Ọgọst 3–9. ‘Ị Bịawo … maka Ụdị Oge dị ka Nke a’: Esta,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
Ọgọst 3–9. “Ị bịawo … maka Ụdị Oge dị ka Nke aʻ” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Esta Azọpụta Ndị nke Jehova, site n’aka Sam Lawlor
Ọgọst 3–9: “Ị bịawo … maka Ụdị Oge dị ka Nke a”
Esta
Ọtụtụ ihe omume niime akwụkwọ nke Esta nwere ike ị dịka ihe ọma ma ọ bụ ọdakọ. Kedụ otu ọzọ i ji akọwa otu nwata nwanyị onye Juu na-enweghị nne na nna jiri ghọọ nwunye eze nke Persia nʻoge ahụ ziri nnọọ ezi iji zọpụta ndị ya site na ogbugbu? Kedụ nnọọ otu o siri daba adaba na nwanna Esta Mordecai ga-enwe ike nụ nkata a na-akpa iji gbuo eze ahụ? Ihe ndị a ha bụ ọdakọ, ka ha bụ akụkụ nke atụmatụ si nʻigwe? Okenye Ronald A. Rasband kwuru: “Ihe nwere ike iyi dị ka ihe ndakọrịta bụ, nʻezie, ihe Nna nke Eluigwe dị ihụnaanya na-ahụ maka ya. … Aka Onyenwe anyị nọ niime ụmụ ururu ihe ndị nke ndụ anyị” (“Site Na Nhazi Si Nʻigwe,” Liahona, Nov. 2017, 56) Anyị nwere ike ịkọta mgbe niile mmetụta nke Onyenwe anyị nọ niime ụmụ “ururu ihe ndị a.” Mana anyị na-amụta ihe site na nhụmihe nke Esta na Ọ pụrụ idu ụzọ anyị ma kwadoo anyị “maka ụdị oge dị ka nke a” (Esta 4:14) mgbe anyị nwere ike ị bụ ngwa ọrụ nʻaka Ya iji mezuo ebumnuuche Ya niile.
Maka nchikọta nke akwụkwọ nke Esta, lee “Ezra, akwụkwọ nke” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Esta
Onyenwe anyị na-edobe m n’ọnọdụ ndị nke m nwere ike iji gọzie ndị ọzọ.
Onyeisi Dieter F. Uchtdorf kuziri na onye ọbụla niime anyị “guzooro nʻebe pụrụiche ma nwee ọrụ dị mkpa nke naanị [anyị] nwere ike ịrụ. … Onyenwe anyị nyere gị oke na ọrụ nke gị maka otu ebumnuuche. Enwere ndị mmadụ na obi ndị ọ bụ naanị gị pụrụ irute ma kpasa aka. Ikekwe enweghi onye ọzọ nwere ike ime ya nʻụzọ ahụ pụrụiche” (“Bulie Ebe I Guzoro,” Liahona, Nov. 2008, 56).
Dị ka ị na-agụ akụkọ nke Esta, tulee otu okwu a ekwuru jiri gbasa ya. Chọọ ụzọ ndị nke Onyenwe anyị jiri mee ka okwe omume ya ịzọpụta ndị Juu (lee, iji maatụ, Esta 2:21–23; 3:10–14; 4:14–16). Mgbe ahụ tulee otu O jiri nye gị ọtụtụ ohere iji gọzie ndị ọzọ. Kedụ ụfọdụ ọnọdụ ma ọ bụ mmekọrịta niile nke O duworo gị banye maka “ụdị oge dị ka nke a”? (Esta 4:14). Ọ bụrụ na ị nwere ngọzi nke onye petrak, tulee ịgụ ya iji mụtakwuo banyere ọrụ ahụ Onyenwe anyị nyeworo gị ịrụ? Kedu ihe i nwere ike ime iji mejupụta ọrụ nke a?
Lee kwa (vidiyo) nke “Maka Ụdị Oge dị ka Nke a” , ChurchofJesusChrist.org.
For Such a Time as This
Anyị na-amụtakwu ihe karịa site na-ime eme karịa ịnụru anụ. Okenye Devid A. Bednar nyere ndị nkuzi ndụmọdụ: “Ebumnuuche anyị ekwesịghị ị bụ ʻKedụ ihe m ga-agwa ha?ʻ Kama, ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị bụ ʻKedụ ihe m ga-akpọku ha ime? Kedụ udị ajụjụ mmụọ kpakere nke m nwere ike ịjụ, ma ọ bụrụ na ha dị njikere ịzaghachi, ga-ebido ikpọbata Mmụọ Nsọ niime ndụ ha?ʻ” (niime Nkuzi ihe n’Ụzọ nke Onye Nzọpụta, 25). Ọ bụrụ na ị na-akuziri ezi na ụlọ gị ma ọ bụ otu klas ihe banyere Esta, kedụ ihe inwere ike ị gwa ha mee nke nwere ike inyere ha aka mụta ịhe?
“Mgbe Haman hụrụ na Mordecai ehudataghị isi …mgbe ahụ Haman jupụtara na iwe” (Esta3:5).
Esta 3; 5:9–14; 7
Mpako na iwe nwere ike i duba na ọdịda.
Niime akwụkwọ nke Esta, anyị mụtara ihe site na ikwesị ntụkwasị obi nke Esta na Mordecai, mana anyị mụtakwara ihe site na mpako na iwe nke Haman. Dị ka ị na-agụ Esta 3; 5:9–14, hụba ama mmetụta niile, okwu niile na omume niile nke Haman. Kedụ ihe ha na-ekpughe banyere ya na ebumnuuche ya niile? Gịnị bụ nsonaazụ ndị o zutere? (lee Esta 7). Ịgụ maka Haman nwere ike kpalie gị inyochagharị ihe ndị na-akpali mmetụta na omume gị niile. A na-akpali gị ime mgbanwe ọbụla? Kedụ otu ị ga-esi agakwuru Nna nke Eluigwe maka enyemaka?
Lee kwa Ilu 16:32; Alma 5:28.
Esta 3–4; 5:2–3; 8:11–12
Ibu ọnụ na-egosi na atụkwasịrị m obi ma dabere na Onyenwe anyị.
Hụta ihe kpatara Esta na ndị Juu ndị ọzọ jiri kpebie ibu ọnụ (lee Esta 3:13; 4:1–3, 10–17). Kedụ otu ibu ọnụ jiri gọzie ha? (lee Esta 5:2–3; 8:11–12). Gịnị kpatara Onyenwe anyị jiri chọọ ka anyị buo ọnụ? (Lee Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ibu Ọnụ na Onyinye Ibu Ọnụ,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Tulee otu i ga-eji eme ka ibu ọnụ bụrụ ngọzi bakwuru ụba niime ndụ gị.
Lee kwa Aịzaya 58:6-12; “Ibu ọnụ: Ngalaba ukwu nke Ndị Dimkpa nta Na-emebeghị ọlụlụ, Amanda” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org
Fasting: Young Single Adult Ward, Amanda
Esta3:1–11; 4:10–17; 5:1–4; 9:17–19
Ime ihe ziri ezi ọtụtụ mgbe na-ewekarị nnukwu obisike.
Mgbe Mordecai na Esta guzooro maka nkwenye ha na nke ndị ha, ha tinyere ndụ ha niime ihe ize ndụ. Nhọrọ anyị nwere ike nwee nsonaazụ ndị belatara ebelata, mana ime ihe ahụ ziri ezi nwere ike chọọ kwa mgbamume. Kedụ ihe ị na-amụta site na Esta 3:1–4; 4:10–17 banyere inwe ume iji mee ihe ahụ ziri ezi? Hụba ama nsonaazụ dị iche iche nke Mordecai na Esta nwetere mgbe ha gosiworo ume (lee Esta 3:5–11; 5:1–4). Kedụ ihe Esta na Mordecai kwesịrị ịmata banyere Chineke iji mee nhọrọ ndị ahụ ha mere?
Chee maka ọnọdụ niile ebe ị chọrọ ume iji guzoro maka ihe ahụ ziri ezi. Gịnị ka ị na-amụta site n’aka Esta na Mordeca nke nwere ike inyere gị aka chọta ume niime Onyenwe anyị?
Mgbamume nke Esta mere ka “ụbọchị nke obi ụtọ” ahụ bịa (see Esta 9:17–19). Kedụ otu mgbamume nke ahụ yiri nke Kraịst jiri nye gị “ụbọchị nke obi ụtọ”?
Lee kwa “Mgbamume,” “Atụla egwu Iguzo Naanị Gị” (video niile), Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Ikwụdesi ike N’ọkwukwe ahụ,” Abụ niile, no. 254.
Courage
Dare to Stand Alone
Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Esta 2:5–7
Enwere m ike ijere ezi na ụlọ m ozi.
-
Enwere ike kpakee gị ijiri Esta 2:7 kuziere ụmụ gị banyere inyere ndi otù ezi na ụlọ nọ na mkpa aka, otu Mordecai meere Esta. I nwere ike gụkọọ amaokwu ahụ ọnụ ma ọ bụ chịkọta ha jiri okwu nke onwe gị. Emesịa gị na ụmụ gị nwere ike chee maka ndị otù ezi na ụlọ nwere ike inwe mkpa enyemaka gị. Rọpụta atụmatụ iji enyere ha aka.
Esta 3:1–11; 4:10–17
Onyenwe anyị pụrụ ịnyere m aka ịnwe obi dike.
-
Ọmụmatụ nke Esta na Mordecai nwere ike ịnyere ụmụ gị aka ghọta na inwe obi dike pụtara ịme ihe ahụ ziri ezi ọbụna mgbe ị na-atụ ụjọ. Tulee ide nkebiokwu ndị a Mordecai nwere obi dike mgbe ya … na Esta nwere obi dike mgbe o … Dị ka ị na-amụkọta akụkọ nke Esta ọnụ, ụmụ gị nwere ike tụọ arọ ụzọ ndị eji ekwucha ahịrịokwu ndị ahụ. Ị nwere ike gụọ Esta 3:1–11; 4:10–17 ma ọ bụ “Nwunye Eze Esta” (niime Akụkọ nille nke Agba Ochie, 166–70) ma ọ bụ lee anya na foto niile nọ na ndepụta nke a. Emesịa dee Aga m enwe obi dike site na … , ma kpọkuo ụmụ gị idepụta ihe niile Nna nke Eluigwe chọrọ ka ha mee nke na-achọ mgbamume. Otu egwu banyere ume, dị ka “Atụla egwu Ịme Ihe Ziri Ezi” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 158), nwere ike nye aka.
2:45Queen Esther
-
Ị nwekwara ike mụta banyere oge niile ahụ mgbe Jizọs Kraịst nwere obi dike—maka ọmụmatụ, mgbe Ọ tara ahụhụ maka mmehie anyị na Getsemani na nʻelu obe (lee Matiu 26:36–39; 27:33–35). Rịọ ụmụ gị ka ha kesaa otu oge mgbe ha nwere obi dike, ma kesaakwa nhụmihe niile nke gị onwe gị.
Esta 4:1–3, 10–17
Ibu ọnụ na-eweta ngọzi niile nke Onyenwe anyị.
-
Ịgụ Esther 4:1–3, 10–17 nwere ike nyere gị aka kuziere ụmụ gị banyere ibu ọnụ. Gịnị mere Esta na ndị Juu jiri buo ọnụ? Gwa ụmụ gị ihe mere iji ebu ọnụ. Ị nwekwara ike jụọ ha otu ha nwere ike iji kọwa ihe ibu ọnụ pụtara nye otu enyi na-emebeghi ya mbụ. Kedụ otu anyị ga-esi enyere ndị enyi anyị aka ghọta ngọzị niile na-abịa site na-ibu ọnụ?
-
Nyere ụmụ gị aka chee maka otu ihe ha nwere ike ịchọ enyemaka Onyenwe anyị maka ya. Tụọ aro na ha mee nke ahụ ka ọ bụrụ akụku nke Sọnde ibu ọnụ nke na-abịa niihu.
Nihi na Esta nwere obi dike, ọ nwere ike ịzọpụta ndị nke Onyenwe anyị.
Esta 4:14
Enwere m ike ị bụ ngwa ọrụ n’aka nke Chineke.
-
Nyere ụmụ gị aka ghọta na mgbe Esta tụrụ ụjọ, Modekaya gbara ya ume site na-ịkọwa na Onyenwe anyị enyeworo ya aka ịbụ nwunye eze “maka ụdị oge dị ka nke a” (Esta 4:14). Kedụ ihe Mordecai na-ekwu site na nke a? Kwuoro ibe unu okwu banyere otu Esta jiri bụrụ ngwa ọrụ maka Onyenwe anyị. Olee otu anyị nwere ike i si bụrụ ngwa ọrụ maka Onyenwe anyị?
-
Olee otu i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka ghọta ihe ngwa ọrụ bụ? Ikekwe i nwere ike kpọkuo otu onye ịkpọ otu egwu na otu ngwa egwu ma ọ bụ gosi otu foto nke otu onye na-eji otu ngwa ọrụ nʻọrụ. Emesịa inweziri ike kwuo ihe ọ pụtara ịbụ ngwa ọrụ n’aka Chineke.
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .