Appendix
Nna gị nke Eluigwe na-akpọku gị ịnata emume nsọ ndị dị nsọ. Emume nsọ ndị a gụnyere ọgbụgba ndụ—ị na-ekwe nkwa nye Chineke ma Ọ na-ekwe nkwa nye gị. Ị na-agba ndụ ndị a, nʻịmatụ, mgbe a na-eme gị baptizim na ime onye otù, mgbe ị na anata onyinye dị nsọ, na mgbe a na-arachi gị maka oge na mgbe niile na-adigide niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Ịgba ndụ na idebe ha ga-enwetere gị ọn̄ụ na obiụtọ ma ọ ga-ekwe ka i nwee ohere inwete ike nke Chineke iji nyere gị aka lọghachi n’iru Ya, ebe ị ga-erite ndụ ebighị ebi gị na Ya.
Iji mụtakwuo banyere ihe ị kwere Chineke na nkwa mgbe ịgbara ndụ ndị a—na ihe ndị Ọ kwere nkwa nye gị—lee Akwụkwọ ntụziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a, 3.5, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Tụgharịa uche nʻajụjụ niile nọ nʻokpuru Ha bụ ajụjụ ajụrụ gị mgbe agbara gị ajụjụ ọnụ iji nata tempụl rekọmendị, mana ịkwesịghị ịche maka ajụjụ ọnụ ọbụla. Mee nnyochagharị nke ime mmụọ nkeonwe gị oge ọbụla ịchọro.
Isiokwu Ndịinyom Nta, Isiokwu nke Ọkwa nchụaja nke Erọn, Iwu nsọ Iri nwere ike bụrụ ngwaọrụ enyemaka na nnyochagharị gị nkeonwe.
Ajụjụ nke Rekọmend Tempụl maka Ndịntorobịa
-
I nwere okwukwe niime na ọgbụgba ama nke Chineke, Nna nke Ebighị ebi; Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst; na Mmụọ Nsọ?
-
I nwere ọgbụgba ama nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na maka ọrụ Ya dịka Onye nzọpụta na Onye mgbapụta gị?
-
I nwere ọgbụgba ama nke Mweghachite nke oziọma nke Jizọs Kraịst?
-
Ị na-akwado Onyeisi nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a dịka onye amụma, ọhụụ ụzọ, na onye mkpughe na dịka onye naanị ya nwere ikikere n’elu ụwa iji ntụghe niile nke ọkwa nchụaja eme ihe? Ị na-akwado ndị otù nke Otù Ndịisi Mbụ na Ndị Kworum Ndị Ozi Iri na Abụọ dịka ndị amụma, ndị ọhụụ ụzọ, na ndị mkpughe? Ị na-akwado ndị ọzọ Ji Ikike Zuruọha na ndị ndụ ime obodo nke Nzukọ nsọ?
-
Onyenwe anyị ekwuwo na ihe niile ka a ga “eme n’ịdị ọcha” n’ihu Ya (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 42:41). Ị na-agba mbo maka agwa ịdị ọcha niime echiche gị niile na omume gị niile? Ị na-erube isi nye iwu nke ịdị ọcha mmekọrịta?
-
Ị na-esoro nkuzi niile nke Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst niime omume nke onwe gị na n’ihu ọha n’etiti ndị otù nke ezi na ụlọ gị na ndị ọzọ?
-
Ị na-akwado ma ọ bụ bugoo nkuzi niile ọbụla, omume, ma ọ bụ ozizi megidere ndị ahụ nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a?
-
Ị na-agba mbo idebe ụbọchị Izuike nsọ, ma n’ebe obibi ma na nzukọ nsọ; gaa ọgbakọ gị niile; kwadoo maka ma rie oriri nsọ na ntozu okè; ma bie ndụ gị ka ya na iwu niile na iwu nsọ niile nke ozi ọma magbaa?
-
Ị na-agba mbo ịkwụwa aka gị ọtọ niime ihe niile ị na-eme?
-
Ịbụ onye na-akwụzu otu ụzọ na ụzọ iri?
-
Ị ghọtara ma rube isi nye Okwu nke Amamihe?
-
Enwere mmehie ọjọọ niime ndụ gị nke ekwesịrị idozi n’aka ndị ji ikike ọkwa nchụaja dịka otu akụkụ nke nchegharị gị?
-
I kwere na gị tozuru okè ịbanye ụlọ nke Onyenwe anyị ma soro n’emume nsọ niile nke tempụl?
Isiokwu nke Ndịiyom Nta
Abụ m nwada ahụrụ naanya nke nne na nna nke eluigwe, nwere ọdịdị dị nsọ na akaraka dị ebighị ebi.
Dị ka onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, ana m agbasi mbọ ike ịdị ka Ya. Ana m achọ mkpughe nke onwe ma na-etinye ya n’ọrụ ma na-elekọta ndị ọzọ n’aha nsọ Ya.
Aga m eguzo ka onye aka ebe Chineke oge niile na n’ihe niile nakwa na-ebe niile.
Dị ka m na-agbasi mbọ ike itozu okè maka mbuli elu, onyinye nke nchegharị na-amasị m nke ukwuu ma ana m achọ ka ndụ m na-adịwanye mma ụbọchị ọbụla. Site na okwukwe, aga m akwalite ebe obibi m na ezi na ụlọ m, ma gbaa ma dobe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ, ma nata emume nsọ niile na ngọzi niile nke tempụl dị nsọ.
Isiokwu nke Ọkwa nchụ aja nke Erọn
Abụ m nwa nwoke ahụrụ naanya nke Chineke, ma O nwere ọrụ maka m ịrụ.
Jiri obi m nile, ike, uche, na ume, Aga m ahụ Chineke naanya, dobe ọgbụgba ndụ m niile, ma jiri ọkwa nchụaja Ya jeere ndị ọzọ ozi, bido niime ebe obibi nke m.
Dịka m na-gbalịsie ike ije ozi, nwee okwukwe, chegharịa, ma metazie ụbọchị ọbụla, a ga m etozu okè ịnata ngọzi niile nke tempụl na ọn̄ụ nke oziọma na-anọgide.
Aga m akwado ịbụ onye mgbasa ozi ọma siri ike, di kwesiri ntụkwasị obi, na nna nwere ịhụnaanya, site na-ịbụ ezi onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.
Aga m enye aka kwado ụwa maka mbịaghachi nke Onye Nzọpụta site nʻịkpọku onye ọbụla ịbiakwute Kraịst ma nata ngọzi nile nke Aja mgbaghara mmehie Ya.
Iwu nsọ Iri ahụ
-
Ị gaghị enwe chi ndị ọzọ tinyere m.
-
Ị gaghị emere onwe gị arụsị apịrị apị.
-
Ị agaghị ewere aha Onyenwe anyị Chineke gị mee ihe efu.
-
Cheta ụbọchị izuike, idebe ya nsọ.
-
Sọpụrụ nna na nne gị.
-
Ị gaghị egbu mmadụ.
-
Ị gaghị akwa iko.
-
Ị gaghị ezu ohi.
-
Ị gaghị agba ama ụgha.
-
Ị gaghị enwe anya ukwu nʻebe ihe mmadụ ibe gị nọ.
Lee Ọpụpụ 20:3–17.