Ọgbakọ Zuru ọha
Ọn̄ụ Site na Ịbụ ndị na-eso ụzọ nke Ọgbụgba ndụ
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


10:58

Ọn̄ụ Site na Ịbụ ndị na-eso ụzọ nke Ọgbụgba ndụ

Dị ka anyị na-ekegide onwe anyị ime omume dị ka ndị na-eso ụzọ ọgbụgba ndụ, mmekọrịta anyị na Nna na Ọkpara ka emere ọgaranya, ọn̄ụ anyị emelite, ma echiche ebighị ebi anyị ka amụbara.

Otu ụbọchị na 2023, Uyanga Altansukh nọ nʻọrụ nʻobodo ukwu Mongolian mpaghara ugwu nke Darkhan mgbe onyeisi mishọn ndị Mongolian banyere nʻụlọ ọrụ ya. Nʻokwu ọnụ ya:

“A hụrụ m ya ma chee na o nwere ìhè na-amuke amuke na mbara ihu ya. O nwere ezi obi ọma ma na-eme ndị ahụ gbara ya gburugburu an̄ụrị, ma obi ruru m ala. Tupu ya apụọ, a jụrụ m ya ajụjụ ole ma ole. Mgbe ụbọchị ole ma ole gasịrị, ọ bịara nʻebe ọrụ m ọzọ ma rịọ ma m nwere ike ịbịa nzukọ nsọ ya. E chere m na o nwere ike nyee aka. E nwere m nchegbu maka ọdịniihu nke ụmụ m, dị ka obodo yiri ka ebe nrụgide na ọchịchịrị juputara. A chọburu m ka ụmụ m ịdịrị ka nwoke nke a nwere ìhè na mbara ihu ya, na-agbasasị ọn̄ụ nye ndị ọzọ gbara ha gburugburu.

“Otu ụbọchị ndị mgbasa ozi ọma kuziiri anyị iwu nke ịkwụ otu ụzọ nʻụzọ iri. Ụmụ m nʻoke obi ụtọ kwuru, ʻAnyị ahaghị ịkwụ otu ụzọ nʻụzọ iri anyị, Nne.’ Ọ dịrị m mfe ịhụta okwukwe nke ụmụ m nʻoge ahụ. Tupu mụ esonye Nzukọ nsọ, elere m ọgbakọ zuru ọha ma gee Onyeisi Russell M. Nelson kwuo okwu. Ọ mara ọkwa tempụl ọhụrụ niile gburugburu ụwa ma kwuo na aga arụ tempụl ọhụrụ na Ulaanbaatar, Mongolia. E nwere m an̄ụrị ma bee akwa, ọbụna agbanyeghị aghọtaghị m ihe kpatara. Jiri ọn̄ụ nke a, e nwere m ike ikwu na okwukwe m na ama m nọọrọ na-etolite etolite.”

Uyanga, dị ka nde kwuru nde ndị ọzọ, bụ ndị so na nnukwu mkpokọta nke Izrel na nkwado maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst. Ọ malitewo njem ya nʻụzọ ọgbụgba ndụ ma bụrụworịị onye na-eso ụzọ nke Kraịst. Gịnị ka ọ pụtara ịbụ onye na-eso ụzọ nke Kraịst? E nwere m mmasị maka mkpụrụ okwu nke Japanese maka onye na-eso ụzọ—deshide nke pụtara nwanne nwoke nke nta, na shi nke pụtara nwata.

Jizọs Kraịst mara ọkwa, “A nọ m na mmalite mụ na Nna, ma abụ m Nwa nke mbụ.” Niihi onyebụ na ihe O meworo, anyị na-efe Ya ofufe, anyị na-asọpụrụ Ya, anyị na-enye Ya otito, ma anyị na-esoro Ya. Kraịst agbapụtawo anyị, ma anyị juputara nʻobi ekele ruo ebighị ebi maka aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị atụ.

