Ndị ntoroọbia
8. Emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile nke tempụl na-enye gị ohere kacha ukwuu ịnata ngọzi niile nke Chineke


Jizọs Kraịst nọdụrụ ọdụ ma na-akuziri ndị na-eso ụzọ Ya ihe

8.

Emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile nke tempụl kacha ukwuu na-enye gị ohere ịnata ngọzi niile nke Chineke

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 95:8

Ụfọdụ ngọzi nke Nna nke Eluigwe dị ezigbote nsọ, O nyewo anyị iwu ka anyị dọpụ iche ebe ndị pụrụ iche, ebe ndị dị nsọ ebe anyị nwere ike ị nata ha: tempụl niile. Niime tempụl, ụlọ nke Onyenwe anyị, ị nwere ike ịnata emume nsọ Ya ndị ahụ kachasị elu—onyinye dị nsọ na nrachị—ma natakwa nkwa ya nke bakwuru ụba.

Eziokwu ndị dị Ebighị ebi

Onyinye dị nsọ bụ onyinye nke mmata ihe na ike. Niime emume nsọ niile nke onyinye dị nsọ nke tempụl, ị na-ewekwasị nʻonwe gị aha nke Onye Nzọpụta nʻuju ya karịa. Ị na-agba ndụ irubere Chineke isi, chụọ aja iji mee uche Ya, bie ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst, rube isi nʻiwu nke ịdị ọcha mmekọrịta, na nraranye—ma ọ bụ nyefee—ndụ gị na ihe niile nke Chineke nyeworo gị nye Nzukọ nsọ Ya. Ndị a bụ nkwa gị niile. Chineke na-ekwe nkwa igozi gị jiri nnukwu mmata ihe, nchekwa, na ohere inwete ike Ya. Ọ na-ekwekwa nkwa inye gị ndụ ebighị ebi gị na Ya. Dị ka akụkụ nke onyinye dị nsọ tempụl, enyere gị ohere dị nsọ nke iyi gament nke ọkwa nchụaja dị nsọ. Gamentị ahụ bụ ọdịmara nke Jizọs Kraịst nakwa ihe ncheta nke ọgbụgba ndụ gị niile nke tempụl.

Nrachị nke tempụl na-eme ka di na nwunye na ezinụlọ dịrị nʻotu ruo ebighị ebi. Niime emume nsọ nke nrachị nke tempụl, gị na onye ị na-alụ ga-agba ndụ unu na Chineke na unu nʻonwe unu. Ị ga-ekwe nkwa na ị ga-eguzosiike kpamkpam nʻebe Chineke na ibe unu nọ, hụkọrịta ma jekọrịta ibe unu ozi, ma rụkọta ọrụ ọnụ iji debe iwu niile nke Chineke. Nke a bụ nkwa gị. Chineke na-ekwe nkwa na mmekọrịta ahụ dị nʻetiti gị na onye ị na-alụ nakwa nʻetiti gị na ụmụ gị ga-anọgide ruo ebighi ebi. Ọ na-ekwekwa nkwa na ị ga-anata ebube ahụ kachasi ibe ya ibinyere Ya na alaeze seletịal dịka ị na-edebe ọgbụgba ndụ gị niile. Ngọzi nke a ka a na-akpọ mbuli elu.

Ọkpụkpọ okù niile

Nwee rekọmend tempụl mgbe niile. Gaa hụ onye otù ndị otù bishọp gị iji nata otu. Ọ ga-ajụ gị ajụjụ banyere otu isi na-edebe ọkọlọtọ ndị ahụ Onyenwe anyị debere maka ibanye niime ụlọ nsọ Ya? Nyochagharịa ajụjụ ndị a mgbe na mgbe. (Ị nwere ike chọta ha niime appendix nke ihe odudu nke a.) Ọbụrụgodi na ibi nʻebe tere aka site na tempụl, kwee ka rekọmend gị bụrụ ọdịmara nke ịhụnaanya i nwere maka Onyenwe anyị na mkpebi gị ịmere ibi ndụ dịka ọkọlọtọ Ya sịrị dị.

Gaa na tempụl mgbe na mgbe otu ike kwere gị. Ijiri rekọmend tempụl gị, ị ga-enwe ike banye nʻụlọ nke Onyenwe anyị ma emee gị baptizim na ime onye otù nʻaha ndị nna nna ochie gị ha, ka ha nwee ike nata ngọzi niile nke enyeworo gị. Were ohere ọbụla pụtara iji gaa na tempụl. Chọọ Onyenwe anyị niime ụlọ Ya. Chọọ Ya niime emume nsọ niile, ọdịmara niile, na Mmụọ ahụ na-emetụta gị. Ị ga-achọta Ya.

Kwado akwado igba ndụ niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Otu niime ụzọ ndị kachasị mma iji mee nke a bụ idebe ọgbụgba ndụ nke baptizim gị. Mee ka ebumnuche ga-edu gị bụrụ ịnata emume nsọ niile nke tempụl na ịbụ onye na-edebe ọgbụgba ndụ ogologo ndụ gị niile. Malite ugbua idebe iwu niile ị ga-ekwe nkwa na tempụl irube isi nye: nrube isi nye iwu nsọ niile nke Chineke, ichụ aja, ozi ọma nke Jizọs Kraịst, ịdị ọcha mmekọrịta, na nnyefechasị. Ndị ezinụlọ gị, bishọp na ndị ndu Nzukọ nsọ ndị ọzọ nwere ike nyere gị aka.

Tegucigalpa Honduras Tempụl

Ngọzi ndị Ekwere nkwa

I nwere ike dịrị ka Jizọs Kraịst karịa. Ọ ga-enyere gị aka bụrụ nnukwu onye na-eso eziomume. Emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile ga-akuziri gị otu esi abanye nʻiru Chineke ma bie ndụ ebighị ebi gị na Ya.

Ike Chineke ka a ga-akwado gị inwete. Ọgbụgba ndụ nke tempụl na-ekwe nkwa na ike na ebube nke Chineke ga-adakwasị nʻisi gị. Ndị mmụọ ozi Ya ga-echekwa gị.

Oge a nọ na tempụl ga-eme ka ịbịarute Jizọs Kraịst na Mmụọ Nsọ ahụ nso karịa. I ga-enweta mmetụta udo na ezumike nke Chineke. Ị ga-anụ olu Ya nʻụzọ kacha doo anya. Eluigwe ga-emepere gị, ma ị ga-aka aghọta ụzọ Ya karịa na mbụ. Ị ga-enweta nnukwu ume iji zute aka mgba gị niile nihi na obi gị na nke Ya jikọtara.

Ajụjụ na Azịza niile

Kedụ mgbe m ga-anata onyinye dị nsọ ahụ? Mkpebi ịmere ịnata onyinye dị nsọ bụ nkeonwe; jiri ekpere mee mkpebi nke a. Dụkọrịta odụ gị na ndị ezi na ụlọ gị na ndị ndu Nzukọ nsọ. Ịnata onyinye dị nsọ, ọ dị mkpa nʻiruru opekampe afọ 18 ma ị naghizi agụ ụlọakwụkwọ sekọndịrị. Ị ga-anata onyinye dị nsọ tupu ị ga mishọn ma ọ bụ mee nrachi, mana ị kwesịghị ịche maka nke ọbụla nʻemume abụọ ndị a tupu gị anata onyinye dị nsọ gị. Naanị ihe dịrị gị mkpa bụ inwe mmasị na nkwado iji gbaa na debe ọgbụgba ndụ ndị ozọ gị na Nna nke Eluigwe gbara. Bishọp gị ma ọ bụ onyeisi ngalaba nta gị nwere ike nyere gị aka mata ma ịkwadowo. Ahụkwala onyinye dị nsọ dịka ọrụ ebighị ebi a na-eme ka asị na-emewokwa ya. Hụta ya dịka ihe ọma na ihe dị ebube sonyere niime njem ebighị ebi gị iji bịakwute Kraịst ma nata ngọzi Chineke nke ime mmụọ ahụ kachasị.

Gịnị mere m ji nwee mkpa tempụl rekọmendị iji banye tempụl? Tempụl bụ ụlọ nke Onyenwe anyị, ma Ọ debere ọkọlọtọ ndị ahụ maka ịbanye niime ya. Emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile nke tempụl dị ezigbo nsọ nke mere na ha na-achọ nkwado nke ime mmụọ pụrụ iche. Ajụjụ ọnụ maka tempụl rekọmendị ka ehiwere iji hụ na ịkwadoro akwado niime mmụọ maka ohere ndị ahụ pụrụiche dị elu nke ọgbụgba ndụ tempụl niile. Nna nke Eluigwe na-akpọku ụmụ Ya niile ka ha kwado akwado ikwe Ya nkwa niime ụlọ nsọ Ya.

Ekwesịrị m izu okè iji gbaa ọgbụgba ndụ niile nke tempụl? Enweghi onye zuru okè. Chineke na-achọ ka ịbụrụ onye eziokwu ma dị njikere idebe iwu nsọ Ya niile? Ịgba ndụ na ịdebe ọgbụgba ndụ gị na Chineke bụ ihe na-enye ike iji zuo okè site na Jizọs Kraịst. Ọ bụ ume gị!

Lee Aịzaya 2:2–3 (Chineke na-akuziri anyị ụzọ Ya niime tempụl); Matiu 11:28–30 (wekwasị nʻonwe gị ịnyagba nke Onye Nzọpụta); 1 Nefi 14:14 (ike nke Chineke nọ nʻisi ndị ọgbụgba ndụ nke Ya); Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:15–16 (Iru nke Chineke na ebube Ya dị niime ụlọ Ya); 109:22 (niime tempụl a na-akwado anyị site nʻike nke Chineke); 131:1–4; 132:4–6, 15–20 (iji nata ndụ ebighị ebi, nwoke na nwanyị ga-arachịrị ruo ebighị ebi site na alụmalụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide); Ebreham 1:2 (Ebreham chọburu ịbụrụ nnukwu onye na-eso eziomume ma nata nnukwu mmata ihe).

Ajụjụ nke Rekọmend Tempụl

  • Ị kwere na gị tozuru okè ịbanye ụlọ nke Onyenwe anyị ma soro n’emume nsọ niile nke tempụl?