Julaị 27–Ọgọst 2. ‘Ana M Arụ Nnukwu Ọrụ’: Ezra 1; 3–7; Nehemaya 2; 4–6; 8,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie (2026)
Julaị 27–Ọgọst 2. ‘Ana M Arụ Nnukwu Ọrụ,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
E nwere M Nnukwu Ọrụ Ịrụ, site nʻaka Tyson Snow
Julaị 27–Ọgọst 2: “Ana M Arụ Nnukwu Ọrụ”
Ezra 1; 3–7; Nehemaya 2; 4–6; 8
Ndị Juu bụ ndị adọkpụworo nʻagha na Babilọn ruo ihe ruru afọ 70. Jerusalem na tempụl ahụ efunarịwo ha, ma ọtụtu echefuwo mkpebi ha nʻebe iwu nke Chineke nọ. Mana Chineke echefughị ha. Nʻezie, Ọ mawo ọkwa site nʻọnụ onye amụma Ya, “ Aga m eleta unu, ma mezuo eziokwu m nʻebe unu nọ, wee mee ka unu lọghachi”(Jeremaya 29:10) Iji mezuo amụma nke a, Onyenwe anyị rọpụtara ụzọ maka ndị Ya iji lọghachi—ma ruo na Jerusalem ma, nke kacha nke, ruo na ọgbụgba ndụ ha niile. Ma Ọ kpọlitere ndị odibo ndị rụzuru “nnukwu ọrụ” (Nehemiah 6:3): Otu gọvanọ akpọrọ Zerubbabel hụrụ maka mwuzigharị nke ụlọ nke Onyenwe anyị. Ezra, onye nchụaja na odee, nyeere ndị mmadụ aka chigharịa obi ha niile azụ nʻebe iwu nke Onyenwe anyị nọ. Ma Nehemaya duru na mwuzigharị nke mgbidi niile nke nchekwa gburugburu Jerusalem. Ha zutere mmegide, mana ha nwetekwara enyemaka site nebe ndị na-atụghị anya. Nhụmiihe ha niile nwere ike igwa anyị okwu ma kpakee anyị niihi na anyịnwa kwa na-arụ nnukwu ọrụ. Ma dị ka nke ha, ọrụ anyị nwere ọtụtụ ihe metụtara ụlọ nke Onyenwe anyị, iwu nke Onyenwe anyị, na nchekwe nke ime mmụọ anyị na-achọta na Ya.
Maka nchikọta nke akwụkwọ nke Ezra na Nehemaya, lee “Ezra” na “Nehemaya” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ezra 1
Onyenwe anyị na-akpake ndị mmadụ imejuputa ebumnuuche Ya niile.
Mgbe Persia merichara Babilọn, Onyenwe anyị kpakere eze ndị Persia, Cyrus, iziga otu otù ndị Juu ịga Jerusalem iwuzigharị tempụl ahụ. Dị ka ị na-agụ Ezra 1, hụba ama ihe Cyrus mere iji kwadoo ndị Juu nʻọrụ nke a dị mkpa. Kedụ otu i si ahụ Onyenwe anyị si arụ ọrụ site naka ndị nwoke na ndị nwanyị nọ na gburugburu gị, gụnyere ndị ahụ na-abụghị ndị otù Nzukọ nsọ Ya? Gịnị ka nke a na-atụziri gị banyere Onyenwe anyị na ọrụ Ya?
Lee kwa Aịzaya 44:24-28.
Ezra 3:8–13; 6:16–22
Ụlọ nke Onyenwe anyị bụ ebe ọn̄ụ dị.
Mgbe ndị Babịlọn wakporo Jerusalem, ha bụsasịrị ihe dị na tempụl ahụ ma kpọọ ya ọkụ ruo nʻala (lee 2 Ndị Eze 25:1–10; 2 Ihe e mere 36:17–19). Kedụ ihe ichere gaara emetụta gị nʻobi ma ọ bụrụ na ịbụ otu niime ndị Juu ndị hụrụ ihe a?(lee Abụ ọma 137). Mata otu o jiri metụta ndị Juu ahụ nʻobi, mgbe ọtụtụ iri afọ gasịrị, mgbe ahapụrụ ha ịlọghachi ma wuzigharịa tempụl ahụ (lee Ezra 3:8–13; 6:16–22). Nke ahụ nwere ike kpalie gị itule nʻuche mmetụta nke gị onwe gị banyere Onyenwe anyị na ụlọ Ya. Gịnị kpatara iwu tempụl jiri bụrụ ihe eji an̄ụrị ọn̄ụ?
