Ndị ntoroọbia
10. Ahụ gị dị nsọ


otu nna na otu nne na otu nwa ọhụrụ

Ezinụlọ Na-ekiri anya Nʻebe Ihe nọ, site nʻaka Lovetta Reyes Cairo. Anatara ikike nke Havelight

10.

Ahụ gị dị nsọ

1 Ndị Kọrịnt 6:18–20

Ahụ gị bụ onyinye dị itụnaanya sitere na Nna gị nke Eluigwe. inwe anụ arụ na-enye gị ike bara ụbara iji gosi mnwere onwe gị maka ịhọrọ nʻetiti ihe ziri ezi na nke nʻezighi ezi. Ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere nwere ike ịnyere gị aka hụ anụ arụ gị site na anya nke Chineke. Ma nke a na-arọpụta nnukwu ndịiche niime nhọrọ gị niile banyere ihe ị ga-ejiri anụ arụ gị eme na otu isi elekọta ya.

Eziokwu ndị dị Ebighị ebi

Anụ arụ dị nʻoyiyi nke Chineke—Onye kacha dị ebube, kacha nwee ugwu na mbara igwe. Akwụkwọ nsọ jiri anụ aru anyị tụnyere tempụl dị nsọ, ebe Mmụọ nwere ike ibi. Nʻezie, anụ arụ gị ezughi okè ugbua. Mana nhụmịhe niile ahụ iji anụ arụ gị na-enwete nwere ike nyere gị aka kwadoo ịnata nʻotu ụbọchị anụ arụ zuru okè, nke bilitere nʻọnwụ, nke dị ebube.

Mkpụrụ obi gị gụnyere anụ arụ gị na mmụọ gị. Maka nke a, ahụike nke anụ arụ na ahụike nke ime mmụọ nwere njikọta. Onye Nzọpụta kpughere Okwu nke Amamiihe iji kuzie ụkpụrụ nke nlekọta anụ arụ gị nakwa ịkwe nkwa ngọzi niile nke anụ arụ na nke ime mmụọ.

Mmetụta niile nke mmekọrịta bụ otu akụkụ dị mkpa niime atụmatụ Chineke iji rọpụta alụmalụ nwere an̄ụrị na ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi. Mmetụta ndị a abụghị njọ—ha dị nsọ. Nihi mmetụta niile nke mmekọrịta dị nnọọ nsọ ma dịkwa oke ike, Chineke enyewo gị iwu Ya nke ịdị ọcha mmekọrịta iji kwadoo gị ijri mmetụta ndị a dịka Ọ siri chọọ. Iwu nke ịdị ọcha mmekọrịta na-ekwu na Chineke kwadoro mmekọrịta anụ ạrụ naanị nʻetiti otu nwoke na otu nwanyị ndị gbaworo akwụkwọ. Ọtụtụ mmadụ na-eleghara iwu Chineke anya ma ọbukwanụ na-akwa ya emo, mana Onyenwe anyị na-akpọku anyị ịbụ ndị na-eso ụzọ Ya ma debe ọkọlọtọ kacha elu.

Ọkpụkpọ okù niile

Lekọta anụ arụ gị—na anụ arụ nke ndị ọzọ anya—na nkwanye ugwu. Dị ka ị na-eme mkpebi niile gbasara uwe, ọdịdị ntụtụisi gị, na ngosipụta gị, jụọ onwe gị, “Ana m akwanyere anụ arụ m ugwu dị ka onyinye dị nsọ si nʻaka Chineke?” Nna nke Eluigwe chọrọ ka anyị hụkọrịta ibe anyị maka onye anyị bụ nʻezie: nʻabụghị naanị dịka anụ arụ mana dịka ụmu Ọ hụrụ naanya ndị nwere akaraka si nʻigwe. Zere njikwa ndị na-ekwusiike ma ọ bụ na-adọtara anụ arụ gị nlebara anya nke nʻezighi ezi karịa nke onye ahụ ị bụ dịka nwa nke Chineke onye nwere ọdịniihu dị ebighị ebi. Kwee ka eziomume dị ọcha na ịhụnaanya maka Chineke duo nhọrọ gị niile. Chọọ ndụmọdụ site nʻaka ndị ezinụlọ gị.

