“Jun 29–Julaị 5. ‘Ọ bụrụ ma Onyenwe anyị Bụ Chineke, Soro Ya’: 1 Ndị Eze 12–13; 17–22,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Jun 29–Julaị 5. ‘Ọ bụrụ ma Onyenwe anyị Bụ Chineke, Soro Ya,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Elijah Amaa aka megide Ndị nchụaja nke Baal, site n’aka Jerry Harston
Jun 29–Julaị 5: “Ọ bụrụ ma Onyenwe anyị Bụ Chineke, Soro Ya”
1 Ndị Eze 12–13; 17–22
Ụlọ nke Izrel nọ na ọgba aghara. Alaeze ahụ ekewaworịị, mgbe ebo iri kpụrụ Alaeze nke Izrel dị na Mpaghara Ugwu na ebo abụọ ndị kpụrụ Alaeze nke Judah dị na Mpaghara Ndịda. Mana kacha njọ karịa nkewapụ ha site n’ibe ha bụ ma nkewa nke alaeze site n’ọgbụgba ndụ ha. Ndị eze ajọọ omume dupụrụ ndị ahụ site na Onyenwe anyị, ma ọtụtụ ndị mmadụ dara mba n’okwukwe ha.
Na ntọ nke a, Onyenwe anyị kpọrọ Elijah oku ịbụ onye amụma. Ndụ ya gosiri na mmadụ nwere ike nwee nnukwu okwukwe niime Onyenwe anyị ọbụna n’ọnọdụ ndị na-adịghị mma. Mgbe ụfọdụ Onyenwe anyị na-azaghachi nye ụdị okwukwe ahụ jiri ọrụ ebube niile mara mma, nke ihu ọha, dị ka ọkụ si n’eluigwe n’ada. Mana Ọ nakwa arụ ọrụ ebube ndị na-adịghị ada ụda, nke onwe, dị ka inye nwanyị isi mkpe kwesịrị ntụkwasị obi na nwa ya nwoke ihe oriri. Ma ọtụtụ mgbe ọrụ ebube niile nke Onyenwe anyị bụ nnọọ n’otu n’otu mere naanị otu onye jiri mara ha—ịma atụ, mgbe Onyenwe anyị kpughere Onwe Ya nye gị site na “olu nta na-anọgide” (1 Ndị Eze 19:12).
Maka ihe ọzọ banyere Elijah, lee “Elijah” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
1 Ndị Eze 12:1–20
Ndị ndu yiri Kraịst na-ejere ndị ha na-edu ozi.
Kedụ otu ị ga-esi akọwa njehie Eze Rehoboam, ọkpara Solomọn, mere niime 1 Ndị Eze 12:1–14? Kedụ njirimara ndị yiri Kraịst gaara enwe ike enyere Rehoboam aka chekwaa alaeze ya? (lee amaokwu 7; Matiu 20:25–28; Mozaya 2:10–21). Kedụ otu i nwere ike i si jiri njirimara ndị a dị ka onye ndu—ma n’ọkpụkpọ oku Nzukọ nsọ ma ọ bụ dị ka onye ndu nke ndụ nke onwe gị?
1 Ndị Eze 17:8–16; 19:19–21
Ọkpụkpọ oku ịchụ aja bụ ohere iji tinye okwukwe m niime Jizọs Kraịst n’ọrụ.
Onye amụma Elijah rịọrọ nwanyị isi mkpe inye ya ihe oriri na mmiri tupu inye onwe ya na nwa ya nwoke bu ọnụ ihe oriri. Gịnị mere ọ ga-eji mee nke ahụ? Arịrịọ nke Elijah ka e nwere ike ịhụta dị ka ngọzi maka ezi na ụlọ nta nke a. Ha nwere mkpa ngọzi niile nke Onyenwe anyị, ma ịchụ aja na-ewete ngọzi niile—gụnyere ngọzi nke okwukwe siri ike karịa.
Dị ka ị na-agụ 1 Ndị Eze 17:8–16, chegodị na ịbụ nwanyị isi mkpe nke a. Kedụ ihe na-amasị gị banyere ya? I nwekwara ike depụta nhọrọ niile na-achọ okwukwe niime Jizọs Kraịst (ịma atụ, lee Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu ruo Na-ime Nhọrọ niile [2022]). Kedụ ihe ị na-amụta site na nwanyị isimkpe nke a banyere itinye okwukwe n’ọrụ?
Kedụ otu omume niile nke Elisha dị niime 1 Ndị Eze 19:19–21 siri yie omume niile nke nwanyị isimkpe ahụ?
Chee banyere aja niile i chụworo iji soro Onye Nzọpụta. Gịnị ka 1 Ndị Eze 17:8–16; 19:19–21 na-akuziri gị banyere aja ndị a niile? Kedụ otu mmata ihe gị banyere Onye Nzọpụta si enyere gị aka mgbe Ọ rịọrọ gị ịchụ aja? Kedụ otu O siworo gọzie gị?
Lee kwa Matiu 4:18–22; 6:25–33; Luk 4:24–26; “Elijah na Nwanyị Isimkpe nke Zarefath” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Mgbe Okwukwe Nagidere,” Abụ, no. 128.
Elijah and the Widow of Zarephath
1 Ndị Eze 18
“Ọ bụrụ ma Onyenwe anyị bụ Chineke, soro ya.”
Ndị Izrel nwere ike ha echewo na ha nwere ebumnuuche ndị dị mma iji fee Baal, onye a maara dị ka chi nke ebili mmiri na mmiri ozuzo. Mgbe afọ atọ nke oke ọkọchị gasịrị, ha chọsiri mmiri ozuzo ike. Ma ife Baal ofufe ka anabatara n’ihu ọha ma akwadoo ya site n’aka eze na eze nwanyị. Dị ka ị na-agụ 1 Ndị Eze 18, chee banyere ihe mere mmadụ n’ụbọchị anyị nwere ike na-enwe obi abụọ banyere isoro Onyenwe anyị. N’isi nke a, kedụ ihe i chere Onyenwe anyị naara agbalị ikuzi banyere Onwe Ya? Kedụ nhụmiihe ndị nyeworo gị aka kpebie isoro Onye Nzọpụta?
Lee kwa D. Todd Christofferson, “Nhọrọ na Nkwa” (worldwide devotional for young adults, Jan. 12, 2020), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Ngosipụta nke Elijah, site n’aka Wilson Ong
1 Ndị Eze 19:1–18
Onyenwe anyị na-ekwukarị n’ụzọ ndị dị jụụ, dị mfe.
Na mwute, ọrụ ebube n’elu Ugwu Carmel emeghị ozi mgbasa ozi nke Elijah adị mfe karịa. N’ezie, ndụ ya nọ n’egwu, ma ọ bịara zoo niime oghere dị n’okwute dị niime alaịkpa. Ebe ahụ, ị na-ahụju anya ịnọrọ naanị ya na ndakpọ olileanya, o nwetere nhụmiihe ya na Onyenwe anyị nke dịịrị ezigbo iche site na nhụmiihe n’elu Ugwu Carmel. Gịnị ka nhụmiihe nke Elijah niime 1 Ndị Eze 19:1–18 na-akuziri gị banyere otu Onyenwe anyị si agwa gị okwu n’oge mkpa gị niile?
Tụlee oge niile mgbe i chere na Onyenwe anyị agwawo gị okwu. Kedụ otu i ga-esi akọwa ụzọ O si ekwuru gị okwu? Gịnị mere mkpụrụokwu ndị a “duu” na “ntakịrị” si bụrụ ụzọ ndị dị mma iji kọwaa olu nke Mmụọ? Kedụ mkpụrụokwu ndị ọzọ ị na-achọta niime Helaman 5:30; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:22–23; 11:12–14? Kedụ ihe i nwere mkpa ime iji natakwuo odudu nke Onyenwe anyị mgbe niile?
Lee kwa Abụ ọma 46:10.
Jiri akọ na uche ji melite ọmụmụ ihe. Anyị niile na-amụta ihe banyere ụwa site n’akọ na uche ise. Ojiji akọ na uche ndị ahụ nwekwara ike melite ọmụmụ ihe nke ozi ọma. Ịma atụ, chee maka eserese niile ma ọ bụ ụda ndị i nwere ike iji gosipụta mkpụrụokwu “duu” na “ntakịrị” dị ka ị na-amụta ma ọ bụ na-akuzi ihe banyere olu nke Onyenwe anyị niime 1 Ndị Eze 19.
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
1 Ndị Eze 17
Onyenwe anyị na-agọzi m dị ka m na-enwe okwukwe na Ya.
-
Iji nyere ụmụ gị aka mụta akụkọ niile nke okwukwe niime 1 Ndị Eze 17, i nwere ike gosi ha foto niile ma ọ bụ ihe mkpanaka iji gosipụta akụkọ niile, dị ka nnụnụ dị iche iche, achịcha, ma ọ bụ nwantakịrị nwoke. Dị ka ị na-akọrọ ụmụ gị akụkọ ndị a, kpọkuo ha ịchọta foto ma ọ bụ ihe mkpanaka na-adaba n’akụkọ nke ọbụla. “Elijah Onye amụma” (niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 121-24) nwere ike inyere gị aka kọọ akụkọ ndị a. Gịnị ka akụkọ nke ọbụla na-akuziri anyị banyere igosi okwukwe niime Jizọs Kraịst?
1:58Elijah the Prophet
-
Nyere ụmụ gị aka chee maka ụzọ ndị ha nwere ike iji gosi okwukwe ha niime Jizọs Kraịst. Soro ha gụọ egwu banyere okwukwe, dị ka “E nwere M Okwukwe niime Onyenwe anyị, Jizọs Kraịst” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma), ma kesaara ibe unu ihe ị mụtara banyere okwukwe site n’egwu ahụ.
Ngosipụta nke Elijah na ọgwụgwọ nke nwa nwoke nke nwanyị isimkpe, site n’aka Charles Edmund Brock
1 Ndị Eze 17:8–16
Mgbe Onyenwe anyị rịọrọ m ịchụ aja, e nwere m ike irube isi n’okwukwe.
-
Elemaanya ụmụ gị nwere ike see foto nke ihe Onyenwe anyị rịọrọ nwanyị isimkpe inye Elijah (lee 1 Ndị Eze 17:12–13) na ihe nwanyị isimkpe natara niihi ya (lee 1 Ndị Eze 17:15–16). (Lee kwa ihu akwụkwọ ihe omume izu ụka nke a.) Ha nwere ike chọọ foto nke ndị ọzọ ndị nyefere ihe ha chọburu maka ihe dịtụ mma karịa. Kpọkuo ụmụ gị ịchọta foto niile niime Akwụkwọ Nka Ozi ọma ma ọ bụ Bịanụ, Soro M. Gịnị ka Onyenwe anyị chọrọ ka anyị ji chụọ aja? Kedụ otu O si agọzi anyị?
1 Ndị Eze 18:17–39
E nwere m ike ịhọrọ isoro Jizọs Kraịst.
-
Dị ka unu na-agụkọta 1 Ndị Eze 18:17–39 ọnụ, ụmụ gị nwere ike họrọ otu amaokwu ma see foto nke ihe ọ na-akọwa. Ha nwere ike jiri foto ha niile ji kọọ akụkọ ahụ n’okwu nke onwe ha. (Lee kwa “Elijah na Ndị Nchụaja Baal,” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 125–28.)
2:17Elijah and the Priests of Baal
-
Nyere ụmụ gị aka chee maka ọnọdụ niile mgbe ha nwere ike ịchọ ikpebi ma ma ọ bụ ghara isoro Jizọs Kraịst. Ikekwe ha nwere ike see foto nke onwe ha na-eme ezi nhọrọ. Kesaara ibe unu ihe mere iji họrọ isoro Jizọs.
1 Ndị Eze 19:9–12
Onyenwe anyị na-agwa m okwu site na olu dị jụụ, dị ntakịrị nke Mmụọ Nsọ.
-
Dị ka ị na-achịkọta 1 Ndị Eze 19:9–12, kpọkuo ụmụ gị ime omume iji gosipụta ufufe mmiri siri ike, ala ọma jijiji, na ọkụ. Emesịa kpọkuo ha ịnọdụ jụụ dị ka unu na-ekwukọrịta, n’olu dị nwayọ, “mgbe ọkụ gasịrị olu nta dị jụụ” (amaokwu 12). (Lee kwa “Onyenwe anyị Na-agwa Elijah okwu,” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 129–31.) Gwa ụmụ gị banyere oge niile mgbe i nwere nhụmiihe olu nke Mmụọ Nsọ dị jụụ, dị nta.
1:48The Lord Speaks to Elijah
-
Jiri olu dị jụụ gụọ otu egwu banyere Mmụọ, dị ka “Olu Nta Dị jụụ” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 106–7). Kedụ ihe nwere ike ịdọpụ uche anyị site na-ịmata Mmụọ ahụ? Kedụ ihe nwere ike inyere anyị aka nụrụ Ya?
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.