Ọgbakọ Zuru ọha
Zuo oke niime Ya nʻụzọ Ime Mmụọ
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


11:28

Zuo oke niime Ya nʻụzọ Ime Mmụọ

Ozuzu oke abụchaghị na ọ pụtara mweghachite nke anụ ahụ na nke mmetụta uche niime ndụ nke a. Ozuzu oke ka a mụrụ nʻokwukwe niime na ntọghata nye Jizọs Kraịst.

Ndị ekpenta tikuuru Onye Nzọpụta, “Meere anyị ebere.” Ma Jizọs mere. Ọ gwara ha igosi onwe ha nʻaka onye nchụaja, ma dị ka ha gara, asachara ha site nʻọrịa ha.

Ma otu niime ha, mgbe ọ hụrụ na agwọwo ya, tiri mkpu otito nye Chineke. Ọ lọghachikwutere Onye Nzọpụta, daa nʻụkwụ Ya, ma nye ekele.

Ma Onye Nzọpụta jụrụ ya onye nke juru nʻekele, “Okwukwe gị agwọwo gị.”

Jizọs Kraịst agwọworịị ndị ekpenta iri. Mana otu, ịlọghachikwute Onye Nzọpụta, natara ihe ọzọ. E mere ya ezuo oke.

Ndị ekpenta itolu ka agwọrọ nʻanụ ahụ.

Otu onye ka agwọrọ nʻanụ ahụ ma mee ya e zuo oke niime mmụọ.

Na-ịtụgharị uche nʻakụkọ nke a, echewo m ma mkparịta ụka ahụ ọ bụ eziokwu. Ọ bụrụ ma ọgwụgwọ na izu oke abụghị otu ihe ahụ, enwere ike mee mmadụ zuo oke niime mmụọ site nʻaka Ya mana a kaa gwọbeghị ya nʻanụ ahụ na nke mmetụta uche?

Onyeisi Ọgwọọ ọrịa ga-agwọ mkpagbu anyị niile—nke anụ ahụ na nke mmetụta uche—nʻoge Ya. Mana na-iche ka agwọọ, mmadụ o nwere ike zuo oke?

Gịnị ka ọ pụtara izu oke niime mmụọ?

Anyị zuru oke niime Jizọs Kraịst mgbe anyị tinyere ohere nhọrọ anyị nʻọrụ isoro Ya nʻokwukwe, nyefee obi anyị nʻaka Ya ka O wee gbanwee ha, debe iwu nsọ Ya niile, ma banye na mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Ya, n’obi dị ala na-anagide ma na-amụta site nʻihe ịma aka niile nke oge ndụ nke a tutu ruo anyị alaghachikwuru ihu Ya ma agwọọ anyị nʻụzọ niile dị adị. E nwere m ike izu oke mgbe m na-eche maka ọgwụgwọ ọ bụrụ ma m ji obi m niile na mmekọrịta mụ na Ya.

Okwukwe niime Jizọs Kraịst mụtara olileanya. Ana m achọta olileanya mgbe m na-agba mbọ izu oke—ozuzu oke nke okwukwe niime Jizọs Kraịst mụtara. Okwukwe niime Ya na-abawanye olileanya m maka ọgwụgwọ, ma olileanya ahụ na-emesị okwukwe m niime Jizọs Kraịst ike. Ọ bụ okirikiri dị ike.

Onyenwe anyị gwara Ịnọs na okwukwe ya emewo ya “ezuo oke.” Ozuzu oke bịara dị ka Ịnos tụgharịrị uche nokwu niile nke nna ya Jekọb, onye amụma, dị ka o nwere agụụ ịghọta ohere maka ndụ ebighị ebi, dị ka o bekuru Chineke nʻekpere dị ike. Ma niime ọnọdụ nke ọchịchọ na umeala nʻobi ahụ, olu nke Onyenwe anyị bịakwutere ya, na-ama ọkwa na-agbagharawo ya mmehie ya niile. Ma Ịnos jụrụ Onyenwe anyị, “Kedụ otu esi eme ya” Ma Onyenwe anyị zaghachiri, “Niihi okwukwe gị niime Kraịst, … okwukwe gị emewo gị ezuo oke.”

