Ozi sitere nʻaka Otù Ndịisi Mbụ
Ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwanyị dị anyị nʻobi,
Anyị hụrụ unu n’anya, ma anyị nwere obisiike n’ebe unu nọ. Nʻezie unu sonyere nʻetiti ụmụ mmụọ nke Nna nke Eluigwe họọrọ, ezitere nʻụwa nʻoge nke a ime ihe ndị dị mkpa.
Unu siri ike ma nwee ike karịa otu unu nwere ike i si chee. Ma mgbe unu dabeere na Onye Nzọpụta, ume unu ga-etolitekwa karịa. Ọ bụ “ume nke ndi ntoroọbịa.”
Ntuziaka nke a ga-enyere unu aka wuo ntọala siri ike maka ime nhọrọ niile iji nọrọ n’ụzọ ahụ na-eduba na ndụ ebighị ebi. Ọ ga-enyere unu aka kwadoo ịgba ọgbụgba ndụ niile dị nsọ niime tempụl, kwadoo ije ozi mgbasa ozi ọma, ma chọta ọn̄ụ na-isoro Jizọs Kraịst nʻoge ndụ unu niile. Unu nwere ọnọdụ dị mkpa niime Nzukọ nsọ Ya. Jizọs Kraịst ga-enyere unu aka mezuo ebumnuuche Ya niile maka unu.
Anyị maara na Chineke dị ndụ. Ọ bụ ekpere anyị na unu ga-eguzosiike nʻụzọ ọgbụgba ndụ ahụ—ụzọ nke ịgba na idobe ọgbụgba ndụ dị nsọ nʻetiti anyị na Chineke. Nke ahụ bụ ụzọ na-edughachi azụ nʻebe Nna unu nke Eluigwe nọ. Dịka unu na-eme, unu ga-abụ ike mmetụta maka ezi ihe, wee na-ekesa ozi ọma nʻọn̄ụ, na-akpọkọta ụmụ nke Chineke, ma na-akwado ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta. Cheta: Jizọs Kraịst bụ ume unu!
Otù Ndịisi Mbụ