“Me 25–31. ‘Onyenwe anyị Kpọlitere Onye Nnapụta”: Ndị Ikpe 2–4; 6–8; 13–16,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Me 25–31. ‘Onyenwe anyị Kpọlitere Onye Nnapụta’,” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
“N’ezie Aga M Eso Gị Aga”—Debora Onye amụma nwanyị, site n’aka Des Leavitt
Me 25– 31: “Onyenwe anyị Kpọlitere Onye Nnapụta”
Ndị Ikpe 2–4; 6–8; 13–16
Anyị niile maara ihe ọ dị ka ya ime njọ, nwee mwute banyere ya, ma mesịa chegharịa ma kpebie ịgbanwe ụzọ anyị niile. Mana ọtụtụ mgbe anyị na-echefu mkpebi isimbụ anyị, ma, mgbe ọnwụnwa bịara, anyị na-ahụta onwe anyị ime otu mmehie ahụ kwa. Usoro nke a pụtara ihè mgbe na mgbe niime akwụkwọ nke Ndị Ikpe. Niihi mmetụta sitere n’ekweghị ekwe na omume ofufe niile nke ndị Kenan—ndị ha kwesịrị ịchụpụ site nʻala ahụ—Ndị Izrel mebiri ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị ma dapụ na-ife Ya ofufe. Niihi ya, nchekwa Ya funaara ha ma ha adaba niime ndọkpụ n’agha. Ma otu ọ dị oge ọbụla nke a mere, Onyenwe anyị na-enye ndị ọgbụgba ndụ Ya ohere ichegharị ma kpọlite onye nnapụta, onyeisi agha akpọrọ “onye ikpe.” Ọ bụghị ndị ikpe niile niime akwụkwọ nke Ndị Ikpe dịịrị ezi omume, mana ụfọdụ niime ha nwere nnukwu okwukwe na-ịnapụta ụmụ Izrel ma weghachite ha na mmekọrịta ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị. Akụkọ ndị a na-echetere anyị na-agbanyeghị ihe dupuworo anyị site na Jizọs Kraịst, Ọ bụ Onye Mgbapụta nke Izrel ma dị njikere ịnapụta anyị ma nabatakwa anyị ọzọ dị ka anyị na-alọkwute Ya.
Maka nchịkọta nke akwụkwọ nke Ndị Ikpe, lee “Ndị Ikpe, akwụkwọ nke” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ndị Ikpe 2:1–19; 3:5–12
Onyenwe anyị na-agbaghara ugboro ugboro dị ka m na-echegharị.
Akwụkwọ nke Ndị Ikpe nwere ike bụrụ ma ịdọ aka na ntị ma inye mgbam ume. Chọọ ịdọ aka na ntị na mgbam ume nke a dị ka ị na-agụ Ndị Ikpe 2:1–19; 3:5–12. Kedụ otu i si eche na ịdọ aka na ntị na mgbam ume ahụ metụtara gị?
Ịma atụ, ọ bụrụ na Ndị Ikpe 2:19 bụụrụ maka gị na ọnwụnwa gị kama ịbụ banyere ndị Izrel mgbe gboo, gịnị ka o nwere ike ikwu? Ọ bụrụ na Ndị Ikpe 3:9 bụụrụ banyere ihe Onyenwe anyị meworo iji napụta gị, gịnị ka o nwere ike ikwu?
Tụlee ịgụ ajụjụ na azịza na peeji 9 nke Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile. Kedụ otu i siri chee na nke a metụtara nhụmiihe nke Ndị Izrel niime akwụkwọ nke Ndị Ikpe? Kedụ ihe nke a na-akuziri gị banyere Jizọs Kraịst?
Ndị Ikpe 4:1–15
E nwere m ike ịkpate mmụọ ndị ọzọ inwe okwukwe niime Onyenwe anyị.
Mgbe ụfọdụ okwukwe nke otu onye nwere ike kpateemmụọ okwukwe niime ọtụtụ ndị ọzọ. Niime Ndị Ikpe 4, otu onye ahụ bụ Debora. Gụọ banyere ya niime Ndị Ikpe 4:1–15, ma mata ike mmetụta o nwere na ndị mmadụ gbara ya gburu gburu. Ebe a bụ ụfọdụ ajụjụ iji nyere gị aka tụgharịa uche otu enwere ike iji tinye nhụmiihe ya na ndụ gị:
-
Kedụ otu ị ga-esi akọwa ọnọdụ niile nke Ndị Izrel nọ niime ya n’oge ahụ? (lee amaokwu ndịa 1-3). Kedụ myiri niile ị na-ahụ n’ọnọdụ nke taa—niime ndị mmadụ n’otu nʻotu ma nʻọha na eze?
-
Kedụ mkpụrụokwu niile ma ọ bụ omume niile nke Debora gosịrị gị na o nwere okwukwe n’Onyenwe anyị? Kedụ otu okwukwe ya sịrị metụta ndị ọzọ? Kedụ ihe ọzọ na-emetụta gị banyere ya?