Site nʻokwukwe anyị niime Jizọs Kraịst, anyị pụrụ ịchọ izu oke niime mmụọ dị ka anyị na-eche ma nwee olileanya maka ọgwụgwọ anụ ahụ na nke mmetụta uche.

Site nʻikike nke aja mgbaghara mmehie Ya, na mgbe anyị na-echegharị nʻezi obi, Onye Nzọpụta na-agwọ anyị site na mmehie, dị ka O meere Ịnos. Aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị atụ na-erutekwa iru uju na mwute anyị niile.

Mana e nwere ike Ọ gaghị ewete ọgwụgwọ site na nrịa nrịa na ọrịa—mgbu na-adịghị ala ala, ọrịa ndị na-eri ime ahụ dị ka otutu sclerosis, kansa, nchegbu, ịda mbà nʻobi, na ihe ndị yiri ha. Ụdị ọgwụgwọ ahụ bụ nʻoge nke Chineke. Ma ka ọ dị ugbu a, anyị nwere ike họrọ ka anyị zuo oke site na-inwe okwukwe na Ya!

Izu oke pụtara izu ezu ma ju eju. Kachasị dị ka ụmụagbọghọ na-amaghị nwoke maara ihe ndị gbajuru oriọna ha jiri mmanụ mgbe nwoke na-alụ nwunye bịara, anyị nwere ike zuo oke niime Jizọs Kraịst dị ka anyị na-agbaju oriọna anyị jiri mmanụ ọzụzụ nke ntọghata na Ya. Nʻụzọ ahụ, anyị akwadowo maka nri anyasị alụmdi ihe atụ ahụ, Ọbịbịa Ya nke Ugboro Abụọ.

Niime ụkabụilu ahụ ụmụagbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke nọọrọ nʻebe ziri ezi, na-eche nwoke na-alụ nwunye. Onye ọbụla niime ha jiri oriọna ha bịa.

Mana mgbe Ọ bịara, nʻoge awa etiti abalị atụghị anya, ise ndị nzuzu ahụ enweghị mmanụ ọkụ zuru ezu maka oriọna ha. Akọwaghị ha dị ka ndị ajọọ omume mana kama dị ka ndị nzuzu. Ndị nzuzu dara ịkwado nke ọma idebe oriọna ha ị na-enwu na mmanụ ọkụ nke ntọghata.

Ma otu a, na nzaghachi nye arịrịọ ha ka ekwe ha ịbanye na nri anyasị alụmdi ahụ, nwoke na-alụ nwunye zaghachiri, “Unu amaghị m.”

Na-egosi, mgbe ahụ, na ụmụagbọghọ ahụ maara ihe maara Ya. Ha zuru oke niime Ya.

Oriọna ha juru eju na mmanụ nke ntọghata dị oke ọnụ ahịa, nke kwere ụmụagbọghọ ndị ahụ maara ihe ịbanye na mmemme alụmdi ahụ naka nri nke nwoke na-alụ nwunye.

Dị ka akọwara site naka Onye Nzọpụta, “Kwesị ntụkwasị obi, na-ekpe ekpere mgbe niile, ma nwee oriọna unu na-njikere ma na-enwu enwu, ma jirikwa mmanụ, ka unu nọrọ na njikere chere ọbịbịa nke Nwoke na-alụ nwunye.”

Ụmụagbọghọ Ise Maara ihe, site nʻaka Ben Hammond

Ụmụagbọghọ Ise Maara ihe, site nʻaka Ben Hammond

Akpụrụ akpụ dị ebube na-egosiputa ụmụagbọghọ na-amaghị nwoke ise ka edebere nʻezi ọnụ ụzo Ụlọ Otù Enyemaka dị na Ogige Tempụl na niime onyunyo nke Tempụl Salt Lake.

Ọ bụ ebe dabara adaba nojiji nke ụkabụilu ahụ. Niihi na mgbe anyị na-eme ma na-edebe ọgbụgba ndụ niile, kachasị nke ndị ahụ dị adị niime ụlọ nke Onyenwe anyị, anyị ga-emeju oriọna anyị jiri mmanụ nke ntọghata.

Ụmụagbọghọ ise maara ihe na-ekesa ìhè ha.
Ụmụagbọghọ ise maara ihe na-akwado otu onye nʻibe ya.

Ebe ndịinyom egosiputara dị ka ụmụagbọghọ ise ahụ maara ihe adịghị ekekọrịta mmanụ nke ntọghata ha, ha na-ekekọrịta ìhè ha dị ka ha na-eweli oriọna ha, nke juputara na mmanụ ma na-enwuke enwuke. Nʻụzọ dị mkpa ha na-egosiputa ịkwado onye nʻibe ya—ubu nʻubu, otu ogwe aka jigide nke ọzọ, na-ele anya na anya ma na-akpọku ndị ọzọ ịbịa nʻìhè ahụ.

“Nʻezie, “[anyị] bụ ìhè nke ụwa.” Onye Nzọpụta mara ọkwa sị:

“Enye m gị ya ịbụ ìhè nye ndị a. Obodo ukwu nke e wuru n’elu ugwu enweghị ike izo ezo.

“… [Anyị ọ] na-amụnye oriọna ma debe ya n’okpuru iko ntụtụ? Mba, mana n’elu osisi ịdọba oriọna; ma ọ na-enye ìhè [nye] ndị niile nọ niime ụlọ ahụ;

“Ya mere kwe ka ìhè unu si otu a na-enwu n’ihu ndị a, ka ha wee hụ ọrụ ọma niile unu ma nye Nna unu [nke] bi n’eluigwe otuto.”

Enyere anyị iwu ikesa ìhè Ya. Ya mere gbajuo oriọna gị jiri mmanụ nke ntọghata ruo Jizọs Kraịst ma diri nkwado ịgbanye oriọna gị ma na-enwuke enwuke. Mgbe ahụ kwe ka ìhè ahụ na-amuke. Mgbe anyị na-ekesa ìhè anyị, anyị na-ewete enyemaka nke Jizọs Kraịst ruo ndị ọzọ, ntọghata anyị ruo na Ya emikpuo, ma anyị nwere ike izu oke ọbụna mgbe anyị na-eche maka ọgwụgwọ. Ma dị ka anyị na-ekwe ìhè anyị imuke amuke, anyị nwere ike juputa nʻọn̄ụ ọbụna mgbe anyị nọ na-eche.

Ọmụmaatụ akwụkwọ nsọ bara uru na-imesi ike ụkpụrụ ahụ na anyị nwere ike izu oke dị ka atọghatara anyị nye Jizọs Kraịst ma dọrọ ike site na Ya, ọbụna ka anyị na-eche maka ọgwụgwọ.

Onye Ozi Pọl nweburu ụfọdụ ụdị mkpagbu—ihe ọ kọwara dịka “ogwu nʻanụ ahụ,” nke ọ rịọworo Onyenwe anyị ugboro atọ iwepụ. Ma Onyenwe anyị sịrị Pọl: “Amara m ezuworo gị: niihi na ume m ka e mere ka o zuo oke niime adịghị ike.” Nye nke Pọl mara ọkwa:

“Ya mere n’obi kachasị dị ụtọ ọbụna ka m … ga-eji nye otuto niime adịghị ike m niile, ka ike nke Kraịst wee dakwasị m.

“Ya mere ọ na-amasị m niime adịghị ike niile, … niime mkpagbu niile niihi Kraịst: niihi na mgbe m adịghị ike, mgbe ahụ e siri m ike.”