Anyị nwere Nna nke Eluigwe, onye hụrụ anyị naanya dị ka ụmụ Ya. Ịhụnaanya Ya maka anyị zuru oke. Jizọs Kraịst na ozi Ya na-egosipụta ịhụnaanya nke Chineke maka anyị. Dị ka Jọn dere, “Niihi na Chineke hụrụ ụwa naanya nke ukwuu, nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”

Na ọchịchọ anyị ịghọta ihe anyị na-amaghị, anyị mgbe ụfọdụ na-adabere na nhụmiihe ndụ anụ ahụ ndị anyị maara nke ọma, ma ọ bụ ihe ndị anyị maa ama. Ịma atụ, anyị nwere ike ịmụtatụ ihe maka Chineke Nna site na ịbụ nne na nna na mmekọrịta ezi na ụlọ ndụ anụ ahụ anyị niile. Kosiladị, anyị kwesịrị ịkpachapụ anya na-itinye ntụnyere ndịa nke ukwuu na mgbalị anyị ịghọta Nna anyị nke Eluigwe. Njirimara niile nke Chineke Nna gafere njirimara niile dị nta karịa izu oke nke mmadụ dara ada. Chineke Nna bụ Nna ahụ zuru oke. O zuru oke na-inwe ịhụnaanya, ịdị obi ọma, inwe ndidi, na ịdị nghọta, na ịdị ebube zuru oke. Anyị nwere ike ịtụkwasị obi na Ya kpamkpam. Ịhụnaanya nke Kraịst na-egosipụta ịhụnaanya nke Chineke Nna ma bụ ngosipụta nke ịhụnaanya ahụ.

Jizọs Kraịst bụ ma ọmụmaatụ ahụ ma ụzọ ahụ. Niime Kraịst, anyị nwere ike ghọtazie njirimara niile zuru oke nke Nna na atụmatụ Ya. Site na Kraịst, a na-enye anyị ike na-enye ike iji merie ọchịchọ niile nke ndịikom na ndịinyom eke ka anyị nwee ike dịrị ka Nna karịa.

Dị nnọọ ka Nna nke Eluigwe, Jizọs Kraịst zuru oke nobi ebere na ịdị eziokwu. Njirimara ndịa si na chi nke ikpe ziri ezi na ebere anọghị na mmegide. Ha na-emekọ ihe ọnụ. Ma ikpe ziri ezi ma ebere na-egosipụta ịhụnaanya zuru oke nke Chineke maka ụmụ Ya. Anyị nwere ike tụkwasị obi na Chineke Nna na Jizọs Kraịst niihi na Ha dị eziokwu ma dịrị mma nye anyị niile.

Chineke Nna na Ọkpara Ya Jizọs Kraịst, nọziri nke ọma na nzube na ịhụnaanya. Niihi Chineke na Jizọs Kraịst hụrụ anyị naanya, enyere anyị ohere na ohere ọma dị ka ezi ndị na-eso ụzọ ịgba ndụ anyị na Ha. Site na anyị ime nke a, mmekọrịta anyị na Kraịst agbatịa: “Ma ugbua, niihi ọgbụgba ndụ ahụ unu meworo a ga-akpọ unu ụmụ nke Kraịst, ụmụ ya ndị nwoke, na ụmụ ya ndị nwanyị; niihi na lee, n’ụbọchị nke taa, ọ mụwo unu niime mmụọ; niihi na unu na-asị na obi unu niile ka a gbanweworo site n’okwukwe n’aha ya; ya mere, unu ka a mụworo na ya ma unu aghọwo ụmụ ya ndị nwoke na ụmụ ya ndị nwanyị.”

Dị ka ndị na-eso ụzọ, mgbe anyị mere ma debe ọgbụgba ndụ ndị dị nsọ, ana agọzi anyị jiri ike ime mmụọ. Ejikọtara anyị na Kraịst na Chineke Nna na mmekọrịta pụrụiche ma nwere ike nwete nhụmiihe ịhụnaanya na ọn̄ụ Ha na atụ edokwara maka ndị ahụ meworo ma debeworo ọgbụgba ndụ. Ike anyị ịmata uju atụ nke ịhụnaanya nke Chineke, ma ọ bụ ịganiihu nʻịhụnaanya Ya, dabeere nʻọchịchọ na omume ezi omume anyị.

Na Jọn isi nke 15, amaokwu 9, anyị na-agụ, “Dị ka Nna siworo hụ m naanya, otu ahụkwa ka m siworo hụ unu naanya.” Ma mgbe ahụ ana enye anyị ọkpụkpọ oku, “Gaanụ niihu nʻịhụnaanya m.”

Niime amaokwu nke na-esote, enyere anyị ụzọ esi aganiihu nʻịhụnaanya Ya: “Ọ bụrụ ma i debe iwu nsọ m niile, ị ga-anọgide nʻịhụnaanya m; ọbụna dị ka m debeworo iwu nsọ niile nke Nna m, ma nọgide nʻịhụnaanya ya.”

Mgbe ahụ anyị na-ahụ ebumnuuche nke idebe iwu nsọ niile dị na amaokwu 11: “Ihe ndị a ka m gwaworo unu okwu maka ha, na ọn̄ụ m nwere ike nọgide niime unu, ma na ọn̄ụ unu nwere ike iju eju.”

Site na-ịbụ onye na-eso ụzọ nke ọgbụgba ndụ, anyị nwere ike malite ịghọtazi ọdịdị nke Chineke na ọn̄ụ nke Ọ na-achọ ụmụ Ya niile inwete nhụmiihe ya. Anyị nwekwara ike ghọta ụfọdụ ụkpụrụ ndị na mbụ nwere ike yie ihe dị mgbagwoju anya. Ịma atụ, kedụ otu Chineke si enwe uju nke ọn̄ụ mgbe ụfọdụ niime ụmụ Ya na-ata nnukwu ahụhụ? Azịza ahụ dabeere nʻechiche zuru oke nke Chineke na niime atụmatụ Ya zuru oke. Ọ na-ahụ anyị site na mmalite ruo na ọdịniihu ike mmetụta anyị dị ebube. O wetewo ụzọ, site na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, maka anyị niile, ụmụ Ya, imeri mgbu niile, ntaram ahụhụ, mmehie, ikpe ọmụma, na owu ọmụma nke ndụ anụ ahụ anyị. Chineke eweteworo anyị ụzọ na nhọrọ.

Ọmụmaatụ niile nke ndị ahụ nweteworo nhụmiihe ọn̄ụ site na-ịbụ onye na-eso ụzọ nwere ike nyere anyị aka ghọtazie echiche nke a. Elemaanya ị nụwo nkebiokwu ahụ na anyị nwere obi ụtọ naanị dị ka nwa anyị kacha na-enweghị obi ụtọ. Ahụwo m na nke a ekwesịghị ịbụ ọnọdụ ahụ. Nne m gbara afọ 94 nwere ihe karịrị ụmụ ụmụ ụmụ 200 dị ndụ. Nʻoge nke ọbụla, aga enwerịrị opekempe 200 na-enweghị obi ụtọ. Ọ bụrụ na ahịrị nke a bụụrụ eziokwu, nne m ga-anọgide nʻọnọdụ nke enweghị obi ụtọ, nke ọ nọghị na ya. Ndị ahụ maara ya maara ụdị obi ụtọ ọ na-enwe.

Ugbua ọ ga-amasị m ikesa nhụmiihe ọzọ. Na Jenụwarị 2019, mụ na nwunye m, Debbie, ka akpọkuru niime ụlọ ọrụ nke Onyeisi Nelson. O doziwo otu oche nʻakụkụ anyị, ma anyị nọdụrụ nʻikpere nʻikpere. Mgbe o gwachara anyị ọkpụkpọ oku ọhụrụ anyị, Onyeisi Nelson tụgharịrị na Debbie ma lekwasị anya na ya. Ọ nwere obi ọma, dị ịhụnaanya, dị nwayọọ, ma juputa nʻọn̄ụ, dị ka nna ma ọ bụ mpa nnukwu zuru oke. O jidere aka Debbie ma kụtụ aka ya, na-emesi ya obi ike na ọ ga-adị MMA ma na aga agọzi ezi na ụlọ anyị. Ọ dịịrị anyị nʻoge ahụ na anyị bụụrụ ndị kachasị dị mkpa nye ya ma na o nwere oge niile nʻụwa maka anyị. Anyị hapụrụ ụlọ ọrụ ya nʻehihe Fraịde ahụ na-enwe mmesịgharị obi ike, mmetụta ịhụnaanya, ma na-ejuputa nʻọn̄ụ.

Na Mọnde anyị hụrụ ozi ahụ. Nʻotu ụbọchị ahụ nke Onyeisi Nelson gburu oge anyị na ya, otu nwa ya nwanyị nwụrụ site nʻọrịa kansa. Ọ tụrụ anyị naanya. Obi anyị juputara dị ka anyị ruru uju maka ya na ezi na ụlọ ya. Obi anyị juputakwara nʻekele maka ige nti ya yiri nke Kraịst nye anyị mgbe ọ na-eru uju maka nwa ya nwanyị naara ata ahụhụ.