-
Gịnị ka i chere Debora bu nʻobi site nʻajụjụ ya dị niime amaokwu 14: “Ọ bụ na Onyenwe anyị apụbeghị niihu gị?” Kedụ otu Onyenwe anyị si “pụọ niihu” gị? (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:87–88).
Tụgharịa uche otu okwukwe gị niime Jizọs Kraịst nwere ike gọzie ndị ọzọ nʻụzọ okwukwe nke Debora siri gọzie Barak na Ndị Izrel ndị ọzọ. Inyere gị aka chee banyere nke a, i nwere ike mụọ ozi nke Okenye Neil L. Andersen “Anyị Na-ekwu maka Kraịst” (Liahona, Nov. 2020, 88–91). Chọgharịa ozi maka (1) ebumnuche ikwupụtakwu okwu banyere Onye Nzọpụta na (2) ụzọ ndị esi eme ya.
Emesịa i nwere ike depụta ihe ndị ị maara banyere Jizọs Kraịst—site n’akwụkwọ nsọ, site n’okwu niile nke ndị amụma, na site na nhụmiihe nke onwe gị. Onye kwesịrị ịmara nke a? Kedụ otu i ga-esi ekesa ya?
Lee kwa Matiu 5:14–16; 1 Pita 3:15; “Ndụ Ọ Bụla Nke Metụtara Nke Anyị maka Nke Ọma,” Abụ, no. 293.
Nabata nkesa. Ọ bụrụ na ị bụ onye nkuzi—n’ebe obibi ma ọ bụ na nzukọ nsọ—“nye ndị na-amụ ihe ohere niile iji kesaara ibe ha ihe ha na-amụ banyere Onye Nzọpụta na ozi ọma Ya. Ịme nke a ga-enyere ha aka mikpuo eziokwu ndị ahụ akuziiri ha ma gosipụta ha” (Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye nzọpụta, 26). Ịma atụ, mgbe ịmụkọta Ndị Ikpe 4 ọnụ, i nwere ike nye onye ọbụla na-amụ ihe ohere ịchọta ihe kpọmkwem n’isi okwu ma mesịa kpọkuo ha ikesara ibe ha ihe ha chọtara.
Ndị Ikpe 6–8
Onyenwe anyị nwere ike rụọ ọrụ ebube mgbe m tụkwasịrị obi n’ụzọ Ya.
Dị ka ị na-agụ Ndị Ikpe 6–8, dedata ihe atụ niile ebe Onyenwe anyị rịọrọ Gideon ikwere nʻihe nwere ike iyi ihe na-adịghị eme eme. Ọ rịọwo ihe yiri nke ahụ n’aka gị mbụ?
Kedụ mmetụta ị na-enwe na Onyenwe anyị na-agbalị ikuziri gị ihe jiri nkọwapụta nke a? Ị hụwo ka Onyenwe anyị rụrụ ọrụ Ya niile ndị yiri ihe na-adịghị ekwe omume?
Ndị Ikpe 13–16
Chineke na-agba m ume dị ka m na-ekwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ m niile.
Samson tufuru ma ike anụ ahụ ya ma ike ime mmụọ ya niihi na o mebiri ọgbụgba ndụ ya na Chineke, gụnyere ndị ahụ metụtara ndị Nazaret kpọmkwem (maka ozi banyere ndị Nazaret, lee Ọnụọgụgụ 6:1–6; Ndị Ikpe 13:7). Dị ka ị na-agụ banyere Samson niime Ndị Ikpe 13–16, mata amaokwu ndị na-egosi na Onyenwe anyị nọnyeere Samson, dịkwa ka amaokwu niile na-egosi na Samson aranyeghị n’uju nye Onyenwe anyị.
i nwekwara ike tụgharịa uche n’ọgbụgba ndụ niile i meworo gị na Onyenwe anyị. Kedụ otu ọgbụgba ndụ ndị a siworo wete ike Ya niime ndụ gị? Kedụ ihe ị na-amụta site na nhụmiihe nke Samson na-akpatemmụọ gị ịnọgide n’eziokwu nye ọgbụgba ndụ gị na Chineke?
Nwanne nwanyị Ann M. Dibb kuziri: “Samson ka a mụrụ jiri ike mmepụta dị ukwuu. Nne ya ka e kwere nkwa, ‘Ọ ga-amalite ịnapụta Izrel site n’aka ndị Filipịa’ [Ndị Ikpe 13:5]. Mana Samson tolitere, o tinyere obi nye ọnwụnwa niile nke ụwa karịa ntuzi aka nke Chineke. O mere nhọrọ niile niihi na ha ‘masịrị [ya] nke ọma’ [Ndị Ikpe 14:3] kama na-abụghị na nhọrọ ndị ahụ ziri ezi. Ugboro ugboro, akwụkwọ nsọ na-eji nkebiokwu a ‘ma ọ dara ada’ [Ndị Ikpe 14:7] dị ka ha na-akọ njem nke Samson, omume niile, na nhọrọ niile. Kama ibilite ma mukee iji mejuputa ike mmepụta ya dị ukwuu, Samson ka ụwa meriri, ike Chineke nyere ya efunarị ya, ma nwụọ ọnwụ dị egwu, ọnwụ na-erughị eru” (“Kulie ma Mukee Pụta ihe,” Liahona, Me 2012, 118).
Lee kwa Dallin H. Oaks, “Ọgbụgba ndụ niile na Oke na ọrụ niile,” Liahona, Me 2024, 93–96; Ulisses Soares, “Obisike Ọgbụgba ndụ site na Jizọs Kraịst,” Liahona, Me 2024, 17–21.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Niihi Sọnde nke a bụ Sọnde nke mbụ nke ọnwa, ndị nkuzi Praịmarị ka agbara ume iji ihe omume ọmụmụ ihe niime “Appendix B: Ịkwado Ụmụntakịrị maka Oge ndụ N’ụzọ Ọgbụgba ndụ nke Chineke.”
Ndị Ikpe 3:7–9, 12–15
Jizọs Kraịst bụ Onye Nnapụta m.
-
Ndị Ikpe 3 na-akọwa usoro na-akuzi ihe banyere ike nke Onye Nzọpụta ịnapụta anyị site na mmehie. Inyere ụmụ gị aka mata usoro nke a, i nwere ike dedata nkebiokwu ndị a: “o mere ajọọ ihe,” “bekuru Onyenwe anyị,” na “kpọlitere onye nnapụta.” Emesịa ụmụ gị nwere ike chọọ maka nkebiokwu ndị a niime Ndị Ikpe 3:7–9 na Ndị Ikpe 3:12–15. Kedụ ihe anyị na-amụ banyere Onyenwe anyị site na usoro nke a?
-
Ikwusi ike na Jizọs Kraịst bụ Onye Nnapụta anyị, i nwere ike chịkọta foto dị iche iche nke ndị mmadụ, gụnyere foto nke Jizọs, ma kpuo ha ihu n’ala. Kwe ụmụ gị iwere oge otu n’otu ịtụgharị foto niile ahụ. Mgbe ha chọtara foto nke Jizọs, gụọ otu egwu banyere Ya, dị ka “O Zitere Ọkpara Ya” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 34-35), ma gwa ụmụ gị banyere otu O siworo napụta gị.
Ndị Ikpe 4:1–15
E nwere m ike ịkpate mmụọ ndị ọzọ inwe okwukwe niime Onyenwe anyị.
-
i nwere ike jiri “Debora Onye amụma nwanyị” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 92-95, iji kọọrọ ụmụ gị akụkọ dị niime Ndị Ikpe 4. Kekọrịta n’ibe unu ihe na-amasị gị banyere Debora. Kedụ otu okwukwe ya niime Onyenwe anyị si gọzie ndị gbara ya gburu gburu? Gịnị ka anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka nwetụkwuo okwukwe niime Jizọs Kraịst?
2:9Deborah the Prophetess
Ndị Ikpe 7:1–21
Onyenwe anyị pụrụ iji ụmụ obere ihe arụ nnukwu ọrụ.
-
Jiri Ndị Ikpe 7:4-7, ihu akwụkwọ ihe omume izu ụka nke a, ma ọ bụ “Ndị Agha nke Gideon” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 96-99, iji kuziere ụmụ gị banyere otu Onyenwe anyị siri mee ndị agha nke Izrel dịkwuo nta. Gịnị mere Onyenwe anyị jiri chọọ ndị agha nke Gideon ịdịkwu nta? (lee Ndị Ikpe 7:2).
2:37The Army of Gideon
-
Ụmụ gị nwere ike see foto nke mma agha, ngwa nchekwa, opi, oriọna, na ite mmiri ma kwuo okwu banyere niime mkpanaka ndị a nke ha nwere ike ịchọ n’agha. Emesịa ha nwere ike gụọ Ndị Ikpe 7:16 iji mụta ihe Onyenwe anyị gwara ndị agha nke Gideon jiri. Dị ka ị na-agụ banyere agha ahụ niime Ndị Ikpe 7:19–21, kesaara ibe unu ihe ị mụtara banyere Onyenwe anyị site n’akụkọ nke a.
Samson Akwada Ogidi niile, site n’aka James Tissot na ndị ọzọ
Ndị Ikpe 13:5
Idebe ọgbụgba ndụ niile na-enye m mgbam ume.
-
Ọgbụgba ndụ nke Samson na Onyenwe anyị nyere ya ume anụ ahụ, dị nnọọ ka ọgbụgba ndụ anyị nyere anyị ume ime mmụọ. Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ ime ụfọdụ mmegharị ahụ nke ahụ ma kparịta otu mmegharị ahụ ndị ahụ nwere ike iji nye aka mee ahụ anyị e sie ike. Kedụ otu idebe ọgbụgba ndụ anyị si eme mmụọ anyị sie ike? (lee Mozaya 18:8–10; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77, 79).
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.