Come, Follow Me
Me 18–24. “Kwudosie Ike ma nwee Ezi Mgbam ume”: Joshua 1–8; 23–24


“Me 18–24. ‘Kwudosie Ike ma nwee Ezi Mgbam ume: Joshua 1–8; 23–24,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Me 18–24. ‘Kwudosie Ike ma nwee Ezi Mgbam ume,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

Mosis na-agọzi Joshua

Mosis Na-echi Joshua Echichi, site n’aka Darrell Thomas (nkọwa)

Me 18– 24: “Kwudosie Ike ma nwee Ezi Mgbam ume”

Joshua 1–8; 23–24

O wewo ọtụtụ ndudugandu, mana nkwa nke Onyenwe anyị bụ nke a na-achọ imezu: ụmụ Izrel n’ikpeazụ na-aga irite ala e kwere na nkwa. Mana Osimiri Jodan nọchiri ụzọ ha, mgbidi Jeriko, na ndị dike jụworo Onyenwe anyị (lee 1 Nifaị 17:35). Ma ha ga-ezute ihe ndị ahụ niile ebe onye ndu ha hụrụ naanya Mosis agaghị eso ha. Ọnọdụ ahụ nwere ike bụrụ na o mewo Ndị Izrel enwee mmetụta ịda mba na ịtụ ụjọ, mana Onyenwe anyị kwuru, “Kwudosie ike ma nwee ezi mgbam ume.” Kedụ ebumnuche ha nwere iji nwee mgbam ume? Ọ bụghị niihi ume nke onwe ha—ma ọ bụna nke Mosis ma ọ bụ nke Joshua—mana niihi na Onyenwe anyị Chineke gị nọnyeere gị ebe ọbụla ọ bụ ị na-aga” (Joshua 1:9). Mgbe anyị nwere osimiri nke onwe anyị ịgafe na mgbidi niile ịkụda, ihe ndị dị ịtụnaanya nwere ike ime niime ndụ anyị niihi na “Onyenwe anyị ga-eme ihe ebube dị iche iche nʻetiti [anyị]” (Joshua 3:5).

Maka nchịkọta nke akwụkwọ nke Jenesis, lee “Joshua, akwụkwọ nke” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Joshua 1:1–9

Chineke ga-anọnyere m dị ka m na-agba mbọ ikwesị ntụkwasị obi na Ya.

Tụgharịa uche ihe o nwere ike ịdị ka nye Joshua ịbụ onye akpọrọ ịnọchi Mosis. Mata ihe Onyenwe anyị kwuru niime Joshua 1:1-9 iji gbaa ya ume. Chee banyere aka mgba ndị siri ike ị na-agabiga; gịnị dị niime amaokwu ndị a na-enye mgba ume.

Aha ahụ Joshua (Yehoshua ma ọ bụ Yeshua na Hibru) pụtara “Jehova na-azọpụta.” Ma aha ahụ Jizọs bịara site na Yeshua. Ya mere dị ka ị na-agụ banyere Joshua, tụlee ọrụ ya na-idu ụmụ Izrel gafee Osimiri Jodan ma baa niime ala e kwere na nkwa. Kedụ otu ozi ya jiri yie ihe Kraịst na-emere anyị?

Joshua 1:8

akara ngosi semịnarị
Okwu Chineke nwere ike mee ụzọ m agaa nke ọma.

Dị ka Ọ gbara Joshua ume, Onyenwe anyị nyere ndụmọdụ niime Joshua 1:8 banyere akwụkwọ nsọ, ma ọ bụ “okwu nke iwu ahụ.” Na-itụle nnukwu ọrụ nke Joshua, kedụ ihe mere ndụmọdụ nke a jiri baa uru kachasịa?

Mgbe Onyenwe anyị na-akpọku anyị ịgụ akwụkwọ nsọ, Ọ na-ejikarị okwu ndị gafere naanị ịgụ agụ. Ọ nakwa ekwe nkwa nnukwu ngọzi. Tebuulu dị n’okpuru nwere ike nyee aka chọpụta ọkpụkpọ oku ndị a na ngọzi ndị ekwere na nkwa:

Ọkpụkpọ oku

Ngọzi ndị ekwere nkwa

Joshua 1:8

Ọkpụkpọ oku

Tụgharịa uche ụtụtụ na abalị

Ngọzi ndị ekwere nkwa

1 Nifaị 15:23–24

Ọkpụkpọ oku

Ngọzi ndị ekwere nkwa

2 Nifaị 32:3

Ọkpụkpọ oku

Ngọzi ndị ekwere nkwa

Mozaya 1:7

Ọkpụkpọ oku

Ngọzi ndị ekwere nkwa

Mee nke ọma n’ala ahụ

Helaman 3:29-30

Ọkpụkpọ oku

Ngọzi ndị ekwere nkwa

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:85

Ọkpụkpọ oku

Ngọzi ndị ekwere nkwa

Russell M. Nelson,“Nụrụ Ya,” Liahona, May 2020, nkeji ahịrị ikpeazụ dị na ihu akwụkwọ 89

Ọkpụkpọ oku

Ngọzi ndị ekwere nkwa

Kedụ otu Onyenwe anyị siworo mezuo nkwa ndị a niime ndụ gị? Ugbu a nwere ike bụrụ oge dị mma inyochagharị omume ọmụmụ akwụkwọ nsọ gị. Kedụ ihe na-aga nke ọma? Kedụ mmetụta i na-enwe mkpatemmụọ ime iji nwee nhụmiihe niile bara uru n’okwu Chineke?

