“Echiche niile ndị aga E Buru nʻUche: Na-agụ Abụ niime Agba Ochie,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Na-agụ Abụ niime Agba Ochie,” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Echiche niile ndị aga E Buru nʻUche
Na-agụ Abụ niime Agba Ochie
Niime Agba Ochie site nʻakwụkwọ nke Jenesis gbadaruo Esta, anyị na-achọtakarị ọtụtụ akụkọ—akụkọ nkọwa na-akọwapụta ihe omume agụgụala niile sitere na nhụnuuche nke ime mmụọ. Noa wuru nnukwu ụgbọ mmiri, Mozis napụtara Izrel, Hannah kpere ekpere inwe nwa nwoke, nsa ndị ọzo. Malite site na Job, anyị na-ahụta usoro odide dị iche iche. Niime akwụkwọ ndị a, ndị odee Agba Ochie bidoro jiriwe asụsụ abụ iji gosipụta mmetụta dị omimi ma ọ bụ amụma ndị dị ịtụnaanya nʻụzọ echefughi echefu.
Anyị ahuworịị ọmụmaatụ ole ma ole nke abụ efesasịrị gburugburu akwụkwọ niile nke agụgụala nke Agba Ochie. Site nʻakwụkwọ nke Job gawaniihu, anyị ga-ahụ ọtụtụ niime ha karịa. Akwụkwọ niile nke Job, Abụ ọma, na Ilu bụcha nnọo ihe ruru abụ kpam kpam, dị ka kwa ụfọdụ akụkụ akwụkwọ amụma dị ka Aịzaya, Jeremaya na Emọs. Nihi ịgụ abụ dị iche site na-ịgụ akụkọ, nghọta ya ọtụtụ mgbe na-achọkarị ụzọ dị iche. Nke a bụ ụfọdụ echiche ndị nwere ike inyere gị aka chọta mpụtara karịchara dị niime abụ nke Agba Ochie.
Ị Malite Ịmata Abụ Ndị Hibru
Nke mbụ, ọ nwere ike nyere gị aka ịmata na abụ Ndị Hibru niime Agba Ochie adabereghi na ndakọrịta, dị ka ụfọdụ abụ ndị ọzọ. Ma na-agbanyeghị na ndanuusoro, okwu egwuruegwu, na nkwugharị ụda bụ ihe ndị ama ama so na abụ Ndị Hibru mgbe ochie, ihe ndị a efuwo nnọọ na ntụgharị asụsụ. Otu ejirimara ị ga-achọpụta, agbanyeghi, bụ nkwugharị nke echiche ma ọ bụ uche niile, mgbe ụfọdụ akpọrọ “kwunkwugha.” Nke a bụ otu ọmụmaatụ dị mfe sitere na Aịzaya:
Yikwasị ume gị, O Zayọn;
yikwasị ọmarịcha gamentị niile gị, O Jerusalem. (Aịzaịah 52:1)
Abụ ọma 29 nwere ọtụtụ ahịrị myiemetụ—iji maatụ:
Olu nke Onyenwe anyị dị ike;
olu nke Onyenwe anyị juputara na ebube. (Abụ ọma 29:4)
Ma nke a bụ otu ọmụmaatụ nke ịmata na ahịrị nke abụọ bụ nyiemetụ nye nke mbụ ahụ na-eme edereede akacha dịrị mfe nghọta.
Enyewo kwa m unu eze dị ọcha niime obodo ukwu unu niile,
ma mkpa nke achịcha nʻebe unu niile. (Emọs 4:6)
Niime ọmụmaatụ ndị a, odee abụ ahụ kwugharịrị otu echiche jiri obere ndịiche. Usoro a nwere ike kwusie ike echiche ahụ ekwuru ugboro ugboro ma jiri ọtụtụ ndịiche iji kọwaa ma ọ bụ hiwe ya nke ọma.
N’ọnọdụ ndị ọzọ, ahịrịokwu myiemetụ abụọ ahụ na-eji asụsụ yiri ibe ha iji wepụta echiche dị iche iche, dị ka na ọmụmaatụ nke a:
Ọsịsa dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ:
ma okwu ike na-akpasu iwe. (Ilu 15:1)
Ụdị kwunkwugha nke a anaghị eme na mberede. Ndị odee ha kpachara anya mee ya. O nyeere ha aka gosipụta mmetụta ma ọ bụ eziokwu nke ime mmụọ jiri ma ike ma ịma mma. Niihi ya mgbe ị hụtara kwunkwugha niime edereede nke Agba Ochie, jụọ onwe gị otu nke a nwere ike iji nyere gị aka ghọta ozi nke odee ahụ. Iji maatụ, kedụ ihe Aịzaya na-agba mbọ ikwu site na ịtụnyere “ume” ya na “gamentị mara mma” na “Zayọn” ya na “Jerusalem”? (Aịzaịah 52:1). Gịnị ka anyị ga-echepụta banyere nkebiokwu ahụ “azịza dị nro” ma ọ bụrụ na anyị maara na “okwu ọjọọ” bụ ihe na-emegide ya? (Ilu 15:1).
