12.
Jizọs Kraịst na-ewete ọn̄ụ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 101:36
Nna gị nke Eluigwe bụ onye ọn̄ụ. Ọ chọrọ gị, nwa Ya, ka ị nwe nnukwu ọn̄ụ nke ị ga-enwetenwu. Ọ bụ ya mere O jiri kwado atụmatụ nke obi ụtọ. O zitere Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, ịbụ Onye Nzọpụta gị ma kuzie ozi ọma Ya. Okwu ahụ ozi ọma pụtara “ozi dị mma,” ma ozi ahụ dị mma bụ na nihi Jizọs Kraịst, i nwere ike nwee obi ụtọ na ndụ nke a na ọn̄ụ nʻuju ya ruo ebighị ebi.
Eziokwu ndị dị Ebighị ebi
Nzube enwere maka gị bụ ka inwe obi ụtọ na ọn̄ụ. Nke ahụ bụ ebumnuuche nke ndụ gị. Ọ bụ ebumnuuche atụmatụ obi ụtọ nke Nna nke Eluigwe. Nke ahụ apụtaghị na ịgaghị ma ọlị enwe mwute ma ọ bụ nwee oge niile nke ihe isiike. Mana ọ pụtara na Onye Nzọpụta nwere ike ịnyere gị aka gabiga oge niile nke ihe isiike ma chọta ọn̄ụ.
Ọn̄ụ anaghị abịa site na ọnọdụ gị niile; ọ na-abịa site na-isoro Jizọs Kraịst. I nwere ike nwee ụbọchị ọjọọ, izuụka ojọọ, ma ọ bụ afọ ọjọọ. Mana ọn̄ụ apụtaghị enweghi mwute niime ndụ gị; ọ pụtara inwe Kraịst niime ndụ gị.
Ọn̄ụ nke Onye Nzọpụta dị ukwuu karịa ma ga-anọgide karịa ihe ọbụla ọzọ. Ekwensụ ga-anwa gị ọnwụnwa ka ịchọ ihe ụtọ na nriju afọ niime ụzọ niile nkeonwe ma ọ bụ site na ihe ụtọ nke ụwa. Ihe ọbụla na-adabaghị na Jizọs Kraịst na nʻiwu nsọ Ya enweghi ike ma ọlị ewete ezi ọn̄ụ na obiụtọ nke na-anọgide. Chetakwa na ihe niile nke ụwa nke a bụ maka nwantịtị oge. Ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-enye ọn̄ụ na obiụtọ nke mikpuru ime, dị nsọ, ma dị ebighị ebi.
Ọkpụkpọ okù niile
Họrọ ọn̄ụ. Agbanyeghị na ọ bụ eziokwu na enwere mwute na ihe isiike niime ụwa nke a, Nna nke Eluigwe nʻotu aka ahụ emejuputawo ụwa jiri ọtụtụ ihe ndị mara ama ma zie ezie. Chọpụta ha. Gbalịa ịchọta ihe ndị ga-eme ka an̄ụrịa ọn̄ụ ụbọchị ọbụla—ikekwe i nwere ike detụọ ha edetuo. Ndị a bụ onyinye sitere nʻaka Nna gị nke Eluigwe dị ịhụnaanya.
Wetere ndị ọzọ ọn̄ụ na obiụtọ. Jizọs Kraịst chọtara ọn̄ụ nʻuju ya site na-inwetere anyị ọn̄ụ. I nwere ike isoro ọmụmatụ Ya site na-ịchọta ọn̄ụ na obiụtọ nʻijere ndị ọzọ ozi. Nyere otuonye aka mata na-ahụrụ ya naanya. Nye ekele si n’obi Gbaa otuonye ume onye na-adọlị adọlị. Ọ bụrụ na ịchọọ ọn̄ụ bakwuru ụba niime ndụ gị, gbalịa wetere onye ọzọ ọn̄ụ.
Bụrụ onye ọn̄ụ nʻofufe nke Onyenwe anyị. Mgbe ị gara nzukọ nsọ, lekwasị anya nʻọn̄ụ ahụ nke Jizọs Kraịst nyere gị, ma nye Ya otuto maka nke ahụ! Rụọ ọrụ nke gị iji rọpụta mmụọ ọn̄ụ niime ọgbakọ niile nke Nzukọ nsọ gị. Mee ka egwu dị nsọ bụru otu akụkụ nke ofufe gị n’ebe obibi nakwa na nzukọ nsọ.
