Ọgọst 10–16 ‘Ma A ga M Atụkwasị Ya obi’: Job 1–3; 12–14; 19; 21–24; 38–40; 42,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
Ọgọst 10–16 ‘Ma A ga M Atụkwasị Ya obi,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Ikpe niile nke Job, site n’aka Josef Brickey
Ọgọst 10–16: “Ma A ga M Atụkwasị Ya obi”
Job 1–3; 12–14; 19; 21–24; 38–40; 42
Ọ bụ ihe eke iche ihe mere ajọọ ihe ji eme ndị ezigbo mmadụ—ma ọ bụ, maka okwu ahụ, ihe mere ihe ọma ji emere ndị ajọ mmadụ. Gịnị mere Chineke, onye ikpe ziri ezi, na-ahapụ nke ahụ? Akwụkwọ nke Job na-enyochọgharị ajụjụ dị ka ndị a. Job bụụrụ otu niime ndị ezigbo mmadụ onye ọtụtụ ajọọ ihe mere. Niihi nnwale niile nke Job, ndị enyi ya chere ma ọ bụ ezigbo mmadụ nʻezie. Job gosipụtara eziomume ya ma cheekwa ma Chineke ọ bụ onye ikpe ziri ezi nʻezie. Mana na-agbanyeghị ntaram ahụhụ na echiche ya, Job kwụdesiri ike na eziokwu na okwukwe ya niime Jizọs Kraịst. Niime akwụkwọ nke Job, okwukwe ka agbara ajụjụ ma nwalee mana ahapụghị ya kpam kpam ma ọlị. Nke a apụtaghị na ajụjụ niile ka azara. Mana akwụkwọ nke Job na-akụzi na tutu azaa ha, ajụjụ nwere ike ibikọ ọnụ ya na okwukwe. Ma na-agbanyeghi ihe na-eme nʻoge nke a, anyị nwere ike ikwuchitere Onyenwe anyị, “Ma A ga M Atụkwasị Ya obi” (Job 13:15).
Maka nchikọta nke akwụkwọ nke Job, lee “Job” niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ niile (Ọba akwụkwọ Ozi ọma).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Job 1–3; 12–13
E nwere m ike ịtụkwasị Chineke obi niime ọnọdụ niile.
Mmalite isi niile nke Job na-ekwusi ike, nʻụzọ abụ, oke nʻọrụ Setan dị ka onye iro ma ọ bụ onye ebubo anyị; ha anaghị akọwa mkparịta ụka mere eme nʻetiti Chineke na Setan. Dị ka ị na-agụ ihe Setan kwuru maka Job (lee Job 1:9–11; 2:4–5), i nwere ike jụọ onwe gị, “Gịnị mere m ga-eji nọgide nʻikwesị ntụkwasị obi nye Chineke?” Gịnị mere ọ ga-eji abụ ihe ize ndụ irubere Onyenwe anyị isi naanị niihi arọ ahụ Setan tụrụ?
Gịnị na amasị gị banyere nzaghachi niile nke Job nye mnwale ya niile (lee Job 1:20–22; 2:9–10).
Ndị enyi Job tụrụ aro na Chineke na-ata ya ahụhụ (lee Job 4–5; 8; 11). Kedụ nsogbu ndị ị na-ahụ niime ụdị echiche nke a? Gụọ nzaghachi Job niime isi ndịa 12–13. Kedụ ihe Job maara banyere Chineke nke nyere ya ike ịganiihu na ntụkwasị obi? Kedụ ihe ị maara banyere Chineke na-enyere gị aka zute ịma aka niile?
Job 19
Jizọs Kraịst bụ Onye Mgbapụta m.
Mgbe ụfọdụ anyị na-amụta eziokwu ndị kacha ibe ha nʻoge ndị ahụ ihe kachasị siere anyị ike. Tulee mnwale ndị ahụ Job kọwara niime Job 19:1–22 na eziokwu ndị o kwuputara niime amaokwu ndịa 23–27. Olee otu isi mara na Onye Mgbapụta gị dị ndụ? Kedụ ndịiche nke mmata ihe nke a na-eme niime ndụ gị?
Tulee ịgụ ma ọ bụ ige otu egwu banyere Jizọs Kraịst, ụdị dị ka “A maara M Na Onye Mgbapụta M Dị Ndụ” (Abụ niile, no. 136). Kedụ okwu sitere na abụ nke a na-egosipụta mmetụta ị nwere banyere Ya?
Lee kwa Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 121:1–12; 122.
