“Julaị 20–26. ‘Na Gị ka Anya Anyị Na-elekwasị’: 2 Ihe e mere 14–20; 26; 30,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Julaị 20–26. ‘Na Gị ka Anya Anyị Na-elekwasị,’” Bịanụ, Soro M: 2026
Ekpere nke Eze Jehoshafat, site n’aka Keeley Rae
Julaị 20–26: “Anya Anyị Na-elekwasị”
2 Ihe e mere 14–20; 26; 30
Alaeze nke Judah ka agbara gburugburu. Ndị agha sitere na mba ndị iro atọ dị ezigbo ike naara abịaru n’ike nʻike otu mgbe, kwadoworịị maka ịlụ agha. N’oge mkpa nke dị oke mkpa, Jehoshafat, Eze nke Judah, chigharịkwutere Eze nke eluigwe na ala. Jehoshafat kpokọtara ndị ya na tempụl ma kpee ekpere. Ọ nakweere adịghị ike anụ ahụ ha ma rịọ maka nnapụta. Na azịza, Onyenwe anyị kwere nkwa nchekwa Ya: “Atụla egwu, ọ bụghị ma ịda mba” (2 Ihe e mere 20:17).
Anyị nwere ike gaghị enwe otù ndị agha na-ebuso agha n’ọnụ ụzọ na-eyi egwu ibibi anyị, mana mgbe ụfọdụ anyị na-enwe mmetụta mkpagbu na ihe ọjọọ gbara anyị gburugburu. Ụzọ nnapụta anyị bụ otu ụdị Jehoshafat chọrọ, ma ekpere anyị nwere ike ịdị kwa ka nke ya: “O Chineke anyị, … ike adịghị niime anyị iguzogide igwe mmadụ ndị a bara ụba na-abịa ịlụso anyị ọgụ; ọ bụghị ma anyị makwa ihe anyị ga-eme: mana na gị ka anya anyị na-elekwasị” (2 Ihe e mere 20:12).
Niime 2 Ihe e mere 14-30, ị ga-agụ banyere Jehoshafat na eze ndị ọzọ nke Judah. Tụlee otu ndozi niile, mmeri niile, na ịma aka niile ha nke okwukwe kwagidere nwere ike ịdaba na ndụ nke onwe gị.
Maka nchịkọta nke akwụkwọ nke 2 Ihe e mere, lee “Ihe e mere” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
2 Ihe e mere 14–16
Ịtụkwasị obi na Chineke ga-ewetere m udo.
Mgbe Asa bụ eze nke Judah, o zutere ọtụtụ ịma aka—dị nnọọ ka anyị niile na-ezute taa. Dị ka ị na-agụ banyere mnwale niile o zutere, mata ebe ọ tụkwasịrị obi ya na otu nke ahụ siri gbanwee n’oge.
|
Ntụaka |
Ịma aka niile Asa zutere |
Ebe Asa tụkwasịrị obi ya |
|---|---|---|
Ntụaka 2 Ihe e mere 14:9–12 | ||
Ntụaka 2 Ihe e mere 15:1–8 | ||
Ntụaka 2 Ihe e mere 16:1–10 |
Gịnị mere mgbe ụfọdụ anyị akwụsị ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị? Kedụ ihe ọzọ ị mụtara site na ndụ nke Asa?
Lee kwa Okenye D. Todd Christofferson, “Mmekọrịta Anyị na Chineke,” Liahona, Me 2022, 78–80.
2 Ihe e mere 18
E nwere m ike ichekwa eziokwu, ọbụna mgbe amachaghị nke ọma.
Onye amụma Maịkaya dịịrị ka ọ nwetere ọtụtụ nkwagide ibu amụma ọganiihu nke eze Jehoshafat na Ahab n’agha ha megide Syria. Chọọ maka ihe aka ebe nke nkwagide ahụ dị niime 2 Ihe e mere 18:1-12. Kedụ ihe aka ebe ị na-achọta na-egosi ike na iguzosi ike n’ezi ihe nke Maịkaya niime amaokwu ndịa 13-27? (Mata na niime amaokwu 14, Maịkaya na-enye azịza mkparị; ezigbo azịza ya dị niime amaokwu nke 16.) Kedụ otu okwu niile nke Maịkaya ji mezuo niime amaokwu ndịa 28–34?
Gịnị bụ ụfọdụ ọnọdụ nke i nwere ike izute nkwagide dị ka Maịkaya zutere? Kedụ ihe na-enye gị mgbam ume iguzosi ike maka Onyenwe anyị na nkuzi Ya niile?
N’ụbọchị niile nke Eze Jehoshafat, mba atọ busoro Jerusalem agha.
