Ọgbakọ Zuru ọha
Ikike Dị Nsọ, Ndịikom Nta Mara mma
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


11:44

Ikike Dị Nsọ, Ndịikom Nta Mara mma

E nwere m obi ekele mgbe niile na ndị ji Ọkwa nchụaja nke Erọn, site nʻike ya niile, emume nsọ niile, na ọrụ niile, na-agọzi anyị niile.

Imeela, Okenye Andersen, maka nkwuputa nke ike ọkwa nchụaja dị ịrịba ama na banyere ike nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta.

Otu ụtụtụ Sọnde na Jenụwarị nke a, ka m nọdụrụ ọdụ na nzukọ oriri nsọ, ihe karịrị ụmụ nwoke nta iri na abụọ ka a kwadoro ka ebugoo ha nʻỌkwa nchụaja nke Erọn. E enwere m mmetụta na ụwa na-agbanwe nʻokpuru ụkwụ anyị.

Ọ tụrụ m naanya na nʻakụkụ ụwa niile, site na mpaghara oge ruo na mpaghara oge, niime nzukọ oriri nsọ niile dị nnọọ ka nke ahụ, iri puku kwuru iri puku nke ndị dikọn, ndị nkuzi, na ndị nchụaja—dị ka enyi Onyeisi Holland nʻụtụtụ nke a, Easton—bụ ndị a na-akwado ka e chie ha echichi banye niime ozi niile nke ọkwa nchụaja oge ndụ ha niile nke ga-agbasa ruo akụkụ anọ nke ụwa banyere mkpọkọta nke Izrel.

Nʻọnwa Jenụwarị ọ bụla, a na-edokwasị aka nʻisi nke ihe dịka ndịikom nta ruru 100,000, na-ejikọta ha site nʻemume nsọ ruo nʻahịri nke ikike na-egbuke egbuke na-adọla azụ site nʻoge Mweghachite nye Josef na Oliver—ma nye Jọn Omee Baptizim ma nye Jizọs Kraịst.

Ugbua, nke anyị abụghị mgbe niile nzukọ nsọ nke a maara na-egosipụta onwe ya. Ebe a, ka anyị kwụsịtụrụ.

Mana rute ugbua, ịhụ igwe ndị ji ọkwa nchụaja nke a na-ehi ụda echiri echichi ọhụrụ gbasara nʻofe ụwa niile, Ọ tụrụ m naanya—na “nzukọ nsọ nke ọńụ”dị ka ọ dị—ọ bụrụ na e kwesịghị iti mkpu ya site nʻelu ụlọ niile. “Taa,” E chere m, “e kwesịrị igbu opi niile na aja na-akụda mmụọ na kandụl niile ndị Rom. E kwesịrị inwe ngagharị niile!”

Ịmara ike nke Chineke maka ihe ọ bụ nʻezie, anyị bụụrụ ndị aka ebe nye nkwụsị nke bụ isi nsoro niile nke ụwa nke a site nʻikike chineke na-agbasa ofe ụwa.

Echichi niile ndị a dubara ndịikom nta ndị a nime ije ozi oge ndụ nke dị ka ha ga-achọta onwe ha nime oge na ọnọdụ ebe ọnụnọ ha na ekpere ha na ike niile ọkwa nchụaja nke Chineke ha ji ga-adị mkpa nke ukwuu.

Mmeghachi omume agbụ a na-achịkwa malitere site na mmụọ ozi na-eje ozi nke Chineke. Jọn Omee Baptizm a kpọlitere nọnwụ nke oge ochie pụtara nihu Josef na Oliver, bikwasị aka ya nisi ha ma sị, “N’elu isi unu ndị odibo ibe m, n’aha nke Mesaịa, ana m enyefe Ọkwa Nchụaja nke Erọn, nke ji ntụghe nile nke nkwusa ozi-ọma nke ndị mmụọ ozi na nke ozi-ọma nke nchegharị, na nke baptizim site na-imikpu n’ime mmiri maka mgbaghara nke mmehie nile”(Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile13:1).

Jọn kpọrọ ikike nke a “Ọkwa nchụaja nke Erọn,” bụ nwanne nwoke nke Mozis na onye otu ọkwa nchụaja. Nʻoge ochie, ndị ji ọkwa nchụaja nke Aarọn ga-akụzi ma nye aka nime emume nsọ niile—emume nsọ niile lekwasịrị anya nʻịbụ ndị na-eso ụzọ nke Mezaya na-abịa nihu, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst (lee Ditronomị 33:10).

