3.
I nwere ike inye aka n’ọrụ Chineke
Nna nke Eluigwe hụrụ ụmụ Ya niile naanya. Ọ chọrọ inyere ha aka chọta an̄ụrị na ọn̄ụ, laghachikwuru Ya, ma nwete ndụ ebighị ebi. A na-akpọ nke a ọrụ nke nzọpụta Ya na mbuli elu, ma Ọ na-akpọku gị inye aka!
Eziokwu ndị dị Ebighị ebi
Ọrụ na otuto nke Chineke bụ iwete na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke gị. Anwụghị anwụ bụ ibi ndụ ruo ebighị ebi jiri anụ arụ biliteworo nʻọnwụ. Ndụ ebighị ebi, ma ọ bụ mbuli elu, pụtara ịdịrị ka Chineke karịa ma binyere Ya ruo ebighị ebi dịka ezinụlọ. Ihe nke a niile kwere omume niihi Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya. I nwere ike ịtụkwasị obi na Ya.
I nwere ike inye aka nʻọru Chineke site nʻịbịakwute Kraịst na inyere ndị ọzọ aka meekwa otu ahụ. Mgbe ọbụla ịmere ihe ọbụla iji nyere otuonye aka soro Jizọs Kraịst, ị na-enye aka nʻọrụ Chineke.
Ọkpụkpọ okù niile
Bie ndụ ozi ọma. Wulite okwukwe gị niime Jizọs Kraịst. Chegharịa kwa ụbọchị. Nata emume nsọ niile ọkwa nchụaja nke Chineke ma debe ọgbụgba ndụ gị niile. Mee ka nsoro ahụ nọgide ruo oge ndụ gị niile.
Lekọta ndị ahụ nọ na mkpa. Chọta ụzọ ndị iji eje ozi ma lekọta ndị ọzọ, gụnyekwa ezinlulọ gị, ndị enyi gị, na ndị obodo gị. Otu ụzọ dị ukwuu iji nyere ndị nọ na mkpa aka bụ irube isi nye iwu nke ibu ọnụ ma nye onyinye ibu ọnụ.
Kpọkuo ndị niile ịnata ozi ọma ahụ. Mee ka okwu gị na omume gị gosi okwukwe gị niime Jizọs Kraịst. Dịrị njikere ịgwa onye ọbụla jụrụ gị ajụjụ banyere olileanya na an̄ụrị ahụ ị na-enwete dịka onye na-eso ụzọ Ya. Maka ndịikom nta, ije ozi mishọn nʻuju oge bụ oke nʻọrụ ọkwa nchụaja. Maka ndịiyom nta, ọ bụ ohere dị ike; kpee ekpere ịmara ma Onyenwe anyị ọ ga-achọ ka ị jee ozi. Dị njikere ikesa ozi ọma ahụ nʻoge ndụ gị niile.
Mee ka ezinụlọ dịrị nʻotu ebighị ebi site na-ịrụ ọrụ nke agụgụala ezi na ụlọ na ọrụ nke tempụl. Mụta ihe banyere ndị nna nna gị ha. Chọpụta onye nwere mkpa emume nsọ tempụl. Gaa na tempụl ọtụtụ mgbe dị ka i nwere ike ka emee gị baptizim na onye otù nʻaha ha. I nwee mkpa enyemaka, gakwuru FamilySearch.org.
Ngọzi ndị ekwere na nkwa
I ga-enweta enyemaka nke Chineke. Nna nke Eluigwe anaghị atụ anya na ị ga-eme ọrụ nke a naanị nʻonwe gị. Ọ nọnyeere gị. Mgbe i jiri obi umeala nyefee oge na obi gị, Ọ ga-eme ihe dị ịtụnanya site na gị. Jizọs Kraịst bụ ume gị!
Ị ga-ejupụta n’ọn̄ụ. Ọrụ Chineke bụ ọrụ nke ọn̄ụ! Dịka ị na-esonye na ya, ị ga-enwe ike nwee mmetụta ọn̄ụ nke Ọ na-enwe. Cheegodi ọn̄ụ ahụ gị na Nna nke Eluigwe na ụmụ Ya ndị ịnyere aka kpọta nʻebe Ọ nọ ga-enwekọta ọnụ!
Ajụjụ na Azịza niile
Chineke ọ pụrụ nʻezie iji m kwara ngwaọru nʻọrụ Ya? Ee! E nwere ọtụtụ ụzọ iji nyee aka nʻọrụ ahụ. O nwere ike dị ka ndị ozọ ha karịrị gị nwee akaraka mọbụ nka, mana Nna gị nke Eluigwe na-ahụ ike mmepụta gị. O nyewo gị onyinye nke ị nwere ike iji jee ozi ma kpọkọta ụmụ Ya. Ọ dị mma ma ọ bụrụ na onyinye ndị a dị iche site na nke ndị ozọ nwere. Nʻezie, ọ bụ ya kpatara onyinye nke gị jiri baa oke uru. A chọrọ gị!
Lee Matiu 10:39 (ọ bụrụ na itufuo ndụ gị niime ije ozi nke Onye Nzọpụta, ị ga-achọta ya); 1 Ndị Kọrịnt 12:14–27 (ndị otù niile dị mkpa nʻahụ nke Kraịst); Ndị Filipi 1:6 (nwee obisiike na Chineke na-arụ ọrụ niime gị); Jekọb 5:72 (Onyenwe anyị nke ubi vaịn ahụ rụkwara ọrụ gị na ya); Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:15–16 (ọn̄ụ gị ga-adị ukwuu maka ndị ahụ ịkpọtaara Kraịst); 64:33–34 (ọrụ dị ukwuu na-abịa site nʻihe dị nta ma dịkwa mfe); Mozis 1:6 (“Enwere m ọrụ maka gị”); 6:31–34 (Chineke na-akwado ndị ahụ Ọ kpọrọ, ọbụnadị ma ha chere na ha etozughi okè).
Ajụjụ nke Rekọmend Tempụl
-
I nwere ọgbụgba ama nke Mweghachite nke oziọma nke Jizọs Kraịst?