Lee kwa “Dị ka M Na-enyochagharị Akwụkwọ nsọ Dị Nsọ,” Abụ, no. 277.

Joshua 2

Ma okwukwe ma ọrụ niile dị mkpa maka nzọpụta.

Ndị Kristian Ama Ọhụrụ hụrụ Rahab dị ka ihe atụ nke ike nke ma okwukwe ma ọrụ niile (lee Ndị Hiburu 11:31; Jemis 2:25). Dị ka ị na-agụ Joshua 2, tụlee ọrụ okwukwe na ọrụ nke Rahab na-ịzọpụta onwe ya, ezi na ụlọ ya, na ndị ọgba nke Ndị Izrel. Kedụ ihe nke a na-akuziri gị banyere otu okwukwe gị niime Kraịst na ọrụ gị nwere ike imetụta onwe gị na ndị ọzọ?

Rahab na-elepụ anya na ọnụ mpio

Rahab nọ na ọnụ mpio ya. Na-echere Nkwa, site n’aka Elspeth Young (nkọwa)

Joshua 3–4

Site n’okwukwe niime Jizọs Kraịst, e nwere m ike nwee nhụmiihe “ihe ịtụnaanya niile” nke Chineke.

Onyenwe anyị rụrụ ọrụ ebube dị iche iche n’etiti ndị Ya dị ka O duru ha baa niime ala e kwere na nkwa, ma O pụrụ imere gị ụdị ihe ahụ. Ebe a bụ ụfọdụ ajụjụ iji duo ọmụmụ ihe gị nke Joshua 3-4:

  • Gịnị mere i jiri na-eche na Ndị Izrel kwesịrị ido onwe ha nsọ tupu ha agafee Osimiri Jodan? (lee Joshua 3:5).

  • Mata na osimiri ahụ kewara naanị mgbe “ndị nchụaja zọnyere ụkwụ … n’ọnụ mmiri ahụ” (Joshua 3:13, 15). Gịnị kpatara nke a jiri dị iriba ama?

  • Ọtụtụ emume ndị ọzọ dị iriba ama mere na Osimiri Jodan—lee 2 Ndị Eze 2:6–15; 5:1–14; na Mak 1:9–11. Kedụ njikọ ndị ị na-ahụ n’etiti ihe omume ndị a?

  • Kedụ otu Onyenwe anyị siworo na-arụ “ọrụ ebube dị iche iche” niime ndụ gị? (Joshua 3:5). Kedụ otu i nwere ike iji nwee nhụmiihe—ma ọ bụ mata—ọrụ ebube ndị ahụ karịkwuo? (iji maa atụ, lee Joshua 3:17).

Joshua 6–8

Nrube isi na-edubata ike nke Chineke niime ndụ m.

Joshua 6-8 na-ede maka agha niile nʻala niile nke Jeriko na Ai. Dị ka ị na-agụ isi akwụkwọ ndị a, tụlee otu i si alụ agha ọnwụnwa (iji maa atụ, lee Joshua 7:10–13). Gịnị ka ị na-amụta banyere otu Chineke nwere ike iji nyere gị aka na gịnị ka ị chọrọ iji nwete ike Ya? Ịma atụ, kedụ ihe na-emetụta gị banyere nkuzi niile nke Onyenwe anyị maka iwere Jeriko? (lee Joshua 6:1–5) Elemaanya nkọwapụta nke dị niime Joshua 7 ga-akpatemmụọ gị ikpebi ma “e nwere ihe abụrụ ọnụ” niime ndụ gị nke i kwesịrị iwepụ (Joshua 7:13).

Joshua 23–24

“Họrọ gị taa onye ị ga-ejere ozi.”

Nkuzi ikpeazụ niile nke Joshua nye ndị Izrel niime Joshua 23–24 gụnyere ịdọ aka na ntị ndị dị mkpa, ndụmọdụ, na ngọzi ndị ekwere nkwa. Elemaanya i nwere ike depụta ihe ịchọtara. Ịtụle ihe niile ndị Izrel gabigaworo, gịnị mere i jiri na-eche na Joshua họọrọ ịgwa ha ihe ndị a na ngwụcha nke ndụ ya? Kedụ ihe ị na-achọta na-akpatemmụọ gị “ịrapara na Onyenwe anyị”? (Joshua 23:8).

Lee kwa Dale G. Renlund, “Họrọ Gị n’Ụbọchi Nke a,” Liahona, Nov. 2018, 104–6.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Joshua 1–46

“Kwudosie ike ma nwee ezi mgbam ume.”

  • Nke a bụ otu ụzọ iji nyere ụmụ gị aka “kwudosie ike ma nwee ezi mgbam ume” (Joshua 1:6) site na Jizọs Kraịst. Kpọkuo ha ịchọta nkebiokwu nke ekwugharịrị niime Joshua 1:6, 9, na 18, ma dedata ya ma ọ bụ bụrụ ya n’isi. Nyere ụmụ gị aka chee maka ọnọdụ niile ebe ha nwere ike inwe mkpa ozi nke a, dị nnọọ ka Joshua mere. I nwekwara ike nyochakọtagharịa ọnụ ụfọdụ akụkọ ndị dị niime Joshua 1–46 (lee kwa “Joshua Onye amụma” na “Rahab na ndị Ọgba nke” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 85–91). Kedụ otu ndị mmadụ niime akụkọ ndị a siri gosi obisike na mgbam ume niime Onyenwe anyị?

    2:59

    Joshua the Prophet

    1:39

    Rahab and the Spies

Joshua 1:8

Ịmụ akwụkwọ nsọ na-ewetere m ngọzi niile.

  • Ị na-agụ Joshua 1:8 nwere ike kpatemmụọ ụmụ gị ịgụ akwụkwọ nsọ n’onwe ha. Nyere ha aka chọta okwu ndị dị niime amaokwu ndịa na-akuziri ha otu na ihe mere anyị kwesịrị ịgụ akwụkwọ nsọ. Ha nwere ike chọọ maka otu ụdị ihe niime 1 Nifaị 15:23–24; 2 Nifaị 31:20; 32:3; Jekọb 4:6; Helaman 3:29–30. I nwekwara ike nyere ha aka mee ma mepụta atụmatụ ịgụ akwụkwọ nsọ.

Joshua 3–4

Aga m emerịrị baptizim iji banye n’alaeze eluigwe.

  • I nwere ike jiri akụkọ nke ndị Izrel na-agafe Osimiri Jodan dị ka ọdịmara nke baptizim—ịhapụ ndụ ochie anyị niime alaịkpa na ịmalite nke ọhụrụ na mmekọrịta ọgbụgba ndụ gị na Chineke. Ya mere dị ka ị na-agụkọta Joshua 3-4 ọnụ (ma ọ bụ “Joshua Onye Amụma” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 85-89), i nwekwara ike lee anya na foto nke Jizọs a na-eme baptizim ma kọwaa na e mere Jizọs baptizim nʻotu osimiri ahụ ndị Izrel gafere. I nweziri ike gụọ otu egwu dị ka “Baptizim” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 100-101). Kesaara ibe unu otu ime baptizim si dịrị ka mmalite ndụ ọhụrụ n’alaeze nke Jizọs Kraịst.

    2:59

    Joshua the Prophet

oyiyi abụọ etikọtara ọnụ na-egosi mgbe a na-eme Jizọs baptizim na otu nwa okoroọbịa a na-eme baptizim

Joshua 24:15

A pụrụ m ịhọrọ ijere Jizọs Kraist ozi.

  • Kedụ ihe i nwere ike ime iji nyere ụmụ gị aka ịhọrọ isoro Jizọs Kraịst, dị ka Joshua kpọkuru ndị Izrel ime? I nwere ike kpọkuo ha i:

    • Buru n’isi nkebiokwu dị nta sitere Joshua 24:15. Gbaa mbọ ime ya ihe obi ụtọ maka ụmụ gị. Nomba nke mkpụrụokwu ha buru n’isi nwere ike dabere n’afọ ole ha gbara.

    • Chọta akụkọ niile banyere ndị họọrọ ijere Jizọs Kraịst ozi. Ha nwere ike lee anya niime magazin Friend, Akwụkwọ Nka Ozi ọma, ma ọ bụ Akụkọ Agba Ochie niile na akwụkwọ akụkọ ndị ọzọ.

    • Ọnọdụ ngosi egwuregwu nke ha nwere ike họrọ isoro ma jeere Onye Nzọpụta ozi.

Jiri ihe omume dị iche iche. “Ụmụntakịrị niile dị iche, ma dị ka ha na-etolite, mkpa ha ga-agbanwe. Idị na-agbanwe usoro nkuzi gị ga-enyere gị aka zute mkpa dị iche iche” (Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Onye Nzọpụta31).

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend

ihe njide ihe

Nzọụkwụ Mbụ nke Okwukwe niime Jodan, site n’aka Trent Gudmundsen

Ihu akwụkwọ ihe omume Prịamarị: Aga m emerịrị baptizim iji banye n’alaeze eluigwe