Ọmụmaatụ nke Pọl na-atụpụta na ọbụna niime adịghị ike anyị niile, ume anyị niime Jizọs Kraịst nwere ike izu oke—nke bụ, izu ezu na izu oke. Ndị ahụ na-agba mgba ha na ndọlị niile nke ndụ anụ ahụ ma tụgharịa nye Chineke nʻokwukwe dị ka Pọl nwere ike nata ngọzi niile nke ịmara Chineke.

Agwọghị Pọl mkpagbu ya, mana o zuru oke nʻụzọ ime mmụọ niime Jizọs Kraịst. Ma ọbụna niime mkpagbu ya, ìhè nke ntọghata ya na ume ya sitere na Jizọs Kraịst nọ na amuke amuke, ma obi juru ya nʻọn̄ụ. Niime Akwụkwọ ozi ya nye Ndị Filipi ọ mara ọkwa, “N̄ụrịanụ niime Onyenwe anyị mgbe [niile]: ma ọzọkwa a sị m, N̄ụrịanụ.”

Ụmụnne nwanyị na ụmụnne nwoke, azịza ahụ bụ ee, anyị nwere ike izu oke nʻụzọ ime mmụọ, ọbụna mgbe anyị na-eche maka ọgwụgwọ nke anụ ahụ na nke mmetụta uche. Ozuzu oke abụchaghị na ọ pụtara mweghachite nke anụ ahụ na nke mmetụta uche niime ndụ nke a. Ozuzu oke dị irè site nʻokwukwe niime na ntọghata nye Jizọs Kraịst ma na-ikwe ìhè nke ntọghata ahụ mukee.

“Ọtụtụ ka akpọrọ, mana ole ma ole [họọrọ ka] ahọrọ ha.”

Ma ga-enwete ọgwụgwọ nke anụ ahụ na nke obi na Mbilite nʻọnwụ. Mana ị ga-ahọrọ ugbua izu oke na Ya?

Ana m ama ọkwa, nʻọn̄ụ na atọghatala m nye Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Ana m agba mbọ izu oke niime Ya. O doro m anya na ihe niile ka aga eweghachite ma ọgwụgwọ ga-abịa, nʻoge Ya, niihi na Ọ dị ndụ

Mary Magdalene bụ otu nwanyị Jizọs Kraịst gwọrọ. Ma ọ bụ otu nwanyị zuru oke niime Jizọs Kraịst. Dị ka ndị na-eso ụzọ Ya, o sooro Onye Nzọpụta gburu gburu Galili ma jeere Ya ozi.

Ọ nọburu nʻebe ụkwụ obe ahụ, onye akaebe nye ọnwụ Ya.

Ọ gara nili Ya imezu nkwado olili ozu niile ma chọpụta na-ewepụwo okwute eji kpuchie ili ahụ, na anụ ahụ nke Onyenwe anyị efuwo. Meri nọ nʻebe ili na-ebe akwa mgbe a jụrụ ya, na mbụ site nʻaka ndị mmụọ ozi ma emesị a site nʻaka Onye Nzọpụta nʻOnwe Ya, Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa? onye ka ị na-achọ?”

Meri bere akwa, “Ha ebupuwo Onyenwe anyị, ma amaghị m ebe ha debeworo ya.”

Ma Jizọs jiri nwayọọ kpọọ ya naha, “Meri.” Ma ọ matara Ya ma na nsọpụrụ zaghachi, “Raboni; … Nna Ukwu.”

Ịbụ amụma nke Onye Nzọpụta, Aịzaya kwuru, “Ọ ga-eloba ọnwụ na mmeri; ma Onyenwe anyị Chineke ga-ehichapụ anya mmiri niile pụọ site niihu ndị niile.”

Mbilite n’ọnwụ Ya kwere ka ehichapụ anya mmiri niile nke Meri. Nʻezie Ọ ga-ehichapụkwa nke gị.

Meri bụ onye aka ebe nke mbụ nke Onye Nzọpụta bilitere nʻọnwụ. Ma ọ bụ onye mbụ ịgba aka ebe nye ndị ọzọ maka ihe ọ hụworo.

