Ọgbakọ Zuru ọha
Ịhụnaanya nke Chineke
Ọgbakọ zuruọha Eprel 2025


10:34

Ịhụnaanya nke Chineke

Eji m an̄ịrị agba aka ebe dị nro na Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst bụ Ịhụnaanya nke Chineke. Ịhụnaanya O nwere maka anyị zuru oke, nke onwe onye, ma dị ebighị ebi.

Otu oge ọkọchị mgbe m na-emega njem nʻotu mpaghara ime ime obodo, ndị ezi na ụlọ anyị jiri mgbede ahụ hie ụra nʻokpuru mbara eluigwe na-enweghị urukpuru. Nke a na-ahụzi ụzọ nke ọma nʻelu isi anyị ka e nwere ọmarịcha Milky Way, juputara na imerime kpakpando a na-apụghị ịgụta ọnụ na mmụmụ ọwa na-apụta kwa mgbe kwa mgbe. Ebe anyị na-enwe ịtụnaanya na okike nke Chineke dị ebube, anyị nwere njikọ dị nsọpụrụ nʻebe Ọ nọ. Ụmụ anyị dị nta, ndị toliteworo na Hong Kong, enwetụbeghị nhụmiihe dị ka nke a mbụ. Na-enweghị ụta ha jụrụ ma anyị bikwa nʻotu ụdị okpuru eluigwe dị otu ahụ nʻobodo ebe anyị bi. A gbalịrị m ịkọwara ha na ọ bụkwa otu mbara eluigwe ahụ, mana ngwarụ ikuku na ihè nʻebe anyị bi gbochiri anyị site nʻịhụ kpakpando ndị a ọbụladị na ha nọ ebe ahụ.

Akwụkwọ nsọ na-akuziri anyị na “okwukwe bụ ụmị nke ihe niile atụrụ anya ha, akaebe nke ihe niile a na-anaghị ahụ anya.” Ebe mmegharị anya ndị na-akụda mmụọ na ọnwụnwa niile nke terestịal na-ekpuchi ọhụ nke ime mmụọ anyị, mgbe anyị tinyere okwukwe na Chineke na Ọkpara Ya Jizọs Kraịst, anyị na-anata mmasi obi ike doro anya nke ịdị adị Ha na nke nchekasị Ha maka anyị.

Niime Akwụkwọ nke Mọmọn, onye amụma Lehi hụrụ “otu osisi, nke mkpụrụ ya nwere oke mmasị ime mmadụ obi ụtọ” ma bụkwa “nke kachasị ụtọ, karịa ihe niile.” Mgbe ọ rachara mkpụrụ ahụ, mkpụrụ obi ya juputara na nnukwu ọn̄ụ, ma ọ chọrọ ka ezi na ụlọ ya rachaakwa ya. Anyị na-amụta na osisi nke a nọchiri anya “ịhụnaanya nke Chineke,” ma dị ka Lehi, anyị nwekwara ike ịnata aka ebe nke Chineke na-enye an̄ụrị mgbe anyị kpọbatara Ya niime ndụ anyị.

Jizọs Kraịst na-egosịpụta ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe nwere maka anyị. Site na aja mgbaghara mmehie Ya, O wekwasịrị onwe Ya mmehie anyị niile ma e chiri Ya ọnụ nʻala niihi njehie anyị niile. “O buruwo iru uju anyi niile nʻonwe ya, burukwa mwute anyị niile, ma wekwasị Onwe Ya mgbu na ọrịa anyị niile. Ọ na-ezite Mmụọ Nsọ ịkasi anyị obi, ma mkpụrụ niile nke Mmụọ ahụ gunyere ọn̄ụ, udo, na okwukwe, nke na-emejuputa anyị nʻolileanya na ịhụnaanya.

