“Jun 8–14. ‘Onyenwe anyị Na-ele anya n’Obi’: 1 Samuel 8–10; 13; 15–16,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Jun 8–14. ‘Onyenwe anyị Na-ele anya n’Obi’,” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
N’akụkụ Mmiri Na-anaghị Asọ asọ, site n’aka Simon Dewey
Jun 8– 14: “Onyenwe anyị Na-ele anya n’Obi”
1 Samuel 8–10; 13; 15–16
Sọl bụ onye nlekọka ịnyịnya ibu. Agbanyeghị o toro ogologo ma maa mma, ọ “dị nta naanya nke onwe [ya]” ma mara onwe ya banyere ihe nketa ezi na ụlọ ya (lee 1 Samuel 9:2–3, 21; 15:17). N’ụbọchị ahụ a na-aga igosi ya niihu ndị Izrel dị ka eze ha, ọ bịaghị; ụjọ jụrụ ya ahụ ya “ezoo onwe ya” (1 Samuel 10:21-22). Ị na-ele Sọl, i nwere ike ị gaghị eche na ọ ga-edu ndị Izrel ruo mmeri megide ndị iro ha—ma ọ bụ na ọ ga-emescha bụrụ onye mpako na onye nnupu isi megide Onyenwe anyị.
Devid bụ onye nlekọka atụrụ. Ọ dịchaghị mma ile anya na ahụ dị ka ụmụnne ya ndị nwoke asaa tọrọ ya. Otu ụbọchị Samuel bịara ịhọrọ eze ọhụrụ maka Izrel, o yighị ihe bara uru ịgụnye Devid n’etiti ndị ọzọ nwere ike ịhọrọ, ya mere a hapụrụ ya niime ubi ama ya na ụmụ atụrụ. Ị na-ele Devid, i nwere ike ị garaghị eche na ọ ga-enwe okwukwe na ike imeri nnukwu mmadụ ma bụrụ eze nke Izrel kachasị mee nke ọma.
Mana Onyenwe anyị na-ahụ gafee ihe a na-akpọ anyị, ọdịdị anụ ahụ anyị, adịghị ike anyị niile. Ọ na-ele anya, kama, “n’obi” (1 Samuel 16:7). Ma ọbụna mgbe obi anyị na-ezichaghị ezi, ọ bụrụ na anyị dị njikere, ọ ga-enye anyị “obi ọzọ” (1 Samuel 10:9)
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
1 Samuel 8
Jizọs Kraịst bụ Eze m.
1 Samuel 8 na-ekwu maka ihe omume nke ga-agbanwe ruo ebighị ebi akara aka nke ndị Izrel. Maka nchekwa megide ndị iro ha, ndị Izrel naara achọ ihe ndị agbata obi ha nwere—eze ịchị ha. Dị ka ị na-agụ banyere arịrịọ ha na azịza nke Onyenwe anyị, chee banyere onye ị na-elekwasị anya maka nchekwa na odudu. Tụlee ihe ọ pụtara ikwe ka Onyenwe anyị [chịa n’isi gị]” (1 Samuel 8:7).
Niime izu ụka ndị na-abịa, ị ga-agụ banyere ọtụtụ ndị eze akpọrọ idu Izrel. Dị ka ị na-amụ banyere ha, tụlee ajụjụ ndị a sotere:
-
Kedụ otu ịdọ aka na ntị niile nke Onyenwe anyị si mezuo niime 1 Samuel 8:10–18?
-
Kedụ otu ụmụ Izrel si nwee mmetụta site na nhọrọ ha inwe eze nke ụwa?
-
Kedụ otu Jizọs Kraịst si dịrị iche site na eze ndị nke ụwa? Tụlee ike mmetụta niile nke ụwa i nwere ike ịchọ ka ewepụ site na ndụ gị iji kwe ka Kraịst bụrụ Eze gị.
Lee kwa “Ńụrịa, Onyenwe anyị Bụ Eze!,” Abụ, no. 66.
1 Samuel 9–10; 16:1–13
Chineke na-akpọ ndị mmadụ site n’amụma ijere alaeze Ya ozi.
Gụọ banyere otu Chineke siri họrọ eze ndị Izrel niime 1 Samuel 9–10 na 16 (lee kacha 9:15–17; 10:1–12; 16:1–13). Chọọ maka edereede ndị na-enyere gị aka ghọta ihe ọ pụtara ị “bụ onye Chineke kpọrọ, site na amụma” niime Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị taa (Edide niile nke Okwukwe 1:5). I nwere ike tụlee itinye onwe gị n’ọnọdụ nke onye ndu na-akpọ (Samuel) oku, onye a na-akpọ (Sọl na Devid), na ndị akpọrọ ka ha jeere ozi (ndị Izrel). Gịnị ka ị na-amụta site n’okwu ha na omume ha niime isiokwu ndị a?
Ngosipụta nke Samuel na-ete Sọl mmanụ, site n’aka P. Mann, © Lifeway Collection/licensed from goodsalt.com
1 Samuel 13:5–14; 15
“Irube isi ka mma karịa ịchụ aja.”
Itụle otu Sọl siri dịrị ka onye enweghị obisike niime 1 Samuel 10, ọ dị ịtụnaanya ịgụ banyere “nnupụ isi” ya na “isi ike” ya mgbe ọ mesịrị bụrụ eze (1 Samuel 15:23). Gịnị mere i jiri chee na nke a mere? Niime 1 Samuel 13:514, kedụ agwa na omume ndị ị na-ahụ nke dubara nʻọdịdị ya?
Niime 1 Samuel 15, ị ga-agụ banyere iwu nsọ sitere na Onyenwe anyị na Sọl erubeghị isi niihi na o chere na o nwere ebumnuche dị mma. Ịmụta ihe site na nhọrọ Sọl ndị na-adịghị mma, lee anya na amaokwu 22 ma dochie mkpụrụokwu ndịa “aja” na “abụba nke ebule” jiri ihe ndị yiri ihe dị mma mana adịchaghị mkpa dị ka ịnụrụ na irube isi nye Onyenwe anyị. Kedụ otu esiworo gọzie gị dị ka i jiworo uche nke Onyenwe anyị kporo ihum na ndụ gị?
1 Samuel 16:6–12
“Onyenwe anyị na-ele anya n’obi.”
I mewo mkpebi gbasara “ọdịdị a na-ahụ anya” nke ihe ma ọ bụ nke mmadụ, naanị ịchọpụta na i nweteghị ya? Ikekwe i riri ihe na-adịchaghị mma dị ka o yiri. Ma ọ bụ ikekwe i kpere mmadụ ikpe na-ezighị ezi.
Mgbe Samuel nọ na-achọ eze ọhụrụ maka Izrel, Onyenwe anyị kuziiri ya ihe nʻụzọ dị mma karịa. Gụọ banyere ya niime 1 Samuel 16:67, ma tụlee idepụta ụzọ ndị mmadụ si ekpe ndị ọzọ ikpe “nʻọdịdị a na-ahụ anya.” I nwere ike ịchọta ụfọdụ ọmụmaatụ ndị dị niime ozi nke Okenye Christophe G. Giraud-Carrier “Anyị Bụ Ụmụ Ya” (Liahona, Nov. 2023, 114–16). Gịnị ka ọ pụtara ile anya “nʻobi,” dị ka Onyenwe anyị na-eme? (1 Samuel 16:7). I nwere ike chọtakwa ọmụmaatụ niile maka nke a, niime ozi nke Okenye Giraud-Carrier. Ikekwe i nwere ike na-eche maka oge ndị ọzọ mgbe Onye Nzọpụta lefere anya nʻọdịdị nke mmadụ a na-ahụ anya. (Lee, iji maatụ, Mak 12:41–44; Luk 5:1–11; 19:1–9; Jọn 4:5–30; Mosis 6:31–36.) Kedụ ihe ị na-amụta site na ọmụmaatụ ndị a?
Kedụ otu i ga-esi esoro ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta n’otu i si ahụ ndị ọzọ—na onwe gị? Kedụ otu ime otu a si emetụta mmekọrịta gị na ndị ọzọ? Tụlee ịgwa mmadụ banyere ịdị mma ị na-ahụ nʻobi ha.
Lee kwa Ulisses Soares, “Ụmụnne nwoke na nwanyị niime Kraịst,” Liahona, Nov. 2023, 70–73.
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
1 Samuel 8
Jizọs Kraịst bụ Eze m.
