Rie Oriri Nʻokwu ahụ, site n’aka Liz Lemon Swindle. Anatara ikike nke Havelight
11.
Eziokwu ga-eme ka inwere onwe gị
Jọn 8:32
Nna gị nke Eluigwe bụ Chineke nke eziokwu. Ọ bụ onye maara ihe niile. Eziokwu niile na-abịa site na Ya ma na-eduba na Ya. Ị na-egosi na ijiri eziokwu kpọrọ ihe dịka ị na-achọ mmụta, na-ebi ndụ nkwụwa aka ọtọ, ma jiri obiike kwụrụ maka ihe ịmara ziri ezi—ọbụnagodi na ọpụtara na naanị ga-akwụ.
Eziokwu ndị dị Ebighị ebi
Nna nke Eluigwe chọrọ ka ụmụada na ụmụ Ya ndị nwoke nọrọ mgbe niile nʻọmụmụ ihe. I nwere ihe kpatara ma nke anụ ahụ ma nke ime mmụọ, ị ga-eji chọọ ma hụ mmụta naanya. Agụmakwụkwọ abụghị naanị banyere ịkpata ego. O sonyere niime ebumnuche nke ebighị ebi gị ịdịrị ka Nna nke Eluigwe karịa.
Ibi ndụ eziokwu pụtara na ịhụrụ ihe dị mma nʻịru Chineke naanya—karịa otu isi hụ ọnọdụ nkeonwe dị mma, ịbụ onye ama ama, ma ọ bụ mgbe ọ dị mfe naanya. Ọ pụtara ịme ihe dị mma naanị nihi na ọ dị mma.
I nwere otu ihe dị oke ọnụ ahịa ịkesa. Ozi ọma nke Jizọs Kraịst ji azịza niile nke ndụ. Ọ bụ ụzọ e si enwe udo na an̄ụrị. Enwere ike ịmachaghị ihe niile, mana ịmazuru otu isi ahụ onye agbata obi gị naanya, kesara ha ezi ụkpụrụ, ma kpọkuo ha ịmụtakwu ọzọ.
Ọkpụkpọ okù
Na-amụta ihe mgbe niile. Chọo ohere ndị i nwere ike iji gbasaa uche gị na nka gị niile. Ohere ndị a nwere ike gụnye agụmakwụkwo nʻụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ọzụzụ ọrụaka, tinyekwara ebe ọbụla dị ntụkwasị obi isi na ha na-amụta ihe. Kwee ka Onyenwe anyị sonye niime mgbali gị niile, ma Ọ ga-eduzi gị.
Mụta eziokwu niile nke ime mmụọ. Dị ka ị na-amụta banyere ụwa nọ gị gburugburu, mụtakwa banyere Onye nzọpụta, onye kere ụwa. Mụọ ndụ na nkuzi Ya niile. Mee ka semịnarị, institute, na ọmụmụ ozi ọma nkeonwe sonye na ọzụzụ ogologo ndụ gị nille. O nwere ike kwado gị maka ije ozi mishọn ma ikesa ozi ọma ahụ ruo ogoglogo ndụ gị niile.
Bie ndụ eziokwu. Ezula ohi, ekwula okwu ụgha, aghọkwala aghụghọ, ma ọ bụ duhie nʻụdị ọbụla—nʻụlọakwụkwọ, nʻebe ọrụ, nʻikuku, ebe niile. Bụrụkwa otu ụdị onye nsiso kwesịrị ntụkwasị obi nke Jizọs Kraịst niihu ọha na n’onwe naanị.
Ngọzi ndị Ekwere nkwa
Agụmakwukwọ na-abawanye ikike gị ijere Onyenwe anyị ozi, gụnyekwa dịka onye mgbasa ozi ọma. O na-enye gị ike iji gọzie ndị ọzọ, tụmadị ezinụlọ gị. Dị ka ị na-amụtakwu ihe, mgbe ahụ ka ị ga aka enwe ike iwulite alaeze nke Chineke ma metụta ụwa maka ọdị mma.
Eziokwu na-ewete udo na nsọpụrụ nkeonwe. Mgbe okwu gị niile na omume gị dabara nʻeziokwu, ị na-egosi na ndị mmadụ na Onyenwe anyị nwere ike ịtụkwasị gị obi.
Mgbe ị guzoro ọtọ maka nkuzi niile nke Jizọs Kraịst, Ọ ga-eguzoro ọtọ maka gị. Jizọs Kraịst bụ ume gị! Ndị ọzọ nwere ike ha agaghị ekwenye na nkwenye gị, mana obisiike na obi ọcha gị ga-apụta ihè. Ma ndị ọzọ ha sooro ọmụmatụ gị ma ọ bụ ha esonyeghi, ama gị, obisiike, na okwukwe gị niime Kraịst ga-eto.
Ajụjụ na Azịza niile
Ọ bụ ihe dị njọ inwe ajụjụ banyere Nzukọ nsọ? Kedụ otu m nwere ike iji chota azịza? inwe ajụjụ abụghị akara nke adịghị ike ma ọ bụ enweghi okwukwe. Nʻezie, ịjụ ajụjụ nwere ike ịnye aka wulite okwukwe. Mweghachite nke ozi ọma ahụ malitere mgbe Josef Smit dị afọ 14 jụrụ ajụjụ nʻokwụkwe. Chọọ azịza niime akwụkwọ nsọ, niime okwu niile nke ndị amụma Chineke, site nʻaka ndi ndu na ndị otù ezinụlọ kwesịrị ntụkwasị obi, na site na Chineke Nʻonwe Ya. Ọ bụrụ na azịza abịaghị ozugbo ahụ, nwee ntụkwasị obi na ị ga-amụta ahịrị nʻelu ahịrị. Nọgide na-ebi ndụ dabara nʻihe ị diwo mbụ mara, ma nọgide na-achọ eziokwu.
Kedụ otu m ga-esi guzoro ọtọ maka ihe ahụ dị mma na-akpasughi ndị ahụ nwere nkwenye dị iche iwe? Malite site na-ịhụ na okwu gị na omume gị bụ nke akpakere nʻihi ịhụnaanya i nwere maka Chineke na maka ụmụ Ya. Ekwesịghi ijiri mmụọ esemokwu kesaa ozi ọma ahụ ma kama jiri ido anya, obi ruru ala na obi ebere. Ị nwere ike ịdị ịhụnaanya nʻebe ndị ọzọ nọ ma ọ bụrụgodi na ị kwenyeghi na echiche ha. Bụrụ ezi ọmụmatụ nke onye na-eso Jizọs Kraịst site nʻụzọ isi ebi ndụ.
Lee Matiu 5:14–16 (kwee ka ihè gị mukee); Jọn 14:6 (Jizọs bụ eziokwu ahụ); 1 Pita 3:15 (dịrị na njikere mgbe niile ịkesa olile anya gị na Kraịst); Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:77–80 (ihe ndị Onyenwe anyị chọrọ ka anyị mụta); 88:118 (chọọ amamiihe site n’akwụkwọ nile kachasị mma); 93:36 (ebube nke Chineke bụ akọn’uche); 124:15 (eziokwu pụtara ịhụ ihe dị mma naanya); 130:18 (akọ na uche anyị ga-esoro anyị bilie mgbe anyị bilitere nọnwụ).
Ajụjụ nke Rekọmend Tempụl
-
Ị na-agba mbo ịkwụwa aka gị ọtọ niime ihe niile ị na-eme?
-
Ị na-akwado ma ọ bụ bugoo nkuzi niile ọbụla, omume, ma ọ bụ ozizi megidere ndi ahụ nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a?