Akwụkwọ nke Ọnụọgụgụ na-ekenye nke ọma ndị ji ọkwa nchụaja nke Erọn ọrụ nke ijikwa arịa niile nke emume nsọ niile. “Ma ị ga-akpọ Erọn na ụmụ ya ndị nwoke … ma ọrụ ha ga-abụ … tebụlụ ahụ … na ihe niile nke ebe nsọ ahụ ebe ha neje ozi” (Ọnụọgụgụ 3;10, 31).

Emume nsọ Agba Ochie ahụ nke ịchụ aja anụmanụ ka emezuru ma dochie ya site na ndụ na aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta. Emume nsọ oge ochie ahụ ka edochiri site na emume nsọ ahụ anyị na-akpọ oriri nsọ nke Nri anyasị nke Onyenwe anyị.

Onyenwe anyị na-akpọ ndị ji ọkwa nchụaja nke Erọn nke oge a ka ha mee otu ihe ahụ kwa ha mere nʻoge ochie: ịkuzi na inye emume nsọ niile—ha niile ichetara anyị maka Aja mgbaghara mmehie Ya.

Mgbe ndị dikọn, ndị nkuzi, na ndị nchụaja na-enye aka na oriri nsọ, ha na-anata ngọzi ya dịka onye ọ bụla ọzọ: site na idobe ọgbụgba ndụ ahụ ha na-eme ka ha nʻotu nʻotu na-eri achịcha na mmiri ahụ. Mana nʻịrụ ọrụ ndị a dị nsọ, ha na-amụtakwu gbasara ọrụ ọkwa nchụaja ha kwesịrị ịrụ na oke na ọrụ ha niile.

A na-akpọ Ọkwa nchụaja nke Erọn ọkwa nchụaja nkwadobe nʻotu akụkụ nihi na emume nsọ ya niile na-enye ha ohere inwe nhụmihe ịnyị arụ na ọn̄ụ nke ịnọ nʻozi nke Onyenwe anyị, na-akwado ha maka ozi ọkwa nchụaja dịniihu, mgbe enwere ike ịkpọku ha ije ozi nʻụzọ ndị a na-atụghị anya ya—gụnyere ịkpọpụta ngọzi niile site na mkpate mmụọ nʻoge mgbe olileanya na nrọ niile, ma ọbụna ndụ na ọnwụ, koro na-agbata dị egwu.

Atụmanya niile ndị a siri ike chọrọ nkwadebe siri ike.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile na akọwa na ndi dikọn na ndị nkuzi “ga-adọ aka na ntị, kọwadaruo ala, ma kuzie, ma kpọkuo mmmadu niile ịbịakwute Kraịst” (Ozizi na Ọgbụgbandụ niile 20:59.). Na mgbakwunye nye ohere ndị a, ndị nchụaja ga “ekwusa ozi ọma … ma na-eme baptizim” (Ozizi na Ọgbụgbandụ niile 20:50.).

Ọ ga-abụ na, Ihe a niile na-ada ka ọtụtụ ihe, mana nʻezi uche ya, ihe ndị a na-eme nʻụzọ eke, na nʻụwa niile gbaa gburugburu.

Otu bishọp kuziri ndịisi nduzi kworum ọhụrụ ndị dikọn ya ọrụ ndị a niile. Ya mere otu ndịisi nta malitere ikwu okwu gbasara ihe nke ahụ nwere ike ịdị ka ya na kworum na niime ngalaba ukwu ha. Ha kpebiri na ha ga-aga leta ndị agadi bụ ndị otu ngalaba ukwu ha iji mata ihe ha chọrọ ma mgbe ahụ gaa mee ya.

Onye so na ndị ha jeere ozi bụ Alan, onye ike, onye na-eme omume rụrụ arụ mgbe niile, ma mgbe ụfọdụ onye na-emegide onye agbata obi ya. Nwunye Alan, Wanda, bịa bụrụ onye otu Nzukọ nsọ, mana Alan bụụrụ, dị ka anyị na-ekwu, ebe e nwere ọrụ.

Rute ugbua, ndị dikọn gara rụọ ọrụ, jiri ọchị leghara mkparị ya niile anya, ebe ha na-ekpopụ snow ma kwafuo unyi. Ndị dikọn nwere ike sie ike ịkpọ asị, ma Alan mechara malite ịhụ ha naanya. Oge ruru mgbe ha kpọrọ ya ka ọ bịa nzukọ nsọ.

