Ịhụnaanya M maka Onye Nzọpụta ahụ Bụ “Ihe Kpatara” M
A hụrụ m Onye Nzọpụta anyị naanya. Nke a bụ ezigbo ihe kacha ike mere m ji eme ihe m na-eme.
Ị hụtụla na onye amụma anyị hụrụ naanya, Onyeisi Russell M. Nelson, nọgidere nʻịkpọ anyị oku? Na-abụghị ihe ijuanya, ọ kpọọla anyị oku ịmụ ma tụgharịa uche nʻozi niile ekesara na ọgbakọ abụọ gara aga. Nime Eprel 2024, o kwuru, “E nwere m olile anya na unu ga-agụgharị ozi niile nke ọgbakọ a ugboro ugboro n’ọnwa ndị n’abịa abịa.” Mgbe ahụ, nime Ọktoba 2024, o kwuru, “Ana m arịọ unu ka unu mụọ ozi ha niile nke [ndị kwuru okwu]. Jirinụ ha tụlee ihe bụ eziokwu na nke na-abụghị n’oge ọnwa isii ndị na-abịa.”
Ịkpọ oku niile ndịa ka enwere ike ịgbakwunye na ịkpọ oku oke amụma niile anyị nataworo nʻoge ndụ anyị niile, gụnyere ma karịsịa ndị anyị natara nʻafọ ndị na-adịbeghị anya. Anyị nwere ike nwee mmetụta ma ọ bụ chee na ịkpọ oku ndị a bụ ihe ọzọ anyị kwesịrị itinye na listi ihe ndị anyị kwesịrị ị na-eme, nihi na akpọro anyị ma ọ bụ gwaa anyị mee ya. Mana enwere ike inwekwu ihe ọzọ nye ya?
Ịtụgharịa uche na nke a na ọkpụkpọ oku niile anyị natara, Ana m echeta ihe mmụtarala ma kpebiela ọtụtụ oge gara aga. Ana m agbalị ime ihe ndị a niile ndị dị mkpa nye m nihi na A hụrụ m Ya naanya; A hụrụ m Onye Nzọpụta anyị naanya. Nke a bụ ezigbo ihe kacha ike mere m ji eme ihe m na-eme, ma mgbe ahụ ijikọta ya na nke a bụ ịhụnaanya m nwere nʻebe unu nọ ụmụnne m ndị nwoke na nwanyị.
Dịka nwanne unu nwoke, E nwere m olile anya na unu ga-atule okwu m niile dị ka ọkpụkpọ oku sitere nʻobi iji chọọ ịghọta ohere iji jikọta ihe niile anyị na-eme na ịhụnaanya anyị nwere maka Onye Nzọpụta.
Ime nke a ga-enyere anyị aka ịghọta ezi “ihe kpatara” ahụ nọ nʻazụ ihe niile anyị na-eme dị ka ndị na-eso ụzọ nke Onye Nzọpụta ahụ. Nke a ga-enyere anyị aka ime ka njikọ ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, ịghọta eziokwu Ya niile dị nsọ— eziokwu Ya niile dị nsọ ma dị ebighị ebi nke na-agaghị agbanwe agbanwe. Eziokwu ebighị ebi niile dị ka “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa naanya nke ukwuu, nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”
Ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị na mgbe ụfọdụ nihi na anyị na-eme ihe mgbe niile ruo nʻogo nke na ha ghọrọ omenaala, anyị na-ekwe ka omenaala ndị a ma ọ bụ ihe omume niile ndị a na-ekpebi mgbalị anyị iji wulite okwukwe niime Jizọs Kraịst. Ọ dị ka anyị na-eme ihe niile ndị a nihi na anyị emewo ha ọtụtụ afọ, na-atụleghị mmetụta ha na njikọ ọgbụgba ndụ anyị na Onye Nzọpụta.
Nime ụwa anyị, anyị na-elekwasị anya na ihe anyị na-eme ya na ịrụzu ọrụ na ebumnuche niile mgbe niile. Na ebe ime mmụọ, anyị nwere ohere ịgafe naanị ime ihe niile ma ọ bụ imejupụta ebumnuche niile site na ịghọta ihe mere anyị ji eme ha. Ọ bụrụ na anyị nwere ike ịghọta ma jikọọ na ihe kpatara omume anyị niile metụtara ịhụnaanya anyị nwere maka Onye Nzọpụta na Nna anyị nke Eluigwe, site na iji ohere niile ndị a mee ihe anyị ga-aghọta na ọbụnaghị na anyị na-eme ezi omume niile dịka inwe mmemme niile nke Nzukọ nsọ ma ọ bụ omenaala niile nke Nzukọ nsọ na ime ha nke ọma bụ ihe dị mma, mgbe anyị jikọtara ha na “ihe kpatara,” a ga-agọzi anyị ịghọta ihe kpatara ya. Ọ gaghị abụ naanị ime ihe ọma niile ma ọ bụ ime ha nke ọma; anyị ga-enwetakwa ha nke ọma.
Nʻịmaatụ, mgbe i setipụrụ ebumnuche ịgụ akwụkwọ nsọ, kpee ekpere sitere nʻobi, ma ọ bụ kwado ihe omume maka ezi na ụlọ gị ma ọ bụ ngalaba ukwu, ezigbo ebumnuche ọ bụ naanị ịrụzu ọrụ ndị a? Ma ọ bụ omume niile ndị a bụ ụzọ niile, ngwa ọrụ dị gị nʻaka, iji nweta ezi ebumnuche? Ebumnuche ahụ ọ bụ naanị iji nwee ihe omume nihi na anyị emewo ya ruo ọtụtụ afọ ma mgbe ahụ denye na anyị emezuola ya? Ma ọ bụ, ọzọkwa, ndị a bụ ụzọ anyị ji amụta ihe, nwee mmetụta, na jikọọ anyị na Onye Nzọpụta ahụ?
Biko aghọtahila ihe m na-ekwu banyere inwe mmemme na ọdịnaala niile ma ọ bụ itinye ihe ebumnuche niile na ịrụsi ọrụ ike iji nweta ha; o nweghị ihe dị njọ na nke a. Otu o sila dị, ana m akpọ unu oku ka unu meghee obi na uche unu niile nye ohere na ngọzi nke ịghọta ihe mere anyị ji eme ihe ndị a na otu anyị si eme okpukperechi anyị.
Otu isi ihe ịmaatụ nke ọdịnaala niile gbadoro ụkwụ na Kraịst bụ ihe ịma aka nke Onyeisi Dallin H. Oaks nyere anyị niile nʻaha nke Otu Ndịisi Mbụ. Onyeisi Oaks kwuru, “Dị ka anyị na-abanye afọ ọhụrụ a, ka anyị jikere maka mmemme Ista nke aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. … Nʻagbanyeghị ihe ndị ọzọ kwenyere ma ọ bụ mee, anyị kwesịrị ime emume Mbilite nʻọnwụ nke Onye Nzọpụta anyị dị ndụ site na ịmụ nkuzi Ya niile na inye aka guzobe omenaala niile Ista niime obodo anyị nʻozuzu ya karịsịa niime ezi na ụlọ anyị niile.” Dị ka i nwere ike ịhụ, ọ bụghị naanị ịkpọ oku ka e nwee omenaala niile. Kama, anyị na-eji omenaala ndị a dị ka ụzọ isi mụtakwuo gbasara Onye Nzọpụta ahụ na icheta Mbilite nʻọnwụ Ya.
Ka anyị nwere ike jikọta ihe kpatara ya na ịhụnaanya anyị nwere maka Onye Nzọpụta ahụ, ka anyị ga-enwekwu ike ịnata ihe anyị chọrọ ma ọ bụ na-achọ. Onyeisi Nelson kwuru, “Ajụjụ nke ọbụla ma ọ bụ nsogbu ndị i nwere, azịza ya ka a na-achọtakarị niime ndụ na nkuzi niile nke Jizọs Kraịst. Ma mgbe ahụ ọ kpọrọ oku a: “Mụtakwuo banyere Aja mgbaghara mmehie Ya, ịhụnaanya Ya, ebere Ya, ozizi Ya, na ozi ọma Ya eweghachitere nke ọgwụgwọ na ọganiihu. Tụgharịa na Ya! Soro Ya!”
Tụgharịa uche nke a niime obi na uche unu niile: Ị kwenyere na ọkpụkpọ oku ahụ nke Onyeisi Nelson bu nʻobi inyere anyị aka ịkwadebe ndepụta nlele ebe anyị ga-enwetakwu ihe ọmụma ihe ma imezu ọrụ niile ka anyị nwere ike ịkachapụ ọkpụkpọ oku ya site na listi ihe anyị chọrọ ime? Ma ọ bụ ọ na-akpọ anyị ka anyị tụlee akụkụ nke eziokwu na ụkpụrụ niile ebighị ebi ndị a dị ka ohere ịghọta “ihe kpatara” ya ma jikọta ịhụnaanya ọgbụgba ndụ nke Onye Nzọpụta nwere nʻebe anyị nọ na njem ndụ iso ụzọ ya?
Ka m kọwaa ụkpụrụ ahụ m na-agbalị ikuzi. Otu nhọrọ, nke nwere ike dị oke egwu, nwere ike ịbụ ịgụ ozi niile sitere na ọgbakọ ahụ otu mgbe, mgbe ahụ, ma ozugho mmechara, a ga m agụnye ọkpụkpọ oku a site na ndepụta ime ihe m na-emeghị ihe ọ bụla ọzọ na ihe m gụrụ. A ghọtara m na nke a bụ ihe siri ike, mana ọ bụghị eziokwu. Ma eleghị anya, ọtụtụ nọ nʻotu ebe nʻetiti nke a na ezigbo ya.
