Come, Follow Me
Julaị 13–19. “Ọ Tụkwasịrị obi na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel”: 2 Ndị Eze 16–25


“Julaị 13–19. ‘Ọ Tụkwasịrị obi niime Onyenwe anyị Chineke nke Izrel’: 2 Ndị Eze 16–25,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Julaị 13–19. ‘Ọ Tụkwasịrị obi niime Onyenwe anyị Chineke nke Izrel,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

imerime otù ndị Juu na-eme njem ịgbapụ na Babịlọn

Ọsọ ndị Mkpọrọ, site n’aka James Jacques Joseph Tissot na ndị ọzọ

Julaị 13–19: “Ọ Tụkwasịrị obi niime Onyenwe anyị Chineke nke Izrel”

2 Ndị Eze 16–25

Na-agbanyeghị ije ozi dị ike nke onye amụma Elisha, ndị nke Mpaghara Ugwu Alaeze nke Izrel echegharịghị. N’ikpeazụ, Alaeze ukwu ndị Asiria meriri ma kposasịa ebo iri nke Izrel. Ka ọ dị ugbu a, Mpaghara ndịda Alaeze nke Judah anaghị eme nke ọma: ife arụsị gbasakwara ebe ahụ nke ukwuu.

N’etiti ire ure ime mmụọ nke a niile, akwụkwọ nsọ kwuru maka eze abụọ nke Judah ndị, n’oge nta, mere ka ndị nke ha chigharịkwute Onyenwe anyị. Otu bụ Hezekaya. N’oge ọchịchị ya, Ndị Asirịa meriri ọtụtụ ndị Judah. Mana Hezekaya na ndị ya gosiri okwukwe niime Onyenwe anyị, onye zọpụtara Jerusalem n’ụzọ dị ebube. Emesịa, mgbe oge ngọnarị okwukwe ọzọ gasịrị, Josaya ghọrọ eze. Ke mmụọ kpatere n’otu aka site na nchọpụtagharị nke akwụkwọ nke iwu nke Mosis, Josaya wetere ndozi ndị kpọtere ndụ ife Chineke nke ndị ya.

Dị ka Izrel na Judah, anyị niile na-eme ma nhọrọ ọjọọ ma nhọrọ dị mma. Mgbe anyị matara na ndụ anyị na-achọ ụfọdụ ndozi, anyị nwere ike nwete mgbam ume site n’oge abụọ ndị a dị mma n’afọ ndị nke ihe isi ike nʻagụgụala nke Judah. Elemaanya ọmụmaatụ ndị nke Hezekaya na Josaya nwere ike kpateemmụọ anyị ịtụkwasị obi niime Onyenwe anyị Chineke” (2 Ndị Eze 18:22).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

2 Ndị Eze 18–19

akara ngosi semịnarị
E nwere m ike nọgide eziokwu nye Onyenwe anyị mgbe a mara okwukwe m aka.

Ọtụtụ niime anyị nwere nhụmiihe ndị na-ama okwukwe anyị aka. Nye Hezekaya na ndị ya, otu niime ịma aka ndị ahụ bịara mgbe otù ndị agha Ndị Asirịa bịaruru Jerusalem. Dị ka ị na-agụ 2 Ndị Eze 18–19, chegodị na i bi niime Jerusalem n’oge nke a. Kedụ otu ị gaara esi eche, ịma atụ, ịnụrụ mkpọtụ nkọrọmọnụ niile nke ndị Asirịa niime 2 Ndị Eze 18:28–37; 19:10–13? Kedụ ihe ị gaara eme? Tụnyere nzube ndị Asirịa maka ndị Izrel ịghara ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị site na nzube nke Setan na-enye maka anyị inwe obi abụọ n’okwukwe anyị taa. I nwekwara ike chọọ ndịiche nzube nke ndị Asirịa ya na nzube nke gị ihe kpatara i ji atụkwasị obi na Onyenwe anyị.

Kedụ ihe ị na-amụta site n’omume nke Hezekaya n’ọnọdụ nke a? (lee 2 Ndị Eze 19:1–7, 14–19). Kedụ otu Onyenwe anyị si zaghachi? (lee 2 Ndị Eze 19:35–37). Gịnị mere i jiri chee na Hezekaya nọgidere na-ikwesị ntụkwasị obi? (lee 2 Ndị Eze 18:5–7). Tụgharịa uche otu Onyenwe anyị siworo kwadoo gị n’oge ịma aka niile nke gị. Kedụ mmetụta mkpatemmụọ ị na-enwe iji bawanye ntụkwasị obi gị na Ya?