Tempụl nke Zerubbabel, ngosipụta site n’aka Sam Lawlor
Ezra 4–7; Nehemaya 2; 4; 6
Chineke nwere ọrụ dị mkpa maka m ịrụ.
Ọrụ nke Onyenwe na-ara ahụ adịghị enwekarị mmegide. Nke a bụ eziokwu maka mbọ niile nke Zerubbabel na Nehemaya duru. Nke a bụ ụzọ dị mfe nke nwere ike inyere gị aka mụta ihe site nʻakụkọ ndị a ma tulee otu inwere ike iji rụọ ọrụ nke Onyenwe anyị na-agbanyeghị mmegide:
Ọrụ nke Chineke maka Zerubbabel (Ezra 4:3):
Ọrụ nke Chineke maka Nehemaya (Nehemaya 2:17-18):
Ọrụ Chineke maka m:
Mmegide Zerubbabel zutere (Ezra 4:4–24):
Mmegide Nehemaya zutere (Nehemaya 2:19; 4:1–3, 7–8; 6:1–13):
Mmegide m na-ezute:
Otu Zerubbabel jiri zaghachi (Ezra 5:1–2):
Otu Nehemaya jiri zaghachi (Nehemaya 2:20; 4:6, 9; 6:3–15):
Otu m ga-esi azaghachi:
Maka enyemaka ịtụnyere nhụmihe nke Nehemaya na ndụ gị, inwere ike mụọ ozi nke Onyeisi Dieter F. Uchtdorf “Anyị Na-arụ Nnukwu Ọrụ ma Anyị Enweghị ike Agbada Ala” (Liahona, Me 2009, 59–62), kachasị nkeji abụọ ndị ikpeazụ. Dị ka ị na-eche banyere ọrụ Chineke nyeworo gị, ịnwere ike mụọ “Isiokwu Ndị Iyom Nta” ma ọ bụ “Isiokwu Ndị Kworum Ọkwa Nchụaja nke Erọn” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Ma ọ bụ inwere ike chọọ niime abụ dị ka “Dị ka Ụmụnne ndị nwanyị N’ime Zayọn” (Abụ, no. 309) ma ọ bụ “Unu Ndị Okenye nke Izrel” (Abụ,, no. 319).
Kedụ ihe i chere ọ pụtara inwe “uche ịrụ ọrụ” nʻije ozi nke Onye Nzọpụta? (Nehemaya 4:6). Gịnị ka o nwere ike ịpụta inwe “aka ọma nke Chineke nʻelu isi [gị]” dị ka ị na-arụ ọrụ Ya? (Nehemaya 2:8; lee kwa Nehemaya 2:18; Ezra 7:6, 9, 27–28). Olee otu i siworo hụ aka Ya niime mbọ niile gị ijere Ya ozi?
Nehemaya 8
Ana agọzi m mgbe m mụrụ akwụkwọ nsọ.
Maka ndudugandu ndị a nọ na ndọkpụ n’agha, ndị Juu nwere obere ohere nye “akwụkwọ nke iwu nke Mosis” (Nehemaya 8:1). Na Nehemaya 8, Ezra gụụrụ ndị mmadụ iwu ahụ. Kedụ ihe ị na-achọta nime isi nke a na-egosi otu Ezra na ndị ya si nwee mmetụta banyere Chineke na okwu Ya? (lee kacha nke amaokwu ndịa 1–12). Kedụ ihe na ndụ gị na-egosi otu ị na-eche banyere Chineke na okwu Ya?
Lee kwa Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Ezra Taft Benson (2014), 115–24.
Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ezra 3:8–13; 6:16–22
Ụlọ nke Onyenwe anyị bụ ebe ọn̄ụ.
-
Maka ikuziri ụmụ gị banyere ọn̄ụ nke ndị Juu nwetere mgbe ewuzigharịchara tempụl ha, ịnwere ike gosi ha foto dị ka nke nọ nʻokpuru. Kwuo okwu banyere ihe kpatara ndị a nwere iji nwee obi ụtọ ịnọ nʻụlọ nke Onyenwe anyị. I nwerekwara ike gwa ụmụ gị ihe kpatara tempụl ahụ jiri bụrụ ebe ọn̄ụ dị maka gị. Kedụ otu tempụl siworo nyere gị aka nwee mmetụta ịbịaru Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta nso?
