“Me 11–17. ‘Kpachara anya Ka Ighara Ichefu Onyenwe anyị’: Ditronomị 6–8; 15; 18; 29–30; 34,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Me 11–17. ‘Kpachara anya Ka Ighara Ichefu Onyenwe anyị,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Mosis n’elu Ugwu Nebo, site n’aka John Steel, © Providence Collection/licensed from goodsalt.com
Me 11– 17: “Kpachara anya Ka Ighara Ichefu Onyenwe anyị”
Ditronomị 6–8; 15; 18; 29–30; 34
Ije elu ụwa nke Mosis malitere n’elu ugwu, mgbe Chineke gwara ya okwu site n’ọhịa na-ere ọkụ (lee Ọpụpụ 3:1-10). Ọ bịakwara na ngwụcha nʻelu ugwu, ihe karịrị afọ 40 gara aga, mgbe Chineke gositụrụ ya ala e kwere na nkwa site nʻelu Ugwu Nebo (lee Ditronomị 34:1–4). Mosis ejiriwo oge ndụ ya na-ikwado ụmụ Izrel ịbanye ala ahụ e kwere na nkwa, ma akwụkwọ nke Ditronomị dekọrọ nkuzi ikpeazụ ya niile, ihe ncheta niile, mgbam ume niile, na arịrịọ niile nke Ndị Izrel. Ị na-agụ okwu ya niile na-eme ya e doo anya na ezigbo ebumnuuche nke ije ozi nke Mosis—nkwado nke dịịrị ndị ahụ mkpa—abụghị banyere nlanarị alaịkpa, imeri ndị iro, ma ọ bụ iwu otu mba. Ọ bụ banyere ịhụ Chineke naanya, rubere Ya isi, ma nọgide iguzosi ike na Ya. Nke a bụ nkwado anyị niile chọrọ iji banye ala e kwere na nkwa nke ndụ ebighị ebi. Ya mere na-agbanyeghị Mosis enweghị mgbe ọ zọnyere ụkwụ nʻala ahụ na-asọ asọ na mmiri ara ehi na mmanụ ańụ” (Ọpụpụ 3:8), niihi okwukwe na ikwesị ntụkwasị obi ya, ọ banyere ala ahụ e kwere na nkwa nke Chineke kwadoworo nye ndị niile na-esoro Ya.
Maka nchịkọta nke akwụkwọ nke Ditronomị, lee “Ditronomị” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ditronomị 6:4–7; 8:2–5, 11–17; 29:18–20; 30:6–10, 14–20
“Hụ Onyenwe anyị Chineke gị naanya jiri obi gị niile.”
Iwu nke Mosis gụnyere ọtụtụ mmemme na ntọaja ndị a hụrụ naanya. Dị ka ị ga-ahụ niime ndụmọdụ nke Mosis niime Ditronomị, Onyenwe anyị nwekwara nchegbu banyere ọnọdụ nke ime mmụọ ndị Ya—ọnọdụ ime mmụọ nke obi ha.
Niime edereede ndị dị n’okpuru, chọọ maka mkpụrụokwu ahụ obi, ma tụgharịa uche ihe o nwere ike igosipụta. I nwere ike chee maka edereede ndị a dị ka ụdị nlekọta ime mmụọ n’obi gị. Kedụ nchọpụta ị ga-enye onwe gị? Kedụ ọgwụgwọ ndị ị ga-enye iji melite ahụike ime mmụọ nke obi gị? Dedata mmetụta gị niile:
-
Ditronomị 6:4–7:
-
Ditronomị 8:2–5:
-
Ditronomị 8:11–17:
-
Ditronomị 29:18–20:
-
Ditronomị 30:6–10:
-
Ditronomị 30:14–20:
Otu ụzọ iji hazie echiche gị nwere ike bụrụ ise obi ma dee niime ya ihe ndị nke Onyenwe anyị na-ekwu na i kwesịrị inwe niime obi gị. Mgbe ahụ i nwere ike dee na-akụkụ ya ihe ndị i kwesịrị iwepụ site n’obi gị.
Kedụ otu i si egosi na gị hụrụ Chineke naanya jiri obi gị niile? Maka nchepụta niile, lee “Hụ Chineke naanya, hụ agbata obi gị naanya” niime Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile, 10–12.
Lee kwa M. Russell Ballard, “Ị Hụrụ M N’anya Karịa Ihe Ndịa?,” Liahona, Nov. 2021, 51–53.
Chọọ nghọta ime mmụọ nke onwe gị. Bịanụ, Soro M tụpụtara edereede niile na ụkpụrụ niile a ga-elekwasị anya niime akwụkwọ nsọ, mana ekwekwala nke ahụ belata ọmụmụ ihe gị. Dị ka ị na-agụ Ditronomị, i nwere ike chọpụta ụkpụrụ nke pụtara ìhè ebe a. Kwe ka Mmụọ ahụ duo gị ruo n’ihe i kwesịrị ịmụta.
Ditronomị 6:4–12, 20–25
“Kpachara anya Ka Ighara Ichefu Onyenwe anyị.”
Ọtụtụ niime Ndị Izrel ndị banyere ala e kwere na nkwa ahụghị ọrịa mkpochapụ ndị ahụ mere na Ijipt ma ọ bụ gafee Osimiri Uhie. Mosis maara na ha—na ndudugandu ọdịniihu—ga-enwe mkpa ọrụ ebube niile nke Chineke na iwu niile nke Chineke iji nọgide ịbụ ndị nke Chineke.
Kedụ ndụmọdụ ị na-achọta niime Ditronomị 6:4–12, 20–25 nwere ike inyere gị aka cheta nnukwu ihe niile Chineke mewooro gị? Kedụ ihe na-akpate mmụọ gị ime nke ga-eme ka okwu nke Onyenwe anyị “nọrọ niime obi gị” kwa ụbọchị? (amaokwu 6).
I nwekwara ike mụọ ozi nke Nwanne nwoke Jan E. Newman “Ichekwa Olu nke Ndị Ọgbụgba ndụ niime Ndụdụgandu Na-etolite” (Liahona, Nov. 2023, 36–38) ma tụgharịa uche otu i ga-esi enyefe okwukwe gị nʻaka ndudugandu ndị dịniihu.
Lee kwa Ditronomị 11:18–21; Dale G. Renlund, “Tụgharịa uche Na-Ịdịmma na Na-Ịdị ukwuu nke Chineke,” Liahona, Me 2020, 41–44; Ọkọwa okwu Baịbụl, “Frontlets or phylacteries.”
Ditronomị 15:1–15
Inyere ndị nọ na mkpa aka gụnyere aka na-emesapụ na obi dị njikere.
Anyị aka erubeghị n’ụbọchị ahụ “mgbe agaghị enwe ogbenye ọbụla n’etiti unu” (Ditronomị 15:4), ya mere ụkpụrụ niile banyere inyere ndị ogbenye aka niime Ditronomị 15 ka adị adị, ọbụna ọ bụrụ na otu omume kpọmkwem agbanwewo. Mata ihe amaokwu ndịa 1-15 kuziri banyere ihe mere anyị ji enyere ndị nọ na mkpa aka na ihe agwa anyị kwesịrị ịbụ maka ya.
Kedụ ihe ọ pụtara i “mepe aka gị nke ọma” nye ndị nọ na mkpa? (Amaokwuamaokwu ndịa 8, 11). Kedụ ihe ị na-amụta sitere n’ọmụmatụ nke Onyenwe anyị banyere inyere ndị nọ na mkpa aka? (lee amaokwu 15).
Lee kwa “E Mewo M Ihe Dị Mma Taa?,” Abụ, no. 223.
Ditronomị 18:15–19
Mosis “dịịrị ka” Jizọs Kraịst.
Peter, Nifaị, Moronaị, na Onye Nzọpụta Nʻonwe Ya ha niile kwuru okwu banyere amụma niime Ditronomị 18:15–19 (lee Ọrụ niile 3:20–23; 1 Nifaị 22:20–21; Joseph Smith—Agụgụala 1:40; 3 Nifaị 20:23). Kedụ ihe ị na-amụta banyere Onye Nzọpụta site na amaokwu ndị a? Chee maka ihe ị gụworo banyere Mosis niime izu ụka ole ma ole ndị a gara aga. Kedụ otu Mosis si “dịrị ka” Jizọs Kraịst?
Jizọs Kraịst gwara ndị Ya niime Amerịka mgbe gboo, “A bụ m ya onye amụma kwuru maka ya” (3 Nifaị 20:23).
Ditronomị 29:9; 30:15–20
Onyenwe anyị na-akpọku m ịhọrọ n’etiti ezi ihe na ajọọ ihe.
O nwere ike dị mmasị ịtụnyere okwu Mosis niile niime Ditronomị 29:9; 30:15–20 ya na ụfọdụ nkuzi ikpeazụ nke Lehi nye ezi na ụlọ ya niime 2 Nifaị 2:26–29; 4:4. Kedụ otu Lehi siri gbasaa n’ihe Mosis kuziri? Gịnị ka ị na-ahụta niime edereede ndị a na-akpatemmụọ gị “ịhọrọ ndụ”? (Ditronọmị 30:19).
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ditoronọmị 6:5
E nwere m ike ịhụ Chineke naanya jiri obi m niile.
-
Inyere ụmụ gị aka ghọta Ditronomị 6:5, i nwere ike see obi, nsepụta nke ahụ, na ogweaka siri ike. Ụmụ gị nwere ike tụọ aka na foto ahụ niile dị ka ị na-agụ mkpụrụokwu ndịa “obi,” “mkpụrụ obi,” na “uche” niime amaokwu ahụ. Kedụ otu anyị ga-esi egosi Onyenwe anyị na anyị hụrụ Ya naanya jiri obi anyị, mkpụrụ obi, na ike anyị niile?
Ditronomị 6:6–15
E nwere m ike idebe okwu nke Chineke niime obi m.
-
Gị na ụmụ gị gụọ ndụmọdụ nke Chineke nye ndị Izrel itinye edereede akwụkwọ nsọ nʻebe ha ga-ahụ ha ụbọchị ọbụla (lee Ditronomị 6:6–9). Nke a nwere ike kpateemmụọ gị na ụmụ gị iche maka ụzọ iji hụ na i gaghị “echefu Onyenwe anyị” (amaokwu 12) ma icheta ihe O mewooro gị.
-
I nwere ike tụpụta na Ditronomị 6:13, 16 na 8:3 nyeere Onye Nzọpụta aka n’oge dị mka niime ndụ Ya. Ịhụ otu e si mee, gụkọta ọnụ Matiu 4:1-10. Mgbe ahụ i nwere ike kesaara ibe unu ụfọdụ edereede akwụkwọ nsọ ndị ọzọ nyewooro gị aka n’oge mkpa niile.
Ditronomị 18:15–18
Ndị amụma na-akuzi ihe banyere Jizọs Kraist.
-
Dị ka ị na-agụkọta Ditronomị 18:18 ọnụ, nyere ụmụ gị aka ghọta na Onye amụma dị ka Mosis niime amaokwu nke a bụ Jizọs Kraịst. Ikekwe i nwere ike lee foto nke ihe ndị Mosis mere na ihe ndị Jizọs Kraịst mere, ma kwe ụmụ gị mekọta ha (lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nos. 15, 16, 38, 39). Gịnị ka onye amụma anyị taa kuziwooro anyị banyere Onye Nzọpụta?
Ditronomị 29:12–13; 30:8–10
Niihi ọgbụgba ndụ m niile, a bụ m onye so na ndị nke Chineke.
-
Ikwu okwu banyere Ditronomị 29:12–13 na-ewete ohere maka gị na ụmụ gị ikwu okwu banyere ọgbụgba ndụ niile ha ga-agba ma ọ bụ nke agbaworo ha na Nna nke Eluigwe. Gịnị ka ọ pụtara ị bụ ndị nke Chineke? Kedụ otu nkwa anyị si eme anyị ndị nke Chineke? (lee amaokwu 13; lee kwa Mozaya 18:8–10).
-
Ọ bụrụ na ụmụ gị chọrọ enyem aka ịghọta ihe ọgbụgba ndụ bụ, tụpụta na ha na-achọta nkọwa niime “Ọgbụgba ndụ” nọ niime Odudu nke Akwụkwọ nsọ (Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Kedụ nkwa niile Chineke na Ndị Izrel na-ekwe onwe ha niime Ditronomị 30:8–10? Kedụ nkwa ndị anyị kweworo anyị na Chineke? (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37, 77). Kedụ otu nkwa ndị a si jikọta anyị na Ya? Tụlee ịgụkọta otu egwu ọnụ banyere ọgbụgba ndụ, dị ka “Iguzoro n’elu Nkwa niile” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma).
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.