Dị ka anyị tụgharịrị uche nhụmiihe nke a, anyị jụrụ onwe anyị, “Kedụ otu o si dịrị ezi obi ọma, dị ịhụnaanya, ọbụna juputa nʻọn̄ụ nʻụdị oge ahụ siri ike?” Azịza ya bụ niihi na ọ maara. Ọ maara na Kraịst emeriworịị. Ọ maara na ya na nwa ya nwanyị ga-ezukọta ọzọ ma ga-anọgide ebighị ebi ya na ya. Ọn̄ụ na echiche ebighị ebi na-abịa site na-ikegide na Onye Nzọpụta site na-ime na idebe ọgbụgba ndụ niile na site na-ịbụ onye na-eso ụzọ dị ka nke Kraịst.

Onyeisi Nelson akuziwo: “Dị nnọọ ka Onye Nzọpụta na-enye udo nke ‘karịrị nghọta niile’ [Ndị Filipi 4:7], Ọ nakwa enye ike, omimi na obosara nke ọn̄ụ nke na-emegide ihe mmadụ na-eche ma ọ bụ nghọta nke anụ ahụ. Iji maatụ, ọ yighi ka ihe kwere omume inwe mmetụta ọn̄ụ mgbe nwa gị na-ata ahụhụ ọrịa na-enweghị ọgwụgwọ ma ọ bụ mgbe ọrụ gị kwụsịrị ma ọ bụ mgbe di gị ma ọ bụ nwunye gị mebiri ntụkwasị obi gị. Otu ọ dị nke ahụ bụ kpọm kwem ọn̄ụ nke Onye Nzọpụta na-enye.”

Dị ka anyị na-eme ma na-edebe ọgbụgba ndụ niile, anyị ga-atụgharị pụta ma nwee ọchịchọ inyere ndị ọzọ aka nwete mmetụta atụ nke ọn̄ụ na ịhụnaanya anyị na-enwe mmetụta niime mmekọrịta nke ọgbụgba ndụ. Anyị nwere ike bụrụ akụkụ nke ihe kachasị nʻelu ụwa taa—mkpokọta nke Izrel. Anyị nwere ike nyee aka ịkpọta ụmu nke Chineke nye Kraịst. Dị ka onye amụma Jekọb kuziri, “Ma ngọzi na-adịrị gị; niihi na ị rụsie ọrụ ike niime ubi vaịn m, ma debewo iwu nsọ m niile, ma kpọtaworo m ọzọ mkpụrụ eke, … ị ga-eso m enwe ọn̄ụ niihi mkpụrụ nke ubi vaịn m.”

Dị ka anyị na-ekegide onwe anyị ime omume dị ka ndị na-eso ụzọ ọgbụgba ndụ, nʻogo ike nke ọbụla, mmekọrịta anyị na Nna na Ọkpara ahụ ka emere ọgaranya, emelite ọn̄ụ anyị, ma echiche ebighị ebi anyị ka amụbara. Mgbe ahụ enyewo anyị onyinye jiri ike ma nwere ike nwete ọn̄ụ nʻatụ edokwara maka ezi ndị na-eso ụzọ ọgbụgba ndụ nke Chineke. N’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:21.

  2. Lee Matiu 1:21; 2 Nifaị 2:6.

  3. Jọn 3:16.

  4. Mozaya 5:7.

  5. Lee Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị ebighị ebi,” Liahona, Ọkt. 2022, 4–11.

  6. Lee Dale G. Renlund, “Nwete nhụmiihe Ịhụnaanya nke Chineke” (Brigham Young University devotional, Dec. 3, 2019), speeches.byu.edu.

  7. Jọn 15:9–11.

  8. Lee Alma 7:11–13.

  9. Russell M. Nelson, “Ọn̄ụ na Ịnya ndụ nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nọv. 2016, 82.

  10. Lee Russell M. Nelson, “Olileanya nke Izrel” (worldwide youth devotional, June 3, 2018), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  11. Jekọb 5:75.

  12. Lee “Hesed, Ịhụnaanya Ọgbụgba ndụ nke Chineke, Bụ Ebumnuuche Anyị si Ewu Tempụl niile ma Na-eme Emume nsọ niile: Nkuzi sitere nʻaka Onyeisi Russell M. Nelson,” nzukọ odudu ọgbakọ Zuru ọha, Ọkt. 2024, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.