Okwukwe: Ihe nkekọ nke ntụkwasị obi na Iguzosi ike n’ihe
Okwukwe na-epu ume dị ka anyị na-atụkwasị obi niime Jizọs Kraịst ma na-etolite dị ka anyị na-ekwesị ntụkwasị obi ma na-eguzosike nʻebe Ọ nọ.
Mgbe m dị afọ 17, mụ na enyim José Luis nwere nkwekọrịta ịkuziri ya otu esi egwu mmiri. Nihi ya nʻotu ụtụtụ anyị nwepụtara oge iji malite ọmụmụ ya. Mgbe oge ọmụmụ ihe anyị gasịrị ma dị ka m na-esi nʻọdọ mmiri ahụ apụ, a nụrụ m enyi m ka otiri mkpu enyemaka. Mmiri nọ na-eri ya nʻebe ọdọ mmiri di omimi.
A mụnyere m onwem niime mmiri ma gwuo mmiri ruo ebe ọ nọ ma na-ekpe ekpere maka enyemaka. Dị ka m jidere aka ya ma dọpụta ya nʻelu mmiri, enyi m nke a obi na-amapụ rigoro m nʻazụ na nwere ogweaka ya machie m nʻolu. Ugbua anyị abụọ ka mmiri na-erizi. Dị ka m na-agba mbọ irute nʻelu mmiri, ekpere m ekpere jiri ume m niile maka ọrụ ebube sitere na Chineke. Ma emesịa, jiri nnọọ nwayọọ, ike nke Chineke pụtara ihè dị ka otu aka kwaara m ruo ebe ọdọ mmiri ahụ na-adịghị omimi, wee kpọta anyị nʻebe nchekwa dị.
Nhụmihe nke a emewo ka m mata eziokwu dị niime otu nkuzi nke Onyeisi Russell M. Nelson kuziiri: “Mgbe iwelitere aka gị maka ike nke Onyenwe anyị na ndụ gị jiri ụdị obi ike ike nke onye ahụ mmiri na-eri mgbe ọ na-achọ ikute ume, ike sitere na Jizọs Kraịst ga-abụ nke gị.”
Ezi ụmụaka na ndị ntorobịa, taa A chọrọm ịkwuuru unu okwu banyere ụkpụrụ dị oke mkpa nke okwukwe n’ime Jizọs Kraịst.
Okwukwe n’ime Kraịst Pụtara Ntụkwasị obi na Ya
Gịnị ka ọ pụtara “ịnwe okwukwe nime Kraịst? Ọ pụtara na anyị kwenyere na Ya ka ọ bụ na anyị nwere ịgba ama na Ọ dị irè? Nke ahụ nwere ike bụrụ ebe mmalite, mana ọ karịrị nke ahụ. Ichetuwo echiche na okwukwe na ọ dị ka ntụkwasị obi? Chee maka onye ahụ ị kacha nwee ntụkwasị obi na ya—o nwere ike bụrụ onye otù ezinaụlọ ma ọ bụ otu enyi. Gịnị kpatara iji nwee ntụkwasị obi na ha? Akpachaghị anya ọ bụ niihi ịhuwo ịhụnaanya na enyemaka ha nke na-adịgide.
Mgbe anyị nwere okwukwe niime Kraịst, anyị na-amata ngọzị niile Ya ma wulite njiko ntụkwasị obi nʻetiti anyị na Ya.
Kedụ otu Inwere ike iji Mụbaa Ntụkwasị obi Gị niime Kraist?
Nʻoge otu ofufe nro ndị ntorobịa emere nso nso a, akpọkuru unu ịbịa “tulee uche maka otu oge niime ndụ unu mgbe unu natara otu ụzara nke ihè nke igwe.” Nwalee ihe omume nke a!
Malite site na-itule uche banyere Kraịst na an̄ụrị nke Aja mgbaghara mmehie na ozi ọma Ya na-ewete na ndụ gị. Ọzọkwa, mee ndekọihe maka “ncheta ndị na-enwe nkọwa ime mmụọ” ebe Chineke nọworo ebe ahụ maka gị, maka ndị ịhụrụ naanya, na maka ndị ahụ nọ niime akwụkwọ nsọ. Ugbua, ịgba ama ndịa agaghị enweta ike niime ndụ gụ tutu ruo mgbe Mmụọ ahụ kanyere ha niime “mbadamba anụ-arụ” nke obi gị. Nihi ya tulee uche ma dekọọ ihe niile nke Chineke debere maka ọrụ ebube ndịa ịbịa nʻoge ahụ dabara adaba.
Ọzọ, jiri ohere ihe omume nke a iji bịaruo Chineke nso. Kpeere Nna nke Eluigwe gị ekpere dịka a ga-asị na ọ bụ nke ugboro mbụ. Gosipụta ịhụnaanya na obi ekele gị maka ngọzị Ya niile. Ọbụnadị jụọ Ya otu Ọ chere banyere gị na banyere ụzọ ahụ nke ndụ gị na-aga.
Ọ bụrụ na gị nwee obi ọcha na umeala, ị ga-anụ azịza Ya ma malite ịnwe mmekọrịta nke onwe na nke na-adịgide gị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst. Na-abụghị naanị nke ahụ, mana agwa okpukperechi gị ga-enwe ezi nkọwa! Nʻọmụmatụ, ị ga na-enwe agụụ maka ekpere gị, ọmụmụ nke onwe, na ofufe nke tempụl ma hụ ha dị ka ohere ndị iji abịa amata Ha ma nọnyere Ha.
Okwukwe Na-amụba Jiri Iguzosi ike n’ihe
Hụta na okwukwe na-epu ume dị ka anyị na-atụkwasị obi niime Jizọs Kraịst ma na-etolite dị ka anyị na-ekwesị ntụkwasị obi ma na-eguzosike nʻebe Ọ nọ. Ọ bụrụ na ịchọrọ ezi mmekọrịta gị na Kraịst, gosi Ya site na-ịgba ndụ ma ịkwanyere ha ugwu jiri nkwesị ntụkwasị obi na nguzosiike. Ịgba ndụ anyị na Jizọs Kraịst na-ewulite olile anya. Ịkwanye ugwu na-ewulite okwukwe.
Ka m jiri otu ọmụmatụ nke onwe m: Mgbe m bụ nwata, a hụrụ m nne m ka ọ na-ebe akwa naanị ya otu ụbọchị. Mgbe m jụrụ ya ihe kpatara ya, o jiri nwayọọ kwuo, “a chọrọ m ka ị bụrụ ezigbo nwata nwoke.” Nagbanyeghi na a maara m na ọ bụghịm kpatara nchegbu ya, a hụru m nne m naanya ma tụkwasị obi na ya karịsịa onye ọbụla ma achọrọ m ị mee ka ndụ ya dịtukwuo mfe. Nihi ya, jiri anya mmiri ma jiri obi dị jụụ nke nwata gbara afọ itolu nwere ike ịnwe, ekwere m ya nkwa nʻụbọchị ahụ na A ga m agbalịsike ịbụ nwata nwoke kacha mma ma mee ka ọ nwee ugwu.
Ịnwere ike itule nʻuche ike nke nkwa ahụ nweburu—ma ka nweekwa—na ndụ mụ?
Nkwa ahụ m kwere ya bụ nke ga-edu ndụ m. Tupu ma emee nhọrọ, A na m atule ma omume ahụ ọ ga-enye ya obi ụtọ. Nkedo nke nkwa ahụ ya na mmekọrịta mụ na nne m bụ ihe mere ka omume ogologo ndụm gbaa mgbọrọgwụ.
Ka ọtụtụ afọ gasịrị, dị ka m bịara mata Jizọs Kraịst ofụma, amụtawomrịi otu m ga-eji edobe okwukwe m na Ya. A gbara m ndụ mụ na Onyenwe anyị, ma dịka m gbara mbọ ịkwanyere ha ugwu, Ọ gbagharawo m mmehie m, duo ndụ m, ma “juputa m na ịhụnaanya Ya” ruo nʻala ala obi m nke ịdị adị m. Kraịst etinyewo nime m ịhụnaanya dị omimi, nsọpụrụ na iguzosiike maka Ya.
Ịghọtawo ihe kpatara okwukwe jiri bụrụ ụkpụrụ nke omume” na “ma asi na okwukwe adịghị apughi ime ihe ga-atọ [Chineke] obi utọ”?
Dị ka ị na-agba mbọ ịme ihe na-atọ Ya ụtọ, ị ga-ekwu okwu dị ka Josef na Ijipt mgbe nwunye Pọtịfa nwara ya ọnwụnwa, “Kedụ otu m ga-esi eme ụdị oke ajọo ihe, na mmehie megide Chineke?” Ma mgbe izutere mmegide, ị ga-ekwu dị ka Josef nta Onye amụma kwuru, “A maara m ya, ma a maara m na Chineke maara ya, ma enweghị m ike ịgọnarị ya; …A mara m na site na-ime otu a a ga m akpasu Chineke iwe.”