Ọ Na-eweghachite Mkpụrụ obi M, site n’aka Walter Rane
Abụ Ndị Hibru dị ka otu Enyi Ọhụrụ
Ụfọdụ ndị na-atụnyere ịgụ abụ ya na izute onye ọhụrụ Ịgụ abụ Agba Ochie, ma emesịa, nwere ike dịrị ka izute otu onye si mba dị anya na omenaala mba ọzọ onye na-asụ asụsụ dị iche site na nke anyị—na onye dị nnọọ ka ọ gbara karịa puku afọ abụọ. Onye nke a nwere ike kwuo ihe ndị anyị anaghị aghọta na mbụ, mana nke a apụtaghị na ha enweghi ihe bara uru ha ga-ekwu. Anyị kwesịrị nnọọ ịnọnyetụrụ ha, na-agba mbọ ị hụ ihe site na anya ha ji ahụ ihe. Anyị nwere ike chọpụta na niime obi anyị, anyị nʻezie na-aghọta onwe anyị nke ọma. Ma ọ bụrụ nʻanyị nwee ndidi na ọmịiko, enyi ọhụrụ anyị ga-emesị bụrụ enyi ọma anyị.
Niihi ya mgbe ị na-agụ site nʻotu ederede nke Aịzaya, na-ịmaatụ, were ya na ọ bụ ndubata mbụ a na-egosi gị otu onye ọhụrụ. Jụọ onwe gị, “Gịnị bụ mmetụta izugbe m na-enwete?” Kedụ otù edereede ahụ ji emetụta gị—ọbụnadị mgbe ị nʻadịghị aghọta okwu niile? Mgbe ahụ gụgharịa ya ọzọ, ọtụtụ mgbe ma okwe omume. Tulee ị gụpụta ya agụpụta; ụfọdụ ndị na-achọta mpụtara agbakwunyere site nʻụzo ahụ. Hụba ama kpọm kwem mkpụrụokwu ndị Aịzaya họọrọ, kacha nke mkpụrụokwu ndị na-ese ihe osise niime uche gị. Kedụ otu foto ndị ahụ ji emetụta gị? Gịnị ka ha na-atụpụta nye gị banyere mmetụta niile nke Aịzaya? Dị ka ị na-amụtakwu mkpụrụokwu nke ndị odee Agba Ochie karịa, otu ahụ ka ị ga-eji amatakwu na ha kpachaara anya họrọ okwu ha niile na usoro ndị ha ji egosipụta ozi nke ime mmụọ miri emi.
Abụ nwere ike ịbụ ndị enyi ọma niihi ha na-enyere anyị aka ghọta mmetụta na nhụmiihe niile anyị. Abụ niile nke Agba Ochie kacha nke dị oke ọnụ ahịa nihi na ha na-enyere anyị aka ghọta mmetụta niile na nhụmihe niile kachasị dị mkpa—ndị ahụ metụtara njikọta anyị na Chineke.
Dị ka ị na-amụ abụ dị niime Agba Ochie, cheta na ọmụmụ akwụkwọ nsọ kachasị baa uru mgbe ọ na-eduba anyị ruo na Jizọs Kraịst. Chọo ọdịmara niile, ihe oyiyi, na eziokwu ndị na-ehiwe okwukwe gị na Ya. Gee ntị maka mkpatemmụọ sitere na Mmụọ Nsọ dị ka ị na-amụ ihe.
Agụmagụ Amamiihe
Otu katigorị abụ nke Agba Ochie ka ndị ọka mmụta kpọrọ “agụmagụ amamiihe.” Job, Ilu, na Ekliziastis dabara niime katigori nke a. Ebe abụ ọma na-egosipụta mmetụta nke otuto, iri uju, na ife ofufe, agụmagụ amamihe lekwasịrị anya na ndụmọdụ anwụghị anwụ ma ọ bụ ajụju miri emi nwere nkà ihe ọmụma. Akwụkwọ nke Job, na-ịmaatụ, na-enyochagharị ikpe ziri nke Chineke na ihe niile kpatara ntaram ahụhụ nke ụmụ mmadụ. Ilu na-enye ndụmọdụ otu eji ebi ndụ ọfụma, gụnyekwara okwu amamiihe ndị ndudugandu mbụ chịkọtara ma nyefee gbada ala. Ma Ekliziastis na-ajụ ihe bụ ebumnuuche nke ndụ nʻonwe ya—ebe ọ dị nnọọ ka ihe niile adịghị adịte aka, ebee ka anyị ga-achọta ezi mpụtara? Ị nwere ike chee na agụmagụ amamiihe ka mkparịta ụka miri emi nʻetiti ndị ndụmọdụ akpakere ndị chọrọ ịkesa ihe ha chọpụtaworo banyere Chineke na ụwa O kere eke—ma ikekwe nwere ike nyere gị aka ghọtakwuo ihe ndị a otu dị mma karịa na mbụ.