Come, Follow Me
Ọgọst 17–23. “Onyenwe anyị Bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ M”: Abụ ọma 1–2; 8; 19–33; 40; 46


“Ọgọst 17–23. ‘Onyenwe anyị Bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ M’: Abụ ọma 1–2; 8; 19–33; 40; 46,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Ọgọst 17–23. ‘Onyenwe anyị Bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ M,ʻ” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

Jizọs na-edu atụrụ

Onyenwe anyị Bụ Onye ọzụzụ atụrụ M, site n’aka Yongsung Kim Oyiyi nke a si nʻaka havenlight.com

Ọgọst 17–23: “Onyenwe anyị Bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ M”

Abụ ọma 1–2; 8; 19–33; 4046

Anyị amaghị nʻezie nʻezie onye dere Abụ ọma. Ụfọdụ ka asị David dere, mana maka ọtụtụ ha, ndị odee ka nọkwa na-amaghị ha. Mana mgbe agụsịworo Abụ ọma, ọ na-adị anyị kʻanyị maara obi nke ndị odee abụ ọma ahụ, ọbụrụgodu na anyị amaghị aha ha. Anyị maara na Abụ ọma bụrụ akụkụ dị mkpa na ofufe dị nʻetiti ndị Izrel, ma anyị maara na Onye Nzọpụta n̄omiri ha mgbe na mgbe. Nime Abụ ọma, anyị na-enwete ohere inyoba anya ruo na mkpụrụ obi nke ndị mgbe ochie nke Chineke. Anyị na-ahụ otu ha si wee chee maka Chineke, ihe na-echegbu ha, na otu ha si wee chọta udo. Dị ka ndị kwere ekwe taa, gburugburu ụwa niile, anyị ka na-eji okwu ndị a niime ofufe nke Chineke anyị. Ọ dị nnọo ka ndị odee Abụ ọma nyobakwara anya ruo na mkpụrụ obi anyị, nihi na ha gosipụtara otu anyị si eche maka Chineke, ihe na-echegbu anyị, na otu anyị si achọta udo.

Maka nchikọta nke akwụkwọ nke Abụ ọma, lee “Abụ ọma” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Abụ ọma 1; 23; 26–2846

“A tụkwasịrị m obi … na Onyenwe anyị.”

Dị ka ị na-agụ Abụ ọma, ịnwere ike hụ otu ndị odee ahụ si egosipụta ụjọ, iri uju, na obi nchegbu. Ụdị mmetụta ahụ ka a na-ahụkarị, ọbụna maka ndị kwere ekwe. Mana ihe mere Abụ ọma jiri bụ ihe na-akpakemmụọ bu na-enye azịza na-akpake mmụọ, gụnyekwa ntụkwasị obi kpam kpam niime Onyenwe anyị. Dị ka ị na-agụ Abụ ọma 1; 23; 26–2846, dedata:

  • Ọkpụkpọ okù ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị.

  • Okwu ndị na-akọwa Ya.

  • Okwu ndị na-akọwa udo, ume, na ngọzi ndị ọzọ Ọ na-enye.

  • Okwu ndị na-akọwa ndị tụkwasịrị obi na Ya.

Ma lee anya maka oyiyi na ọdịmara ndị ahụ doro anya nke ọma nke Abụ ọma jiri kuzie ihe banyere Onye Nzọpụta. Na-ịmatụ, na Abụ ọma 23, kedụ ihe nkebiokwu ndị a dị ka “makpuru nʻebe ịta nri nke ahịhịa ndụ” ma ọ bụ “mmiri nke izu ike” (amaokwu 2) na-agbata nʻuche? Kedụ ihe “ndele” na “mkpanaka” na-akasi obi (amaokwu 4) na-egosịpụta? Gịnị ka “iko” (amaokwu 5) anyị ịnwebiga ihe oke pụtara?

Abụ ọma 222

Jizọs Kraịst bụ Mezaya ahụ ekwere na nkwa.

Ọtụtụ abụ ọma ahụ rụtụrụ aka na ndụ anụ ahụ nke Jizọs Kraịst. Ndị Kristian nʻoge ndị nke Agba Ọhụrụ hụrụ njikọ ndị a kwa. Tulee ịgụ ntụaka niile nke akwụkwọ nsọ ndịa na-esote. Chọo njikọ niile ndị nọ nʻetiti okwu niile ndị dị niime abụ ọma ndị a na ndụ nke Onye Nzọpụta.

  • Abụ ọma 2:1–3 na Ọlụ 4:24–28

  • Abụ ọma 2:7 na Ọlụ 13:30–33

  • Abụ ọma 22:1 na Matiu 27:45–46

  • Abụ ọma 22:7–8 na Matiu 27:39–43

  • Abụ ọma 22:16 na Luk 23:32–33

  • Abụ ọma 22:18 na Matiu 27:35

  • Abụ ọma 31:5 na Luk 23:46

Kedụ ihe ị na-amụta site na-ịmụ njikọ niile ndị a? Kedụ amụma na nkwa niile si na akwụkwọ nsọ ndị a na-emezubeghi? Gịnị ka ị na-ahụta niime nkwa niile ndị a na-enye gị olileanya maka ọdịniihu?

osimiri na oke nkume

Abụ ọma 8; 1933

“Ụwa juputara na ịdị mma nke Onyenwe anyị.”