Ọkpụkpọ oku ahụ bụ ka anyị mụọ ma tụgharịa uche nʻozi niile sitere na ọgbakọ zuru ọha ma jiri ha chọpụta ma ghọta ihe onye ọ bụla niime anyị nwere ike ime iji meziwanye.
Mgbe anyị nabatara ọkpụkpọ oku ahụ, na-aghọta “ihe kpatara” ya, anyị ga-enwekwu ohere iji bịaruo Onye Nzọpụta nso. Anyị ga-ebido ịghọta na nihi na A hụrụ m Onye Nzọpụta naanya,, a chọrọ m ịmụtakwu banyere Ya site na ịmụ okwu niile nke ndị amụma niile dị ndụ. Ma nihi na A hụrụ m mmadụ ibe m naanya, a ga m ekerịta nkuzi niile nke ndị amụma, ndị ọhụ ụzọ, na ndị mkpughe nʻetiti ndị ọzọ, malite na ndị m hụrụ naanya.
Nʻịmaatụ abụọ ndị a, unu na-eme ezi omume. Niime otu, ebumnuche ahụ yiri ka ọ na-eji ụzọ nke Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta nyeworo anyị, nke bụ ozi niile e kesara nʻoge ọgbakọ zuru ọha. Ụdị nke abụọ na-anabata nnukwu ngọzi nke inweta nghọta niime ihe ndị kpatara ya, na-enye ụzọ ịghọta eziokwu ebighị ebi niile na ngọzi niile e kwere na nkwa nye ndị niile na-eme ozizi niile nke Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, isi ihe nke ndụ ha niile.
Ezigbo ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, e nwere m olile anya na unu nwere ike nwee mmetụta ma hụ mkpa ọ dị ijikọta omume anyị na ịhụnaanya anyị nwere maka Onye Nzọpụta ahụ. Niime ụwa zuru ụwa ọnụ, ọtụtụ olu ga-anwa imegharị unu anya ma, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, duga unu ikwere na ụfọdụ eziokwu nile nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere adịghị mkpa. Ọtụtụ olu ndị a na-ebido jiri eziokwu bụ isi nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere nʻoge ụbọchị ikpeazụ ndị a, gụnyere mkpa ọ dị inwe alaeze nke Chineke nʻelu ụwa, nke ndị na-anọchi anya ya bụ Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a eweghachitere.
Ị nwere ike ịnụ olu niile na-ekwusi ike na ọ bụ naanị mmekọrịta onwe onye ma ọ bụ nghọta gị na Onye Nzọpụta zuru oke na okpukperechi ma ọ bụ Nzukọ eweghachitere adịghị mkpa ma ọ bụ na ọ baghị uru. Ana m akpọ gị oku ka ị were nwayọ na ịtule ma ọ bụ ọbụna ịbụrụ onye a na-apụghị ime ka echiche ndị a na-eduhie eduhie mmetụta ya na ka ị dị ngwa icheta ihe Onye Nzọpụta na-ekwu ma na-akuziri anyị kemgbe oge ochie niile—na-amalite site na ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst nʻebe anyị nọ na ijikọta ịhụnaanya anyị nwere nʻebe Ha nọ dị ka ihe mere anyị ga-eji soro Ha.
Chineke Nna na Ọkpara Ya bịara ma gwa Josef Smith okwu iweghachite Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst na ibido ogologo oge nke oge niile zuru oke, Alaeze Ya nʻụwa. Ya mere, Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a bu ụzọ Nna nke Eluigwe hiwere iji nweta ọgbụgba ndụ niile ndị na-enyere anyị aka ịlaghachi nʻebe obibi. Ya mere, anyị chọrọ karịa naanị mmekọrịta nke onwe anyị na Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya; anyị chọrọ emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja dị mkpa nke anyị na Ha na-eme. Nke a na-enye njikọ ọgbụgba ndụ anyị na Ha ma na-enye anyị ohere ịbanye nʻịhụnaanya ọgbụgba ndụ Ha, na-eme ka o kwe omume inweta alaeze nke ebube kachasị elu nke akwadoro maka ndị ahụ dị eziokwu ma kwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ha niile.
Site nʻike niile nke mkpụrụ obi m, ana m agba ama maka eziokwu na ịdị nsọ nke Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst. Ọ hụrụ unu na anya. Ọ maara ihe na-eme niime ndụ unu. Ogwe aka Ya sara mbara, na-esetị oku ahụ “Bịakwutenụ m, … na M ga-enye gị izu ike.”
A hụrụ m Onye Nzọpụta naanya, ma ịhụnaanya m nwere maka Ya bụ “ihe kpatara” m. Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.