Ozi nke Onyeisi Jeffrey R. Holland “Atụla Egwu: Naanị Kwere!” (Liahona, Me 2022, 34–36) nwere ndụmọdụ ndị na-enye aka maka oge ndị nke ịtụ egwu na inwe obi abụọ. Abụ dị ka “Ka Anyị Niile Kwagide” (Abụ, no. 243) nwekwara ike nwee ozi mgbam ume niile. Gịnị ka ị na-achọta nime akụrụngwa ndị a nke na-enyere gị aka?

Lee kwa 2 Ihe e mere 31–32; 3 Nifaị 3–4; Jörg Klebingat, “Ịbụ Onye Na-eso ụzọ Na-arụsi ọrụ ike n’Ụbọchị Ikpeazụ ndị a,” Liahona, Me 2022, 107–10.

IJi ihe ọmụmụ akwụkwọ nsọ na-enye aka. Nzukọ nsọ na-ewete ọtụtụ akụrụngwa iji nyere gị aka ghọta akwụkwọ nsọ. Ịma atụ, niime Ọba akwụkwọ Ozi ọma i nwere ike ịchọta Odudu ruo Akwụkwọ nsọ, Isiokwu niile na Ajụjụ niile, na Magazin niile nke Nzukọ nsọ. Na mgbakwunye, dị ka ị na-agụ Agba Ochie, i nwere ike chọta ọnọdụ na-enyeaka na nghọta ndị dị niime edereede “Echiche ndị aga Eburu n’Uche” dị niime Bịanụ, Soro M. Edereede akpọrọ “Jizọs Ga-agwa Izrel Niile, ‘Lọtanụ Ụlọ’” nwere ike nyere gị aka na ọmụmụ nke 2 Ndị Eze 16–25.

ezi na ụlọ na-agụkọta akwụkwọ nsọ ọnụ

2 Ndị Eze 19:20–37

Ihe niile dị n’aka nke Onyenwe anyị.

Sennacherib, eze nke Asirịa, nwere ezi ebumnuche ikwere na otù ndị agha ya ga-emeri Jerusalem (lee 2 Ndị Eze 17; 18:33–34; 19:11–13). Mana Onyenwe anyị nwere ozi gbasara Sennacherib, enyere site n’aka onye amụma Aịzaya. E dedatara ya niime 2 Ndị Eze 19:20–34. Kedụ eziokwu ndị ị na-ahụta n’ozi nke Onyenwe anyị na-enyere gị aka nwee okwukwe na Ya na nʻatụmatụ Ya?

2 Ndị Eze 21–23

Akwụkwọ nsọ nwere ike tụgharịa obi m nʻebe Onyenwe anyị nọ.

Enwewo oge ọbụla inwere mmetụta na enwere ihe ime mmụọ kọrọ gị? Ikekwe i na-eche na mmekọrịta gị na Chineke nwere ike sie ike karịa. Kedụ ihe nyeere gị aka chigharịkwute Ya? Tụgharịa uche nʻajụjụ ndị a dị ka ị na-agụ 2 Ndị Eze 21–23, nke na-akọwa otu Alaeze nke Judah siri dapụ site n’ebe Onyenwe anyị nọ n’okpuru Eze Manasseh (lee 2 Ndị Eze 21) na otu Eze Josaya siri nyere ndị ahụ aka chigharịkwute Ya (lee 2 Ndị Eze 22–23). Kedụ otu na gịnị mere Josaya na ndị ya jiri gbanwee? (lee 2 Ndị Eze 22:8–11; 23:1–6, 21, 24).

Onyeisi Spencer W. Kimball kpọrọ akụkọ nke Eze Josaya “otu niime akụkọ ndị kacha mma niime akwụkwọ nsọ niile” (Nkuzi niile nke Ndịisi nke Nzukọ nsọ: Spencer W. Kimball [2006], 62). Gụọ okwu niile nke Onyeisi Kimball banyere Eze Josaya (ihu akwụkwọ 62–64). Elemaanya i nwere ike chee maka otu nhụmiihe mgbe otu edereede nke akwụkwọ nsọ “[rụrụ] ọrụ dị egwu” niime gị. Gịnị ka i nwere ike ime iji natakwuo nhụmiihe karịa dị ka nke ahụ?

Lee kwa Alma 31:5; “Josaya na Akwụkwọ nke Iwu” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

12:25

Josiah and the Book of the Law

2 Ndị Eze 23:1–25

Ọgbụgba ndụ bụ nkwa juru mkpụrụ obi n’etiti mụ na Onyenwe anyị.

Kedụ ihe na-amasị gị banyere ọgbụgba ndụ Josaya gbara niime 2 Ndị Eze 23:3? Dị ka ị na-aganiihu na-agụ isi nke 23, mata ihe Josaya mere iji gosi nkwa ya nye Onyenwe anyị (lee kwa foto dị na ngwụcha ndepụta nke a). Kedụ otu i ga-esi egosi nkwa gị nye Ya?

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

2 Ndị Eze 18:3–6; 19:14–19

E nwere m ike tụkwasị obi na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst.

  • Niime 2 Ndị Eze 18:3, 5–6, nyere ụmụ gị aka chọpụta ihe mere Hezekaya ezigbo eze. Emesịa dị ka unu na-agụkọta ọnụ 2 Ndị Eze 19:14–19, ha nwere ike chọpụta otu o si gosi na ya tụkwasịrị obi na Onyenwe anyị. I nwere ike lee anya na foto nke Jizọs ma kwuo okwu banyere ihe mere anyị ga-esi enwe ike tụkwasị obi na Ya. Kedụ otu anyị ga-esi egosi na anyị tụkwasịrị obi na Onyenwe anyị?

2 Ndị Eze 22:1–7

Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist nwere ike ịtụkwasị obi na m.

  • Niime 2 Ndị Eze 22:1, nyere ụmụ gị aka chọpụta afọ ole Josaya gbara mgbe ọ ghọrọ eze. Kedụ ihe unu na-amụta banyere Josaya na amaokwu nke 2? Tụlee ihe omume nke nwere ike igosipụta isoro Onyenwe anyị ma ghara ịtụgharị “azụ n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.”

  • Ndị ọrụ kọwara niime 2 Ndị Eze 22:3–7 ka ejiri ntụkwasị nye ego iji wugharịa tempụl ahụ “niihi na ha kpara agwa kwesịrị ntụkwasị obi” (amaokwu nke 7). Mgbe agụsịrị amaokwu ndị a, gị na ụmụ gị nwere ike kwuo okwu banyere ihe ndị enyefere gị n’aka. Kedụ otu anyị ga-esi etozu oke ntụkwasị obi dị ka ndị ọrụ dị niime amaokwu ndị a?

odee ya na Eze Josaya

Odee na-ewete ukwu akwụkwọ nke akwụkwọ nsọ nye Eze Josaya; ngosipụta site n’aka Robert T. Barret

2 Ndị Eze 22:8–11; 23:2–3

Akwụkwọ nsọ na-akuziri m isoro Jizọs Kraịst.

  • Idubata akụkọ nke Eze Josaya niime 2 Ndị Eze 22–23, i nwere ike zoo otu kọpị nke akwụkwọ nsọ otu ebe niime ụlọ ahụ. Kpọkuo ụmụ gị ịchọta ya. Emesịa i nwere ike kesaa ihe mere mgbe otu niime ndị nchụaja nke Josaya chọtara akwụkwọ nsọ niime tempụl (lee 2 Ndị Eze 22:8–11; lee kwa “Eze Josaya” niime Akụkọ nille nke Agba Ochie, 148–49). Gịnị nwere ike ime anyị ọ bụrụ na anyị enweghị akwụkwọ nsọ? Kesaara ibe unu ihe mere i jiri nwee obi ekele na anyị nwere akwụkwọ nsọ taa.

    1:36

    King Josiah

  • Mgbe agụsịrị 2 Ndị Eze 23:2–3, gị na ụmụ gị nwere ike kwuo okwu banyere akwụkwọ nsọ nke kpateworo mmụọ unu “ije ije dị ka Onyenwe anyị” (amaokwu 3) Unu nwekwara ike gụọ otu egwu banyere akwụkwọ nsọ, dị ka “Chọgharịa, Tụgharịa uche, ma Kpee ekpere” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụ ntakịrị, 109).

2 Ndị Eze 23:1–3

Aga m edebe ọgbụgba ndụ mụ na Chineke.

  • Mgbe Josaya na ndị ya mụtara iwu nsọ niile nke Chineke, ha gbara ndụ idebe ha. Gụọ banyere nke a gị na ụmụ gị niime 2 Ndị Eze 23:1–3, ma nyere ha aka chọta mkpụrụokwu ma ọ bụ nkebiokwu nke na-egosi otu ndị ahụ siri nwee mmetụta banyere iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị. Ikekwe ụmụ gị nwere ike guzoro ma kwuo okwu banyere ihe o nwere ike ịpụta “[iguzo] n’elu ọgbụgba ndụ.” Emesịa ha nwere ike jee ije ebe ahụ ma kwuo okwu banyere ihe o nwere ike ịpụta “ije ije dị ka Onyenwe anyị.” Ọzọkwa, ha nwere ike tụkwasị aka ha n’obi ha ma tụpụta ụzọ ndị anyị nwere ike i si debe ọgbụgba ndụ anyị “jiri obi [anyị] niile.”

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.

ndị mmadụ na-adọda akpụrụakpụ jiri ụdọ

Ndị nke Josaya na-ewepụ arụsị niile site n’obodo ukwu; ngosipụta site n’aka William Hole

Ihu akwụkwọ ihe omume Prịamarị: Akwụkwọ nsọ na-akuziri m isoro Jizọs Kraịst