Ndị ntoroọbia
5. Jee ije nʻÌhè nke Chineke


Jizọs Kraịst na-edu otu igwè atụrụ

Ọ Dịghị Ihe Kọrọ M, site n’aka Yongsung Kim. Anatara ikike nke Havelight

5.

Jee ije nʻÌhè nke Chineke

Ndị Galetia 5:25

Ị na-eme nhọrọ katụ mma mgbe ị bidoro hụwa ihe nʻụzo doro anya. Ọ bụ ya mere ihè jiri dịrị oke mkpa; ihè na-eme ka ọ dịrị mfe ịhụ ụzọ ziri ezi. Nna nke Eluigwe enyewo gị ohere iji nata ihè nke sinigwe—onyinye nke Mmụọ Nsọ—iji nyere gị aka hụ ọfụma ihe ziri ezi na nke na-ezighi ezi, nke ọma na nke ọjọọ.

Eziokwu ndị dị Ebighị ebi

I nwere ike nwee Mmụọ nsọ ahụ dịka onye nsiso oge niile. Mgbe emesịrị gị onye otù nke Nzukọ nsọ ahụ, akpọkuo gị “ịnata onyinye nke Mmụọ Nsọ.” Ohere inwete Mmụọ ahụ dịka onye nsiso gị mgbe niile bụ otu niime onyinye ndị kachasị ukwuu Chineke nyere gị.

Ime ezi nhọrọ na-emelite ikikere gị inwe mmetụta nke Mmụọ ahụ. Enwere ọtụtụ ihe ndị dị mma ma kwesị ekwesị niime ụwa nke a. Otu ahụ ihe anyị riri nʻọnụ ma ọ bụ n̄ụọ si emetụta anụ arụ anyị, ka ihe anyị na-agụ, na-ele, ma na-egere ntị si na-emetụtakwa uche na mmụọ anyị nʻụzọ dị ukwuu.

Ọkpụkpọ okù niile

Kepụtara Onyenwe anyị oge kwa ụbọchị. Mụta ihe banyere Ya Na-echeta Ya oge niile. Kpeere Nna gị nke Eluigwe ekpere. Mụọ akwụkwọ nsọ na okwu niile nke ndị amụma dị ndụ. Emesịa gbalịa bie ndụ site na ihe ị na-amụta.

Chọọ ihe ahụ na-ebuli elu, na-akpatemmụọ, ma na-akpọku Mmụọ ahụ. Dịka ị na-eme nhọrọ banyere ihe a ga-ele, agụ, ma geere ntị, ma ọ bụ sonye mee ihe, chee echiche banyere otu o si emetụta gị. Ọ na-akpọku echiche ndị ziri ezi? Wezuga onwe gị site n’ihe ọbụla na-akwa ihe ndị dị nsọ emo ma ọ bụ ihe rụrụ arụ. Esonyekwala niime ihe ọbụla na-akụnyu mmụọ nhọrọ ezi ihe ma ọ bụ na-emerụ Mmụọ, ụdị dịka ime ihe ike, mmanya na-egbu egbu, na ọgwụ ike. Nwee obisiike ịgbanyụ vidiyo ma ọ bụ egwuruegwu ọbụla, si na onyonyo ma ọ bụ ịgba egwu pụọ, gbanwee egwu gị, ma puọ nʻebe ihe ọbụla nke na-adabaghị na Mmụọ ahụ.

Jiri soshia midiya iji bulie. Soshia midiya nwere ike ịbụ ngwaọrụ mkparịta ụka dị ike. Ọ bụrụ na ijiri ya, lekwasị anya nʻihè, okwukwe na eziokwu. Ejila ndụ gị tụnyere ihe yiri ka ndị ọzọ ọ na-agabiga. Chetakwa na ugwu gị na-abịa site nʻịbụ nwa nke nne na nna nke eluigwe, nʻabụghị site na soshia midiya.

Chọọ nhụmịhe ndị dị mma ma zie ezie, mmekọrịta nke na-anọgide. Kpachara anya maka ijiri teknụzụ na midiya mee ihe agaghị edochi mmkparịta nke mmadụ na mmadụ nʻetiti ndị ezinụlọ na ndị enyi. Soshial midiya na teknụzụ ndị ọzọ nwere ike iwe ọtụtụ oge gị ma na-enyeghi gị ọtụtụ uru ọbụla. Nwee ezumiike site nʻụwa ikuku ma jikọta gị na ndị mmadụ nʻụwa a na-ahụ anya.

Jizọs Kraịst na-edu otu igwè atụrụ gafee otu ubi ama ahịhịa ahịhịa.

Ngọzi ndị Ekwere nkwa

I nwere ike inwe Mmụọ ahụ ịnọnyere gị mgbe niile. Nkwa nke a bụ otu akụkụ nke ọgbụgba ndụ ị na-eme oge ọbụla ị na-eri oriri nsọ. Mmụọ ahụ ga-agba aka ebe nye gị maka Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst. Ọ ga-akasị gị obi, duo gị, dọọ gị aka na ntị ma doo gị nsọ. Ọ ga-enyere gị aka mata eziokwu ma hụ ezi ihe nọ niime ụwa.

Ajụjụ na Azịza niile

Kedụ ka m ga-esi mara ma m na-enwe mmetụta nke Mmuọ Nsọ? Ịmụta ka esi enwete mmetụta nke Mmụọ na-ewe oge, omume, na ndidi. Ọ na-ekwuru ndị dị iche iche okwu nʻụzọ dị iche iche. Ejikwala ihe ndị dị mfe akpọ ihe efu—mmetụta udo ahụ ị na-enwete mgbe ịnụrụ ama nke otuonye ma ọ bụ nchekasị ahụ ị na-enwete mgbe i mere ajọọ nhọrọ. Nyochasịa akwụkwọ nsọ maka ụzọ ndị dị iche iche Mmụọ ji akparịta ụka, kpee ekpere banyere ya, ma na-aganiihu na-achọ ohere ndị iji enwe mmetụta nke Mmụọ ahụ.

Gịnị bụ nzịakwụna? Gịnị mere m ga-eji ezere ya? Nziakwụna bụ ihe ngosipụta, na foto ma ọ bụ nọkwu ọnụ, ahaziri iji kpalie mmetụta niile nke mmekọrịta. Nziakwụna na-abịa nʻụdị nʻụdị, gụnyere vidiyo, foto, akwụkwọ, egwuruegwu, na egwu. O nwere ike ịbụ ozi ma ọ bụ oyiyi ndị ezigara nʻetiti ndị enyi. Nziakwụna na ewere ihe ndị dị nsọ—anụ arụ anyị na mmetụta nke mmekọrịta—dịka ihe agaghị enye ugwu. I nwere ike ịbanye niime nziakwụna na-amaghị ama. Ma ịbanyere na nziakwụna nʻaka gị ma ọ bụ na-amaghị ama, si na ya wezuga onwe gị ozugbo. I nwekwara ike chọọ ikwu okwu gị na otu niime nne na nna gị ma ọ bụ onye dimkpa ịtụkwasịrị obi. Ịkpachara anya lee nziakwụna bụ mmehie ma ọ ga-emebi ike gị inwe mmetụta nke Mmụọ ahụ. Ọ na-egbuda ike nke njikwa onwe gị ma mebie ụzọ ị si ahụ onwe gị na ndị ọzọ. Jizọs Kraịst nwere ike ahụ iji nyere gị aka gbanarị nziakwụna ma chegharịa. Chigharịa nʻebe Ọ nọ ma pụọ site nʻọchịchịrị. Bishọp gị nwere ike inyere gị aka nata ume na mgbaghara site na Onye Nzọpụta. Jizọs Kraịst bụ ume gị!

Lee Abụ ọma 119:105 (Okwu Chineke dịka ihè nʻụzọ anyị); Emọs 5:14 (chọọ ihe ọma); Ndị Galeshia 5:22–23 (mkpụrụ niile nke Mmụọ); Moronaị 7:18–19 (ihè nke Kraịst); Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:23 (Onyenwe anyị na-ekwu udo); 20:77, 79 (ekpere oriri nsọ).

Ajụjụ nke Rekọmend Tempụl

  • Onyenwe anyị ekwuwo na ihe niile ka a ga “eme n’ịdị ọcha” n’ihu Ya (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 42:41). Ị na-agba mbo maka agwa ịdị ọcha niime echiche gị niile na omume gị niile?