Job 21– 24
“Mgbe ọ nwasịworo m, Aga m apụta dị ka ọlaedo.”
Niime Job 21–24, ị ga-agụ maka arụmụka nʻetiti Job na ndị enyi ya. Isiokwu nrụrịtaụka nke a bụ ajụjụ nke ọtụtụ mmadụ jụworo: Gịnị mere ndị ezi omume ji na-ata ahụhụ mgbe ụfọdụ?
Nagbanyeghi na anyị enweghi azịza niile, niime ozi ọma Jizọs Kraịst eweghachitere, anyị nwere ụfọdụ eziokwu nwere ike inyere anyị aka ghọta ihe mkpagbu na ntaram ahụhụ pụtara. Nʻokpuru bụ akwụkwọ nsọ ụbọchị ikpeazụ a nke nwere ụfọdụ eziokwu ndị a. Gịnị ka akwụkwọ nsọ ndị a na-akuziri gị banyere Nna nke Eluigwe na atụmatụ Ya?
Ịnwekwara ike gụọ nkuzi niile nke Onyeisi Spencer W. Kimball banyere mkpagbu niime “Ọdachi ma ọ bụ Akaraka?” (Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ ahụ: Spencer W. Kimball [2011]), 11–21).
Ịdabere niihe ị mụworo, kedụ otu i ga-esi aza otu ajụjụ dị ka “Gịnị mere Chineke ji ekwe ka ndị ezi omume taa ahụhu?”
Dị Nwayọọ na Kpakpando niile, site n’aka Yongsung Kim. Oyiyi nke a si nʻaka havenlight.com
Job 38–40; 42
Nhụnuuche nke Chineke karịri nke m
Niihi nkụda mmụo sitere niihi ebubo niile nke ndị enyi ya (lee Job 16:1–5; 19:1–3), Job jụrụ Chineke ugboro ugboro ihe kpatara o ga-eji ata nnukwu ahụhụ dị otua (lee Job 19:6–7; 23:1–9; 31). Onyenwe anyị enyeghi azịza doro anya niime akwụkwọ nke Job. Mana Ọ kụziri otu ozi dị mkpa niime isi ndịa 38–40. Kedụ otu ị ga-esi achịkọta ozi ahụ ọnụ? Na-ịmatụ, kedụ ihe ị na-amụta site n’ajụjụ nke Onyenwe anyị niime Job 38:1–7, 18–24?
Ị ga-ahụta na Onyenwe anyị kwuuru Job okwu banyere ụfọdụ okike Ya na ọrụ ndị ọzọ dị ukwuu (lee Job 38–39). I nwere ike lee anya na ụfọdụ ihe okike ndị ahụ (ma ọ bụ foto ha). Kedụ otu ihe ndị a si enyere gị aka chee echiche dị iche banyere Chineke? banyere mnwale niile gị? Kedụ otu ha si gbanwee nhụnuuche nke Job? (lee Job 42:1–6; lee kwa Mozis 1:8–10).
Nke a bụ ozi abụo nke ọgbakọ zuru ọha nke nwere ike inye aka gbanwee nhụnuuche anyị: Tamara W. Runia, “Ịhụ Ezi na ụlo nke Chineke site na Anya Nchịkọta” (Liahona, Nov. 2023, 62–69); Russell M. Nelson, “Chee Maka Selestial!” (Liahona, Nov. 2023, 117–20). Niime ozi nke ọbụla, chọọ maka otu ihe nke ị ga-achọ ịcheta mgbe ọzọ ọ dị nnọọ ka mnwale gị ọ na-eri isi gị. Kedụ otu ị ga-esi echatara onwe gị maka ihe ị mụtaworo?
Nwee ekeereuche. Mmụta ihe ekwesịchaghị ịbụ nnọọ naanị maka ịgụ agụ, iche echiche, na ikwu ekwu. Mgbe ụfọdụ mmụta ihe akachasị ebu nʻisi na-abịa nʻụzo mmegharị ahụ. Na-ịmatụ, mgbe ị na-agụ banyere otu Onyenwe anyị si gbanwee nhụnuuche Job niime Job 38–40, i nwere ike jee ije ma lee anya nʻụfọdụ ihe okike nke Onyenwe anyị, nke ukwu na nke nta. Ma ọ bụ ịnwere ike lee otu mpanaka anya site na nhụnuuche ndị dị iche iche—site nʻelu, nʻokpuru, bịaruo nso, gatee aka, ma nʻụzọ ndị ọzọ.
Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Job 1–2; 12; 19
Okwukwe niime Jizọs Kraịst ga-enyere m aka n’oge ihe isi ike.
-
Gbaa ụmụ gị ume ịgwa gị ihe ha maara banyere Job. Ọ bụrụ na ha chọọ enyemaka tụọrọ ha aka na Job 1:1, 13–22; 2:7–10 ma ọ bụ na “Job” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 145–47). Kedụ otu Job jiri meso ịma aka ndị ahụ? (lee Job 1:21; 2:10).
1:55Job
-
Job kwudesịrị ike nʻokwukwe niime ịma ka ya niile niihi ihe ọ maara banyere Onyenwe anyị. Eleghị anya gị na ụmụ gị nwere ike lee anya na ụfọdụ foto nke Jizọs Kraịst dị ka ọ na-akparịta ụka ya na ndị ọzọ (dị nnọọ ka nke nọ nʻokpuru ma ọ bụ foto ndị nọ niime Akwụkwọ Nka Ozi ọma). Kwuo banyere ihe ị maara banyere Ya na ihe Ọ dị ka ya. Ebe a bu ụfọdụ amaokwu ndị ga-egosi ihe Job maara banyere Onyenwe anyị: Job 12:10, 13, 16; 19:25–27. Gịnị mere o ji baa oke uru imata ihe ndị a banyere Ya?
Ọ Gwọrọ Ha Nille, site n’aka Michael Malm
Job 14:14
Niihi Jizọs Kraist, aga m adịkwa ndụ ọzọ mgbe m nwụsiworo.
-
Job jụrụ otu ajụjụ dị mkpa niime Job 14:14. Ikekwe gị na ụmụ gị nwere ike nʻotu nʻotu kọọ otu unu nwere ike iji nye Job azịza. Ị nwere ike chọọ maka echiche ndị ọzo niime Alma 11:42–44, niime vidiyo “NʻỤbọchị Na-abịa abịa” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma), ma ọ bụ niime otu egwu banyere Mbilite n’ọnwụ, nke dị ka “Jizọs O biri Ndụ Ọzọ Nʻezie?” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị64).
#BECAUSEofHIM: An Easter Message of Hope and Triumph
Job 16: 1–5; 22:5
Ndị enyi ziri ezi na-ebuli ma na-agbakọrịta onwe ha ume.
-
Mgbe Job nọ na mnwute, ndị enyi ya kwuru na Chineke na-ata ya ahụhụ niihi na o mewo njọ (lee Job 22:5). Ọ bụrụ na anyị bụ ndị enyi Job, kedụ otu anyị ga-esi agba mbọ inyere ya aka? Kedụ otu okwu ọnụ anyị ga-esi enyere ndị ọzọ aka mgbe ha nọ na mnwute? (lee Job 16:5). Tulee igosi otu foto ma ọ bụ karịa niime ntụpụta nke a dị ka unu na-akparịta ụka banyere ajụjụ ndị a.
-
Tulee ị rịọ ụmụ gị ịdepụta ụfọdụ ejirimara nke ezi enyi ma ịkpọpụta otu enyi nwere ejirimara ndịa. Emesịa unu nwere ike lee anya nʻotu foto nke Jizọs Kraịst. Kedụ ụzo ndị Jizọs ji bụrụ ezi enyi nye onye ọbụla niime anyị? Ị nwere ike chee maka otu onye na-agabiga oge ihe isi ike. Tụọ atụmatụ otu ịnwere ike iji bụrụ enyi yiri Kraịst nye ha.
Job 19:23–27
Jizọs Kraịst bụ Onye Mgbapụta m.
-
Mgbe agụsịrị Job 19:23–27, gị na ụmụ gị nwere ike kwuo okwu banyere otu unu jiri mara na Onye Mgbapụta anyị dị ndụ. Unu nwere ike rụkọọ ọrụ ọnụ iji debe igba ama unu (ma ọ bụ ihe osise nke Onye Nzọpụta) niime otu akwụkwọ (lee amaokwu 23).
-
Unu nwekwara ike bụọ otu abụ na-agba ama nke Onye Nzọpụta, ụdị dị ka “A maara M Na Onye Mgbapụta M Dị Ndụ” (Abụ niile, no. 136). Kesaa nkebiokwu ndị sitere na abụ ahụ ndị gbara okwukwe ịnwere na Ya ume. Gịnị mere o ji dị mkpa imata na Jizọs Kraịst dị ndụ?
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .