Ofufe
Gịnị ka ife Chineke ofufe pụtaara mụ na gị?
“Ugbu a mgbe a mụrụ Jizọs niime Bethlehem nke Judea n’ụbọchị niile nke Eze Herod, lee, e nwere ndịikom ise maara ihe bịara na Jerusalem site nʻọwụwa anyanwụ.
“Na-asị, Olee ya onye nke a mụrụ Eze ndị Juu? niihi na anyị ahụwo kpakpando ya nʻọwụwa anyanwụ, ma abịawo ife ya ofufe.”
Magaị, dị ka a na-akpọ ha mgbe ụfọdụ, maara ihe nʻịchọ ịchọta ma fee Mezaya ofufe. Maka ha, ife ofufe pụtara ịda nʻala niihu ya na inye Ya onyinye nke ọlaedo na ọmarịcha ngwa nri na-esi isi dị mma.
Gịnị ka ife Chineke ofufe pụtaara mụ na gị?
Mgbe anyị na-eche maka ofufe, echiche anyị na-atụgharịkarị nʻụzọ ndị anyị si egosi nraranye okpukperechi ma nonwe ma niime nzukọ niile nke Nzukọ nsọ. Dị ka m tuleworo okwu nke ife Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya, Onye Nzọpụta anyị ofufe, echiche anọ abịawo niime obi: nke mbụ, omume niile nke mejuputara ofufe anyị; nke abụọ, agwa niile na mmetụta niile na-abanye niime ofufe anyị; nke atọ, naanị ihe gbasara ofufe anyị; na nke anọ, mkpa ọ dị ịn̄ọmi Ndị Dị Nsọ anyị na-efe ofufe.
Nke mbụ, Omume niile Nke Mejuputara Ofufe Anyị
Otu niime ụdị ofufe akachasị mara na nke dị mkpa bụ ịgbakọta noghere edoro nsọ iji rụọ ọrụ niile nke nranye. Onyenwe anyị na-asị, “Ma ka unu wee nwee ike n’uju debe onwe unu na-enweghị ntụpọ site n’ụwa, unu ga-aga n’ụlọ ekpere ma sonye na oriri nsọ niile n’ụbọchị nsọ m.” Nke a bụ, nʻezie, isi mkpali nʻiwulite ụlọ ụka niile. Mana, ọ dịrị mkpa, oghere edobeghị nsọ gakwa adị mma ọ bụrụ na anyị nwere ike igosi nsọpụrụ dị elu ebe ahụ.
Kachasị mkpa bụ ihe anyị na-eme mgbe anyị gbakọtara nʻụbọchi nke Onyenwe anyị. Nʻezie, anyị na-eyi uwe otu o kachasị dị mma anyị nwere ike ime dị ka otu akpa anyị kwere—ọbụghị nʻụzọ gabigara oke mana nke dị mma iji gosi nsọpụrụ na nkwanye ugwu anyị nye Chi. Omume anyị dịkwa ka nsọpụrụ na nke nkwanye ugwu. Anyị na-efe ofufe site nʻisonye nʻekepere; anyị na-efe ofufe site nʻịbụ abụ (ọbụghị naanị ige nti mana ịbụ abụ niile); anyị na-efe ofufe site nʻikuzi ihe na nʻịmụ ihe site nʻaka onye na ibe ya. Jizọs kwuru, “Cheta na nʻụbọchị nke a, bụ nke Onyenwe anyị, ị ga-enye nhunye gị niile [nke pụtara ʻonyinye gị niile … nke oge, akaraka niile, ma ọ bụ akụ niile, nʻije ozi nke Chineke na mmadụ ibe anyịʻ] ma oriri nsọ unu nye Onye Kachasị Elu, na-ekwuputa mmehie gị niile nye nwanne gị nwoke, na niihu Onyenwe anyị.” Anyị na-abịakọta ọnụ ọbụghị inwe ngwori ma ọ bụ ka akpụọ gị ọbịa—dị ka site nʻaka band, iji maa atụ—mana icheta Ya na ka “akuziere gị nʻụzọ kacha zuo oke” nʻozi ọma Ya.
Nʻọgbakọ zuru ọha kachasị nso nso, Okenye Patrick Kearon cheteere anyị na “anyị anaghị agbakọta ọnụ nʻỤbọchị izu ike naanị ịga nzukọ oriri nsọ ma kachapụ ya na ndepụta anyị. Anyị na-agbakọta ife ofufe. Enwere nnukwu ndịiche n’etiti ha abụọ. Ịga aga pụtara ịnọ n’ebe ahụ. Mana ife ofufue bụ ịkpachapụ anya n’eto ma na na-ahụ Chineke anyị naanya n’ụzọ nke na-enwogharị anyị!”