2 Ihe e mere 20:1–25
N’oge ndị ihe isi ike, e nwere m ike ichigharịkwute Chineke na ndị amụma Ya.
Dị ka ị na-agụ 2 Ihe e mere 20:1–12, chọọ ihe Eze Jehoshafat mere mgbe ọtụtụ mba bịara ibuso Judah agha. Kedụ otu i ga-esi etinye omume ya niile n’ọrụ n’ọnọdụ ịma aka niile ị na-ezute?
Azịza nke Onyenwe anyị nye ekpere nke Jehoshafat ka achọtara niime amaokwu ndịa 14–17. Kedụ nkebiokwu ndị ị na-achọta nwere ike ịkasi gị obi ma ọ bụ onye ị maara n’oge niile siri ike?
Ụbọchị soterenu, ndị Jerusalem pụrụ izute otu ndị agha na-ebuso agha. Dị ka ị na-agụ 2 Ihe e mere 20:20, chọọ maka ozi Jehoshafat nyere ndị Jerusalem. Kedụ otu okwu niile ya si mezuo? (lee amaokwu ndịa 22–23). Kedụ otu Chineke si gọzie gị maka ikwere na Ya na isoro ndị amụma Ya?
Onyeisi Russell M. Nelson kwuru: “Nhụmiihe m bụ na ozugbo ị kwụsịrị itinye akara ajụjụ na-azụ nkwuputa niile nke ndị amụma ma kama tinye akara iti mkpu, ma mee ya, ngọzi niile na-awụpụta nnọọ. Ọ dịghị mgbe m jụrụ onwe m, ‘Kedụ mgbe onye amụma na-ekwu dị ka onye amụma na kedụ mgbe ọ dịghị ekwu?’ Mmasị m abụrụwo, ‘Kedụ otu m nwere ike i si dịrị ka ya karịa?’” (niime Lane Johnson, “Russell M. Nelson: Ihe Mmụta maka Nrube isi,” Ensign, Aug. 1982, 24).
Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 21:4–6; “Ihe Njigide Siri ike” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Mee Nhọrọ ndị na-akpate mmụọ,” Maka Ume nke ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile (2022), 4–5.
A Secure Anchor
Chọpụta nkwuputa niile nke eziokwu dị mfe. Okenye Neal A. Maxwell kuziri: “Akwụkwọ nsọ na-enye anyị imerime ozizi ndị dị ka diamond. Ma mgbe ihè nke Mmụọ na-arụ ọrụ n’ihu ha dị iche iche, ha na-amuke n’uche selestịal ma nye ihè n’ụzọ anyị kwesịrị isoro” (“Dị ka otu Ọchịchọ nke Obi [Anyị] Dị,” Ensign, Nov. 1996, 21). Dị ka ị na-amụ akwụkwọ nsọ, tụlee iwere oge ji chọpụta, kanye, ma tụgharịa uche ntakịrị ọbụna ozi ndị dị ike. Ụfọdụ ọmụmaatụ ka e nwere ike ịchọta niime 2 Ihe e mere 14:11; 15:7; 18:13; 20:15; 26:5. Kedụ “ozizi ndị dị ka diamond” ndị ọzọ i nwere ike ịchọta?
2 Ihe e mere 26:3–21
Mpako na-edu ruo mbibi.
Dị ka ọ dị ọtụtụ ndị eze ndị ọzọ nke Judah, ọchịchị nke Uzaya malitere jiri nnukwu mmepụta ihe mana jiri ihe ọjọọ bịa na ngwụcha. Chọọ maka usoro nke a niime 2 Ihe e mere 26. Kedụ ihe ị ga-ekwu bụ oge ntụgharị nke ndụ nke Uzaya?
Dị ka ị na-agụ amaokwu ndịa 16-23, buru n’uche na n’oge nke a, naanị ndị nchụaja nwere ohere imunye ihe nsure ọkụ nwere isi ụtọ ọkụ niime tempụl. Gịnị mere i jiri na-eche na Eze Uzaya erubeghị isi nye Chineke? Kedụ ihe ị na-amụta site na nhụmiihe ọjọọ nke a?
Lee kwa “Dịrị Umeala,” Abụ, no. 130.
2 Ihe e mere 30
Enwere m ike ịbụ onye ome udo.
Niime 2 Ihe e mere 30, Hezekaya bụ eze nke Judah. Ọ kpọkuru Alaeze ndị iro nke Izrel ịgbakọta na Jerusalem ime ememe Emume Ngabiga—ihe Ndị Izrel enwebeghị ike ime ruo ọtụtụ afọ (lee amaokwu ndịa 1-12). Kedụ ihe na-amasị gị banyere ọkpụkpọ oku na otu e siri nata ya—ma site n’aka ndị ọbịa Ndị Izrel ma site n’aka ndị na-akpụ ọbịa niime Judah?