Ngọzi ndị Ekwere na nkwa
I nwere ike inwete ọn̄ụ, ọbụna mgbe ndụ siri ike. I nwere ike na-atule otu nke a ga-esi kwee omume, mana ọ bụ eziokwu. Okwukwe gị na Jizọs Kraịst, ike ọgwụgwọ Ya, na nkwa ebighị ebi Ya nwere ike nye gị ọn̄ụ na-adịgide. Ọn̄ụ Ya na-ekpuchi iru uju ma na-ewete udo nke karịrị nghọta niile.
Ọn̄ụ nʻuju ya na-eche gị niime alaeze seletịal. Jizọs Kraịst meriri ihe niile nke nwere ike igbochi gị site nʻinwete ọn̄ụ dị ebighị ebi. Dịka ị na-atụkwasị obi na Ya ma na-esoro Ya, ọn̄ụ nke a ga-abụ nke gị.
Ajụjụ na Azịza niile
Ọbụrụ na ozi ọma ahụ bụ nke ọn̄ụ, gịnị mere m ji enwe mwute dị otua? Inwe mwute nʻobi abụghị akara na ị naghị ebi ndụ ozi ọma ahụ. Ndụ nke onye niile gụnyere ihe isiike, mnwale, na iru uju. Isoro Jizọs Kraịst anaghị agbanwe nke a, mana ọ na-ejikọta gị na Onye Nzọpụta onye pụrụ ịkasị gị obi ma nyere gị aka chọta ọn̄ụ na obiụtọ.
Gịnị mere ejiri nwee oke ntaram ahụhụ niime ụwa? Ụfọdụ ntaram ahụhụ niime ụwa na-abịa nihi na ndị mmadụ jiri ohere nhọrọ ha mee nhọrọ ndị nʻezighi ezi. Nke a nwere ike butere ha ntaram ahụhụ ma butekwara ndị ọzọ. Nʻọnọdụ ndị ọzọ, ntaram ahụhụ esighi nʻaka onye ọbụla—ọ bụ nnọọ nihi ibi niime ụwa nʻezughi okè. Na-agbanyeghị ọnọdụ ọbụla, ọ bụ ihe mgbawa obi ịhụ otuonye na-ata ahụhụ, tụmadị onye ịhụrụ naanya. Nwee mmasị obi ike na Chineke na-enwekwa mwute mgbe ị na-ata ahụhụ. Ọ na-ekwe ka mnwale niile nke ndụ anụ ahụ nyere gị aka too ma kwado gị maka ọn̄ụ ebighị ebi gị na Ya, mana Ọ naghị ahapụ gị ịta ahụhụ nke a naanị gị. O zitere Jizọs Kraịst ịwekwasị Onwe Ya ihe mgbu gị ka Ọ nwee ike nyere gị aka. Jizọs Kraịst bụ ume gị! Ma Ọ na-akpọku gị, dịka otu niime ndị na-eso Ya, ka ị mee ihe i nwere ike ime iji nye aka belata ntaram ahụhụ ndị ọzọ.
Lee Abụ ọma 16:11 (nʻiru Chineke ka enwere ọn̄ụ nʻuju ya); 95:1 (bụọrọ Onyenwe anyị abụ); Jọn 16:33 (nwee obi ụtọ, Jizọs Kraịst emeriwo ụwa); Ndị Galeshia 5:22 (mkpụrụ nke Mmụọ ahụ bụ ọn̄ụ); Ndị Hibru 12:2 (Jizọs nagidere ntaram ahụhụ Ya nihi ọn̄ụ nke ịzọpụta ụmụ nke Chineke); 2 Nefi 2:25 (Chineke chọrọ ka inwe ọn̄ụ); Alma 26:15–16 (ịrụ ọrụ nke Chineke na-ebute ọn̄ụ); Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:15–16 (ọn̄ụ gị ga-adị ukwuu mgbe ị nyeere ndị ọzọ aka bịakwute Kraịst).
Ajụjụ nke Rekọmend Tempụl
-
I nwere ọgbụgba ama nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na ọrụ Ya dịka Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta gị?