Nchegharị Gị Anaghị Enye Jizọs Kraịst Nsogbu; Ọ Na-amụke Ọn̄ụ Ya
Ọkpụkpọ oku ahụ ichegharị bụ ngosipụta nke ịhụnaanya nke Chineke. Ịsị ee nye ọkpụkpọ oku ahụ bụ ngosipụta nke ịhụnaanya nke anyị.
Ọtụtụ afọ gara aga mgbe m na-eme njem aga Florida, anọ m ọdụ nʻezi na-agụ akwụkwọ. Aha ya tụpụtara na anyị ka nwekwara ike ruo eluigwe ọbụnadị na anyị ezughị oke ugbua. Otu nwanyị na-agafe agafe jụrụ, “I chere na o kwere omume?”
E leliri m anya elu, na mgbagwoju anya, ma mesịa mata na ọ na-ekwu banyere akwụkwọ ahụ m na-agụ. E kwuru m ihe na-atọ ọchị dị ka, “Ọ dị mma, agụmibeghị m ya, mana aga m eme ka ịmara otu o si bie.”
O, ọ dị m ka m ga-ebula uche azụ! A gaara m agwa ya, “Ee, o kwere omume! Niihi na eluigwe abụghị maka ndị ahụ na-ezuworịị oke; ọ bụ maka ndị na-enwetawo mgbaghara, ndị họọrọ Kraịst mgbe na mgbe.”
Taa a chọrọ m ikwu okwu nye ụfọdụ niime anyị ndị mgbe ụfọdụ na-eche, “Nchegharị na mgbaghara yiri ka ihe na-arụrụ onye ọbụla ọrụ ewezuga m.” Ndị na-eche na nzuzo, “Ebe m nọ na-eme kwa otu ụdị mmejọ ahụ, elemanya nke a bụ otu m dị.” Ndị ahụ ndị, dị ka m, nwere ụbọchị mgbe ụzọ ọgbụgba ndụ dị ka ihe dị oke omimi, ọ dịcha nnọọ ka inyi ugwu ọgbụgba ndụ!
Otu onye mgbasa ozi ọma dị egwu na Australia, Okenye QaQa sitere na Fiji, kọrọ maka mmetụta yiri nke a na-ama ya dị ka ọ na-apụ apụ: “Ama m na Chineke hụrụ m naanya, mana mgbe ụfọdụ ana m eche, ʻChineke ọ ma na m hụrụ Ya naanya?ʻ Niihi na ezughị m oke, ma aka m na-emekwa mmejọ.”
Niime otu ajụjụ ahụ dị nro, na-agbakarị nʻobi, Okenye QaQa chịkọtara ọnụ kpọm kwem ihe m na-echekarị uche ya ọtụtụ mgbe. Ikekwe ị nọkwa na-atụ anya, na-eche, “Ana m agbalịsi ike nke ukwuu, mana Chineke ọ maara na m na-agbalị nʻezie? Mgbe m nọgidere na-ada, Chineke ọ ka makwa na m ka hụrụ Ya naanya?”
Ọ na-ewute m ikwete nke a, mana mụ onwe m kwa naara atụ ntụ mmekọrịta mụ na Onye Nzọpụta site nʻotu m si na-ebi ndụ zuru oke. E cheburu m na ndụ nrube isi pụtara na m agaghị enwe mkpa ichegharị. Ma mgbe m mere mmejọ, nke bụ ụbọchị niile, ana m ewezuga onwe m site na Chineke, na-eche, “Ọ ga-enwe oke ndakpọ olileanya niime m.”
Ọ bụghị nnọọ eziokwu.
Amụtawo m na ọ bụrụ na i chere tutu ruo mgbe ị dị ezigbo ụcha ma ọ bụ enweghị ntụpọ zuru oke ịgakwuru Onye Nzọpụta, ị daala ya kpamkpam.
Ọ bụrụ kwanụ na anyị echee gbasara iwu nsọ niile na nrube isi nʻụzọ dị iche?