Nihi ya okwukwe n’ime Jizọs Kraịst bụ nkedo nke ntụkwasị obi akpụpụtara site na iguzosiike na ịhụnaanya. N’aka nke ọzọ, nʻobi ekele, maka ịhụnaanya dị ebere nke Chineke (hesed), anyị na-egosi ịhụnaanya anyị nke guzosiriike (emunah) site na-idebe iwu nsọ Ya niile.
Kraịst kwere nkwa na, “Onye nke ahụ ji iwu nsọ m niile, ma na-edebe ha … ka Nna m ga-ahụ naanya, ma A ga m ahụ ya naanya, ma ga-egosi ya onwe m.” Ọ bụrụ na ikpebie obi iguzosi ike nʻebe Ọ nọ, Ọ ga-egosipụta ịhụnaanya Ya nye gị.
Okwukwe n’oge Mkpagbu
Mana kedụ otu ị ga-esi emeso ụdị ọnọdụ ndị ahụ siri ike ndị na-achọ ọrụ ebube Ya? Ebe ịma aka aghaghi ịbịa ma mgbe ụfọdụ na-atụ egwu, naanị gakwuru ya na-atụghị egwu dịka otu isiokwu FSY afọ 2025 kpokuru: “Lekwasịnụ m anya na echiche ọbụla unu; enwela obi abụọ, atụkwala ụjọ.”
Kedụ Otu Ị Ga-esi Agakwuru Ya Na-atụghị egwu?
Cheegodi na ị bụ onye njem na-akpagharị nʻebe ụkwụ mmadụ agabeghi mbụ. Iji merie ihe mgbochi niile nọ niihu, ị ga enwe mkpa maka ihè. Ịkwesị ntụkwasị obi nye Chineke, tinyere mmekọrịta na-adigide nʻetiti gị na Ya bụ mmanụ ga-eme ka ọriọna gị na-enwu enwu. Ya mere mgbe izutere ọnọdụ gbara ọchịchịrị na nke dị ize ndụ, kama igakwuru ha na-ikpu isi, ị ga-agbanye oriona gị nke juputara na mmanụ nke okwukwe niime Kraịst iji nye gị ihè nke olile anya nʻụzọ ndị ahụ na-edochaghị anya. Nhụmihe gị niile ndị gara aga ga-amụba olile anya gị na Onyenwe anyị ga-akwado gị na njem gị.
Kedụ Ebe Ị Ga Agarụ jiri Olile anya na Okwukwe Gị niime Kraist?
Chetakwa akụkọ nke m ahụ nʻebe ọdọ mmiri? Nʻoge nke obi nkoropụ ahụ, ọrụ ebube ahụ bịara nʻụzọ m tụrụ anya, mana Chineke anaghi ekwe nkwa na ọ ga-emerịrị mgbe niile dị ka otu uche anyị siri dị. Okwukwe anyị garịrị ehiwe isi na Jizọs Kraist ya na nʻolileanya anyị na ngọzị Ya, dị ka Ọ na-ahọrọ iziga ha. “Tụọ anya maka ọrụ ebube,” mana “kwe ka Chineke nwee mmeri niime ndụ anyị.”
Nkwa niile nke Chineke nye Ndị Ya Kwesịrị ntụkwasị obi
Ndị enyi m nta niile, anyị hụrụ unu naanya ma tụkwasị obi nʻunu! Unu sonyere niime ezinaụlọ nke Chineke unu bụ ụmụ nke ọgbụgba ndụ ahụ. Kwerenụ ma tụkwasị obi na Jizọs Kraịst. Ọ ga-enyere unu aka ka unu nʻezie bụrụ ndị na-eso ụzọ Ya.
A na m akpọku ka unu malite taa zulitewe mmekọrịta unu nwere unu na Jizọs Kraịst. Kpebie obi na ị gaghị ahapụ Ya ma ọlị.
Iguzosiike unu, na ntụkwasị obi na Kraịst ka eme ka ọdịdị unu na ejirimara unu dịrị ka nke Ya. Unu ga-enwete obisiike na ume iji megide mbuso agha niile nke Ekwensu. Ma mgbe unu mere njehie, unu ga-enwe agụụ maka mgbaghara mmehie Ya. Nʻikpeazụ, olile anya ịnwere maka ọdịniihu ga-egbuke egbuke. Ọ ga-enye gị ike Ya na ntụkwasị obi iji mezuo ihe ọbụla Ọ chọro nʻaka gị, ọbụnadị ike ahụ iji laghachị niihu Ya.
A na m agba ama nye gị maka ọn̄ụ ahụ na-abịa site ịbụ “abụ mgbapụta ịhụ-n’anya” ma ịbanye na “aka nke ịhụnanya ya gbara m gburu-gburu ruo mgbe ebighi-ebi.” N’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.