Ebe e mere ka ịhụnaanya nke Chineke rute mmadụ niile, ọtụtụ na-achọsi ya ike, ebe ndị ọzọ na-achọ inweta ịhụnaanya nke Chineke mana kwenyeghị na ha kwesịrị inwe ya. Ụfọdụ ndị ọzọ na-achọsi ike ijidesị ya aka ike. Akwụkwọ nsọ na onye amụma nke Onyenwe anyị na-akuziri anyị na anyị nwere ike ịnọgide na-inweta ịhụnaanya nke Chineke mgbe, site na amara nke Jizọs Kraịst, anyị ugboro ugboro na-echegharị, na-agbaghara nʻeziokwu, gbasie mbọ ike idobe iwu nsọ Ya niile, ma na-ejere ndị ọzọ ozi na-echeghị maka onwe. Anyị na-enweta ịhụnaanya nke Chineke mgbe anyị mere ihe ndị na-adọta anyị nso nʻebe Ọ nọ, ụdị dị ka mkparịta ụka anyị na Ya kwa ụbọchị site na ekpere na ịmụ akwụkwọ nsọ, ma kwụsị ime ihe ndị ga-ebupu anyị site na-ebe Ọ nọ, udị dị ka inwe mpako, isi arụmaarụ, na ị na-enupu isi.

Onyeisi Russell M. Nelson akpọkuwo anyị “iwepụ, site na enyem aka nke Onye Nzọpụta, urughuru unyi ochie niile nọ niime ndụ anyị” ma “wezuga obi ilu.” Ọ gbawo anyị ume “imesi ntọala niile nke ime mmụọ anyị ike” site na “ịtụkwasị ndụ anyị [nʻOnye Nzọpụta] na nʻelu emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile nke tempụl Ya. O kwere nkwa na “dị ka anyị na-edobe ọgbụgba ndụ anyị niile nke tempụl, anyị na-enwete nnukwu ohere nke ike nkwado nke Onyenwe anyị. … Anyị na-enweta nhụmiihe ịhụnaanya na-enweghị ntụpọ nke Jizọs Kraịst na Nna anyị nke Eluigwe n’ụzọ bakwuru ụbara!”

E nwere m otu enyi onye a gọziri site na ọmarịcha ezi na ụlọ na ọrụ na-aga nke ọma. Nke a gbanwere mgbe ọrịa mere ka ọ kwụsị ọrụ, nke dubara na ịgba alụkwaghị m. Oge niile kemgbe afọ ahụ a bụrụwo ihe siri ike, mana ịhụnaanya ya maka ụmụ ya na ọgbụgba ndụ niile o meworo ya na Chineke akwadowo ya. Otu ụbọchị ọ nụrụ na nwunye ya nke mbụ alụgharịwo di ma chọọ nkagbu nke nrachi tempụl ha. O nyere ya nsogbu na mgbagwoju anya. Ọ chọrọ udo na nghọta niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Ụbọchị na-esote nleta ya, anatara m ozi nke a na-esote site nʻaka ya:

“E nwetara m nhụmiihe dị ịtụnaanya niime tempụl abalị gara aga. Echere m na o doro anya na m ka nwekwara obere ihe na-ewe m iwe. … A maara m na m ahaghị ịgbanwe, ma anọrịị m na-ekpe ekpere izu ụka niile ime otu ahụ. … Abalị gara aga niime tempụl e nwetara m nnọọ mmetụta nke Mmụọ wepụrụ iwe ahụ site nʻobi m. … Ọ bụụrụ ezigbo enyemaka inwere onwe m site na ya. … Ibu arụ nke anụ ahụ jọgburu onwe ya na-anyịgbu m ka ebupụworo.”

Ebe ọ ka nwekwara ihe ndị chere ya aka mgba, enyi m nabatara nhụmiihe ahụ nʻụlọ nke Onyenwe anyị, ebe ike nnapụta nke ịhụnaanya nke Chineke na-enyeworo ya aka ịnọkarị Chineke nso, nwekwuo obisi ike na ihe gbasara ndụ, ma nakwaghị enwe nchekasị gbasara ọdịniihu ya.

Mgbe anyị nwetara nhụmiihe ịhụnaanya nke Chineke, anyị nwere ike ibù ibù arụ anyị nʻụzọ dị mfe ma jiri ndidi na ihu ọcha nyefee onwe anyị nʻuche Ya. Anyị nwere obisi ike na Chineke ga-echeta ọgbụgba ndụ Ya nke anyị na ya, leta anyị niime mkpagbu anyị niile, ma napụta anyị site na-agbụ ohu. Anyị ga-achọkwa ikwusa ọn̄ụ anyị na-enwe anyị na ezi na ụlọ anyị na ndị anyị hụrụ naanya. Dị ka ọ dịịrị ezi na ụlọ nke Lehi, onye ọbụla nwere ohere nhọrọ nke ịhọrọ ma ha ga-eso rachaa mkpụrụ ahụ ma ọ bụ mba, mana ohere anyị nwere bụ inwe ịhụnaanya, ikwusa, na ịkpọku nʻụdị ụzọ nke ndị ahụ anyị hụrụ naanya nwere iji nweta mmetụta ịhụnaanya nke Chineke.

Inyere ndị ọzọ aka nweta ịhụnaanya Chineke, anyị ga-ewulite niime anyị mmaramagwa niile yiri nke Kraịst udị dị ka ịdị umeala nʻobi, afọ ọma, ọmịiko, na ndidi, ma nye aka chigharịa ndị ọzọ nʻebe Onye Nzọpụta nọ site nʻisoro nnukwu iwu nsọ abụọ nke ịhụ Chineke naanya na ịhụ mmadụ ibe anyị naanya.

Otu niime ụmụ anyị ndị nwoke ka ọ naara ara ahụ ịdaba nʻusoro na inwe ugwu onwe onye nʻoge ntoroọbịa ya. Mụ na nwunye m kpere ekpere ịma otu esi enyere ya aka, ma anyị dịịrị na njikere ime ihe ọbụla Onyenwe anyị ga-achọ ka anyị mee. Otu ụbọchị o metụrụ m nʻobi ịjụ onyeisi nke kworum ndị okenye m ma ọ maara onye nọ na mkpa onye m nwere ike gaa leta mụ na nwa m nwoke. Ka o chetụrụ obere echiche, ọ gwara anyị gaa leta otu nwanyị nwere ezigbo nsogbu ahụ ike, ma site na-ịnata ikikere si nʻaka onyeisi ngalaba nta, iwetara ya oriri nsọ kwa izu ụka. Obi tọrọ m ụtọ mana e chere m echiche banyere otu nwa m nwoke ga-esi anabata mkpebi ije ozi nke kwa izu ụka nke a.

Na nleta anyị nke mbụ, obi gburu anyị mgbu maka ezigbo nwanne nwanyị nke a, dị ka ọ nọ na mgbu esepụghị aka. Obi ya juru nʻekele nke ukwuu maka oriri nsọ ahụ, ma anyị nwere ọn̄ụ ịga leta ya na di ya. Mgbe nleta ole ma ole gasịrị, otu Sọnde a pụrụ m apụ ma nweghị ike isoro nwa m nwoke, mana e chetaara m ya banyere ọrụ ekenyere anyị. Mgbe m lọtara nʻebe obibi, echeghị m eche ịnụ ka nleta ahụ siri gaa. Nwa m nwoke zara na ya echereghị na nwa klaasị ya gaara eme ihe dị mma ka nke a. Ma o nyere ezigbo nkọwa site nʻikwu na ọ kpọtara nwanne ya nwoke inye aka ma na oriri nsọ ahụ gara nke ọma, mana ezi nwanne nwanyị nke a naara ewe iwe nʻoge izu ụka niihi na ọ kpọkuru ndị enyi ịbịa nʻebe obibi ya ile muvii, mana pleya vidiio ya anaghị arụ ọrụ. Nwa m nwoke sịrị na ya mere nchọcha nʻikuku, chọpụta nsogbu ahụ, ma meziere ya ya ozugbo. O nwere mmetụta ime ihe bara uru, obi ụtọ, na ntụkwasị obi ime ihe nke tọrọ ya obi ụtọ. O metụrụ ya na Chineke hụrụ ya naanya.

Ọ bụrụ na-agbanyeghị ezi mbọ gị ndụ juputara na nsogbu, ma ọ bụ ọ bụrụ na i chee na anaghị anụ ekpere gị, ma ọ bụ ọ bụrụ na i nweghị ike inweta ịhụnaanya nke Chineke, biko mata na mbọ gị niile bara uru ma, dị ka a maara nke ọma na kpakpando nọ nʻelu karịa anyị, na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst maara, na-anụ, ma hụrụ gị naanya.

Nʻotu oge mmemme, mgbe ndị na-eso ụzọ Ya nọọrọ niime ụgbọ mmiri nke “ebili mmiri [naara] ebugharị,” Onye Nzọpụta gawara nʻebe ha nọ nʻelu mmiri ma masie ha obi ike, na-asị, “Nweenụ obi ụtọ; ọ bụ M; unu atụla egwu.” Mgbe Pita chọrọ ịgakwuru Onye Nzọpụta nʻelu mmiri, Jizọs kpọkuru ya , na-asị, “Bịa.” Ma mgbe Pita chefuru onwe ya ma bido imikpu, Onye Nzọpụta ozugbo setịpụrụ aka Ya ijide ya ma duruo ya na nchekwa ma na-asị, “O gị onye okwukwe nta, gịnị mere iji enwe obi abụọ?”

Mgbe ikuku na-emegide anyị na ndụ anyị, anyị dị njikere inwe obi ụtọ ma nwee obi ike? Kedụ otu anyị nwere ike iji cheta na Onye Nzọpụta anaghị ajụ anyị ma na Ọ nọ anyị nso, ikekwe nʻụzọ ndị anyị aka amatabeghị? Anyị dị na njikere ịgakwuru Ya nʻokwukwe, nke ka nke mgbe ụzọ nọ anyị niihu yiri ka ihe na-agaghị ekwe omume? Ma olee ụzọ ndị Ọ na-esi ebuli anyị elu ruo na nchekwa mgbe anyị dara mba? Kedụ otu anyị nwere ike nʻikwesị ntụkwasị obi lekwasị Ya anya niime echiche niile, na-enweghị obi abụọ ma ọ bụ na-atụghị egwu?

Ọ bụrụ na ị ga-achọ inweta ịhụnaanya nke Chineke nke kacha ukwuu na ndụ gị, ana m akpọku gị itule ihe ndị a na-esote:

  • Nke mbụ, kwụsịtụ mgbe na mgbe icheta na ị bụ nwa Chineke ma chee maka ihe ndị i nwere obi ekele maka ha.

  • Nke abụọ, kpee ekpere ụbọchị niile, na-arịọ Nna nke Eluigwe maka inyere gị aka mata onye nọ gị nso nwere mkpa inweta ịhụnaanya Ya.

  • Nke atọ, rịọ nʻobi gị niile ihe i nwere ike ime iji nyere onye ahụ aka nweta ịhụnaanya nke Chineke.

  • Nke anọ, mee ihe ọsọ ọsọ na mkpatemmụọ ahụ ị natara.

Ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere esepụghị aka ma rịọ na-aha ndị ọzọ, Chineke ga-egosi anyị ndị anyị nwere ike inyere aka. Ọ bụrụ na anyị mee ihe ngwa ngwa, anyị nwere ike ghọọ ụzọ nke Ọ na-esi aza ekpere ha. Site na-ime otu a, mgbe na-adịghị anya, anyị ga-anata azịza nye ekpere anyị ma anyị ga-enwe mmetụta ịhụnaanya nke Chineke niime ndụ nke onwe anyị.

Lepụ anya site nʻọnụ mpio nke ụgbọ elu.

Ọnwa ole ma ole gara aga mgbe m na-aga Vietnam, mụ na nwunye m nọọrọ nʻụgbọ elu nke feliri nʻoge oke ifufe mmiri. Ọgbaaghara ahụ dịịrị egwu, ma urukpuru ọchịchịrị, oke mmiri ozuzo, na amụma mmiri ka enwere ike ịhụ site nʻọnụ mpio anyị. Ka ogologo na mgbago elu na-adịghị ara ahụ agbanwe gasịrị, ụgbọ elu anyị nʻikpeazụ feliri gafee urukpuru oke ifufe mmiri ahụ niile ma wụchaa na vista nke a dị ebube. E chetakwaara anyị ọzọ banyere Nna anyị nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ma nweta mmetụta nnukwu ịhụnaanya Ha maka anyị.

Ezi ndị enyi, dị ka onye na-enwetawo ịhụnaanya nke Chineke, eji m ọn̄ụ na-agba ama na Jizọs Kraịst bụ ịhụnaanya nke Chineke. Ịhụnaanya O nwere maka anyị zuru oke, nke onwe onye, ma dị ebighị ebi. Dị ka anyị na-eso Ya nʻikwesị ntụkwasị obi, ka anyị juputa na ịhụnaanya Ya ma ka anyị bụrụ ụlọ ìhè nke na-eduba ndị ọzọ nʻịhụnaanya Ya. Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.