Ana m agba ama na ebe Chineke na-eche gbasara amaghị ama anyị, Ọ na-echekarị uche maka ihe na-eme mgbe anyị mejọchara. Anyị ga-echighachikwuru Ya mgbe na mgbe? Anyị ga-anọgide niime mmekọrịta ọgbụgba ndụ nke a?
Ikekwe ị na-anụ okwu niile nke Onyenwe anyị “Ọ bụrụ na [ị] hụrụ m naanya, dobe iwu nsọ m niile” ma dịrị ka akwụfere gị akwụfe niihi na idobeghị iwu nsọ niile. Ka m chetara unu na ọ bụkwa iwu nsọ ichegharị! Eziokwu, o nwere ike bụrụ iwu nsọ akachasị kwugharịa niime akwụkwo nsọ.
Nʻokwu Alma na-ekwuru naanị onwe ya, “O a sị na m bụ mmụọ ozi, ma nwere ike mee ka ọ bụrụ echiche nke obi [m] … ma tie mkpu nchegharị,” ọ naraghị anwa imenye anyị ihere site na-ịrụtụ aka na mmehie anyị. Ọ chọburu iti mkpu nchegharị nke ga-eme ka mụ na gị nwee ike izere ịta ahụhụ nʻụwa. Otu ihe kpatara Alma jiri kpọọ mmehie asị bụ niihi na ọ na-akpatara anyị ihe mgbu.
Mgbe ụfọdụ ana m echeta, dị ka Post-it nootu nọ na-ezuihu m, na iwu nsọ niile bụ ụzọ esi ezere ihe mgbu. Ma nchegharị bụkwa. Onye amụma anyị kwuru, “Onye Nzọpụta hụrụ anyị naanya mgbe niile mana kachasị mgbe anyị chegharịrị.”
Ya mere mgbe Onyenwe anyị na-asị, “Chegharịanụ, Chegharịanụ,” ma ọ bụrụkwanụ na i chere na Ọ na-asị, “A hụrụ m gị naanya. A hụrụ m gị naanya.” Hụta Ya nuuche ka ọ na-arịọ unu ịhapụ agwà ahụ na-akpatara unu ihe mgbu, na-akpọku unu isite nʻọchịchịrị pụta ma chigharịa na ìhè Ya.
Na ngalaba ukwu nke nwa anyị nwanyị Carly, onye nchụaja ọhụrụ gbisara ịgọzi oriri nsọ, ma kama ikwu, “Ka ha nwee ike mee ya na ncheta nke ọbara Ọkpara gị,” o kwuru na-amaghị ama, “Ka ha nwee ike mee ya na ncheta nke ịhụnaanya nke Ọkpara gị.” Anya mmiri juru Carly naanya mgbe eziokwu nke okwu ndị ahụ mibara ime.
Onye Nzọpụta anyị dị njikere ịta ahụhụ mgbu nke Aja mgbaghara mmehie Ya niihi na Ọ hụrụ unu naanya. Nʻezie, unu bụ “ọn̄ụ ahụ nke edebere niihu Ya” mgbe Ọ na-ata ahụhụ.
Ọkpụkpọ oku ahụ ichegharị bụ ngosipụta nke ịhụnaanya nke Chineke.
Ịsị ee nye ọkpụkpọ oku ahụ bụ ngosipụta nke ịhụnaanya nke anyị.
Hụ nuuche gị oyiyi nke Kraịst kacha masị gị. Ugbua hụ Ya nʻechiche gị ka Ọ na-achị ezigbo ọchị nʻọn̄ụ oge ọbụla ijiri onyinye Ya mee ihe, niihi na Ọ bụ “ihe nke olileanya zuru oke.”
Ee, nchegharị gị anaghị enye Jizọs Kraịst nsogbu; ọ na-amụke ọn̄ụ Ya!
Ka anyị kuzie nke ahụ!
Niihi na nchegharị bụ ozi kachasị dị anyị mma!
Anyị anaghị anọ n’ụzọ ọgbụgba ndụ site na-emeghị mmejọ ma ọlị. Anyị na-anọ n’ụzọ ọgbụgba ndụ site na ichegharị ụbọchị niile.
Mgbe anyị na-echegharị, Chineke na-agbaghara na-emenyeghị anyị ihere, na-ejighị onye ọzọ tụnyere anyị, ma ọ bụ ịbara anyị mba niihi na nke a bụkwa otu ihe ahụ anyị ji na-echegharị maka ya izu ụka gara aga.
Ọ na-enwe obi ụtọ oge ọbụla Ọ hụrụ anyị nʻikpere anyị. Ọ na-enwe mmasị ịgbaghara anyị niihi nye Ya anyị bụ ndị nwere obisarịsarị.
Icheghị nnọọ na nke ahụ bụ naanị eziokwu?
Mgbe ahụ gịnị mere o ji ara anyị oke ahụ ikwere?!
Setan, nnukwu onye ebubo na onye nduhie, na-eji ihere akwapụ anyị site nʻebe Chineke nọ. Ihere bụ ọchịchịrị dị oke arụ o ji dị ka ọ bụrụ ma i wepụ ya site na-ahụ gị, ọ ga-enwe nke bụ ezigbo arụ ya ma ọ bụ ibu nye ya.
Ihere bụ olu nke na-eti gị ihe, na-asị, “Gịnị ka ị naara eche?” “Inwewo mgbe i mere ihe ziri ezi?”
Ihere anaghị agwa anyị na anyị mere mmejọ; ọ na-agwa anyị na anyị bụ mmejọ nke anyị. Ọbụna ị nwere ike ịnụ, “Zoo.” Onye iro na-eme ihe ọbụla dị nʻike ya iji dobe ịnyị arụ ahụ niime, na-agwa anyị na ọnụ ahịa ya dị ọnụ nke ukwuu, na ọ ga-aka adị mfe ma ọ bụrụ na nke a nọrọ nʻọchịchịrị, na-ewepụ olileanya niile.
Setan bụ onye ohi nke olileanya.
Ma i kwesịrị ịnụ nke a, ya mere aga m ekwusi okwu ndị a ike: Ị bụghị olu ahụ nọ nʻisi gị ma ọ bụ mmejọ ndị nke i meworo I nwere ike kwuputakwa nke ahụ ka anụ ya. Gwa Setan, “Ọ bụghị taa.” Tifee ya nʻazụ gị.
Nwee mmetụta ọdịdọ ahụ, mwute site na mmehie nke na-echigharị gị chuwe ihu nʻebe Onye Nzọpụta gị nọ, ma hụ ka amara ya si abanye niime ndụ gị na ndụ nke ndị ahụ ị hụrụ naanya. Ana m ekwe nkwa na nkeji ahụ anyị wetere obi tiwara etiwa nʻebe Ọ nọ nʻobi ike, Ọ nọ ebe ahụ ozugbo.
Ọ bụrụ na ị hụrụ onye na-erugbu na mmiri, ọ bụ na ị gaghị aga nye ya aka napụta ya? I nwere ike ịhụ nuuche gị Onye Nzọpụta na-ajụ aka isetịpụrụ? Ana m ahụta Ya nuuche m ịwụba niime mmiri ahụ, na-agbada nʻokpuru ihe niile ibuli anyị elu nke ga-eme ka anyị kuru ume ndụ! O nweghị onye nwere ike imikpu ala ala karịa ka ìhè nke Kraịst ahụ na-amụke amụke.
Kraịst ruo ebighị ebi na-amụke karịa ọchịchịrị nke ihere. Ọ gaghị ma ọlị ebuso uru ị bara. Ya mere lebaruo anya nso.
-
Tinye nuuche na aka nke a nọchiri anya uru.
-
Aka nke a nọchiri anya nrubeisi. Ikekwe itetara nʻụtụtụ a, kpee ezigbo ekpere, ma nyochaa akwụkwọ nsọ ịnụ olu nke Chineke. I mewo mkpebi ndị dị mma ma na-emeso ndị nọ gị gburugburu omume dị ka nke Kraịst. Ị na-ege ntị na ọgbakọ zuru ọha! Nrube isi gị nọ nʻebe a!
-
Ma ọ bụ ikekwe ihe niile agabeghị nke ọma otu dị mma. Ị gbawo mbọ mgbe na-adịbeghị anya ime ụmụ obere ihe ndị dị mfe iji nwee njikọ nʻeluigwe. I mewo ụfọdụ mkpebi nke na-enyechaghị gị obi ụtọ.
-
Olee uru ị bara? Aka nke a omegharịwo ma ọlị?
Ekedoghị uru ị bara nye nrube isi. Uru ị bara na-adịgide adịgide; ọ naghị agbanwe agbanwe ma ọlị. Ọ bụ Chineke nyere gị ya, ma enweghị ihe gị ma ọ bụ onye ọzọ nwere ike ime iji gbanwee ya. Nrube isi na-eweta ngọzi niile; nke ahụ bụ eziokwu. Mana mbamuru abụghị otu niime ha. Mbamuru gị “dị ukwuu n’anya nke Chineke mgbe niile,” na-agbanyeghị ebe ọbụla mkpebi gị na-eburuwo gị gaa.
Ebe m na-eme mmejọ, a chọrọ m ịnọ na mmekọrịta ọgbụgba ndụ mụ na Kraịst, ma aga m agwa gị ihe kpatara ya.
E toro m na-anata ọmụmụ ihe imikpu na mmiri ma mụta na mgbe ndị ọka ikpe kwuru mikpuo, ha na-eleba anya na mmezu ya. Mbanye ya ọ dikwa nnọo otu a chọrọ, mkpịsịrị ụkwụ ịmịpụ amịpụ na obere mgbasa mmiri? Emesịa ha na-eme ihe pụrụ ezigbo iche. Ha na-agụnye ogo ịra ahụ ya.
Onye ọbụla na-emikpu site na ogo ịra ahụ nke onwe ha. Ma Onye Nzọpụta gị bụ naanị onye maara nʻezie ihe isi ike nke iji na-emikpu. A chọrọ m mmekọrịta mụ na otu onye nke na aghọta m, onye nke maara obi m na ka m na-esi na-agbalisi ike!
Ọ maara na ijiriji nke ọchịchịrị na-adakwasị anyị niile ndị njem ma na njem anyị na-agafe site nʻakụkụ osimiri nke unyi—ya mere ọbụla mgbe anyị na-ejide aka nʻokporo igwe ahụ, mmiri ga-efesa anyị.
Ịbịakwute Kraịst bụ ị na-asị, “Ị ga-enyere m aka?” jiri olileanya, mmasi obi ike ekpughere na ogweaka Ya ka agbatịpụrụ gị mgbe niile. Ekwenyere m nhụta ọhụrụ banyere nchegharị pụtara na ọbụladị na anyị enweghị nrube isi zuru oke otu ọ dị, anyị na-anwa nrube isi dị ịhụnaanya ugbua, ịhọrọ ịnọrọ, ugboro ugboro, niihi na anyị hụrụ Ya naanya.
I chetara ndị nke Eze Benjamin, ndị na-enweghị kwa ohere ọbụla ọzọ ime ihe ọjọọ mana naanị ime ihe ọma esepụghị aka? I chere na ha kwakọọrọ ụlọikwuu ha niile, laa nʻebe obibi, ma meghịkwa mmejọ ozọ? Nʻezie mbanụ! Ndịiche bụ na ha achọzikwaghị ime mmehie ọzọ. Ha nwere nrube isi ịhụnaanya! Obi ha gbanwere ma chigharịa nʻebe Chineke nọ ebe ha na-agba mbọ!
