Ọgọst 24–30 ‘A Ga M Ekwupụta Ihe Ọ Meworo Maka Mkpụrụ M’: Abụ ọma 49–51; 61–66; 69–72; 77–78; 85–86,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
Ọgọst 24–30 ʻA Ga M Ekwupụta Ihe Ọ Meworo Maka Mkpụrụ obi M,ʻ” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Ịzọpụta Nke ahụ Furu efu, site n’aka Michael Malm
Ọgọst 24–30: “A Ga M Ekwupụta Ihe Ọ Meworo Maka Mkpụrụ obi M”
Abụ ọma 49–51; 61–66; 69–72; 77–78; 85–86
Ndị odee nke Abụ ọma niile kesaara mmetụta dị omimi niime abụ ha. Ha dere maka mmetụta nke obi ịda mba, ịtụ ụjọ, na ịnwe mmụọ nchegharị. Mgbe ụfọdụ, ọ dịịrị ha ka Chineke ọ hapụwo ha, ma ụfọdụ abụ ọma nwere ụdaolu mgbochi ma ọ bụ obi nkoropụ. Ọ bụrụ na enwewo mgbe ịchere otu ahụ, ịgụ Abụ ọma nwere ike nyere gị aka mata na ọ bụghị naanị gị. Mana ị ga-ahụkwa abụ ọma ndị na-agba ume mgbe ịnwere ụdị mmetụta niile ahụ, niihi na ndị ode abụ ọma tokwara Onyenwe anyị otuto niihi ịdịmma Ya, ma nwee ịtụnaanya nihi ike Ya, ma n̄ụrịa na ebere Ya. Ha maara na anyị bu ibu nke ajọọ ihe na mmehie mana Onyenwe anyị dị “mma, ma dịrị njikere ịgbaghara” (Abụ ọma 86:5). Ha ghọtara na ịnwe okwukwe niime Onyenwe anyị apụtaghị na ị gaghị enwe nsogbu site na nchegbu, mmehie, ma ọ bụ ụjọ. Ọ pụtara na ị maara onye ịga agakwuru mgbe i nwere mkpa.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Abụ ọma 49; 62:5–12
Mgbapụta na-abịa naanị site n’aka Jizọs Kraịst.
Abụ ọma 49 nwere ozi maka “ma ndị nta na ma ndị ukwu, ndị bara ụba na ndị ogbenye” (amaokwu nke 2). Kedụ ihe ị ga-ekwu na ozi nke a bụ? Kedụ mmetụta inwere Abụ ọma 62:5–12 gbakwụnyere nʻelu ozi ahụ?
Ịgụ abụ ọma ndị a nwere ike kpatee mmụọ gị itule ụzọ ndị eji anwa anyị ọnwụnwa kʻanyị tụkwasị obi nʻihe ọzọ na-abụghị na Chineke maka mgbapụta (lee Abụ ọma 49:6–7). Kedụ otu ndụ gị si enwete mmetụta site na ịgba ama gị na “Chineke ga-agbapụta mkpụrụ obi [gị] site nʻike nke ili”? (Abụ ọma 49:15).
Abụ ọma 51; 85–86
Niihi ebere nke Onye Nzọpụta, e nwere ike ịgbaghara m.
Eze David dere Abụ ọma 51 mgbe ọ matara mkpa ọ dị ịnata mgbaghara—ihe dịkwara anyị niile mkpa. Kedụ amaokwu ndị na-akọwa mmetụta ndị ịnweworo na mbụ? Gịnị ka ị na-ahụta niime abụ ọma nke a na-enye gị olile anya maka mgbaghara?
Ịnwekwara ike chọọ Abụ ọma 51 maka enyemaka banyere ịhe ọ pụtara ịchegharị. Depụta ihe ndị ị chọtara. Lee ma ị ga-agbakwụnye na ndepụta gị site na-ịchọ nʻozi Onyeisi Russell M. Nelson, “Anyị Nwere ike Ime Ihe Kacha Dị mma ma Dị Mma Karịa,” (Liahona, May 2019, 67–69).
Kedụ otu ị ga-esi akọwa otu ọ dị ka ịnata mgbaghara site na Kraịst? Ọ bụrụ na ịchọọ enyemaka iji kọwaa mmetụta gị, ịnwere ike chọọ niime Abu ọma 51:1–2, 7–12; 85:2–9. Ụfọdụ ndị mmadụ na-enwe mmasị ise ihe ma ọ bụ chọta foto niile ndị na-egosịpụta mmetụta ha; ịnwere ike nwaa nke ahụ. Ị nwekwara ike bụọ otu abụ ma ọ bụ gee ntị nʻabụ banyere Onye Nzọpụta, ụdị dị ka “Eguzoro M na Ịtụnanya” (Abụ niile, no. 193).
Maka ịchegharị, ọ dị mkpa nʻanyị nwere okwukwe na-abụghị naanị na Jizọs Kraịst nwere ike ịsacha anyị mana na Ọ ga-eme ya Kedụ ihe ndị ị chọtara niime Abụ ọma 86:5, 13, 15 na-enyere gị aka mata na Onye Nzọpụta dị ike ma dịrị njikere ịgbaghara?
Lee kwa Alma 36; Peter F. Meurs, “Ọ Nwere Ike Ịgwọ M!,” Liahona, Me 2023, 39–41.
Abụ ọma 51:13–15; 66:5–20; 71:15–24
Ọgbụgba ama m banyere Jizọs Kraịst nwere ike ịnyere ndị ọzọ aka ịbịakwute Ya.
Tulee otu isiri nwete ọgbụgba ama maka Jizọs Kraịst na ike aja mgbaghara Ya. Ma mgbe ahụ, dị ka ị na-amụ Abụ ọma 51:13–15; 66:5–20; 71:15–24, chee banyere otu ịnwere ike iji kpọkuo ndị ọzọ ị “bịa ma hụ ọrụ niile nke Chineke” (Abụ ọma 66:5). Ọ bụrụ na ị ga-enwe ohere “ikwupụta ihe [Onyenwe anyị] meworo maka mkpụrụ obi [gị]” (Abụ ọma 66:6), kedụ ihe ị ga-ekwupụta?
Gịnị ka ọ pụtara nye gị “ikwu maka eziomume [Ya] ogologo ụbọchị niile”? (Abụ ọma 71:24).
Lee kwa Alma 26.
“Bịa ma nụrụ, … ma aga m Ekwupụta ihe [Chineke] meworo maka mkpụrụ obi m” (Abụ oma 66:16).
Abụ ọma 63; 69; 77–78
Onyenwe anyị ga enyere m aka nʻoge m nwere mkpa.
Ụfọdụ abụ ọma na-akọwa ihe ọ dị ka ya ịnwe mmetụta ịnọ ebe dị anya site nʻebe Chineke nọ ma chọo enyemaka Ya ọkụ ọkụ (lee Abụ ọma 63:1, 8; 69:1–8, 18–21; 77:1–9) Na Abụ ọma 63; 69; 77–78, kedụ ihe ịchọpụtara nyere ndị ode abụ ọma mmasi obi ike?
Mgbe ịnwere nchekasị, kedụ otu o si enyere gị aka ị “cheta ọrụ niile nke Onyenwe anƴị” ma “ihe ndị ịtụnaanya nke mgbe ochie” Ya? (Abụ ọma 77:11). Ụfọdụ ihe ndị dị ịtụnaanya ahụ ka akowara niime Abụ ọma 78. Dị ka ị na-agụ banyere ha, tulee uche ịhe na-enyere gị aka “hiwe olileanya [gị] na Chineke”amaokwu nke 7).
Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Niihi Sọnde nke a bụ Sọnde nke ise na ọnwa, ndị nkuzi Praịmarị ka agbara ume iji ihe omume ọmụmụ ihe niime “Appendix B: Ịkwado Ụmụntakịrị maka Oge ndụ N’ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke.”
Abụ ọma 51; 86:5, 13, 15
Mgbe m mere nhọrọ na-ezighi ezi, Jizọs nwere ike ịnyere m aka gbanwe.
-
Ị nyere ụmụ gị aka chọpụta eziokwu ndị banyere nchegharị niime Abụ ọma, ịnwere ike see obi dị nnukwu. Emesịa ịnwere ike nyere ụmụ gị aka dee nime obi ahụ ihe ọjọọ ndị Setan na-anwa anyị ọnwụnwa ịme. Olee otu anyị si ewepụ ihe ndị a site niime obi anyị? Rịọ ụmụ gị ịchọta okwu a “obi” niime Abụ ọma 51:10–17. Kwuo okwu banyere ihe amaokwu ndịa na-akụzi banyere nchegharị. Kwee ka ụmụ gị hichapụ okwu ndị ahụ site nʻobi ahụ ma dee okwu ọhụrụ ndị na-akọwa ụzọ Jizọs si agbanwe anyị mgbe anyị chegharịrị.
-
Ị nwere ike chọọ ịnyere ụmụ gị aka mụta ihe ọ pụtara ị nwe “obi tiwara etiwa ma nke dị nchegharị” (Abụ ọma 51:17). Ha nwere ike kesaara onwe ha ohere ijiri gbawa otu ihe nwere mkpo siri ike, ụdị dị ka ahụekere ma ọ bụ akụ. Ị nwekwara ike nyere ha aka tụnyere mkpo ahụ ya na ihe ndị na-egbochi anyị ghara ịnwete mmetụta ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe. Olee otu anyị nwere ike isi mehere Ya obi anyị?
