Ndị ntoroọbia
1. Atụmatụ Chineke bụ maka gị


Kraịst na-eje ije site nʻubi ama

1.

Atụmatụ Chineke bụ maka gị

Alma 22:13

Tupu ị bịa nʻụwa, i bibụụrụ gị na nne na nna gị nke eluigwe. Ị bụ nwa Ha hụrụ naanya. Nʻeluigwe, ị mụtara banyere atụmatụ nke Chineke maka ezinụlọ Ya. Ị jiri on̄ụ nabata atụmatụ nke a nihi ọ ga-enyere gị aka tolite ma gaaniihu ịdịrị ka Chineke karịa site na ịnata anụ arụ, sonye na ezinụlọ nke ụwa, ma nwee nhụmịhe nke ndụ nʻụwa. Ụfọdụ niime nhụmịhe ndị a ga-esi ezigbote ike. Nna anyị maara nke a, ya mere dịka akụkụ nke atụmatụ Ya, O zitere Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst, inyere gị aka. Anyị na akpọ nke a atụmatụ nke nzọpụta ma ọ bụ atụmatụ nke an̄ụrị.

Eziokwu ndị dị Ebighị ebi

Nna nke Eluigwe bụ onye isi nke atụmatụ ahụ. Ọ bụ Nna nke mmụọ gị, ma Ọ hụrụ gị naanya. O chọrọ inye gị ngọzi Ya nke kachasị ukwuu—ndụ ebighị ebi gị na Ya. Ikwu ya nʻụzọ ọzọ, Ọ chọrọ ka ị dịrị ka Ya karịa, ma bie ndụ ọn̄ụ, ndụ dị ebube nke Ọ na-ebi. O nwere ike niile ma mara ihe niile. Ị nwere ike ịtụkwasị obi na Ya, ọbụna mgbe ndụ siri ike.

Jizọs Kraịst kwere ka atụmatụ ahụ kwee omume. Tupu ekee ụwa, Nna nke Eluigwe họọrọ Ya ka ọ bụrụ Onye Nzọpụta gị. Ọ bụ naanị Jizọs Kraịst bụ naanị onye pụrụ ịkpọghachi gị azụ nʻebe Nna gị nke Eluigwe nọ. Ọ bụ ya mere anyị ji họrọ isoro Ya. Ihe niile dabeere nʻelu nhọrọ ahụ!

Alụmalụ na ezinụlọ dị oke mkpa n’atụmatụ nke Chineke. Ị bụ otu akụkụ nke ezinụlọ nke Chineke, ma ụmụ ya nke mmụọ niile na-abịa nʻụwa site na onye nne na onye nna. Chineke chọrọ ka ụmụ Ya ndị nwoke na nwanyị gaaniihu nʻotu chuwe ihu na ntozu okè dị ebighị ebi. Ndịikom na ndịinyom ọbụla na-etinye aka nhata nha iji nwete alụmalu dị ịhụnaanya ma dị nʻotu. Ndụ ezinụlọ nʻụwa ebe a—ọbụna nʻetozughi okè ya niile—nwere ike wete nnukwu ọn̄ụ. Emere ya ka o nyere gị aka kwadoo maka ndụ ebighị ebi gị na Chineke.

Ọkpụkpọ okù niile

Nwee nhụnuuche dị ebighị ebi. Oge ọbụla izutere ọnwụnwa, mnwale, ndakpọ olileanya, ma ọ bụ nhọrọ siri ike, chetara onwe gị banyere atụmatụ nke Chineke. Lee otu eziokwu ndị dị ebighị ebi ahụ ị maara banyere atụmatụ Ya nwere ike iji nyere gị aka hụta aka mgba gị niile nʻụzọ dị iche.

Chọọ aka Chineke niime ndụ gị. Hụta ụzọ niile Chineke si na-agọzị gị. O nwere ike ịbụ otu omume obi ebere onye ọzọ gosiri gị, otu oge nke udo, ma ọ bụ otu azịza nye ekpere.

Họrọ isoro atụmatụ nke Chineke. Mụta banyere ihe Nna nke Eluigwe chọrọ ka ị mee. Chọọ odudu Ya dịka ị na-amụ akwụkwọ nsọ, okwu niile nke ndị amụma dị ndụ, ọkwa amara nye ezinụlọ, na ngọzi gị nke petrak. Nke a ga-enyere gị aka kwadoo maka ijere Onyenwe anyị ozi, dịka onye mgbasa ozi ọma ma ruo ogologo ndụ gị niile. Mee ka ijere Onyenwe anyị ozi, alụmalụ ebighị ebi, na izulite ụmụaka bụrụ ihe kacha mkpa. Rụọ ọrụ dịịrị gị iji nwee ezinụlọ an̄ụrị ugbua site na-isoro nkuzi niile nke Jizọs Kraịst.

Jizọs Kraịst na-eje ije nʻubi ama ahihia ahihia ma ihè na-enwupụta site niime ya

Ngọzi ndị Ekwere na nkwa

Ị nwere ike izute mnwale niile nke ndụ na mgbam ume ma nwee olileanya na Kraịst. Nihi ị maara banyere atụmatụ ebighị ebi nke Chineke, ị nwere ngwaọrụ dị mkpa nke nwere ike ịnyere gị aka nʻoge niile nke ihe isiike. Ị maara na enwere ọtụtụ ihe ndị dị na ndụ a karịa ihe ahụ na-eme nʻetiti oge ọmụmụ na oge ọnwụ. Ị maara onye ị bụ nʻezie, ihe ebumnuche gị bụ, na onye i nwere ike ịbụ site nʻenyemaka nke Onye Nzọpụta. Jizọs Kraịst bụ ume gị!

Ị nwere ike ịnata ndụ ebighị ebi dị ka ị na-esoro Jizọs Kraịst. Ọ ga-enye gị ike iji dịrị ka Ya karịa, laghachikwuru nne na nna gị nke eluigwe, ma bie ndụ nʻọn̄ụ gị na ndị ịhụrụ naanya ruo ebighị ebi. Tụkwasị obi na Jizọs Kraịst.

Ajụjụ na Azịza niile

Gịnị mere ndụ jiri esi oke ike mgbe ụfọdụ? Kedụ otu m nwere ike iji chota ume? Nhụmịhe gị niile na ndụ nke a—ọbụna ndị ahụ kachasị sie ike—nwere ike ịbụrụ gị ihe ọma. Ha nwere ike inyere gị aka tolite ma gaaniihu dịka ị na-echigharị nʻebe Onye Nzọpụta nọ. Enweghi ihe ị na-agabiga nke Jizọs Kraịst na-anaghị aghọta nihi aja mgbaghara mmehie Ya. Ọ mara nke ọma otu ọ ga-esi enyere gị aka. Nyefe ndụ gị nʻaka Ya, ma Ọ ga-ebuli gị elu gafee ofe obi abụọ na ụjọ niile.

Mgbe ụfọdụ, echiche nke an̄ụrị niime ezinụlọ na alụmalụ nwere ike yie ka ọ tere ezigbo aka. Kedụ otu m nwere ike iji chota obisiike? Nagbanyeghi ihe ọnọdụ gị bụ, esepụkwala aka na atụmatụ Nna nke Eluigwe ma ọlị. O gaghị esepụ aka na gị. Ọ bụrụ na ịkwesịrị ntụkwasị obi nye Onye Nzọpụta nakwa na ọgbụgba ndụ gị, ị ga-achọta azịza niime nkuzi niile nke Jizọs Kraịst. Ọ ghọtara ihe niile ị na-agabiga. Site na Ya, ị ga enwete ume iji rube isi nʻiwu nsọ Chineke ma nata ngọzi niile nke Ọ kwere nkwa. Tụkwasị obi na Ya na nʻozi ọma Ya.

Lee 2 Nefi 9:13 (lee ka ịdị ukwuu atụmatụ nke Chineke anyị dị!); Mosaia 2:41 (ndị ahụ na-edobe iwu nsọ nwere ike ibi ndụ ha na Chineke niime an̄ụrị nke na-enweghi ọgwụgwụ); Alma 12:28–34 (Chineke mere ka ụmụ Ya mata atụmatụ nke mgbapụta); Ebreham 3:22–26 (Atụmatụ nke Chineke gụnyere izite anyị nʻụwa, ebe anyị nwere ike ịhọrọ nʻonwe anyị isoro iwu nsọ Ya niile).

Ajụjụ nke Rekọmend Tempụl

  • I nwere okwukwe niime na ọgbụgba ama nke Chineke, Nna nke Ebighi ebi; Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst; na Mmụọ Nsọ?