-
Dị ka ị na-agụ 1 Samuel 8 gị na ụmụ gị, nyere ha aka chọta nzube niile Samuel gwara ndị Izrel na inwe eze bụ echiche ọjọọ. Gịnị mere o jiri ka mma inwe Jizọs Kraịst dị ka eze anyị? Ikekwe i nwere ike mepụta okpueze akwụkwọ ma nʻotu nʻotu yiri ya ma na-ekesa otu ihe anyị nwere ike ime iji gosipụta na anyị chọrọ ka Jizọs bụrụ eze anyị. (Lee kwa Jeremaya 23:5; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:59.)
1 Samuel 8:6; 9:15–17; 10:1–24; 16:1–13
Ndị mmadụ na-eje ozi niime Nzukọ nsọ bụ ndị a kpọrọ site nʻaka Chineke.
-
Nkọwapụta nke Chineke ịhọrọ Sọl na Devid ịbụ ndị eze nwere ike inyere ụmụ gị aka ghọta otu esi akpọ ndị mmadụ oku ije ozi niime Nzukọ nsọ taa site na mkpughe. Ikuziri ha akụkọ ndị a, i nwere ike dedata ihe omume ndị sitere nʻakụkọ niile nʻelu mpempe akwụkwọ, ma ụmụ gị nwere ike tinye ha nʻusoro ziri ezi dị ka unu na-agụkọta edereede akwụkwọ nsọ ọnụ (lee kwa “Devid Nta” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 110–11). Emesịa unu nwere ike kwuo okwu banyere oge niile mgbe Chineke gọziri gị jiri ike ime mmụọ iji mezuo otu ọrụ ma ọ bụ ọkpụkpọ oku (lee 1 Samuel 10:9–10).
1:16Young David
-
Nke a nwekwara ike bụrụ oge dị mma iji kuziere ụmụ gị edide nke okwukwe nke ise. Gwa ha otu i siri nata ọkpụkpọ oku gị niime Nzukọ nsọ. Kedụ otu i si a mara na akpọrọ gị site nʻaka Chineke?
Onye amụma Samuel Etee Devid mmanụ ị Bụ Eze nke Izrel niime Bethlehem, site nʻaka Balage Balogh
1 Samuel 16:1–13
Onyenwe anyị na-ele anya n’obi.
-
Ihe ọmụmụ mkpanaka nwere ike nyere ụmụ gị aka ghọta ụkpụru dị niime 1 Samuel 16:7. Ịma atụ, i nwere ike gosi ha ụfọdụ nri ma ọ bụ otu akwụkwọ nwere ihe nfuchi ma ọ bụ ihe mkpuchi na-adabaghị nʻezigbo ọdịnaya niile. Gịnị ka 1 Samuel 16:7 na ihe ọmụmụ mkpanaka nke a na-atụpụta gbasara otu anyị kwesịrị isi hụta onwe anyị na ndị ọzọ? Gụọ otu egwu na-ekwusi ụkpụrụ nke a ike, dị ka “Hụ Ibe Unu Naanya” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 136).
Jiri ọmụmụ ihe ndị enwere ike imetụ aka. Mgbe ụmụ gị nwere ihe ha ga-ahụ ma metụ aka metụtara otu ụkpụrụ ozi ọma, ọ ga-aka a dịrị ha mfe ịcheta ya. Ịma atụ, dị ka gị na ha na-agụkọta 1 Samuel 16:7 ọnụ, i nwere ike kwe ha inyere gị aka chọta ọmụmaatụ niile nke nrọ a na-ahụ anya iji gosipụta nzube ahụ na anyị kwesịrị ịgbalị ịhụ dị ka Onyenwe anyị na-ahụ—site na-ile “nʻobi”—kama ikpe ndị gbasara “oyiyi a na-ahụ anya.”
-
Gị na ụmụ gị nwere ike kesaa nhụmiihe niile nke ị mụtara ihe mere i ga-esi “ele nʻobi,” na-abụghị naanị “nʻoyiyi a na-ahụ anya” (amaokwu 7). Unu nwekwara ike nʻotu nʻotu were ohere na-agwa ibe unu banyere njirimara niile dị mma ị na-ahụ nʻobi nke ibe unu.
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.