Niihi na o tewo aka nke ukwuu, ụfọdụ ndị ọbịa bịara Jerusalem amachaghị nke ọma uju niile nke otu esi esonye na Emume Ngabiga. Dị ka ị na-agụ 2 Ihe e mere 30:18–27, kedụ ihe ị na-amụta site n’azịza nke Hezekaya na nsonazụ nke azịza ya?
Lee kwa Russell M. Nelson, “Ndị Ome Udo Ka A Chọrọ,” Liahona, Me 2023, 98–101.
Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
2 Ihe e mere 14–16; 20
E nwere m ike ịtụkwasị Chineke obi.
-
Idubata nchepụta nke ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị, i nwere ike gosi ụmụ gị ihe ị tụkwasịrị obi idebe gị akọrọ mgbe mmiri na-ezo, dị ka nche anwụ ma ọ bụ jaket. Kwe ha kwuo okwu banyere ihe mere anyị nwere ike iji tụkwasị obi na ihe ndị a. Mgbe ahụ nyere ha aka tụnyere nke ahụ na ntụkwasị obi anyị na Onyenwe anyị. Gịnị mere anyị ji atụkwasị obi na Ya idebe anyị na nchekwa ime mmụọ?
-
I nwere ike nyere ụmụ gị aka chọpụta otu Eze Asa na Eze Jehoshafat siri zaghachi nye ịma aka niile site na-ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị (lee 2 Ihe e mere 14:11; 20:3–5, 12). Kesaara ibe unu ụzọ ndị ọzọ i nwere ike i si gosi Onyenwe anyị na gị tụkwasịrị obi na Ya.
2 Ihe e mere 20:1–29
Chineke ga-anụ ma ga-aza ekpere m niile.
-
Ihu akwụkwọ ihe omume izu ụka nke a nwere ike nyere ụmụ gị aka ghọta akụkọ ekpere nke Jehoshafat na azịza nke Onyenwe anyị. Gị na ụmụ gị nwere ike kesaa oge niile mgbe Chineke nụrụ ma za ekpere gị niile. Tụlee ịgụnye oge niile mgbe azịza niile bịara n’ụzọ ma ọ bụ n’oge ndị ịtụghị anya ya. Otu egwu banyere ekpere, dị ka “Ekpee M n’Okwukwe” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 14), nwere ike nyere gị aka wulite okwukwe nke ụmụ gị.
2 Ihe e mere 26:3–23
Enwere m ike ịdị umeala.
-
Ịmụ banyere ihe egwu nke mpako, ụmụ gị nwere ike jiri okwute ma ọ bụ ụmụ obere iko ji wuo tọwa. Dị ka ha tụkwasịrị okwute ma ọ bụ iko nke ọbụla n’elu tọwa ahụ, nyere ha aka chọpụta otu niime mmepụta niile nke Uzaya site na 2 Ihe e mere 26:3–15. Mgbe ha rụsịrị tọwa ahụ, kwurịta gị na ụmụ gị otu Uzaya nwere ike iji debe ya ogologo ma sie ike. Gịnị nwere ike ime ya adaa? Emesịa, dị ka unu na-agụ amaokwu 16, unu nwere ike kwuo banyere ihe ọ pụtara inwe obi anyị “ebuliri elu ruo na mbibi [anyị].” Kesaara ụmụ gị ihe mere Uzaya niime amaokwu ndịa 16–23. Ka ha kụda tọwa ha. Kwuo okwu banyere ihe anyị nwere ike ime iji dịrị umeala.
Eze Hezekaya na Ndị ahụ Na-ekele Chineke, © Lifeway Collection/licensed from goodsalt.com
2 Ihe e mere 30
Enwere m ike ịbụ onye ome udo.
-
Foto dị n’elu na-egosi mgbe Hezekaya kpọkuru ndị agbata obi nke Judah sitere n’Alaeze nke Izrel ime ememe Emume Ngabiga ha na ha. I nwere ike lee anya na eserese nke a gị na ụmụ gị ma gụọ 2 Ihe e mere 30:18–19, nke na-akọwa na ụfọdụ ndị ọbịa asabeghị onwe ha dị ka otu iwu nke Mosis siri dị. Gịnị ka Hezekaya mere? Kedụ otu nke a gaara esi emetụta ndị ọbịa ahụ? Nyere ụmụ gị aka chee maka otu ha nwere ike i si adị ka Hezekaya n’ụzọ ha si emeso ndị ọzọ.
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.