“Echiche ndị aga E Buru n’Uche: Jizọs Ga-agwa Izrel Niile, ʻLọghachinu Ụlọ,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Echiche ndị aga E Buru nʻUche: ʻJizọs Ga-agwa Izrel Niile, “Lọghachinu Ụlọ”ʻ” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Echiche ndị aga E Buru n’Uche
“Jizọs Ga-agwa Izrel Niile, ʻLọghachinu Ụlọʻ”
Niime ọzara nke Sinai, Mosis kpokọtara ụmụ Izrel nʻụkwụ nke ugwu ukwu. Ebe ahụ Onyenwe anyị mara ọkwa na Ya chọburu ịtụgharị otu nke a nke ndị ohu nweere onwe ha mgbe na-adịghị anya ịghọ ndị dị ike. “Unu ga-abụ nye m,” ka O kwuru, “alaeze nke ndị nchụaja, na mba dị nsọ” (Ọpụpụ 19:6). O kwere nkwa na ha ga-eme nke ọma ma nwee ọganiihu, ọ bụna mgbe ndị iro dị ukwuu karịa, dị ike karịa gbara ha gburugburu.
Ihe nke a niile ga-eme ọ bụghị niihi na Ndị Izrel dịịrị imerime ma ọ bụ sie ike ma ọ bụ juputa na nkà. Ọ ga-eme, ka Onyenwe anyị kọwara, ọ bụrụ na ha “ga-erube isi nʻolu [Ya] nʻezie, ma debe ọgbụgba ndụ [Ya] (Ọpụpụ 19:5). Ike nke Chineke, ọ bụghị nke ha onwe ha, ga-eme ha adị ike.
Otu ọ dị Ndị Izrel adịghị erube isi nʻolu Chineke mgbe niile, ma mgbe oge gara ha kwụsịrị idebe ọgbụgba ndụ Ya. Ọtụtụ fere chi ndị ọzọ ofufe ma nabata omume omenaala nke ndị niile gbara ha gburugburu. Ha jụrụ ihe nke ahụ kpọmkwem nke mere ha mba pụrụ iche—mmekọrịta ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị. Ewezuga ike nke Chineke na-echekwa ha, ọ dịghị ihe gaara egbochi ndị iro ha.
Mkposasị ahụ
Ọtụtụ mgbe nʻetiti ihe ruru 735 na 720 Tupu A Mụọ Kraịst, Ndị Asirịa wakporo Alaeze Mpaghara Ugwu nke Izrel, ebe obibi nke ebo iri nke ebo iri na abụọ ahụ, ma buru puku kwuru puku nke ndị Izrel na ndọkpụ nʻagha banye nʻakụkụ dị iche nke Alaeze ukwu ndị Asiria. Ndị Izrel ndị a ka amaara dị ka “ebo ndị furu efu,” otu aka niihi na ewepụrụ ha site nʻala nna ha ma kposasịa ha nʻetiti mba ndị ọzọ. Mana ha fukwara efu nʻuche miri emi karịa: ka oge na-aga uche njirimara ha dị ka ndị ọgbụgba ndụ nke Chineke furu efu.
Nʻikpeazụ ọtụtụ ndị mmadụ dị na Alaeze Mpaghara ndịda nke Judah dapụkwara site nʻebe Onyenwe anyị nọ. Ndị Asirịa busoro agha ma merie ọtụtụ alaeze ahụ kwa; naanị Jerusalem ka echekwara nʻụzọ dị ebube. Emesịa, nʻetiti 597 na 580 Tupu A Mụọ Kraịst, ndị Babịlọn bibiri Jerusalem, gụnyere tempụl, ma dọkpụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n’agha. Ihe ruru afọ 70 gasịrị, ndị fọdụrụ na ndị nke Judah ka ahapụrụ ịlaghachi Jerusalem ma wugharịa tempụl ahụ. Ọtụtụ, kosiladị, nọgidere na Babịlọn.
Mbibi nke Jerusalem site nʻaka Nebuzar-adan, site nʻaka William Brassey Hole, © Providence Collection/licensed from goodsalt.com
Ka oge gafere, Ndị Izrel sitere nʻebo niile ka “ekposasịrị … jiri oke ifufe nʻetiti mba niile ndị ha amaghị ama” (Zakaraya 7:14). Ụfọdụ ka Onyenwe anyị dubara nʻala ndị ọzọ. Ndị ọzọ hapụrụ Izrel ịgbanarị ndọkpụ ma ọ bụ maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ maka ihe gbasara mkpata ego.
Anyị na-akpọ ihe omume ndị a niile mkposasị nke Izrel. Ma ọ dị mkpa ịmara banyere mkposasị ahụ maka ebumnuche dị iche iche. Niihi otu ihe, ọ bụ ọkpụrụkpụ isiokwu nke Agba Ochie—ọtụtụ ndị amụma Agba Ochie bụụrụ ndị akaebe nke ndapụ ime mmụọ nke dubara na mkposasị ahụ. Ha bu ụzọ hụ ya ma dọọ aka na ntị banyere ya. Ụfọdụ niime ha ọbụna dịịrị ndụ hụ ya. Nke ahụ na-enye aka icheta mgbe ị gụrụ akwụkwọ ndị nke Aịzaya, Jeremaya, Emọs, na ndị amụma ndị ọzọ nʻakụkụ ikpeazụ nke Agba Ochie. Buru ọnọdụ nke a nʻuche, mgbe ị na-agụ amụma ha niile banyere Asirịa na Babịlọn, ife arụsị na ndọkpụ n’agha, mbibi na mweghachite nʻikpeazụ, ị ga-amata ihe ha na-ekwu maka ya.
Ịghọta mkposasị nke Izrel ga-enyere gị aka ghọtakwuo Akwụkwọ nke Mọmọn kwa, niihi na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ndekọihe nke alaka nke Izrel ekposasịrị. Ndekọihe nke a malitere site nʻezi na ụlọ nke Lehi na-agbapụ na Jerusalem ihe ruru 600 Tupu A Mụọ Kraịst, tupu nnọọ mwakpo ndị Babịlọn. Lihaị bụ otu niime ndị amụma buru amụma banyere mkposasị nke Izrel. Ma ezi na ụlọ ya nyere aka mezuo amụma ahụ, ịkpọrọ alaka nke Izrel ha ma kụọ ya nʻakụkụ ụwa nke ọzọ, nʻala ndị Emerịka.
Mkpokọta ahụ
Mkposasị nke Izrel, kosiladị, bụ naanị ọkara akụkọ ahụ. Onyenwe anyị adịghị echefu ndị Ya, ọ bụghị ma Ọ na-ahapụ ha, ọbụna mgbe ha hapụrụ Ya. Ọtụtụ amụma nke na Chineke ga-ekposasị Izrel ka ọtụtụ nkwa na-esote nke mere na otu ụbọchị Ọ ga-ekpokọta ha.
Ụbọchị ahụ bụ taa—ụbọchị anyị. Mkpokọta ahụ amaliteworịị. Niime 1836, puku kwuru puku afọ mgbe Mosis kpokọtasịrị ụmụ Izrel nʻala ala Ugwu Sinai, ọ pụtara ihè niime Tempụl Kirtland inye Joseph Smith “ntughe niile nke mkpokọta nke Izrel site na akụkụ anọ nke ụwa” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:11). Ugbu a, site na nduzi nke ndị ahụ ji ntughe ndị a, ebo niile nke Izrel ka a na-ekpokọta site na mba niile ebe ụmụ odibo nke Onyenwe anyị nwere ike ịga.
Mosis, Elias, na Elijah Na-apụta ihè niime Tempụl Kirtland, site nʻaka Gary E. Smith
Onyeisi Russell M. Nelson akpọwo mkpokọta nke a “ihe kachasi mkpa na-eme n’elu ụwa taa. Enweghi ihe ọzọ eji atụnyere ịdị ukwuu ya, enweghị ihe ọzọ eji atụnyere ịdị mkpa ya, enweghị ihe ọzọ eji atụnyere ebube ya. Ma ọ bụrụ na ị họrọ ime ya, ọ bụrụ na ị chọrọ ime ya, i nwere ike bụrụ nnukwu akụkụ ya.”
Kedụ otu anyị nwere ike i si enye aka? Gịnị bụ ihe ọ pụtara ikpokọta Izrel? Ọ pụtara na iweghachite ebo iri na abụọ ahụ na ala ahụ ha nwebuuru na mbụ? Nʻezie, ọ pụtara ihe dị ukwuu karịa, dị ebighị ebi karịa. Dị ka Onyeisi Nelson kọwara:
“Mgbe anyị na-ekwu maka mkpọkọtaahụ, ihe dị mfe anyị na-ekwu bụ eziokwu nke a dị mkpa: nwa ọbụla nke Nna anyị nke Eluigwe, dị ndụ ma ọ bụ nwụrụ anwụ, kwesịrị ịnụ ozi nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere. …
“Oge ọbụla i mere ihe ọbụla nke na-enyere onye ọbụla aka—na akụkụ abụọ nke akwa mgbochi—zọpụ otu nzọm ụkwụ ruo na ịgba ọgbụgba ndụ ha na Chineke ma ha ịnata emume niile dị mkpa nke baptizim na emume nsọ niile nke tempụl, ị na-enye aka ịkpokọta Izrel. Otu a ka o jiri dịrị mfe.”
Nke a na-eme, dị ka Aịzaya kwuru, nʻotu nʻotu” (Aịzaya 27:12) ma ọ bụ, dị ka Jeremaya buru amụma, “otu onye site nʻotu obodo, ma mmadụ abụọ site nʻotu agbụrụ” (Jeremaya 3:14).
Mkpokọta Izrel pụtara ịkpọghachite ụmụ nke Chineke nye Ya. Ọ pụtara iweghachite ha ruo na mmekọrịta ọgbụgba ndụ ha na Ya. Ọ pụtara ihiwekwa ọzọ “mba dị nsọ” Ọ tụrụ uche ihiwe ọtụtụ oge gara aga (Ọpụpụ 19:6).
Lọta nʻEbe obibi
Dị ka onye meworo ọgbụgba ndụ gị na Chineke, ị bụ akụkụ nke ụlọ nke Izrel. Ekpokọtawo unu, ma unu bụ ndị mkpokọta. Akụkọ egwu ọtụtụ narị afọ ndị gara aga nke ndị ọgbụgba ndụ bụ iwu ruo nʻisi ya, ma ị bụ onyeisi ihe omume. Ugbu a bụ oge mgbe “Jizọs Ga-agwa Izrel Niile, ʻLọtanụ nʻEbe obibi.ʻ”
Nke a bụ ozi nke ndị mkpokọta: Lọtanụ nʻebe obibi ruo ọgbụgba ndụ. Lọtanụ nʻebe obibi ruo Zayọn. Lọtanụ ruo Jizọs Kraịst, Onye Nsọ nke Izrel, ma Ọ ga-akpọlata unu nʻebe obibi nye Chineke, Nna unu.