-
Unu nwekwara ike lekọta anya n’otu foto nke Onye Nzọpụta ma jụọ ụmụ gị okwu ndị ha nwere ike iji kọwaa Ya. Kpọkuo ụmụ gị ịchọta okwu ndị na-akọwa Ya niime Abụ ọma 86:5, 13, 15. Gịnị mere o ji dị mkpa imata maka ihe ndị a banyere Ya?
Abụ ọma 61:2–3
Jizọs Kraịst bụ oke nkume m.
-
Ọ nwere ike masị ụmụ gị ịse ihe osise niile nke ọdịmara ndị ahụ niime Abụ ọma 61:2–3. Kedụ otu Jizọs Kraịst si bụrụ “oke nkume” ahụ dị elu (amaokwu nke 2), “ebe mgbaba,” na “tọwa siri ike”? (Amaokwu 3)>
“Ị bụrụwo ebe mgbaba nye m, na tọwa siri ike” (Abụ ọma61:3).
Abụ ọma 66:16; 77:11; 78:6–7
“Aga m echeta ọrụ niile nke Onyenwe anyị.”
-
Rịọ ụmụ gị ka ha kesaa ụfọdụ akụkọ akwụkwọ nsọ na-akacha amasị ha (foto ndị sitere na Akwụkwọ Nka Ozi ọma nwere ike nye aka). Kedụ ihe akụkọ ndị a na-akuziri anyị banyere Onye Nzọpụta? Unu nwere ike gụkọta Abụ ọma 66:16 ọnụ ma keere onwe unu ohere iji zaa ajụjụ nke a “Kedụ ihe Onyenwe anyị meworo maka mkpụrụ obi m”?
-
Dị ka unu na-agụkọta Abụ ọma 77:11; 78:6–7 ọnụ, ịnwere ike kesara ibe unu otu unu ji agbalị “ịcheta ọrụ niile nke Onyenwe anyị” (Abụ ọma 77:11), gụnyekwara ọrụ Ya niile nime ndụ unu. Olee otu oriri nsọ si enyere anyị aka “ịcheta mgbe niile”? (Moronaị 4:3; 5:2).
Abụ ọma 71:8
Enwere m ike ịgwa ndị ọzọ banyere Jizọs Kraịst.
-
Mgbe ị gụsịrị Abụ ọma 71:8 gị na ụmụ gị, kpọkuo ha ise ọnụ sara mbara. Rịọ ha ka ha nyere gị aka “ijupụta” ọnụ ahụ jiri foto niile ma ọ bụ okwu niile ndị na-anọchite ihe ndị anyị nwere ike ịgwa ndị ọzọ banyere Kraịst.
-
Emesịa ịnwere ike kesaa otu foto banyere Jizọs Kraịst ka o siri nʻaka fee nʻaka. Onye ahụ ji foto ahụ nwere ike kwuo otu ihe ha maara banyere Ya. Kedu otu anyi nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka mata maka ihe ndị a?
Ụmụaka nwere ọtụtụ ihe ha ga ekesaa. “Mgbe ọbụla ụmụaka mụtara otu ihe ọhụrụ, ha na-achọ ikesa ya nye ndị ọzọ. Gbaa ọchịchọ a ume site na-ịnye ụmụaka ohere iji kuzie ụkpụrụ niile nke ozi ọma nye ibe ha, ndị ezi na ụlọ ha, na ndị enyi ha. Rịọkwa ha ka ha kesaara gị echiche ha, mmetụta ha, na nhụmiihe ha nke metụtara ụkpụrụ niile nke ị na-akụzi. Ị ga-ahụ na ha nwere nghọta niile ndị dị mfe, na-enweghi ntụpọ, ma nke dị ike” (Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Onye Nzọpụta, 32).
Abụ ọma 86:7
Nna nke Eluigwe na-anụ ma na-aza ekpere m niile.
-
Ọtụtụ abụ ọma ahụ dị nnọọ ka ekpere nye Chineke. Dị ka gị na ụmụ gị na-agụ Abụ ọma, ịnwere ike gosi ha ihe ndị anyị nwere ike iji kparịta ụka anyị na ndị ahụ nọ nʻebe tere aka, ụdị dị ka ekwenti ma ọ bụ leta. Emesịa gụọ Abụ ọma 86:7. Olee otu anyị ga-esi “akpọku” Nna nke Eluigwe? Kedụ otu O si aza anyị?
-
Unu nwere ike gụkọọ otu egwu banyere ekpere, ụdị dị ka “Ekpere nke Otu Nwata” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 12–13, 12–13; lee kwa Susan H. Porter, “Kpee ekpere, Ọ Nọ Ebe ahụ,” Liahona, Me 2024, 77–79). Gwakọrịta onwe unu banyere oge niile mgbe Chineke zara ekpere unu.
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .