Come, Follow Me
Echiche ndị aga E Buru n’Uche: Ụlọikwuu na Aja


“Echiche ndị aga E Buru n’Uche: Ụlọikwuu na Aja,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Ụlọikwuu na Aja,” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

akara echiche

Echiche ndị aga Edebe n’Uche

Ụlọikwuu na Aja

Dị ka anyị na-agụ Agba Ochie, anyị mgbe ụfọdụ na-achọta ogologo edereede banyere ihe ndị dị mkpa doro anya nye Onyenwe anyị mana nwere ike ghara iyi ozugbo ihe dị mkpa nye anyị taa. Ọpụpụ 25–30; 35–40 na Levitikọs 1–9; 16–17 bụ ọmụmaatụ niile. Isiokwu ndị a na-akọwa nʻuju ụlọikwuu nke Izrel niime alaịkpa na aja anụmanụ niile a ga-achụ ebe ahụ. Ụlọikwuu bụ obere tempụl, ebe obibi nke Onyenwe anyị n’etiti ndị Ya.

Tempụl anyị oge ugbua nwekwara otu ụdị myiri ya na ụlọikwuu nke Izrel, mana ha n’ezie adabachaghị nkọwa ya niime Ọpụpụ. Ma dị ka anyị anaghị egbu anụmanụ niime tempụl anyị niile—Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta kwụsịrị aja ụmụ anụmanụ ihe ruru afọ 2,000 gara aga. Otu ọ dị agbanyeghị ndịiche ndị a niile, e nwere nnukwu uru taa na-ịgụ banyere ụdị ofufe ndị nke Izrel mgbe gboo, kacha nke ọ bụrụ ma anyị hụ ha dị ka ndị nke Chineke niime Akwụkwọ nke Mọmọn mere—dị ka ụzọ iji gbaa okwukwe ha niime Kraịst ume” (Alma 25:16). Mgbe anyị ghọtara isi ntunyere nke ụlọikwuu na aja ụmụ anụmanụ, anyị nwere ike nwete nghọta ime mmụọ nke gakwa agba okwukwe anyị niime Kraịst ume.

Ndị Izrel na-ewete nwa atụrụ n’ụlọikwuu

Aja nke Nwa atụrụ, site n’aka Robert T. Barrett

Ụlọikwuu Na-agba Okwukwe niime Jizọs Kraịst Ume

Mgbe Chineke nyere Mozis iwu iwu ụlọikwuu niime kamp ndị Izrel, O kwuputara ebumnuche ya: “na M ga-ebi n’etiti ha” (Ọpụpụ 25:8) Niime ụlọikwuu ahụ, ọnụnọ nke Chineke ka ụgbọ nke ọgbụgba ndụ nọchitere anya—igbe osisi, nke ọlaedo kpuchiri, nke nwere niime ya ndekọihe nke ọgbụgba ndụ nke Chineke na ndị Ya. Ụgbọ ahụ ka edebere n’ọnụ ụlọ kachasị dị nsọ, nọ niime ime, ekewapụrụ iche site n’akụkụ ndị fọdụrụ nke ụlọikwuu site na akwa mgbochi. Akwa mgbochi nke a nwere ike gosipụta nkewapụ anyị site niihu Chineke niihi Ọdịda ahụ, tinyekwara ụzọ anyị si alaghachikwuru Ya—site na Onye Nzọpụta.

Karịa Mosis, anyị maara naanị maka otu onye nwere ike ịbanye “n’ebe ahụ kachasị dị nsọ” (Ọpụpụ 26:34)—onye isi nchụaja. Dị ka ndị nchụaja ndị ọzọ, a ga-ebu ụzọ sachaa ma tee ya mmanụ ma yiewe ya uwe dị nsọ gosipụtara ọkwa ya. Otu ugboro nʻotu afọ, n’ụbọchị akpọrọ Ụbọchị Aja mgbaghara mmehie, onye isi nchụaja ga-achụ aja n’isi ndị ahụ tupu ịbanye ụlọikwuu naanị ya. N’ebe akwa mgbochi, ọ ga-akpọre ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Anwụrụ ọkụ ahụ siri isi ụtọ na-arigoro eluigwe nọchitere anya ekpere nke ndị ahụ na-arịgo ruo Chineke. Emesịa onyeisi nchụaja ahụ, iburu ọbara site n’aja anụmanụ, ga-agafe site nʻakwa mgbochi ma na-erute ocheeze nke Chineke, nke igbe ọgbụgba ndụ gosipụtara.

