndị ahụ nọ na mkpa, ike nke Onyenwe anyị ga-akwado unu. Ogweaka Ya ga-agbatịpụ ya na nke unu inye aka na ịgọzi ụmụ Nna anyị nke Eluigwe.

Nwa odibo ọgbụgba ndụ ọbụla nke Jizọs Kraịst ga-anata ntuzi aka Ya sitere na Mmụọ ahụ dị ka ha na-agọzi ma na-eso Ya ejere ndị ọzọ ozi. Emesịa ha ga-enweta mmetụta ịhunaanya nke Onye Nzọpụta ma nweta an̄ụrị na ndọbata ịnọ Ya nso.

Abụ m onye mgbaama nke Mbilite n’ọnwụ nke Onyenwe anyị n’eziokwu dị ka aga asị na m nọọrọ rịị n’ebe ahụ mụ na ndị na-eso ụzọ abụọ niime ụlọ ahụ nọ n’ụzọ Emmaus. Ama m na Ọ dị ndụ.

Nke a bụ ezi Nzukọ nsọ Ya—Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Anyị ga, n’Ụbọchị Ikpe, eguzo n’ihu Onye Nzọpụta, n’ihu nʻihu. Ọ ga-abụ oge nnukwu ọn̄ụ maka ndị ahụ, niime ndụ nke a, ndị na-abịaruwo Ya nso nʻozi Ya ma nʻọnụnụ ọkụ obi na-atụ anya ịnụ okwu Ya ndị a: “I meela, gị ezi nwa odibo kwesịrị ntụkwasị obi.”

Ana m agba ama dị ka onye aka ebe nke Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta siworo n’ọnwụ bilite, n’aha Jizọs Kraịst, amen.