Mee ihe ndị ga-agba anụ arụ gị ume, nʻabụghị ihe ndị ga-emerụ ya ahụ ma ọ bụ mebie ya. Jiri obi ekele nwee ọn̄ụ nʻihe ọma niile nke Chineke rọpụtaworo. Cheta na mmanya ike, ụtaba, kọfị, tii, na ọgwụ ndị na-emerụ ahụ na ọgwụ ike ndị ọzọ abụghị maka anụ aru gị ma ọ bụ maka mmụọ gị. Ọbụnadị ọgwụ ọgwụgwọ, dịka ọgwụ dọkịnta nyere, nwere ike ibibi ma ọ bụrụ ma an̄ụbiga ya okè.

Debe mmekọrịta anụ arụ na mmetụta mmekọrịta nsọ. Ha ekwesịghị ị bụ isiokwu nke egwuregwu ma ọ bụ ime ihe ọchị. A sị na ọ bughị alụmdi dị nʻetiti nwoke na nwanyị, ọ bụ ihe jọrọ njọ imetụ aka nʻebe akụkụ ahụ onye ọzọ dị nzizo na nsọ ọbụna ọ bụrụ na-eyi uwe. Ọ bụrụ na nhọrọ niile gbasara ihe ị na-eme, ihe ị na-eleanya, agụ, ihe ị na-egere ntị, na-eche gbasara, ihe ezipụrụ nʻikuku, ma ọ bụ edereede, zere ihe ọbụla nke na-akpachara anya akpake echiche agụụ mmekọ na ndị ọzọ ma ọ bụ nʻonwe gị. Nke a gụnyere nziakwụna nʻụdị ọbụla. Ọ bụrụ na ịhụ ọnọdụ ma obụ ihe omume ọbụla ndị na-eme ka ọnwụnwa sikwuo ike, zere ha. Ị maara ihe ọnọdụ na ihe omume ndị a bụ. Ma ọ bụrụ na imaghi nke ọma, Mmụọ ahụ, ezinụlọ gị, na ndị ndu nwere ike nyere gị aka mata. Gosi Nna gị nke Eluigwe na ị na-akwanyere ugwu ma na-asọpụrụ ike dị nsọ nke ịkepụta ndụ.

Jizọs Kraịst na-eche echiche ma na-adabere nʻelu mkpara ya

Ngọzi ndị Ekwere nkwa

Nsọpụrụ inwere maka onwe gị na ndị ọzọ ga-abawanye dịka ị na-akwanyere anụ arụ gị ugwu site na agwa gị, ọdịdị gị, na uwe gị.

Onyenwe anyị kwere nkwa nnukwu ụba nke mmata ihe nye ndị ahụ na-edebe Okwu nke Amamiihe. Anụ aru nke nwere ezi ahụike, na-enweghi nriri ahụ, nakwa abawanye ikike gị ịnata mkpughe nkeonwe, chee echiche nʻụzọ dọrọ anya, ma jeere Onyenwe anyị ozi.

Idebe iwu nke ịdị ọcha mmekọrịta na-ewete nkwado nke Chineke ya na ike nke ime mmụọ nkeonwe. O ga-echekwa gị nakwa ezinụlọ nke ọdịnihu gị. Mgbe ị ga-agba akwụkwọ, iwu nke a ga-enwetere nnukwu ịhụnaanya, ntụkwasị obi, na ịdị nʻotu na alụmdị na nwunye gị. Irubere iwu nke a isi ga-eme ka o kwee omume ka ị na-aganiihu ebighị ebi ma dịrị ka Nna gị nke Eluigwe karịa. Obisiike gị ga-eto dịka ị na-ebi ndụ dị ka onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst.

Ajụjụ na Azịza niile

Gịnị bụ ọkọlọtọ nke Onyenwe anyị gbasara uwe, nlekọta ọdịdị, egbugbu, na mkpopu anụ arụ? Ọkọlọtọ nke Onyenwe anyị bụ ka gị kwanyere ịdị nsọ nke anụ arụ gị ugwu, ọbụna mgbe nke a pụtara ịdị iche site na ndị ọzọ. Ka eziokwu nke a na Mmụọ ahụ bụrụ onye odudu gị dịka ị na-eme mkpebi obi—tụmadị mkpebi obi ndị ahụ nnapụta ha ga-anọtee aka nʻanụ arụ gị. Nwee amamịhe ma kwesị ntụkwasị obi, ma chọọ ndụmọdụ site nʻaka ndị ezinụlọ na ndị ndu gị.

Kedụ otu m ga-esi merie ọnwụnwa na agwa ọjọọ? Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst nwere ike ahụ iji nyere gị aka. Mejupụta ndụ gị jiri ihe ndị ahụ na-akpọbata ike Ha niime ndụ gị, ụdị dịka ekpere, ọmụmụ akwụkwọ nsọ, na ijere ndị ọzọ ozi. Chigharịa nʻebe Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya nọ, ma ị ga-achọta adịghị ike nwere ike ịmecha bụrụ ume. Mgbe ọ dị mkpa, chọọ enyemaka site nʻaka ndị ezinụlọ gị, ndị ndu, na ndị ọkachamara atụkwasịrị obi. Ha ga-enyere gị aka nweteghachi ndụ gị na njikwa gị. Ọ nwere ike ịwe oge, ya mere nwee ndịdị, ma akwụsịkwala ma ọlị.

Ana m enwe ndọta mmasị maka ndị ahụ mụ na ha bụ otu ụdị okike ọmụmụ. Kedụ otu ọkọlọtọ ndị a si emetụta m? inwe ndọta masị maka otu ụdị okike abụghị mmehie. Ọ bụrụ na inwe mmetụta ndị a ma ị naghị achuso ha ma ọ bụ ị naghị eme omume ha, i na-edebe iwu ịdị ọcha mmekọrịta nke Nna nke Eluigwe. Ị bụ nwa ahụrụ naanya nke Chineke nakwa onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst. Cheta na Onye Nzọpụta ghọtara ihe niile ị na-agabiga. Site na njikọta ọgbụgba ndụ gị na Ya, ị ga-achọta ume iji rube isi nʻiwu nsọ Chineke ma nata ngọzi niile nke Ọ kwere nkwa. Tụkwasị obi na Ya na nʻozi ọma Ya.

Abụ m onye emetọrọ, ma ihere na-eme m. Ikpe ọ mawo m niihi njọ? Mba. Ị bụ onye dabara na mmetọ ọbụla ma ọ bụ mwakpo metụtara anaghị eme ka ịbụrụ onye ikpe ọmụma nke mmehie. Onyenwe anyị hụrụ gị naanya. Ọ bụ ume gị. Ọ chọrọ ịnyere gị aka, gwọọ gị, ma nye gị udo. Ndị ndụmọdụ ọkachamara atụkwasịrị obi, ndị otù ezinụlọ gị, na ndị ndu gị nwekwara ike ịnye aka.

Lee Jenesis 1:27 (anyị niile nọ nʻoyiyi nke Chineke); Jọn 14:18 (Onye Nzọpụta na-ekwe nkwa nkasị obi); Ndị Filipi 4:7 (udo nke Chineke karịrị nghọta); Mosaia 2:41 (ndị ahụ na-edebe iwu nsọ Chineke ka a na-agọzi na anụ ahụ nakwa niime mmụọ); Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:15 (mmụọ ahụ na anụ arụ bụ mkpụrụ obi); 89 (Okwu nke Amamiihe); 121:45 (echiche ndị dị eziomume na-ebute mbawanye nke obisiike).

Ajụjụ nke Rekọmend Tempụl

  • Onyenwe anyị ekwuwo na ihe niile ka a ga “eme n’ịdị ọcha” n’ihu Ya (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 42:41). Ị na-agba mbo maka agwa ịdị ọcha niime echiche gị niile na omume gị niile?

  • Ị na-erube isi nye iwu nke ịdịọcha mmekọrịta?

  • Ị ghọtara ma rube isi nye Okwu nke Amamihe?