Ndị ntoroọbia
Mee nhọrọ ndị mmụọ kpalitere


Mee nhọrọ ndị mmụọ kpalitere

Niime Maka Ume nke nduzi Ndị Ntoroọbịa, ị ga-achọta nkuzi niile nke Jizọs Kraịst na nke ndị amụma Ya. Jiri eziokwu ndị a dika ihe odudu gị, ị nwere ike mee nhọrọ ndị mmụọ kpalitere ndị ga-agọzi gị ugbua ma ruo ebighị ebi.

Ị bụ nwa nke mmụọ nke Chineke hụrụ naanya. Atụmatụ ukwu nke an̄ụrị kwere ka o kwe omume maka gị itolite nʻime mmụọ ma wulite ike mmepụta gị dị nsọ. O zitere Jizọs Kraịst ịbụ Onye Nzọpụta gị.

Nna gị nke Eluigwe tụkwasịrị gị obi. O nyewo gị nnukwu ngọzi niile, gụnyekọta uju nke ozi ọma na emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ na-ekedo gị na Ya ma wete ike Ya niime ndụ gị. Site na ọgbụgba ndụ ndị a, ọn̄ụ na oke nʻọrụ na-abịa. Ọ maara na ị pụrụ imepụta ihe dị iche niime ụwa, ma nke ahụ na-achọ, n’ọtụtụ ọnọdụ, ịdị iche site n’ụwa. Chọọ odudu nke Nna gị nke Eluigwe dịka ị na-eme nhọrọ. Ọ ga ejiri mkpate mmụọ gọzie gị site na Mmụọ Nsọ.

Jizọs Kraịst bụ ụzọ ruo ọn̄ụ dị ebighị ebi. Dịka ị na-eji aka gị ahọrọ isoro Jizọs Kraịst, ya mere ị nọ n’ụzọ ahụ na-eduga ruo an̄ụrị ebighị ebi. Mee ka Jizọs Kraịst bụrụ ọkọlọtọ gị, okwute ntọala gị- siri ike. Wuo ndụ gị nʻelu nkuzi Ya niile, ma hazie nhọrọ gị site na ha. Ọgbụgba ndụ niile ị na-eme na baptizim, nʻoge oriri nsọ, ma nʻime tempụl bụ okwute mwulite niile nke ntọala gị dị ike niime Kraịst. Ị gakwa ezute ọtụtụ ndọlị na ọnwụnwa, mana Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta ga-enyere gị aka site na ha niile.

Ebumnuche nke Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa abụghị ịza gị “ee” ma ọ bụ “mba” banyere nhọrọ ọbụla kwere omume i nwere ike izute. Kama, Onyenwe anyị na-akpoku gị ka ibie ndụ nʻụzọ kacha dị elu ma kacha dị nsọ—ndụ lekwasịrị anya na eziokwu dị ebighị ebi na ngọzi ndị Onyenwe anyị kwere na nkwa. Nke a bụ ụzọ Ya. Ihe odudu nke a ga-akuziri gị banyere ụzọ Ya. Ọ na-akọwa eziokwu ndị O kpughewororịị. Mee ka eziokwu ndị a bụrụ ihe odudu gị maka ime nhọrọ—nhọrọ ndị dị ukwuu, dịka ịgba ndụ niime tempụl na ije ozi mishọn, tinyekwara nhọrọ ndị nke ụbọchị niile, dịka otu esi emeso ndị mmadụ omume ma ọ bụ otu i si eji oge gị eme ihe.

Ebe ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka, ito uto nke ime mmụọ gị bụ nkeonwe. Ọ bụ oke nʻọrụ gị. Mee ike gị imelite onwe gị kwa ụbọchị, debe iwu nsọ Chineke niile ma kwanyere ọgbụgba ndụ gị ugwu, ma nyere ndị ọzọ aka bịaruo Onye Nzọpụta nso.

Lee Mosaia 4:29–30 (ụzọ ndị ahụ eji eme mmehie enweghi ọnụ ọgụgụ, ya mere anyị kwesịrị ịkpachara anya); Hilaman 5:12 (wuo ntọala gị nʻelu Kraịst); Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:57 (were Mmụọ Nsọ dịka onye ndu gị); 25:13 (rapara na ọgbụgba ndụ gị niile).

Otu esiri hazie ihe odudu nke a

Isiokwu nke ọbụla nwere akụkụ atọ:

  1. Eziokwu dị ebighị ebi, ma ọ bụ ozizi nke ozi ọma Jizọs Kraịst eweghachitere.

  2. Ọkpụkpọ okù itinye eziokwu ndị ahụ nʻọrụ

  3. Ngọzi ndị ekwere nkwa nke Onyenwe anyị na-enye ndị ahụ na-ebi ndụ site na nkuzi Ya niile.