Ịmara ihe ị maara banyere Jizọs Kraịst na ọrụ Ya nʻatụmatụ nke Nna nke Eluigwe, i nwere ike ịhụta otu ụlọikwuu ahụ si arụtụrụ anyị aka nʻebe Onye Nzọpụta nọ? Dị nnọọ ka ụlọikwuu, na igbe ahụ dị niime ya, nọchitere ọnụnọ nke Chineke n’etiti ndị Ya, Jizọs Kraịst bụ ọnụnọ nke Chineke n’etiti ndị Ya. Dị ka onyeisi nchụaja, Jizọs Kraịst bụ Onye ogbugbo n’etiti anyị na Chineke Nna. Ọ gafere site n’akwa mgbochi ikwuchitere anyị site n’ike nke ọbara nke aja nke onwe Ya.

Ụfọdụ akụkụ nke ụlọikwuu nke Izrel nwere ike yie ihe ị ma ama, kacha nke ọ bụrụ ma ị gawo tempụl ịnata emume nsọ niile nke onwe gị. Tempụl bụ ụlọ nke Onyenwe anyị—ebe obibi nke Onyenwe anyị n’etiti ndị Ya. Dị ka ebe kachasị dị nsọ nke ụlọikwuu, ọnụ ụlọ selestịal nke tempụl nọchitere ihu Chineke. Ịbanye, a ga-eburịrị ụzọ sachaa ma tee anyị mmanụ. Anyị na-eyi uwe dị nsọ. Anyị na-eme ọgbụgba ndụ. Anyị na-ekpe ekpere n’ebe nchụaja site n’ebe ekpere na-arịgoro ruo Chineke. Ma anyị n’ikpeazụ na-agafe akwa mgbochi banye n’ihu Chineke.

Elemaanya myiri kachasị dị mkpa n’etiti tempụl oge ugbu a na ụlọikwuu mgbe gboo bụ na ha abụọ, ọ bụrụ ma aghọta ha nke ọma, na-agba okwukwe anyị niime Jizọs Kraịst ume ma juputa anyị nʻobi ekele maka aja mgbaghara mmehie Ya. Chineke na-achọ ụmụ Ya niile ịbanye n’ ihu Ya; Ọ na-achọ “alaeze nke ndị nchụaja” na ndị nchụaja ndị nwanyị (Ọpụpụ 19:6). Mana mmehie anyị na-egbochi anyị site na-ịnata ngọzị ahụ, niihi na “ọ dịghị ihe na-adịghị ọcha nwere ike ibinyere Chineke” (1 Nifaị 10:21). Ya mere Chineke Nna zitere Jizọs Kraịst, “onyeisi nchụaja anyị nke ihe niile dị mma” (Ndị Hibru 9:11). Ọ na-emepetụ akwa mgbochi ahụ maka anyị ma nye ndị niile bụ nke Chineke ike ị “bịa n’obi siri ike ruo n’ocheeze nke amara, ka anyị wee nwee ike nwete ebere” (Ndị Hibru 4:16).

Taa, ebumnuuche nke tempụl niile karịrị inwete mbuli elu maka onwe anyị. Mgbe anatasịrị emume nsọ nke onwe anyị na ịgba ndụ anyị na Chineke, anyị nwere ike guzoro n’aha nke ndị nna nna anyị ha ma nata emume nsọ niile n’aha ha. N’ezi uche, anyị nwere ike ị bụrụ ihe dị ka onyeisi nchụaja mgbe gboo—na Onyeisi nchụaja Dị Ukwuu—na-emepe ụzọ ruo niihu nke Chineke maka ndị ọzọ.

Ịchụ aja Na-agba Okwukwe niime Jizọs Kraịst ume

Ụkpụrụ niile nke aja mgbaghara mmehie na ime udo ka akuzisiri ike n’omume mgbe gboo nke ịchụ aja ụmụ anụmanụ, nke dịịrị ogologo oge tupu iwu nke Mosis. Adam na Iv chụrụ aja. Ha ghọtara nrụtụ aka akara ya nye ịchụ aja nke Onye Nzọpụta. Ma ha kuziri nke a nye ụmụ ha.

Ihe akara nke ịchụ aja anụmanụ nwere ike yiworịị kacha nke na-emetụ n’ahụ n’Ụbọchị Aja mgbaghara mmehie nke Izrel mgbe gboo (“Yom Kippur” n’asụsụ Hibru). Mkpa maka mmemme kwa afọ nke a ka egosipụtara niime Levitikọs 16:30: “N’ụbọchị ahụ ka onye nchụaja ga-achụrụ gị aja mgbaghara mmehie, iji sachaa gị, ka i wee dị ọcha site na mmehie gị niile niihu Onyenwe anyị.” Nke a kwere ka ọnụnọ nke Chineke nọgidesie ike n’etiti ndị ahụ. Aja mgbaghara mmehie nke a ka emejupụtara site na mmemme dị iche iche. N’otu niime ndị a, e gburu otu ewu dị ka onyinye maka mmehie niile nke ndị ahụ, ma onyeisi nchụaja weere ọbara ewu ahụ banye n’ebe ahụ kachasị dị nsọ. Emesịa, onyeisi nchụaja atụkwasị aka ya n’elu ewu dị ndụ ma kwupụta mmehie niile nke ụmụ Izrel—dị ka ihe akara iwefe mmehie ndị ahụ nʻebe ewu ahụ nọ. Emesịa chụpụ ewu ahụ site na kamp nke Izrel.

Niime ntọaja ndị a, ewu ndị ahụ bụ ihe akara Jizọs Kraịst, na-ewere ọnọdụ nke ndị juputara na njọ. E nweghị ike ikwe mmehie ịbata niihu Chineke. Ma kama ibibi ma ọ bụ chụpụ ndị mmehie, Chineke wetere ụzọ ọzọ—ewu ka a ga-egbu ma ọ bụ kwanụ chụpụ “Ma ewu ahụ ga-ebukwasị onwe ya mmehie ha niile” (Levitikọs 16:22).

Ntọaja ndị a na-atụ aka n’ụzọ Chineke weteworo iji kpọghachi anyị niihu Ya—Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya. Onye Nzọpụta e “buruwo iru uju anyị niile, ma burukwa mwute anyị niile,” ọbụna “mmehie nke anyị niile” (Aịzaya 53:4, 6). Ọ nọchiri ọnọdụ anyị, nye ndụ Ya iji kwụọ ụgwọ nsonazụ nke mmehie, ma emesịa merie ọnwụ site na Mbilite n’ọnwụ Ya. Aja nke Jizọs Kraịst bụ “aja ahụ dị ukwuu na nke ikpeazụ; ee, ọ bụghị aja nke mmadụ, ọ bụghị ma nke nnukwu anụ ọhịa” ma kama “aja na-enweghị nsọtụ na nke dị ebighị ebi” (Alma 34:10). Ọ bụ mmezu nke ihe niile aja niile nke mgbe gboo rụtụrụ aka na ya.

Jizọs bu obe ahụ

Maka ebumnuuche nke a, mgbe aja Ya bịara zuo oke, Ọ sịrị, “Unu ga-enye m ọbụghịkwa nke ịkwafu ọbara ọzọ; ee, aja unu niile … ka a ga-akwụsị. … Ma unu ga-enye n’ịchụrụ m aja obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị” (3 Nifaị 9:19–20).

Ya mere mgbe ị chọtara edereede ndị dị niime Agba Ochie banyere ịchụ aja niile na ụlọikwuu (ma ọ bụ, emesịa, tempụl)—ma ị ga-ahụta ọtụtụ ha—cheta na isi nzube nke ihe niile bụ ịgba okwukwe gị niime Mezaya, Jizọs Kraịst ume. Jikọọ ihe ị na-agụ na ihe ị na-amụta ya n’ofufe gị niime ụlọ Ya. Kwe ka obi gị na uche gị chigharịa nʻebe Ọ nọ. Tụgharịa uche ihe O mewooro gị iji kpọghachi gị azụ niihu Chineke—na ihe ị ga-eme iji soro Ya.

Hụba ama

  1. Ọpụpụ 33:7–11 kpọtụrụ “ụlọikwuu nke ndị ọgbakọ,” ebe Mosis kwurịtara okwu ya na Onyenwe anyị, mana nke a abụghị ntọ maka ịchụ aja ndị akọwara niime Ọpụpụ na Levitikọs. Aja ndị ahụ ka achụrụ niime ụlọikwuu akọwara niime Ọpụpụ 25–30, nke Chineke nyere Mosis na ụmụ Izrel iwu ka ha wuo (lee Ọpụpụ 35–40). Ụlọikwuu nke a, ebe Erọn na ụmụ ya ndị nwoke chụrụ aja anụmanụ, ka a nakwa arụ aka dị ka “ụlọikwuu nke ndị ọgbakọ” (lee, maka ọmụmaatụ, Ọpụpụ 28:43; 38:30; Levitikọs 1:3).

  2. Lee kwa Jekọb 4:5; Jarom 1:11.

  3. Lee Ọpụpụ 25:10-22.

  4. Lee Ndị Hibru 10:19–20.

  5. Lee Ọpụpụ 40:12–13.

  6. Lee Ọpụpụ 28.

  7. Lee Levitikọs 16:12.

  8. Lee Abụ ọma 141:2.

  9. Lee Levitikọs 16:14–15.

  10. Lee Jọn 1:14.

  11. Lee Ndị Hibru 8–10.

  12. Lee Mozis 5:4–12; lee kwa Jenesis 4:4.

  13. Lee Mozaya 15:8-9.