Nʻobi umeala ana m agbakwunye ama m na nke Meri. O biliwo. Jizọs Kraịst dị ndụ. Nʻikpeazụ aga agwọ ndị niile, na anụ ahụ ma na mmetụta uche, niime Ya. Ma na-ichere maka ọgwụgwọ ahụ, okwukwe niime Onyeisi Ọgwọọ ọrịa ga-eme ka anyị zuo oke nʻụzọ ime mmụọ. Site nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba ama

  1. Lee Luk 17:11–19. Okwu ahụ “zuo oke” ka atụgharịrị asụsụ site na mkpụrụ okwu Greek nke pụtara izọpụta, ịgbapụta, ịnapụta, ma ọ bụ ịgwọ. Nke ahụ yiri ka ọ na-ekwusi ike eziokwu ahụ dị mkpa na Jizọs Kraịst nwere ike ịgwọ anyị nʻanụ ahụ ma O nwere ike napụta, gbapụta, zọpụta, ma gwọọ anyị nʻụzọ ndị ọzọ.

  2. Lee Alma 40:23: “A ga eweghachi mkpụrụ obi ahụ nye ahụ, ma ahụ nye mkpụrụ obi; ee, na ụkwụ na aka niile na njikọ ha a ga-eweghachi ha nye ahụ ya; ee, ọbụna otu mkpụrụ agịrị isi nke isi ahụ agaghị efu; kama a ga-eweghachi ihe niile n’ezigbo ọnọdụ na okporo ahụ zuru oke.” Lee kwa Russell M. Nelson, “Jizọs Kraịst—Onyeisi Ọgwọ ọrịa,” Liahona, Nọv. 2005, 87: “Onyinye nke mbilite n’ọnwụ bụ ọgwụgwọ zuru oke nke Onyenwe anyị.”

  3. Lee Moronaị 7:40–42.

  4. Ịnọs 1:8.

  5. Ịnọs 1:7.

  6. Ịnọs 1:8.

  7. Lee Matiu 25:1–13.

  8. Nzuzu niihi na ha echeghị na inwe mmanụ ọzọ dị mkpa ma ọ bụ bara uru.

  9. Ntụgharị asụsụ Joseph Smith, Matiu 25:12 (niime Matiu 25:12, nkọwada a).

  10. Nke ụkabụilu nke ụmụagbọghọ iri na-amaghị nwoke, Okenye David A. Bednar kuziri:

    “Biko chee maka oriọna niile nke ụmụagbọghọ niile jiri dị ka oriọna nke ama. Ụmụagbọghọ nzuzu ahụ weere oriọna nke ama ha mana ha ewereghị mmanụ ọbụla. Werenụ mmanụ ahụ ịbụ mmanụ nke ntọghata. …

    “Ụmụ agbọghọ ise ahụ maara ihe hà na-achọ ọdịmma onwe ha naanị ma adịghị njikere ikerịkọta, ma ọ bụ ha naara egosiputa nke ọma na mmanụ nke ntọghata abụghị ihe e nwere ike ibinyetụ ebinye? E nwere ike inye onye ọzọ ume ime mmụọ nke na-adị ire niihi nrube isi mgbe niile nye iwu nsọ niile? E nwere ike ibufere onye nọ na mkpa mmata ihe enwetere site na ịmụsi ihe ike na ịtụgharị uche na akwụkwọ nsọ? E nwere ike ibufe udo nke ozi ọma na-ewetere Onye nsọ Ụbọchị ikpeazụ kwesịrị ntụkwasị obi nye onye na-agabiga ahụhụ ma ọ bụ nnukwu ihe ịma aka? Azịza doro anya banyere ajụjụ ọbụla ndị a bụ mba.”

    Ọ gara niihu ịkọwa na anyị nwere oke na ọrụ otu notu idebe oriọna nke ama anyị na-enwu nakwa inwete mmanụ ntọghata bara ụba. Mmanụ nke a dị oke ọnụ ahịa ka a na-enwete otu kpọm nʻotu oge—‘ahịrị nʻahịri [na] iwu nʻiwuʻ (2 Nifaị 28:30), jiri ndidi ma nọgidesie ike. Ọ dịghị ụzọ dị mfe dị adị; ọ dịghị flurry nkwadobe ikpeazụ dị adị” (“Atọghatara nye Onyenwe anyị,” Liahona, Nọv. 2012, 109).

  11. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 33:17. Onyeisi Russell M. Nelson enyewo ndụmọdụ: “Ugbua bụ oge nke unu na maka mụ, iji kwado maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. Ugbua bụ oge nke anyị ime ịbụ onye na-eso ụzọ anyị ihe kachasị mkpa nye anyị” (“Onyenwe anyị Jisọs Kraịst Ga-abịa Ọzọ,” Liahona, Nọv. 2024, 121).

  12. Onye kpụrụ Ụmụagbọghọ Ise Maara ihe bụ ome nka Ben Hammond, onye gosiputara ụmuagbọghọ ise ahụ maara ihe dị ka ndịinyom gbara afọ dị iche iche na ndị azulitere na agbụrụ dị iche iche, na-anọchite ịdị iche iche nke ndịinyom ndị bụ ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst atọghatara atọghata.

  13. Mgbe anyị na-eri oriri nsọ, anyị na-emegharị ọhụrụ ọgbụgba ndụ niile anyị na Onyenwe anyị meworo ma mee ọgbụgba ndụ ọhụrụ na anyị dị njikere iwekwasị aha Jizọs Kraịst ma rube isi nye iwu nsọ Ya niile. Nsonye tozuru oke nʻemume nsọ niile nke ọkwa nchụaja na ime ma debe ọgbụgba ndụ niile na-eme anyị ezuo oke. Ụkpụrụ nke ka egosiputara nke ọma niime abụ oriri nsọ “Achịcha nke Ndụ, Mmiri Dị Ndụ”:

    Achịcha nke Ndụ, Mmiri Dị Ndụ,

    Nye mkpụrụ obi m ihe oriri, mejuo obi m.

    Onyenwe anyị, nye m ndụ ọhụrụ niime Gị

    Ma mee ka m zuo oke—zuo ezuo ma dị nsọ—

    Jikọta na Gị ruo mgbe ebighị ebi.

    (Abụ—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ, Ọba akwụkwọ Ozi ọma; nkwusi ike agbakwunyere.)

  14. Matiu 5:14.

  15. 3 Nifaị 12:14–16.

  16. Nʻokwu niile nke abụ ahụ:

    Obere ìhè mụ nke a, aga m ekwe ka ọ mukee. …

    Ebe ọbụla m jere, aga m ekwe ka ọ mukee. …

    Jizọs nyere m ya; aga m ekwe ka ọ mukee.

    Kwe ka ọ mụkee, kwe ka ọ mụkee, kwe ka ọ mụkee.

    (“Obere ìhè mụ nke a,” Abụ—Maka Ebe obibi na Nzykọ nsọ, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.)

  17. 2 Ndi Kọrịnt 12:7.

  18. Lee 2 Ndi Kọrịnt 12:8.

  19. 2 Ndi Kọrịnt 12:9.

  20. 2 Ndị Kọrịnt 12:9–10.

  21. Ndị Filipi 4:4; lee kwa 2 Ndị Kọrịnt 1:3–4: “Otuto dịrị Chineke, ọbụna Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasị obi niile; onye na-akasị anyị obi niime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʻụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi, inyere ha aka dị ka anyị onwe anyị sị nata inyeaka site nʻaka Chineke.”

  22. Lee David A. Bednar, “Yikwasị Ume Gị, O Zayọn,” Liahona, Nọv. 2022, 94.

  23. Matiu 22:14; lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:34–35.

  24. Lee Luk 8:2–3.

  25. Lee Jọn 19:25.

  26. Jọn 20:15; lee kwa amaokwu 13.

  27. Jọn 20:13.

  28. Jọn 20:16.

  29. Aịzaya 25:8.