Ndị ntoroọbia
7. Emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile na-enye gị ohere ịnata ngọzi niile nke Chineke


Jọn Omee Baptizim na-eme Jizọs Kraịst baptizim

7.

Emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile na-enye gị ohere ịnata ngọzi niile nke Chineke

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:20

Nna nke Eluigwe dị ezi njikere ikuziri gị ihe ma gọzie gị. Otu ụzọ O si eme nke a bụ site na emume nsọ dịka baptizim, ime onye otù, na oriri nsọ. Site na emume nsọ dị ka ndị a, anyị na-agba ndụ, ma ọ bụ kwee nkwa nye Chineke. Idobe ọgbụgba ndụ na-abawanye ike Chineke niime ndụ gị ma na-enyere gị aka kwado maka ndụ ebighị ebi. Ọ bụ ya kpatara emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile jiri dịrị anyị oke mkpa—nihi ha na-agba ume nye njikọta dị nʻetiti anyị na Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị ma nyere anyị aka ịdịrị ka Ha karịa.

Eziokwu ndị dị Ebighị ebi

Emume nsọ niile na-atụrụ gị aka nʻebe Jizọs Kraịst nọ. Emume nso bụ mmemme dị nsọ nwere ọdịmara nke nkọwa ya na-akuzi banyere Jizọs Kraịst. Oriri nsọ, nʻịmatụ, abụghị nnọọ achịcha na mmiri. Ọ na-echetara anyị maka Onye Nzọpụta.

Ọgbụgba ndụ bụ akara na-egosi ịhụnaanya, ntụkwasị obi, na atụmanya niile nke Chineke. Ha na-eme ka njikọta dị nʻetiti gị na Chineke mikpuo ogo dị ime. Ịgba ndụ na-egosi na ị hụrụ Chineke naanya nakwa na ịrarawo onwe gị nye Ya. Ị nwere ike ịtụkwasị obi na Ya, ma Ọ pụrụ ịtụkwasị obi na gị. Site na nraranye ahụ miri emi, ka ohere dị ukwuu esi enweta ike na enyemaka Ya si abịa, dịka ị na-edebe ọgbụgba ndụ gị niile.

Gị na Chineke na-agba ndụ mgbe emere gị baptizim ma mee gị onye otù na mgbe i riri oriri nsọ. Mgbe emere gị baptizim, ị na-ekwe nkwa iwekwasị onwe gị aha nke Jizọs Kraịst, jere Ya ozi, ma debe iwu nsọ Ya niile ogologo ndụ gị niile. Nʻoge oriri nsọ, ị na-ekwekwa nkwa ịcheta Ya mgbe niile. Ndị a bụ nkwa gị niile. Dịka ị dị njikere ịdebe ha, Chineke na-ekwe nkwa ịnye gị Mmụọ Nsọ dịka onye nso gị oge niile.

Ọkpụkpọ okù niile

Were oriri nsọ dịka onyinye dị nsọ. Gosi na irarawo onwe gị nye Jizọs Kraịst site na-ikwado akwado maka nhụmịhe dị nsọ nʻoge oriri nsọ. Tụgharịa uche banyere ihe i nwere ike ime iji mee ka emume nsọ nke a bụrụ ihe omume nke ime mmụọ nke mere nʻizu ụka gị.

Chọọ Onye Nzọpụta niime emume nsọ ndị a. Mgbe ị na-ekiri ma ọ bụ na-esonye niime otu emume nsọ, jụọ onwe gị, “Kedụ ihe m na-amụta site na nke a banyere Jizọs Kraịst?” ma ọ bụ “Kedụ otu o si akpọta m nso nʻebe Ọ nọ?” N̄aa ntị nʻihe Mmụọ ahụ na-akuziri gị.

Kwee ka ọgbụgba ndụ gị niile duo omume gị niile. Mgbe i nwere otu nhọrọ ị ga-eme, chetakwa mmekọrịta ọgbụgba ndụ dị nʻetiti gị na Chineke. Guzosie ike nʻebe Ọ nọ. Jụọ onwe gị: Nke a ọ dabara na ọgbụgba ndụ m niile? Nʻịmatụ, a hụrụ m ndị ọzọ naanya ma na-ejere ha ozi, na-akasị obi nye ndị nwere mkpa nkasị obi, ma na-eguzoro dịka onye aka ebe nke Kraịst—ebe niile na mgbe niile?

Kraịst nọ nʻokpokoro na-akwado oriri nsọ maka ndị Nefi

Ngọzi ndị Ekwere nkwa

I nwere ike inwete ike iji merie ọnwụnwa, mmehie, na mnwale niile nke ụwa. Ịgba ndụ na ịdebe ọgbụgba ndụ agbara na-enye gị ohere iji nata ike nke Chineke. Jiri ike ahụ, i nwere ike izute ihe ọbụla jiri obisiike. Jizọs Kraịst bụ ume gị!

Inwere ike ịdị ọcha ma nata mgbaghara. Otu nkwa Chineke kwere nye gị maka idebe ọgbụgba ndụ nke baptizim gị bụ mgbaghara nke mmehie gị niile. Nke ahụ pụtara na dịka ị na-echegharị ma debe nkwa ịkwere Chineke, Ọ ga-agbaghara gị ma nyere gị aka imelite.

Ị nwere ike inwe Mmụọ Nsọ ahụ ịnọnyere gị mgbe niile. Nkwa ọzọ metụtara baptizim na oriri nsọ bụ nnọnyere mgbe niile nke Mmụọ Ya na nlekọta nke ndị mmụọ ozi. I kwesighị ma ọlị izute ihe aka mgba gị niile naanị gị. Chineke anaghị agharịpụ ụmụ ọgbụgba ndụ Ya ma ọlị—tụkwasị obi na nke ahụ.

I nwere ike inwete nkwado nke ndị nke Chineke gbara ndụ. I sonyere nʻotù ndị gbara ndụ niime Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta. Unu na-ebuli ma na-agbakọrịta onwe unu ume. Unu na-erikọta uju onu ma na-an̄ụkọrịtara onwe unu ọn̄u. Unu na-eburitara ibu-arọ onye ọbụla nye ibe ya. Ndị ezinụlọ gị, bishọp, ndị ndu, na ndị otù Nzukọ nsọ ndị ọzọ nọ nʻebe a ịnyere gị aka, ma inwekwara ike ịnyere ha aka.

Ajụjụ na Azịza niile

Enwere m ike ịbụ ezigbote onye na-eso Jizọs Kraịst ma na-emebeghị emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile ahụ? Enwere ọtụtụ mmadụ dị mma ndị ji obi ọcha ha na-esoro Jizọs Kraịst, nagbanyeghi na emebeghi ha baptizim na mbụ ma ọ bụ gaa tempụl. Nagbanyeghi, Nna nke Eluigwe chọrọ ka ụmụ Ya niile nata emume nsọ Ya niile ma gbaa ndụ ya na Ha ka ha nwee ike nwete nnukwu ohere iji nwete enyemaka, ebere na ume Ya. Nke ahụ bụ otu niime ihe kpatara Jizọs Kraịst jiri weghachite Nzukọ nsọ Ya! Nwa ọbụla nke Chineke ga-enwe ohere—na ndụ nke a ma ọ bụ nke ọzọ—iji nata emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile dị mkpa eji enwete ndụ ebighị ebi.

Ọbụghị mgbe niile ka m kwesịrị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ m niile. Aka m nwere olileanya? Ee! Oziọma nke Jizọs Kraịst bụ oziọma nke olileanya na ọtụtụ mmalite ọhụrụ! Ọ bụ ya kpatara anyị ji anata oriri nsọ kwa izu. Nna nke Eluigwe maara na anyị ga-emejọ ma nwee mkpa mmalite nke ọhụrụ. Onye Nzọpụta nyere ndụ Ya iji nye gị ụzọ nlaghachi azụ. Dị ka ị na-enwe okwukwe niime Jizọs Kraịst ma chegharịa, ị ga-enwetagharị ohere ọzọ iji nwete ike nke Chineke.

Lee 1 Ndị Kọrịnt 11:23–26 (ịnata oriri nsọ na-egosi na anyị kwere na Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya); Mosaia 18:10, 13 (ọgbụgba ndụ nke baptizim); Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13 (Ọkwa nchụ aja nke Erọn gụnyere ọtụghe niile nke nchegharị, baptizim, na ije ozi nlekọta nke ndị mmụọ ozi); 20:37 (atụmanya niile maka baptizim); 20:77, 79 (ekpere oriri nsọ).

Ajụjụ nke Rekọmend Tempụl

  • Ị na-agba mbo idebe Ụbọchị izuike nsọ, ma n’ebe obibi ma na nzukọ nsọ; gaa ọgbakọ gị niile; kwadoo maka ma rie oriri nsọ na ntozu okè; ma bie ndụ gị ka ya na iwu niile na iwu nsọ niile nke ozi ọma dakọrịta?