Ndị ntoroọbia
4. Jizọs Kraịst ga-enyere gị aka


Jizọs Kraịst

4.

Jizọs Kraịst ga-enyere gị aka

Abụ ọma 147:3

Jizọs Kraịst bụ ume gị Ọ mewo ihe niile kwesịrị ekwesi maka gị iji nwee ọn̄ụ niime ndụ nke a na mgbe ebighị ebi. Site nʻihọrọ Ya na ozi ọma Ya, ị na-ahọrọ an̄ụrị na ọn̄ụ nke ebighị ebi.

Ọbụna mgbe ị gbara mbọ ịme ike gị ihoro ezi ihe, mgbe ụfọdụ ị ga-eme mmejọ. Ị ga-eme ihe ndị ị ga-ata onwe gị ụta na ị mere. Onye ọbụla na-eme otu ahụ. Mgbe nke a mere, ọ na-adị mfe inwe nkuda mmụọ ma obụ chee ma ị ga-adịkwa mma zuru okè ọzọ. Mana enwere ozi dị mma—ozi dị ịtụnannya ma na-enye nchekube! Niihi na Chineke hụrụ gị naanya, O zitere Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, onye wekwasịrị Onwe Ya mmehie gị niile ka i nwee ike chegharịa, nata mgbaghara, ma na-aga n’ihu.

Eziokwu ndị dị Ebighị ebi

Jizọs Kraịst ga-agba gị ume. Ọ ga-enyere gị aka gbanwee ọchịchọ gị niile, echiche gị, na omume gị niile. Mgbe ị nwere nchekasị obi, na-atụ ụjọ, ma ọ bụ na-adọli nʻụzọ ọbụla, Ọ ga-akasị gị obi. Ọ ga-enyere gị aka nʻebe ihe niile gbasara ndụ gị. Ị nwere ike ịtụkwasị obi na Ya.

Nchegharị abụghị ntaram ahụhụ maka mmehie; ọ bụ ụzọ nke Onye Nzọpụta si atọghapụ anyị site na mmehie. Ichegharị pụtara ịgbanwe―ịtụgharị site na mmehie ma chee ihu na Chineke. Ọ pụtara imelite ma nata mgbaghara. Ụdị mgbanwe nke a abụghị ihe na-eme otu ugboro; ọ bụ usoro na-aganiihu.

Ọkpụkpọ okù niile

Mee Jizọs Kraịst bụrụ ebe nlekwasị anya nke ndụ gị. Chọọ enyemaka Ya niime ihe niile ị na-eme.

Chegharịa. Chigharịa nʻebe Onyenwe anyị nọ ma nwee ọchịchọ obi imelite onwe gị. Mgbe ọbụla imere ihe nʻezighi ezi, kwụwa aka gị ọtọ ma nabata ya niihu Chineke ma, dịka ọ dị mkpa, kwuputara ya bishọp gị ma ọ bụ onye ọbụla ị mejọrọ. Mee ike gị iji mezie ihe ahụ.

N̄ụrịa niime onyinye nke ịmee ịhe ọma karịa, ma bụrụ ọnye ọma karịa. Ọbụna mgbe ọ na-adịghị mfe ma na-ewe oge karịa otu masịrị gị, anwakwala anwa ịkwụsị ịgbalị. Gaaniihu na-arụ ọrụ ma tụkwasịnụ obi na Onyenwe anyị. Ọ ga-enyere gị aka na-aga na nzọ ụkwụ ọbụla nke ụzọ ahụ.

Jizọs nọdụrụ ọdụ n’akụkụ olulu mmiri ya na nwanyị Samerịa

Ngọzi ndị Ekwere nkwa

Nna nke Eluigwe ga-agbaghara ma gwọọ gị dịka ị na-echegharị. Ọ ga-ejiri udo na ọn̄ụ dochie ikpe ọmụma gị. Ọ gaghị echeta mmehie gị ọzọ ma ọlị. Jizọs Kraịst bụ ume gị, ma site na ume Ya, ọchịchọ gị idebe iwu nsọ Ya ga-abawanye.

Ọ ga-agbanwe obi gị nakwa ndụ gị. Obere obere, ị ga-eto ma bịa dị ka Ya karịa.

Ajụjụ na Azịza niile

Olee otu m ga-esi ama na Chineke agbagharawo m? Chineke kwere nkwa na Ọ ga-agbaghara ndị ahụ chegharịrị echegharị. Mgbe ị na-enweta nkasị obi sitere na Mmụọ, ị ga-enwe ike mata na ike mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta na-arụ ọrụ niime ndụ gị.

Kedụ mgbe m nwere mkpa enyemaka bishọp iji chegharịa? Bishọp gị ji ọtụghe nke ọkwa nchụaja ma ọ nwere onyinye niile nke ime mmụọ iji nyere gị aka chegharịa. Ị nwere ike chọọ enyemaka na ndụmọdụ ya nʻoge ọbụla. Ọ bụrụ na imewo mmejọ tara akpụ, ụdị dị ka imebi iwu mmekọrịta, gaa hụ bishọp gị. Ọ gaghị ama gị ikpe. Ọ bụ onye nnọchite anya nke Jizọs Kraịst ma ọ ga-enyere gi aka mata otu ị ga-esi chegharịa nʻuju ma nata ike ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta na ike mgbam ume.

Ana m anwa ịchegharị, mana aka m na-emekwa otu mmejọ ahụ. Kedụ ihe m ga-eme? Adakwala mba. Chigharịa nʻebe Kraịst nọ ma tụkwasị okwukwe gị na Ya. Amara Ya zuuru gị oke. Nwaa ọzọ. Ị nọghị naanị gị ma ọlị na mbọ gị niile iji gaaniihu. Jizọs Kraịst mgbe niile nọnyere gị.

Lee Ịnos 1:6 (ikpe-ọmụma ka a zafuworo.); Mosiah 4:3 (site na Mmụọ Nsọ, Chineke na-eme ka ịmata na agbagharawo gị); 26:30 (Onye Nzọpụta na-agbaghara ọtụtụ ugboro dịka anyị na-echegharị); Ịta 12:27 (amara nke Onye Nzọpụta pụrụ ime ka ịhe ndị na-adịghị ike adịrị ike); Moronaị 6:8 (ndị ahụ chegharịrị ka agbagharaworo); 10:32 (itozu okè niime Kraịst); Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:32 (Onyenwe anyị na-agbaghara ndị ahụ chegharịrị); 58:42–43 (nchegharị gụnyere ikwuputa mmehie na ịhapụ mmehie).

Ajụjụ nke Rekọmend Tempụl

  • I nwere ọgbụgba ama nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na maka ọrụ Ya dịka Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta gị?

  • Enwere mmehie ọjọọ niime ndụ gị nke ekwesịrị idozi site n’aka ndi ji ikikere ọkwa nchụaja dịka akụkụ nke nchegharị gị?