“Anaghị m enwe mmasị nzukọ nsọ,” ọ zaghachiri.

“Ọ dị mma, anyị masịrị gị,” ha kwuru. “Ya mere soro anyị. I nwere ike nnọọ bịa na nzukọ kworum anyị ọ bụrụ ma ịchọọ.”

Ma site na nkwado nke bishọp, ọ bịara—ma nọgide wee na-abịa.

Ndị dikọn ahụ ghọrọ ndị nkuzi, ma ka ha nọgidere ijere ya ozi, ọ kuziri ha ịrụzi ụgbọ ala na ịrụ ihe niile. Nʻoge ahụ ndị dikọn ndị a ghọrọ ndị nkuzi bịara ghọọ ndị nchụaja, Alan naara akpọ ha “ụmụ m ndị nwoke.”

Ha naara eme nkwado nʻeziokwu maka mishọn ma jụọ ya ma ha nwere ike isoro ya mụọ ihe ọmụmụ niile nke ndị mgbasa ozi ọma. Ọ n̄ụrụ iyi na ya agaghị ege ntị ma ọ bụ kwere, mana ee, ha nwere ike mee ihe nʻụlọ ya.

Ma emesịa Alan dara ọrịa. Ma ọ bịara dị nro.

Otu ụbọchị na nzukọ kworum, o ji obi dị nro rịọ ha ka ha kpeere ya ekpere ka ọ kwụsị ise siga, ma otu ahụ ka ha mere. Ma mgbe ahụ ha sooro ya laa ma werechaa ụtaba niile nọ nʻebe obibi ya.

Ka ahụ ike ya na-agbada agbada tinyere Alan nʻụlọọgwụ na nʻebe nhazigharị ndụ,”ụmụ ya ndị nwoke” jeere ya ozi, na-eji nwayọ na-egosịpụta ike niile nke ọkwa nchụaja na nke ịhụnaanya nwere isi. (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:41).

Ọrụ ebube ahụ gara nihu mgbe Alan rịọrọ ka e mee ya baptizim—mana ọ nwụrụ tupu o nwee ike mee. Nʻarịrịọ ya, ndị dikọn ya niile ghọrọ ndị nchụaja bụ ndị bu ozu ya na ndị kwuru okwu nʻolili ya, ebe ha—dabara—dọọ aka na ntị, kọwadaruo ala, gbaa ume, kuzie ihe, ma kpọkuo mmadụ niile ịbịkwute Kraịst.

Ka emechara, nime tempụl, ọ bụ otu nime “ụmụ nwoke nke Alan” onye mere onyeisi kworum oge ochie bapizim na nnọchi anya Alan.

Ihe niile Jọn Omee Baptizm kwuru ka e mee, ha mere. Ha mere ihe ndị dikọn, ndị nkuzi, na ndị nchụaja na-eme na Nzukọ nsọ nke a niile ma niime ụwa niile.

Otu nime ihe niile nke ndị ji ọkwa nchụaja nke Erọn kwesịrị ime gụnyere emume nsọ nke oriri nsọ ahụ.

Afọ gara aga, e zutere m otu bishọp nwere mkpake mmụọ na ezigbo nwunye ya. Na ụtụtụ Satọde nso nso a, ha naara anya ụgbọala -aga ime nwa ha nwoke baptizim ma daba na nsogbu dị egwu na ọnwụ mberede nke ezigbo nwa ha nwanyị gbara afọ abụọ, Tess.,

Nʻụtụtụ echi ya, ndị otu ngalaba ukwu ha gbakọrọ maka nzukọ oriri nsọ jupụtara na ọmịiko, na-atakwa onwe ha ahụhụ nihi ọnwụ nke nwata nwanyị a zuru oke. Onweghị onye tụrụ anya na ezinaụlọ nke bishọp ga-abịa nzukọ nsọ nʻụtụtụ ahụ, mana nkeji ole na ole tupu nzukọ amalite, ha ji nwayọọ bata ma were oche.

Bishọp ahụ gara nʻebe elu ma gafee oche ọ na-adị anọ nʻetiti ndị ndụmọdụ ya ma wee nʻọdụ ala kama nʻetiti ndị ọkwa nchụaja ya na tebụl oriri nsọ.

