Come, Follow Me
Jun 22–28. “Nụrụ Gị Ekpere Ha nʻEluigwe”: 2 Samuel 11–12; 1 Ndị Eze 3; 6–9; 11


“Jun 22–28. ‘Nụrụ Gị Ekpere Ha nʻEluigwe”: 2 Samuel 11–12; 1 Ndị Eze 3; 6–9; 11,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Jun 22–28. ‘Nụrụ Gị Ekpere Ha nʻEluigwe,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

Solomon na-aranye Tempụl

Solomon na-araranye Tempụl dị na Jerusalem, site nʻaka James Tissot na ndị ọzọ

Jun 22–28: “Nụrụ Gị Ekpere Ha nʻEluigwe”

2 Samuel 11–12; 1 Ndị Eze 3; 6–911

Sọl, Devid, na Solomọn, ndị eze atọ mbụ nke Izrel, ha niile malitere jiri oke nnukwu nkwa. Dị umeala, nwe obi dike, ma mara ihe, nke ọbụla niime ha nwetere afọ ọma niihu Onyenwe anyị—opekempe na mbụ. Dị mwute, eze nke ọ bụla dabakwara niime adịghị ike niile na ọnwụnwa nke anụ ahụ. Ha na-eji ọchịchọ nke onwe ha ekporo ihu tupu nke Onyenwe anyị. Ma dị ka anyị hụworo ugboro ugboro niime akwụkwọ nsọ—ma niime ndụ nke onwe anyị—nke na-eduba ruo na ọdachi.

Mana otu ihe dị mkpa mere nʻoge ọchịchị nke Solomọn nke weteere ụfọdụ olile anya maka nkwusi ike niime ndụ nke ndị ọgbụgba ndụ. Solomọn rụrụ tempụl. Ọ bụ ụlọ nke Onyenwe anyị kwesịrị ịdịgịde karịa ụlọikwuu dịwooro. Ma ọ ga-anọchite ọnụnọ nke Onyenwe anyị na-anọgide karịa nʻetiti ndị Ya. Solomọn maara na ndị ahụ ga-aganiihu izute adịghị ike na mnwale niile nʻụdị dị iche iche. Na nrara nye ụlọ nsọ ọhụrụ ahụ, Solomọn rịọrọ Onyenwe anyị, “Ọ bụrụ ma ha … laghachikwute gị jiri obi ha niile, … mgbe ahụ nụrụ gị ekpere ha” (1 Ndị Eze 8:47–48). Nke ahụ bụ akụkụ nke ihe ọgbụgba ndụ niile nke tempụl na-emere anyị—ha na-ekepụta njikọ ruo Chineke. Ha na-echekwa anyị maka nkwa ahụ na site na nchegharị anyị na ebere Ya, O nwere ike ”ibi nʻetiti [anyị]” ma aghaghị echefu anyị ma ọlị (1 Ndị Eze 6:13).

Maka nchịkọta nke akwụkwọ nke 1 Ndị Eze, lee “Ndị Eze, akwụkwọ nke” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

2 Samuel 11; 12:12–14

akara ngosi semịnarị
Onyenwe anyị pụrụ inyere m aka mee ezi nhọrọ niile mgbe a nwara m ime njọ.

Mgbe ụfọdụ anyị na-ele ndị mmadụ anya ndị yiri ka ha siri ike nʻokwukwe ha, ma anyị echee na ọnwụnwa adịghị emetụ ha. Nhọrọ dị egwu niile nke Devid akọwara niime 2 Samuel 11 gosiri nke ọma na nke a abụghị ọnọdụ ya. Tụlee ihe ọmụmụ ndị ị na-amụta site na nhụmiihe ya niile. Ajụjụ niile dị ka ndị a nwere ike nyere gị mụọ 2 Samuel 11-12.

  • Kedụ nhọrọ ndị Devid mere dubara ya gbadaa nʻụzọ juputara na mmehie ma na-abawanye abawanye? Kedụ nhọrọ ezi omume niile ndị ọ gaara eme? (Lee kwa vidiyo “Ilekwasị,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.)

    4:15

    To Look Upon

    Ojiji vidiyo niile. Vidiyo niile nwere ike nyere gị aka hụtazie nkọwapụta niile sitere na akwụkwọ nsọ ma tụlee otu ha si emetụta gị. Tụlee otu i nwere ike i si jiri ha melite nkuzi na ọmụmụ ihe. Ịma atụ, mgbe ị na-ele “Ilekwasị Anya” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma), tụlee ịkwụsịtụ vidiyo nʻoge dị iche iche iji tụgharịa uche ma tụlee ụfọdụ ajụjụ ndị atụpụtara nʻihe omume nke a.

  • Kedụ otu onye iro si na-agba mbọ iduba gị nʻụzo ndị juputara na mmehie? Kedụ nhọrọ ndị nwere ike ime gị ugbu a nọgide na nchekwa niime mmụọ?

  • Mata agwa nke Devid nye akụkọ nke Nathan niime 2 Samuel 12:1–6. Kedụ ihe agwa ya na-atụpụta banyere otu Devid siri hụta onwe ya? Kedụ ihe Onyenwe anyị meworo iji nyere gị aka hụta onwe gị nʻụzọ ziri ezi karịa?

  • Kedụ otu ị ga-esi achịkọta ihe omume niile nke 2 Samuel 11–12 na-ịdọ aka na ntị nʻotu ahịrị?

Ị na-agụ banyere nhọrọ ọjọọ niile nke Devid nwere ike duba gị ịmụta ihe banyere ihe egwu niile nke nziakwụna na njọ mmekọ ahụ. Akụrụngwa dị mma maka nke a bụ Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile, kacha nke nkeji niile akpọrọ “Ihe a ga-eme nʻoge ahụ” na “Ahụ gị dị nsọ” (ihu akwụkwọ 21–28). Ikekwe i nwere ike lee anya na akụrụngwa ahụ maka ndụmọdụ nke gaara enyere Devid aka mee nhọrọ ndị dị mma karịa. Ma ọ bụ i nwere ike gụọ “Jizọs Kraịst ga-enyere gị aka” (ihu akwụkwọ 6-9), na-achọgharị ihe nke gaara enyere Devid aka lọghachikwute Onyenwe anyị.

Tụlee ịgụ otu abụ dị ka “A Chọrọ M Gị Awa Niile” (Abụ, no. 98) ma tụgharịa uche otu Onye Nzọpụta siworo gbaa gị ume mgbe i zuteworo ọnwụnwa.

Lee kwa 2 Nifaị 28:20–24; Ulisses Soares, “Chọọ Kraịst nʻEchiche Niile,” Liahona, Nov. 2020, 82–85; “Were Ọnọdụ nke Teknụzụ,” Ọba akwụkwọ ozi ọma; “Lezie anya na Nzọụkwụ Gị” (vidiyo), Oba akwụkwọ Ozi ọma.

2:36

Watch Your Step

1 Ndị Eze 3:1–15

Onyinye nke nghọta ihe na-enyere m aka mara ndịiche dị nʻetiti ezi ihe na ajọọ ihe.

Ọ bụrụ na Onyenwe anyị gwara gị sị, “Rịọ ihe m ga-eme” (1 Ndị Eze 3:5), kedụ ihe ị ga-arịọ maka ya? Kedụ ihe na-amasị gị banyere arịrịọ nke Solomọn? Tụgharịa uche ihe mere “obi nwere nghọta” iji “ghọta nʻetiti ezi ihe na ajọọ ihe” (amaokwu 9) ji bụrụ onyinye bara uru. Kedu ihe I nwere ike ime iji chọọ onyinye nke a?

Lee kwa Moronaị 7:12-19.

1 Ndị Eze 6–8; 9:1–9

Site na ọgbụgba ndụ niile e mere niime ụlọ nke Onyenwe anyị, Onyenwe anyị na-ebinyerenyere m.

Niime 1 Ndị Eze 6–7 ị ga-achọta nkọwa miri emi banyere ụlọ nsọ nke Solomọn rụrụ maka Onyenwe anyị. Nkọwa niile nwere ike ọ gaghị eyi dị ka ihe dị mkpa nye gị dị ka ha dịịrị nye Ndị Izrel mgbe gboo. Mana ị na-agụ isi ndị a nwere ike nye gị uche maka otu ịdị mkpa ọ dị nye ha inwe ụlọ nke Onyenwe anyị. Gịnị mere o si dịrị gị mkpa?

I nwere ike tụgharịa uche ihe akụkụ ndị dị iche iche nke tempụl nke Solomọn nwere ike igosi. Ịma atụ, tụlee ihe cherubim, osisi niile, na okoko osisi niime 1 Ndị Eze 6:35 nwere ike ịnọchite. (Lee kwa Jenesis 3:24).)

Isi nke 8 dekọrọ ekpere Solomọn nʻoge irụzu tempụl ahụ (lee amaokwu ndịa 22–61). Tụlee idepụta ngọzi niile nke Solomọn rịọrọ maka ya. Kedụ ihe na-amasị gị banyere ngọzi ndị a? (Matakwa nkwa niile nke Onyenwe anyị niime 1 Ndị Eze 6:11–13; 9:1–9.) Ọ bụrụ na ị gaworịị nʻụlọ nke Onyenwe anyị, chee banyere nhụmiihe gị niile na-ife ofufe ebe ahụ. Kedụ otu idebe ọgbụgba ndụ niile nke tempụl si enyere gị aka nwete ngọzi niile nke Onyenwe anyị?

Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109; Henry B. Eyring, “:O Na-amasị m Ịhụ Tempụl,” Liahona, Me 2021, 28–31.

Barranquilla Colombia Tempụl

Barranquilla Colombia Tempụl

1 Ndị Eze 8:61; 11:1–11

“Obi ya ezughị oke nʻebe Onyenwe anyị nọ.”

Kedụ ihe ọ pụtara i “kwe obi gị … zuo oke nʻOnyenwe anyị”? (2 Ndị Eze 8:61). Nke ahụ ọ dị iche site nʻomume anyị izu oke? Kedụ otu ọ bụ? Gụọ 1 Ndị Eze 11:1–11, ma mata ihe Onyenwe anyị kwuru banyere obi nke Solomọn. I nwere ike tụgharịa uche ma e nwere ike mmetụta ndị dị niime ndụ gị nke nwere ike ịkwapụ obi gị site nʻebe Onyenwe anyị nọ ma chuwe ihu nʻebe “chi ndị ọzọ nọ.”

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

2 Samuel 11

Onyenwe anyị pụrụ inyere m aka mgbe anwara m ọnwụnwa.

  • Eze Devid” niime Akụkọ Agba Ochie niile, 117–20, nwere ike nyere gị aka kọọrọ ụmụ gị akụkọ dị niime 2 Samuel 11. I nwere ike rịọ ụmụ gị ịchọpụta nhọrọ ọjọọ niile Devid mere ma tụpụta ezi nhọrọ niile ọ gaara enwe ike mee. Kedụ ihe ndụ anyị nwere ike ime mgbe anwara anyị nke nwere ike inyere anyị aka mee ezi nhọrọ?

    2:11

    King David

  • Ịgụ banyere mmehie dị egwu niile nke Devid nwere ike bụrụ ohere ọma iji kwurita ihe egwu niile nke nziakwụna. Vidiyo ahụ “Gịnị Ka M Ga-eme Mgbe M Hụrụ Nziakwụna?” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma) nwere nduzi ndị na-enye aka. Nyere ụmụ gị aka tụọ atụmatụ banyere ihe ha ga-eme mgbe ha zutere nziakwụna.

    5:46

    What should I do when I see pornography?

1 Ndị Eze 8:22–61

Ịgba ndụ niime ụlọ nke Onyenwe anyị—ma na-edebe ha—na-enyere m aka jee ije nʻụzọ Ya niile.

  • Dị ka gị na ụmụ gị na-amụ ihe banyere nraranye nke tempụl niime 1 Ndị Eze 8, unu nwere ike lee anya na foto ndị nke tempụl niile niime ndepụta izu ụka nke a. Kwe ụmụ gị ikwu okwu banyere uju niile ha na-ahụ niime foto niile. I nwere ike kwusie ike amaokwu ndịa 57–58. Kedụ ihe ọ pụtara ịje ije nʻụzọ niile [nke Onyenwe anyị]”? (1 Ndị Eze 8:58). Ikekwe ụmụ gị nwere ike zọọ otu nzọ ụkwụ maka azịza nke ọ bụla ha nyere.

  • Gwa ụmụ gị otu idebe ọgbụgba ndụ niile i mere niime tempụl si enyere gị aka jee ije nʻụzọ niile nke Onyenwe anyị. I nwere ike gwa ha ihe ọgbụgba ndụ ndị a bụ (lee Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 27.2, Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Unu nwekwara ike gụkọọ egwu dị ka nke a ọnụ “Ọ Na-amasị M Ịhụ Tempụl” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 95).

Tempụl nke Solomọn

Ngosipụta nke Tempụl nke Solomọn, site n’aka Sam Lawlor

1 Ndị Eze 11:1–11

E nwere m ike itinye Onyenwe anyị mbụ niime ndụ m.

  • Ị na-agụ banyere otu ndị nwunye Solomọn si metụta ya nwere ike duba na mkparịta ụka banyere ọmụmaatụ niile nke “chi ndị ọzọ”—ma ọ bụ ihe ndị mmadụ na-efe ofufe ma ọ bụ hụrụ naanya kama Onyenwe anyị. Kedụ otu anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ Ya naanya karịa ihe ọzọ ọ bụla niime ndụ anyị?

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.

Tempụl nke Solomọn

Nraranye nke Tempụl nke Solomọn niime Jerusalem, site nʻaka William Hole

Ihu akwụkwọ ihe omume Prịamarị: Ịgba ndụ niime ụlọ nke Onyenwe anyị na-enyere m aka jee ije nʻụzọ Ya niile