Otu mgbe, nʻebe beach, a hụrụ m nnụnụ na-efeba nʻikuku, na-efesi nku ya ike nke ukwuu, ọbụna ruo na nke na-amaghị ka esi eme ya, mana na-anọgidekwa nʻotu ebe ahụ. Mgbe ahụ a hụtara m nnụnụ ọzọ, nọ nʻebe elu elu. O nwetewo ezigbo ume ma nʻefe nʻelu nʻụzọ dị mfe, na-enweghị nsogbu nʻikuku ahụ. Nke ahụ bụ ọdịiche dị nʻetiti ịgbalị ime nke a nʻonwe anyị na ichigharịkwute Onye Nzọpụta anyị, kwe ka O bulie anyị elu, jiri “ọgwụgwọ na nku ya.”
Dị ka ndị ndu mishọn na Australia, nʻoge nleta ikpeazụ anyị nke anyị na onye mgbasa ozi ọma ọbụla, anyị kwuru gbasara 3 Nefi 17, ebe ndị ahụ nọọrọ Onye Nzọpụta nso ma nụ Ya ka ọ na-ekpere ha ekpere. Anyị jụrụ, “Ọ bụrụ na i nwere ike ịnụ ka Onye Nzọpụta na-ekpe ekpere maka gị, gịnị ka i chere Ọ ga-ekwu?”
Ịnụ azịza ha bụ otu niime nhụmiihe nke ime mmụọ juputara na Mmụọ na ndụ m. Onye ọbula niime ndị mgbasa ozi ọma ahụ ga-akwụsịtụ, ma anya mmiri ga-eju ha anya dị ka anyị chetaara ha, “Onye Nzọpụta gị maara ogo nke ihe isi ike ị na-enwe. O metụrụ Ya na-ahụ!”
Nke a bụ ihe ndị mgbasa ozi ọma ndị ahụ jiri nwayọọ ma nʻobi dị nro kọọ: Otu nwanne nwanyị kwuru, “Jizọs ga-agwa Nna, ʻỌ na-eme ka ike ya ha. A maara m ka o si na-agbalịsi ike.ʻ” Otu okenye kwuru, “Site niihe niile mere na ndụ ya, ana m eweliri ya aka elu.”
Ka anyị nwalee nke a. Nʻabalị a, tupu gị e kpee ekpere. Were uche hụ Jizọs Kraịst na-akụkụ gị. Ọ bụ Onye nkwuchita ọnụ gị n’ebe Nna nọ. Jụọ onwe gị, “Gịnị ka Onye Nzọpụta ga-agwa Nna banyere m?”
Emesịa nọdụ nwayọọ.
N̄aa ntị nʻolu ahụ na-ekwu ihe niile dị mma gbasara gị—olu nke Onye Nzọpụta, enyi gị kachasị mma, na Nna gị bi n’Eluigwe, onye nke nọ nʻebe ahụ nʻezie. Cheta, ịhụnaanya Ha na uru ị bara dị ukwuu mgbe niile, na-agbanyeghị ihe ọbụla!
Eguzo m ebe a ịgba ama na Jizọs Kraịst na-enye ndị nọ nʻọchịchịrị ihè. Ya mere, nʻụbọchị ndị ahụ mgbe i nwere mmetụta olu ahụ na-asị gị gaa zoo, ma gị gaa zoo niime ọnụ ụlọ gbara ọchịchịrị nọrọ naanị nʻonwe gị, ana m akpọku gị ka i nwee obi ike ma kwenyere Kraịst! Gafere ma gbanye Ọkụ—Ihè nke Olileanya anyị Zuru oke.
Ijuputa nʻihè Ya, ị ga-ahụ ndị gbara gị gburgburu ebe niile ndị nwewokwara owu ọmụma, mana ugbua, site na ihè ahụ na-enwu enwu, vgị na ha ga-eche, “Gịnị mere anyị ji na-atụ oke egwu na ọchịchịrị? Ma gịnị mere anyị ji nọrọ ebe ahụ ogologo oge?”
“Ka Chineke nke Ìhè kpuchigide gị nʻogweaka Ya ma kasie gị obi ma hụ gị naanya esepụghị aka.” Ka anyị hụ Ya naanya esepụghị aka ma họrọ Ya, ugboro ugboro. Nʻaha nke Jizọs Kraịst, amen.