“Jun 1–7. ‘Obi M Na-ańụrị Ọńụ niime Onyenwe anyị’: Ruth; 1 Samuel 1-7,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Jun 1–7. ‘Obi M Na-ańụrị Ọńụ niime Onyenwe anyị,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Ebe Ọ bụla Ị Na-aga, site nʻaka Sandy Freckleton Gagon
Jun 1–7: “Obi M Na-ańụrị Ọńụ niime Onyenwe anyị”
Ruth; 1 Samuel 1–7
Mgbe ụfọdụ anyị na-eche na ndụ anyị na-esoro ụzọ doro anya site na mbido ruo na nsọtụ. Ogologo ụzọ kacha nso n’etiti ebe abụọ bụ akara kwụ ọtọ, emesịa ihe niile. Ma otu ọ dị ndụ juputara nʻihe na-egbu oge ma na-eduhie, na kpọrọ anyị baa nʻụzọ a na-atụghị anya.
Ruth na Hannah n’ezie ghọtara nke a. Ruth abụghị onye Izrel, mana ọ lụrụ otu, ma mgbe di ya nwụrụ, o nwere nhọrọ ime. Ọ ga-alaghachikwuru ezi na ụlọ ya na ndụ ochie ya, a maara ama, ma ọ bụ ọ ga-anabata okpukperechi ndị Izrel na ebe obibi ọhụrụ ya na nne di ya? (lee Ruth 1:4-18). Atụmatụ nke Hannah maka ndụ ya bụ ịmụ ụmụ, mana o nweghị ike, ma nke a mere ya enwee “ilu nke mkpụrụ obi” ya (lee 1 Samuel 1:1-10). Dị ka ị na-agụ banyere Ruth na Hannah, tụgharịa uche n’okwukwe ha gaara enwerịrị iji mee njem n’ụzọ ndị ha atụghị naanya. Emesịa chee banyere njem nke onwe gị. Ọ dị iche site na nke Ruth na nke Hannah—na nke onye ọbụla ọzọ. Mana nʻoge mnwale ahụ niile na ịtụnaanya niile n’etiti ebe a na ebe ebighị ebi gị, i nwere ike mụta i soro Hanna kwuo, “Obi m na-ańụrị ọńụ niime Onyenwe anyị” (1 Samuel 2:1).
Lee kwa Ọkọwa okwu Baịbụl maka nchịkọta nke akwụkwọ niile nke Ruth na 1 Samuel.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ruth
Jizọs Kraịst nwere ike ịtụgharị ihe ọjọọ ịghọ mmeri.
Ndụ siri ike maka nwanyị isimkpe n’oge ọbụla. Mana mgbe di Ruth nwụrụ, ọnọdụ ya siri ezigbo ike. N’omenaala ndị Izrel n’oge ahụ, nwanyị na-enweghị di ma ọ bụ nwa nwoke enweghị oke na arịa ma ụmụ ụzọ ole ma ole inwete ihe eji ebi ndụ. Dị ka ị na-akọ akụkọ nke Ruth, mata otu Onyenwe anyị siri tụgharịa ihe ọjọọ ịghọ nnukwu ngọzi. Kedụ ihe ị na-amata banyere Ruth nke nweworo ike nyeere ya aka? Kedụ otu Boaz si gbapụta Ruth site n’ọnọdụ enweghị olileanya? (lee Ruth 4:4-10). Kedụ otu ma Ruth ma Boaz si dị ka Jizọs Kraịst?
Lee kwa “Dere Duu, Mkpụrụ obi M,” Abụ, no. 124.
Ruth; 1 Samuel 1
E nwere m ike ịtụkwasị obi na Chineke ga-edu ma nyere m aka na-agbanyeghị ọnọdụ m.
Ikekwe ị tawo ahụhụ nnukwu nfunarị, dị ka Ruth na Naomi tara (lee Ruth 1:1-5). Ma ọ bụ enwere ike, dị ka Hannah, ị tụwo anya maka ngọzi ndị ị natabeghịrịị (lee 1 Samuel 1:1-10). Kedụ otu ndịinyom ndị a siri gosi okwukwe ha niime Chineke? Kedụ ihe ị na-amụta site na nhụmiihe ha niile?