Ịgụ Abụ ọma 8; 1933 nwere ike kpakee mmụọ gị itule banyere ihe okike niile dị ịtụnaanya nke Onyenwe anyị. N̄aa ntị na mmetụta gị niile dị ka ị na-eme. Ị nwekwara ike chọo ịbụ ma ọ bụ tulee okwu nke egwu ahụ nke metụtara abụ ọma ndị a, ụdị dị ka “Lee ka I Si Dị Ukwuu ” (Abụ ọma, 86). Olee otu ihe okike niile nke Onyenwe anyị si “ekwupụta ebube nke Chineke” nye gị? (Abụ ọma 19:1).

Ndị a bụ ụfọdụ abụ nke Abụ ọma kpaliteremmụọ:

  • Abụ ọma 23:Onyenwe anyị Bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ M” (Abụ, no. 108)

  • Abụ ọma 23:6150:“Otịto dịrị Onyenwe anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” (Abụ, no. 72)

  • Abụ ọma 26:8:Anyị Hụrụ Ụlọ Gị Naanya O Chineke” (Abụ, no. 247)

  • Abụ ọma 27:1:Onyenwe anyị Bụ Ihè M” (Abụ, no. 89)

  • Abụ ọma 33:1–6; 95:1–6:Maka Ịma mma nke Ụwa” (Abụ, no. 92)

  • Abụ ọma 37:3–9:Obi M, Dere Duu” (Abụ, no. 124)

  • Abụ ọma 148:8:Ihe Niile Ekereke nke Chineke na Eze Anyị” (Abụ, no. 62)

Jiri egwu. Onyeisi Dallin H. Oaks ekwuwo na: “Ịbụ abụ bụ otu ụzọ kachasị mma anƴị ji edebe onwe anƴị ịnụrụ Mmụọ nke Onyenwe anyị. … Egwu dị nsọ nwere ikike pụrụ iche ikwupụta mmetụta niile nke ịhụnaanya anyị nwere maka Onyenwe anyị. Ụdị mkparịta nke a bụ enyemaka dị ịtụnaanya maka ofufe anyị. … Abụ anyị juputara nʻokwuchukwu na ozizi niile na-enweghi atụ, nke akwụkwọ nsọ karịrị nihi eziokwu na mmekụta abụ ha” (“Fee Ofufe Site nʻEgwu,” Ensign, Nov. 1994, 10, 11). Kedụ abụ ndị metụtara Abụ ọma ịnwere ike ịge ma ọ bụ gụọ iji mejupụta ofufe gị nʻizu ụka nke a?

Abụ ọma 19:7–1129

Okwu nke Onyenwe anyị dị ike, “obi na-an̄ụrị.”

Niime Abụ ọma, okwu ndị dị ka ịgba ama,akpụrụakpụ niile, iwu nsọ, na ikpe niile nwere ike rụtụ aka na okwu nke Onyenwe anyị. Buru nke ahụ n’obi dị ka ị na-agụ Abụ ọma 19:7-11. Gịnị ka amaokwu niile ndị a na-atụziri gị banyere okwu nke Onyenwe anyị? Kedụ ihe Abụ ọma 29 na-akuziri gị banyere olu Ya? Niime nhụmiihe gị, olee otu okwu ahụ ma ọ bụ olu nke Onyenwe anyị jiri daba na nkọwa ndị a?

Abụ ọma 24; 26–27

akara ngosi semịnarị
Onye Nzọpụta nwere ike ịnyere m aka dị ọcha ka m nwee ike ịbanye niihu nke Chineke.

Niihi na tempụl nke Jerusalem ka ewuru nʻelu ugwu nta, nkebiokwu ahụ “ugwu nta nke Onyenwe anyị” (Abụ ọma 24:3) nwere ike ịrụtụ aka na tempụl ma ọ bụ niihu Chineke. Gịnị ka nke a gbakwunyere na nghọta gị maka Abụ ọma 24? Kedụ ihe ọ pụtara nye gị ịnwe “aka dị ọcha, na obi na-enweghi ntụpọ”? (amaokwu 4). Dị ka ị na-agụ Abụ ọma 26–27, kedụ ihe ọzọ ị na-amụta banyere ụlọ nke Onyenwe anyị?

Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike nwee nkụda mmụọ ịnụ nʻanyị kwesịrị ịbụ ndị na-enweghi ntụpọ iji banye niihu Chineke. Ka emesịrị ihe niile, anyị niile na-adọlị, ma enweghi onye niime anyị zuru oke. Kedụ olileanya ị na-achọta niime ozi nke Okenye Devid A. Bednar “Aka Dị Ọcha na Obi Na-enweghi Ntụpọ”? (Liahona, Nov. 2007, 80–83). Kedụ otu inwere ike jiri ozi ya nyere onye ọzọ aka onye daworo mba niihi ọchịchọ ya izu oke? Tulee otu ịnwere ike iji nata enyemaka Onye Nzọpụta na mbọ gị niile iji nwee “aka dị ọcha, na obi na-enweghi ntụpọ.”

Leekwa Bradley R. Wilcox, “Ntozu oke Abụghị Enweghị Ntụpọ,” Liahona, Nov. 2021, 61–67.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Abụ ọma 23; 27–28; 3246

Onyenwe anyị na-enye m udo, ume, na odudu.

  • Tulee ide Onyenwe anyị na … Kpọkuo ụmụ gị ịchọta ụzọ ndị eji emejupụta ahịrịokwu ahụ jiri akwụkwọ nsọ dị ka ndị a: Abụ ọma 23:1; 27:1; 28:1; 28:7; 32:7; 46:1. Gịnị ka amaokwu ndị a na-akuziri anyị banyere otu Onyenwe anyị si enyere anyị aka?

  • Ị nwere ike gị na ụmụ gị akparịta ụka ihe dịịrị nwa atụrụ mkpa iji nọrọ na nchekwa na ezi ahụike. Mgbe ahụ, dị ka unu na-agụkọta Abụ ọma 23ọnụ, nyere ụmụ gị aka tunyere ihe onye ọzụzụ atụrụ na-emere nwa atụrụ ya na ihe Jizọs na-emere anyị. Kedụ ịhe dịịrị anyị mkpa iji nọrọ na nchekwa na ezi ahụike nke ime mmụọ? Gụkọọ otu egwu nke nwere ike inye ha uche, ụdị dị ka “Ana M Enwe Mmetụta Ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta M” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 74–75).

Concepción Chile Tempụl

Concepción Chile Tempụl

Abụ ọma 24:3-4

Iji banye tempụl, anyị kwesịrị ịnwe “aka dị ocha na obi na-enweghi ntụpọ.”

  • Dị ka unu na-agụkọta Abụ ọma 24:3 ọnụ, ụmụ gị nwere ike chọọ okwu na-echetara ha maka tempụl. Ha nwekwara ike lee anya nʻotu foto nke tempụl. Mgbe ahụ unu nwere ike gụkoọ amaokwu nke 4 ọnụ iji mata onye nwere ike ịbanye na tempụl. Unu nwere ike kwuo otu esi emetọ aka nakwa otu eji ehicha ha. O lee otu anyị si emetọ onwe anyị nke ime mmụọ? Olee otu Onye Nzọpụta si enyere anyị aka mee ka anyị dịrị ọcha nke ime mmụọ?

Abụ ọma 30:5

Jizọs Kraịst nwere ike ịtụgharị mnwute ịghọ ọn̄ụ?

  • Ọ bụrụ na ịnwere ụmụ dị ntakịrị, ịnwere ike kpọkuo ha ime ka a ga-asị ha na-ebe akwa mgbe ị na-agụ site na Abụ ọma 30:5, “Ịkwa akwa ga-anọgide abalị niile.” Emesịa rịọ ha ka ha gosipụta ọn̄ụ dị ka ị na-agụ, “Mana nʻụtụtụ iti mkpu ọn̄ụ ga-abịa.” Kwugharịa nkebiokwu nke a ugboro ole ma ole.

  • Gosi otu foto nke Onye Nzọpụta, ma gwa ụmụ gị ihe O meworo gị nke weteere gị ọn̄ụ. Ị nwekwara ike nye nwata ọbụla ohere iji jide foto ahụ ma kesaa ihe Jizọs meworo na-ewetere ha ọn̄ụ.

Abụ ọma 46:10

“Dere duu ma mata na a bụ m Chineke.”

  • Nyere ụmụ gị aka buru ahịrị nke mbụ ahụ nʻisi nke sitere na Abụ ọma 46:10: “Dere Duu ma Mata Na A Bụ M Chineke” Kedụ ihe ọ pụtara “ịdere duu”? Ị nwere ike tinye ezigbo oge na-ịmụ otu esi edere duu. I nwekwara ike kesaara ibe unu ụfọdụ nhụmihe niile mgbe “ịdere duu” gbara njikọta gị na Chineke ume. Nyere ụmụ gị aka chee maka oge ndị ahụ nʻụbọchị mgbe ha nwere ike “ịdere duu” iji nwee mmetụta ị nọ Nna nke Eluigwe nso.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend

Onye Nzọpụta ahụ ji otu nwa atụrụ

Onye ọzụzụ atụrụ Ọma, site n’aka Eva Timothy

Ihu akwụkwọ ihe omume ndị Praịmarị: Onyenwe anyị Bụ Onye ọzụzụ atụrụ m