Ịranye Ụbọchị izu ike anyị niile nye Onyenwe anyị na nzube Ya niile bụ nʻonwe ya omume nke ife ofufe. Afọ ole ma ole gara aga, mgbe ahụ Okenye Russell M. Nelson chọpụtara: Kedụ otu anyị si asọpụrụ Ụbọchị Izu ike? N’afọ mgbe m kacha dị nta, a mụrụ m ọrụ nke ndị ọzọ ndị chịkọtaworo ndepụta niile nke ihe ndị a ga-eme na ihe ndị agaghị eme n’Ụbọchị izu ike. Ọ bụghị tutu ruo mgbe e mesịrị ka m mụtara site n’akwụkwọ nsọ na omume m na agwa m n’Ụbọchị izu ike gụnyere ihe iriba ama n’etiti mụ na Nna m nke Eluigwe [lee Ọpụpụ 31:13; Izikel 20:12, 20]. Site na nghọta ahụ, enweghịkwa m mkpa ndepụta niile nke ihe a ga-eme na ndị agaghị eme. Mgbe o ruru ime mkpebi ma otu ihe omume ọ dabara adaba ma ọ dabaghị adaba maka Ụbọchị izu ike, a jụrụ m nnọọ onwe m, ‘Kedụ ihe iriba ama m chọrọ inye Chineke?’”
Ofufe nʻụbọchị nke Onyenwe anyị ka a na-eji otu nlekwasị anya amata maka nnukwu aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Anyị na-an̄ụrị ọn̄ụ nʻụzọ kwesịrị ekwesị ma pụọ iche Mbilite n’ọnwụ Ya na Ista mana kwa izu ụka ọbụla dị ka anyị na-eri ihe nnọchianya oriri nsọ nke Aja mgbaghara mmehie Ya, gụnyere Mbilite n’ọnwụ Ya. Maka ndị dị nchegharị, iri oriri nsọ bụ isi ihe nke ofufe Ụbọchị izu ike.
Ifekọta ofufe ọnụ dị ka “otù nke Kraịst” nwere ike na uru ndị pụrụ iche dị ka anyị na-akuzi, na-eje ozi, ma na-akwado onye na ibe ya. Nʻụzọ dị mmasị, otu ihe ọmụmụ chọpụtara na nso nso a nke ndị ahụ na-ahụta ndụ ime mmụọ ha dị ka nke onwe kpamkpam anachaghị etinye uto ime mmụọ ha nʻisi ihe, ma ọ bụ kwuo na okwukwe ha dị oke mkpa, ma ọ bụ inwe oge nraranye ha na Chineke mgbe niile. Dị ka ọhaobodo Ndị nsọ, anyị na-agbakọrịta ibe anyị ume nʻofufe na nʻokwukwe.
Ọbụna otu a, anyị enweghị ike echefu omume niile nke ofufe kwa ụbọchị nke anyị na-eme nʻotu nʻotu ma nʻebe obibi. Onye Nzọpụta na-echetere anyị, “Otu o sila dị nkwa unu niile ka unu ga-enye n’ezi omume n’ụbọchị niile ma n’oge niile.” Otu nwanne nwanyị chọpụtara nke ọma, “Enweghị m ike iche maka ụzọ kacha dị omimi iji fee Chineke ofufe karịa ịnabata obere ụmụ Ya niime ndụ anyị ma lekọta ha ma kuziere ha atụmatụ Ya maka ha.”
Alma na Amiulek kuziiri Ndị Zoram ndị amachibidoro site nʻụlọ ekpere ha niile ife Chineke ofufe ọ bụghị naanị otu ugboro n’izu mana mgbe niile, ma nʻebe ọbụla ọ bụ unu nwere ike ịnọ.” Ha kwuru banyere ekpere dị ka ife ofufe:
“Unu ga-awụpụtarịri mkpụrụ-obi unu nile n’ime ụlọ-nta unu nile, na ebe nzụzọ unu nile, na n’ime ọzara unu.
“Ee, ma mgbe unu ebekurughị Onyenwe anyị, kwenụ ka obi unu juputa, wụpụta nʻekpere nye ya esepụghị aka.”
Ha kwukwara maka inyochagharị akwụkwọ nsọ, na-agba ama banyere Kraịst, na-eme omume afọ ọma niile na ije ozi, na-anabata Mmụọ Nsọ, ma na-ebi ndụ nʻobi ekele kwa ụbọchị. Tụlee echiche ahụ: “ibi ndụ nʻobi ekele kwa ụbọchị.” Ọ na-ekwuru echiche m nke abụọ:
Agwa niile na Mmetụta niile ke Ebumpụta ụwa dị niime Ife Ofufe
Mmetụta na igosipụta obi ekele nye Chineke bụ, nʻezie, ihe na-enye ife ofufe mmetụta uju mmegharị ọn̄ụ ọhụrụ nke megidere ịhụ ya naanị dị ka otu ọrụ ọzọ.
Ezi ofufe pụtara ịhụ Chineke naanya na inyefe uche anyị na nke Ya—onyinye kachasị dị oke ọnụ ahịa anyị nwere ike inye. Mgbe a jụrụ olee nke bụ iwu nsọ ukwuu dị niime iwu ahụ niile, Jizọs zaghachiri, “Ị ga-ahụ Onyenwe anyị Chineke gị naanya jiri obi gị niile, jirikwa mkpụrụ obi gi niile, jirikwa uche gị niile.” Ọ kpọkwara nke a iwu nsọ mbụ.
Nke a bụ nsoro ofufe nke Jizọs nʻonwe ya nye Nna. Ndụ Ya na aja mgbaghara mmehie Ya ka aranyere nʻotuto nke Nna. Anyị na-echeta nke ọma arịrịọ na-agbawa obi nke Jizọs nʻetiti ntaram ahụhụ na nhujuanya na-enweghị atụ: “O Nna m, ọ bụrụ ma o kwe omume, kwe ka iko nke a gafee m,” mana emesịa nrube isi Ya “kosiladị ọbụghị ka M sị chọo, mana otu i siri chọọ.”
Ife ofufe bụ ịgba mbọ isoro ọmụmaatụ nke a zuru oke. Anyị agaghị erute ntozu oke nihe nke taa taa, mana ọ bụrụ ma ụbọchị ọbụla anyị “enye maka ihe aja nye [Ya] obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị,” Ọ gakwa eme anyị baptizim jiri Mmụọ Ya ma jiri amara Ya mejuputa anyị.
Nke atọ, Naanị ihe Gbasara Ofufe Anyị
Na nkeji nke mbụ nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, Onyenwe anyị kwuru ebubo nke a nye ụwa:
“Niihi na ha akpafuwo site n’emume nso m niile, ma mebiwo ọgbụgba ndụ m mgbe niile na-adigide;
“Ha anaghị achọ Onyenwe anyị iji hiwe ezi omume ya, mana onye ọbụla na-eje ije nʻụzọ nke onwe ya, na dị ka oyiyi nke chi nke onwe ya, onye oyiyi ya dị na oyiyi nke ụwa.”
Ọ dịịrị anyị mma ichete ọmụmaatụ nke ndịikom nta ndị Juu atọ Hananiah, Mishael, na Azarịa, adọkpụụrụ nagha ruo Babịlọn mgbe na-eteghị anya Lehi na ezi na ụlọ ya hapụrụ Jerusalem. Onye ụlọọrụ ndị Babịlọn gụgharịrị ha aha Shadrak, Meshach, na Abed-nego. Emesịa, mgbe mmadụ atọ ndị a jụrụ ife akpụrụakpụ nke Eze Nebuchadnezzar hiwere, o nyere iwu ka atụba ha niime ite ọkụ ọjọọ ahụ na-ere ọkụ, na-asị ha, “Ma onye bụ Chineke ahụ nke ga-anapụta unu site nʻaka m?”
Ị ga-echeta azịza obi ike ha:
“Chineke anyị onye anyị na-ejere ozi pụrụ ịnapụta anyị site nʻite ọkụ na-ere ere, ma ọ ga-anapụta anyị site nʻaka gị, O eze.
“Ma ọ bụrụ na ọ bụghị, marakwa na … na anyị agaghị efe chi gị ndị a, ma ọ bụ fee oyiyi ọlaedo gị nke i hiweworo.”
Ite ọkụ ahụ dịịrị ọkụ nke ukwuu nke mere na o gburu ndị ahụ tụbara ha niime ya, mana Shadrak, Meshach, na Abed-nego enweghị mmerụ ahụ ọbụla. “Emesịa Nebuchadnezzar kwuru, ma sị, Ngọzi dịrị Chineke nke Shadrak, Meshach, na Abed-nego, onye nke … napụtaworo ụmụ odibo ya ndị tụkwasịrị obi na ya, ma nyefee ahụ ha niile, ka ha ghara ije ozi ọbụghị ma ife chi ọzọ ofufe, ewezuga Chineke nke ha onwe ha.” Ha tụkwasịrị obi na Jehova maka nnapụta, “mana ọ bụrụ na o meghị,” nke bụ, ọbụna ọ bụrụ ma Chineke na amamiihe Ya egbochighị ọnwụ ha, otu ọ dị ha ga-anọgịde na ntụkwasị obi na Ya.
Ihe ọbụla na-ebute ofufe nke Nna na Ọkpara ahụ ụzọ na-aghọzi arụsị. Ndị ahụ na-ajụ Chineke dị ka nsipụta nke eziokwu, ma ọ bụ jụ inye Ya nkọwa, n’ụzọ dị irè dochiri onwe ha dị ka chi ha. Onye nke na-edebe ikwesị ntụkwasị obi nye otu ma ọ bụ ihe karịa odudu sinachi na-efe chi ụgha. Ọbụna ndị ahụ na-asị na ha na-efe Chineke mana anaghị edebe iwu nsọ Ya niile na-eje ije nʻụzọ nke onwe ha: “Ha ji ọnụ ha abịaru m nso, mana obi ha dị anya site nʻebe m nọ.” Isi ihe nke ofufe anyị bụ naanị “naanị ezi Chineke, nakwa Jizọs Kraịst, onye ahụ [O] ziteworo.”
Nikpeazụ, Mkpa In̄ọmi Nna na Ọkpara ahụ
Emesịa, otu anyị si ebi ndụ nwere ike bụrụ ihe kachasị mma, ụdị ofufe kachasị bụrụ eziokwu. Igosi nraranye anyị pụtara ịn̄ọmi Nna na Ọkpara ahụ—na-azụlite njirimara Ha na agwa Ha niime onwe anyị. Ọ bụrụ na, dị ka esi ekwu, nn̄ọmi bụ ụdị ire ụtọ kachasị dị ire, mgbe ahụ anyị nwere ike kwuo na nsọpụrụ nye Chi, in̄ọmi bụ ụdị nsọpụrụ kachasị dị ire. Nke a tụpụtara mbọ dị nkọ, akwadoro naka anyị iji chọta ịdị nsọ. Mana ịdịrị karịa dị ka Kraịst bụkwa mpụtara eke nke omume ofufe anyị niile. Nkebiokwu nke Okenye Kearon na mbụ banyere ife ofufe, nʻụzọ nke na-enwogharị anyị,” dị ịrịba ama. Ezigbo ofufe na-ebute mnwogharị.
Nke a bụ ịma mma nke ụzọ ọgbụgba ndụ— ụzọ nke ofufe, ịhụnaanya, na ikwesi ntụkwasị obi nye Chineke. Anyị na-abanye nʻụzọ ahụ site na baptizim, na-ekwe nkwa iwekwasị onwe anyị aha nke Kraịst na idebe iwu nsọ Ya niile. Anyị na-anata onyinye nke Mmụọ Nsọ, onye na-eje ozi nke amara nke Onye Nzọpụta nke na-agbapụta ma na-asacha anyị site na mmehie dị ka anyị na-echegharị. Anyị nwekwara ike kwuo na nʻichegharị anyị na-efe Ya ofufe.
Ihe na-esote bụ mgbakwunye emume nsọ ọkwa nchụaja na ọgbụgba ndụ niile emere niime ụlọ nke Onyenwe anyị nke na-aganiihu na-edo anyị nsọ. Mmemme niile na emume nsọ niile nke tempụl mejuputara ụdị ofufe dị elu.
Onyeisi Russell M. Nelson ekwusiwo ike na “onyeikom ọbụla na onyeinyom ọbụla ndị na-eso na emume nsọ ọkwa nchụaja niile na ndị na-eme ma debe ọgbụgba ndụ ha na Chineke nwere kpọmkwem ohere inwete ike nke Chineke.” Nke a abụghị naanị ike anyị na-adọrọ iji jee ozi na iji gọzie. Ọ bụkwa ike sinachi nke na-arụ ọrụ niime anyị iji nụchaa ma sachaa anyị. Dị ka anyị na-eje ije nʻụzọ ogbụgba ndụ, “ike ido nsọ nke ịdị ka chi na-apụta ìhè” niime anyị.
Ka anyị, dị ka Ndị Nifaị na Ndị Laman mgbe ochie, “daa nʻala nʻụkwụ nke Jizọs, ma … fee ya ofufe.” Ka anyị, dị ka Jizọs nyere niwu, “daa nʻala ma fee Nna ofufe nʻaha [nke Ọkpara].” Ka anyị nata Mmụọ Nsọ ma nyefee obi anyị nʻaka Chineke, enwekwala chi ọzọ ewezuga Ya, ma dị ka ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraist, n̄ọmie akparam agwa Ya niime ndụ nke onwe anyị. Ana m agba ama na dị ka anyị na-eme, anyị ga-enwete nhụmiihe ọn̄ụ nʻife ofufe. Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.