N’ezie, ọ bụghị onye ọbụla kpere ekpere maka nwa na-anata ya, ma ọ bụghị onye ọbụla di ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ na-alụgharị. Mana onye ọbụla bịakwutere Onye Nzọpụta na-anata enyem aka na odudu Ya. Tulee otu i siworo “bịa tụkwasị obi” n’Onyenwe anyị (Ruth 2:12) n’oge ihe isi ike gị niile.
Lee kwa Amy A. Wright, “Nọgide n’Ụbọchi ahụ niime Kraịst,” Liahona, Nov. 2023, 9–11.
Maka Nwa Nke a Ekpere M ekpere, site n’aka Elspeth Young
1 Samuel 2; 4–7
Ịnata enyem aka nke Onyenwe anyị, e kwesịrị m ịtụkwasị obi na Ya ma rubere iwu nsọ Ya niile isi.
Mgbe ndị iro wakpọrọ, Ndị Izrel n’ezie chere na naanị nnọọ inwe igbe nke ọgbụgba ndụ ga-echekwa ha. Dị ka ị na-agụ 1 Samuel 4-6, chee banyere ihe mere nke ahụ arụghị ọrụ. (Matakwa omume ajọọ niile nke ụmụ Eli ndị nwoke, ndị jere ozi dị ka ndị nchụaja niime tabanakụl, niime 1 Samuel 2:12-25.) Kedụ ihe i chere Onyenwe anyị naara achọ ikuziri ndị Ya? Kedụ ihe ị na-amụta site n’ihe mere ndị Filipaị mgbe ha nwudesịrị igbe ahụ? (lee isi nke 5-6). Kedụ ihe ị na-amụta site na mgbalị niile nke Izrel iji nwetaghachi nchekwa nke Onyenwe anyị niime 1 Samuel 7?
I nwere ike nwee mkpatemmụọ site na-ịgụ abụ otuto nke Hannah niime 1 Samuel 2:1-10. Kedụ ihe ị na-achọta n’okwu ya niile gaara enwe ike inyere ụmụ Eli ndị nwoke na ndị Izrel fọdụrụ aka?
1 Samuel 3
E nwere m ike ịnụrụ ma rube isi n’olu nke Onyenwe anyị.
Oge ụfọdụ, o nwere ike dị gị ka Samuel, onye nụrụ olu nke Onyenwe anyị mana ọ mataghị ya. Dị ka anyị niile, Samuel bịara mụta otu esi amata olu nke Onyenwe anyị. Dị ka ị na-amụ 1 Samuel 3, kedụ ihe ị na-amụ site n’aka nwata nwoke nke a banyere ịnụrụ na irubere olu nke Onyenwe anyị isi? I nwekwara ike chọgharịa akwụkwọ nsọ ndị a agbakwunyere ma depụta ntuziaka niile nke nwere ike inyere mmadụ aka mata olu nke Onyenwe anyị: 1 Ndị Eze 19:11–12; Luk 24:15–32; 3 Nifaị 11:3–7; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:22–23; 8:2–3; 9:7–9.
Mgbe ọzọ, i nwere ike na-eche na eluigwe niile ka emechiri ma na Chineke achọghị ikwuru gị okwu. Onyeisi Russell M. Nelson kwuru, “Ọ Bụ n’ezie na Chineke chọrọ ị kwuru gị okwu? Ee!” (“Mkpughe maka Nzukọ nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” Liahona, Me 2018, 93–96). Dị ka ị na-amụ ozi nke Onyeisi Nelson, kedụ ihe ị na-achọta na-akpatemmụọ gị ịnụrụ ma rube isi n’olu nke Onyenwe anyị? Kedụ ihe Onyeisi Nelson na-akpọku gị ime, ma kedụ ngọzi ndị ọ na-ekwe nkwa ya? I nwekwara ike chọta ọkpụkpọ oku niile na ngọzi ndị ekwere nkwa banyere mkpughe niime “Jee ije niime ìhè nke Chineke” (Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ, 16-20). Tụlee ịhọrọ otu ihe i nwere ike ime iji bawanye ike ime mmụọ gị iji nata mkpughe.”
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ruth
E nwere m ike inwe ịhụnaanya na obi ọma nye ndị gbara m gburugburu.
-
Dị ka ị na-ekesara ụmụ gị akụkọ nke Ruth (i nwere ike jiri “Ruth na Naomi” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 100-103), kpọkuo ha iwelite aka ha elu oge ọbụla ha nụrụ omume nke obi ọma n’akụkọ ahụ. Ha nwekwara ike kesaa otu o si emetụta ha mgbe ndị ọzọ dịịrị ha obi ọma, ma ọ bụ mgbe ha dịịrị obi ọma nye ndị ọzọ. Kedụ otu Onye Nzọpụta siworo dịrị anyị obi ọma? Kedụ otu anyị nwere ike i si soro ọmụmaatụ Ya? (lee “Obi ọma Na-ebido na M,” Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 145).
2:0Ruth and Naomi
Ruth; 1 Samuel 1
A pụrụ m inwe okwukwe niime Onyenwe anyị.
-
Akụkọ niile nke Ruth na Hannah nwere ike kpatemmụọ ụmụ gị ịnọgide na nkwesị ntụkwasị obi n’oge ndị siri ike. Tụlee inyere ha aka mepụta chaatị dị mfe jiri isiokwu ndị a Mnwale niile, Omume niile, Ngọzi niile. Emesịa unu nwere ike gụkọta Ruth 1:3–5, 8, 16; 2:1–3, 8–12; 4:13–17; 1 Samuel 1:1–18 ọnụ ma dee n’okpuru isiokwu ndị ahụ ihe ndị ha chọtara niime amaokwu ndị a. Kedụ otu Ruth na Hannah si gosi okwukwe ha niime Onyenwe anyị? Gị ma ọ bụ ụmụ gị nwere ike kesaa ọmụmaatụ otu Onyenwe anyị siworo gọzie gị n’oge ndị siri ike.
1 Samuel 1:1–18
Nna nke Eluigwe na-anụ ma na-aza ekpere m niile.
-
Ịmụta ihe banyere Hannah, ụmụ gị nwere ike gụọ 1 Samuel 1:1–18 ma ọ bụ “Hannah” niime Akụkọ nille nke Agba Ochie (104–5) ma ọ bụ lee “Okwukwe nke Hannah” (vidiyo, Ọba akwụkwọ Ozi ọma). O nwere ike bụrụ ihe ọńụ ịtụrụ otu nwata bọọlụ ma kpọkuo ha ịkọ otu akụkụ nke akụkọ ahụ tupu ịtụrụ onye ọzọ bọọlụ ahụ. Kedụ ihe anyị na-amụta banyere ekpere site n’ọmụmatụ nke Hannah?
1:15Hannah
3:9Hannah's Faith
Samuel Agwa Eli Eziokwu ahụ, site n’aka Robert T. Barrett
1 Samuel 3:1–10
E nwere m ike ịnụ ma rube isi nye olu nke Onyenwe anyị.
-
Ikekwe ejije dị mfe nwere ike nyere ụmụ gị aka mụta ihe site na nhụmiihe nke Samuel jiri mkpughe. Otu nwata nwere ike mee ka aga asị ọbụ Samuel, ma onye ọzọ nwere ike mee ka a ga-asị ọ bụ Eli dị ka unu na-agụ 1 Samuel 3:1–10 (lee kwa “Samuel Onye amụma” niime Akụkọ Agba Ochie niile, 106–9, ma ọ bụ vidiyo “Samuel na Eli,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Gịnị ka anyị na-amụta site n’aka Samuel banyere otu esi anụrụ olu nke Onyenwe anyị? Kedụ otu anyị si egosi na anyị dị njikere ịnụrụ mgbe Onyenwe anyị na-agwa anyị okwu?
2:10Samuel the Prophet
1:58Samuel and Eli
-
Jụọ ụmụ gị otu ha ga-esi akọwara mmadụ otu Onyenwe anyị si agwa ha okwu. I nwere ike nyere ha aka chọọ azịza niile niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:22–23; 8:2–3; 9:7–9.
Nyere ụmụntakịrị aka mụta ịmata Mmụọ ahụ. Ọ dịghị mfe ịmata ihe dị iche n’etiti mmetụta nke onwe anyị na nke Mmụọ Nsọ. Onye ọbụla na-agba mbọ na nke a site n’oge ruo n’oge. Were ohere ọbụla i nwere ike iji nyere ụmụ gị aka mata mgbe ha na-enwe mmetụta nke Mmụọ. Ịma atụ, dị ka ị na-agụ 1 Samuel 3:1-10 na amaokwu ndị atụpụtara niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, i nwere ike kesaa nhụmiihe niile nke Onyenwe anyị kuziwooro gị niime uche na obi gị.
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.