Nʻoge nhụjuanya na arahụghị ụra abalị nke ịchọ nghọta na udo, o nwetawo mmetụta na ihe kachasị mkpa ezinaụlọ ya chọrọ—ma ihe kachasị ngalaba ukwu ya mkpa. Ọ bụ ịnụ olu nke bishọp ha, onyeisi Ọkwa nchụaja nke Erọn, nna ha na-eru uju, kpọpụtara nkwa niile nke ọgbụgba ndụ nke oriri nsọ.

Ya mere, ka oge na-aga, ya na ndị nchuaja ahụ gbunyere ikpere nʻala ma gwa Nna ya okwu. Site na nʻụzọ ndị enwere nke emume ahụ, ọ kpọpụtara ụfọdụ nime okwu ndị kachasị ike e kwere ka onye ọ bụla kwuo nʻolu dara ụda nʻoge ndụ a.

Okwu niile nke nsọnaazụ dị ebighị ebi.

Okwu nile nke emume nsọ.

Okwu nile nke ọgbụgba ndụ.

Ntụziaka nke jikọtara anyị na isi ebumnuche niile nke ndụ a—na mpụtara niile kachasị mma nke atụmatụ Nna nke Eluigwe nwere maka anyị.

I nwere ike iji anya nke uche gị hụ ihe ndị ọgbakọ ahụ nụrụ nʻụlọ ụka ụbọchị ahụ—ihe metụtara ha nime okwu niile anyị na-anụ Sọnde niile nime ụlọ ụka anyị niile?

“O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, anyị na-arịọ gị nʼaha Ọkpara gị, Jizọs Kraịst, ka ị gọzie ma doo achịcha nke a nsọ nye mkpụrụ obi nke ndị niile ga-eketa oke na ya, ka ha wee rie na ncheta nke ahụ nke Ọkpara gị, ma gbaara gị aka ebe, O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, na ha dị na njikere iwekwasị onwe ha aha nke Ọkpara gị, ma na-echeta ya oge nile ma na-edebe iwu-nsọ ya nile nke o nyeworo ha, ka ha wee na-enwe Mmụọ ya oge niile ịnọnyere ha. Amen” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77).

Ma mgbe ahụ: “O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, anyị na-arịọ gị nʼaha nke Ọkpara gị, Jizọs Kraịst, ka ị gọzie ma doo [mmiri] nke a nsọ nye mkpụrụ obi nke ndị niile ga-an̄ụ site na ya, ka ha wee mee ya na ncheta nke ọbara nke Ọkpara gị, nke a kwafuru nʼihi ha; ka ha wee gbaara gị aka-ebe, O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, na ha na-echeta ya oge nile, ka ha wee nwe Mmụọ ya ịnọnyere ha. Amen” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77).

Ezi nna na nne nke a na-agba akaebe na e mezuwo nkwa ahụ. Ha nwetara, nʻezie, nkasi obi ha dị ebighị ebi, “nwee Mmuọ ya ịnọnyere ha.”

A na m enwe obi ekele ruo mgbe ebighị ebi na ndị ji Ọkwa Nchụaja nke Erọn, jiri ike ya niile, emume nsọ niile, na ọrụ niile, na-agọzi anyị niile site na ntụghe niile nke “nkwusa ozi-ọma nke ndị mmụọ-ozi, na ozi ọma nke nchegharị, na nke ime baptizim site n’imikpu n’ime mmiri maka mgbaghara nke mmehie niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13:1). Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Lee Patrick Kearon, “Nnọnụ na Nzukọ nsọ nke Ọn̄ụ,” Liahona, Nov. 2024, 36-38.

  2. Nʻokwu o kwuru nʻọgbakọ zuruọha metụtara nʻụzọ pụrụ iche “Welcome to the Church of Joy,” Okenye Kearon tuziiri anyi na nkowada 10 ruo nkuzi nke Onyeisi Gordon B. Hinckley kuziri: “Mgbe gị, dị ka onye nchụaja, sekpuuru na tebulu oriri nsọ ma kpee ekpere, nke bịara site na mkpughe, ị na-edebe ndị ọgbakọ niile n’okpuru ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị. Nke a ọ bụ obere ihe? Ọ bụ ihe kachasị mkpa ma dị ịrịba ama” (“Ọkwa nchụaja nke Erọn—Onyinye sitere n’aka Chineke,” Ensign, Me 1988, 46).