-
Dị ka ị na-agụ Ezra 3:10-13 gị na ụmụ gị, nyere ha aka chọpụta okwu ndị na-egosi otu ndị Juu siri nwee mmetụta mgbe a na-ewuzigharị tempụl ahụ. Mgbe iruru na njedebe nke amaokwu 13, ikekwe unu nwere ike tikọta mkpu ọn̄ụ ọnụ. Nyere ụmụ gị aka chee maka ihe niile ekwesịrị iji maka ha nwee an̄ụrị niihi na Onyenwe anyị enyewo anyị ọtụtụ tempụl? Kedụ otu anyị ga-esi egosi ọn̄ụ ahụ?
-
Tulee ịbụ otu abụ banyere tempụl gị na ụmụ gị, nke dị ka ọdịnọọgbara nke abụọ nke “Nnọnụ Nʻebe Obibi” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Mgbe agụsịrị otu ahịrị, i nwere ike kwụsịtụ ka ị gwa otu nwata ka ọ kesaa otu ihe ọ hụrụ naanya banyere tempụl. Ị nwekwara ike lee anya na foto niile nke tempụl niile mgbe unu na-abụ abụ.
Nehemaya 2:17–20; 6:1–9
Onyenwe anyị ga enyere m aka rụọ “nnukwu ọrụ” Ya.
-
Kesaara ụmụ gị akụkọ nke Nehemaya (lee Nehemaya 2:17–20; 6:1–9; ma ọ bụ “Nehemaya” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 173–74). Dị ka unu na-agụ Nehemaya 2:20, gị na ụmụ gị nwere ike “bilie” ma mee ka agasị na unu na-enye aka ewu mgbidi niile nke Jerusalem. Ma ọ bụ na ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ iwu mgbidi jiri okwute ma ọ bụ mkpanaka ndị ọzọ. Dị ka ha na-eme, i nwere ike nyere ha aka chee banyere ihe ndị dị mkpa Nna nke Eluigwe chọrọ ka anyị mee.
1:38Nehemiah
-
Dị ka unu na-agụ Nehemaya 6:6, kpọkuo ụmụ gị ka ha welie aka ha mgbe ha nụrụ ka ikwuru “gbaa aka m ume.” Gwa ụmụntakịrị ahụ banyere oge mgbe ịnwetere mmetụta na Chineke na-agba aka gị ume ịrụ ọrụ Ya.
Nehemaya 8:1–12
Akwụkwọ nsọ niile bụ ngọzi.
-
Gụpụta n’olu dara ụda ụfọdụ nkebiokwu sitere na Nehemaya 8:2–3, 5–6, 8–9, 12 nke na-akọwa ihe ndị mmadụ mere mgbe ha nụrụ ka Ezra gụpụtara akwụkwọ nsọ. Dị ka ị na-agụ, ụmụ gị nwere ike mee ejije nkebiokwu ndị a. Mgbe ahụ unu nwekwara ike kesakọrịta onwe unu otu unu siworo chee mgbe ịgụrụ ma ọbụ nụ akwụkwọ nsọ.
-
Dị ka unu na-agụkọta Nehemaya nke 8:8ọnụ, i nwere ike jụọ ụmụ gị ihe na-anyere ha aka ịghọta akwụkwọ nsọ. Gosi ha otu esi ejiri enyemaka niile nke ọmụmụ akwụkwọ nsọ dị ka Odudu ruo na Akwụkwọ nsọ na Isiokwu niile na Ajụjụ niile (Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Kpọkuo ụmụ ntakịrị gị ikesa otu ihe ha mụtara banyere Onye Nzọpụta site na akwụkwọ nsọ.
Chọọ eziokwu ebighị ebi dị nime akwụkwọ nsọ. “Akwụkwọ nsọ ahụ … jupụtara na eziokwu nke ozi ọma, mana mgbe ụfọdụ ọ na-ewe mbọ akpachapụrụ anya mee iji chọta ha. Dị ka unu na-amụkọta ọnụ site na akwụkwọ nsọ, kwụsị ma jụọ ndị ahụ ị na-akụziri ihe eziokwu nke onye ozi ọma ha na-achọta. Nyere ha aka hụ otu eziokwu ndịa jiri gbasa atụmatụ nke nzọpụta nke Nna nke Eluigwe. Mgbe ụfọdụ eziokwu nke ebighị ebi ndị a ka ekwuru niime akwụkwọ nsọ, ma mgbe ụfọdụ egosipụtara ha niime akụkọ niile na ndụ nke ndị ahụ anyị na-agụ maka ha. Ọ nwerekwara ike nye aka ịchọkọta ọnụ nsipụta agụgụala nke amaokwu ndị nke ị na-agụ, tinyekwara mpụtara nke amaokwu ndị ahụ ma otu ha jiri metụta anyị taa” (Nkuzi ihe n’Ụzọ nke Onye Nzọpụta, 22).
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .