Ibe ana agu akwụkwọ
9. A gọziri gi site nʻọtụghe niile na ikikere nke ọkwa nchụaja


ndị ozi nke eluigwe na-eweghachite ntụghe niile nke ọkwa nchụaja niime Tempụl Kirtland

9.

A gọziri gi site nʻọtụghe niile na ikikere nke ọkwa nchụaja

Matiu 16:18–19

Mgbe Jizọs kuziiri Pita ihe banyere ikikere nke ọkwa nchụaja, o kwuru maka ntụghe niile. Ntụghe niile ka a na-eji akpọpe ma na-akpọghe ihe. Ntụghe niile nke ọkwa nchụaja nwere ike ịkpọghe ike niile, onyinye niile, na ngọzi niile nke Chineke niime ndụ gị.

Eziokwu ndị dị Ebighị ebi

Ntụghe niile na ikikere nke ọkwa nchụaja na-abịa site na Jizọs Kraịst. Onye ọbụla ji ọkwa nchụaja nwere ike ịgbasoro ikikere ya rute nʻebe Ọ nọ. Ọ bụ Onye Nzọpụta na-ahọpụta onye ga-anata ikikere nke a na onye ga-anata ntụghe niile nke ọkwa nchụaja. Anyị nwere ntụkwasị obi na mmata ihe Ya zuru okè.

Jizọs Kraịst eweghachiwo ọkwa nchụaja Ya nʻụbọchị anyị. Ọ na-edu otu esi ejiri ọkwa nchụaja ahụ arụ ọrụ. Adam, Mozis, Pita, na ọtụtụ ndị amụma ndị ọzọ kemgbe agụgụala nataworo ntụghe niile nke ọkwa nchụaja. Nʻụbọchị anyị, Josef Smit natara ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja site nʻaka Jọn Omee Baptizm, Pita, Elias, Elijah, na ndị ọzọ. Ndị otù nke Otù Ndịisi Mbụ na Kworum nke Ndịozi Iri na abụọ ji ọtụghe niile niile nke ọkwa nchụaja nʻụwa taa. Ndị ndu ime obodo na ndịisi kworum jikwa ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja maka ọkpụkpọ okù nke ha. Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja na-achị ọrụ nke Chineke. Ha na-enye ndịkom na ndịinyom ike na ikikere iji nyee aka nʻọrụ ahụ.

Ikikere nke ọkwa nchụaja na-agọzi ụmụ niile nke Chineke. Nihi eweghachiri ọkwa nchụaja, ị nwere ike nata emume nsọ niile ma mee ọgbụgba ndụ gị na Chineke. Ị nwere ike rụọ ọrụ nʻaha Chineke mgbe ịnatara ọrụ ma ọ bụ ọkpụkpọ okù site nʻaka onye ahụ ji ikikere.

Ọkpụkpọ okù niile

Nabata ọkpụkpọ okù nke Nzukọ nsọ ma jee ozi na-ikwesị ntụkwasị obi. Mgbe ọbụla i natara ọkpụkpọ okù nke Nzukọ nsọ, a na-edopu gị iche jiri ikikere sitere na Chineke iji eje ozi nʻọrụ ahụ. inwekwara ike inwete nduzi site nʻaka Chineke maka ije ozi. Dịka ị na-eje ozi, ị na-anọchite anya Jizọs Kraịst. Nyecha Ya ihe niile i nwere

Kwadoo ndị ahụ Chineke kpọrọ ije ozi. Ịnye nkwado pụtara ihe karịrị iweli aka gị elu oge akpọpụtara otu aha nʻọgbakọ nke Nzukọ nsọ. Ọ pụtara itinye aka na ịnyeaka. Chọọ ụzọ ndị ị ga-esi egosi na ị na-akwado ndị ahụ Jizọs Kraịst kpọrọ ije ozi niime Nzukọ nsọ Ya.

Mejupụta ọrụ ndị ahụ ndị ndu Nzukọ nsọ kenyere gị—gụnyekwara ndị ahụ sitere nʻaka ndịisi kworum na klasị gị. Ha nwere ikikere sitere nʻaka Chineke, nke ha nyefere gị maka ọrụ ahụ ekenyere gị. Enwere ike ịkenye gị ije ozi nlekọta nye otuonye, nabata ndị mmadụ dịka ha na abịa nʻọgbakọ oriri nsọ, ma ọ bụ nye aka nʻihe ndị ana eme eme. Nagbanyeghi ọrụ ọbụla ekenyere gị, hụta ya dịka ohere ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst na ijere ụmụ Chineke ozi.

Jizọs Kraịst ka a na-eme ya baptizim site nʻaka Jọn Omee Baptizm niime Osimiri Jodan

Ngọzi ndị Ekwere nkwa

Obi nwere ike ruo gị ala nihi emume nsọ ndị ahụ ị na-anata ji ikike sitere na Jizọs Kraịst. Nke a bụ otu niime ihe ndị mere Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst jiri pụọ iche. Site na emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja, ka ike nke Chineke na-apụta ihè.

I nwere ike ịbụ ngwa ọrụ n’aka nke Onyenwe anyị. Dịka i na-ejere Onyenwe anyị ozi jiri ikikere Ya nakwa nʻokpuru nduzi nke ụmụ odibo Ya ndị ji ọtụghe niile niile nke ọkwa nchụaja, Ọ ga-enyere gị aka mata otu esi ejere ndị ọzọ ozi nʻọrụ Ya. Jizọs Kraịst bụ ume gị. Ije ozi gị ga-enyere gị aka bịarute Ya nso ma wetere gị ọn̄ụ.

Ajụjụ na Azịza niile

Kedụ onye ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja na ngalaba ukwu m? Bishọp na ndịisi nke ndị okenye, ndị nkuzi, na ndị kworum dikọn ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja. Nke a pụtara na Onyenwe anyị ekenyewo ha ọrụ iduzi otu esi ejiri ọkwa nchụaja rụọ ọrụ iji jee ozi ma gọzie onye ọbụla niime ngalaba ukwu ahụ.

Kedụ otu ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja si agọzi m? Emume nsọ niile dịka baptizim na oriri nsọ ka enyere ikikere site na ọtụghe niile niile nke ọkwa nchụaja. Mgbe ịnatara ọkpụkpọ okù niime Nzukọ nsọ, a na-edopu gị iche n’okpuru ntuziaka nke onye ahụ ji ntụghe niile. Nke a na-agọzi gị jiri ikikere ahụ iji jee ozi na ọkpụkpọ okù ahụ. Ndị ndu na ndị nkuzi Nzukọ nsọ ndị na-ejere gị ozi nakwa anata ikikere ọkwa nchụaja site nʻọtụghe niile ahụ.

Kedụ otu ndịinyom na ndịikom si eje ozi jiri ikikere ọkwa nchụaja? Ndị nwoke tozuru okè ka a na-enyefe ọkwa nchụaja nʻisi ha ma echie ha echichi nʻọkwa ọbụla nke ọkwa nchụaja dịka dikọn, onye nkuzi, onye nchụaja, na okenye. Ma ndị nwanyị ma ndị nwoke ndị edopụrụ iche ije ozi niime ọkpụkpọ okù na anata nnyetụ ikikere ọkwa nchụaja sitere na Chineke iji mezuo ọkpụkpọ okù ahụ. Nke ahụ bụkwa eziokwu maka ndịnwanyị na ndinwoke ndị natara ọrụ site nʻaka onye ndu Nzukọ nsọ.

Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 35:24–27 (Nzukọ nsọ ka a na-edu site na ọtụghe niile nke Onyenwe anyị nyeworo); 107:18–20 (ọtụghe niile nke Ọkwa nchụaja Melkizedek na ọtụghe niile nke Ọkwa nchụ aja nke Erọn); 110:11–16 (Mozis, Elias, na Elijah weghachitere ọtụghe niile ahụ).

Ajụjụ nke Rekọmend Tempụl

  • Ị na-akwado Onyeisi nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a dịka onye amụma, ọhụụ ụzọ, na onye mkpughe na dịka onye naanị ya nwere ikikere n’elu ụwa iji ọtụghe niile nke ọkwa nchụ aja eme ihe?

  • Ị na-akwado ndị otù nke Otù Ndịisi Mbụ na Kworum Ndịozi Iri na Abụọ dịka ndị amụma, ndị ọhụụ ụzọ, na ndị mkpughe?

  • Ị na-akwado ndi ọzọ Ji Ikike Zuruọha na ndi ndụ ime obodo nke Nzukọ nsọ?