“Me 18–24. ‘Kwudosie Ike ma nwee Ezi Mgbam ume: Joshua 1–8; 23–24,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Me 18–24. ‘Kwudosie Ike ma nwee Ezi Mgbam ume,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Mosis Na-echi Joshua Echichi, site n’aka Darrell Thomas (nkọwa)
Me 18– 24: “Kwudosie Ike ma nwee Ezi Mgbam ume”
Joshua 1–8; 23–24
O wewo ọtụtụ ndudugandu, mana nkwa nke Onyenwe anyị bụ nke a na-achọ imezu: ụmụ Izrel n’ikpeazụ na-aga irite ala e kwere na nkwa. Mana Osimiri Jodan nọchiri ụzọ ha, mgbidi Jeriko, na ndị dike jụworo Onyenwe anyị (lee 1 Nifaị 17:35). Ma ha ga-ezute ihe ndị ahụ niile ebe onye ndu ha hụrụ naanya Mosis agaghị eso ha. Ọnọdụ ahụ nwere ike bụrụ na o mewo Ndị Izrel enwee mmetụta ịda mba na ịtụ ụjọ, mana Onyenwe anyị kwuru, “Kwudosie ike ma nwee ezi mgbam ume.” Kedụ ebumnuche ha nwere iji nwee mgbam ume? Ọ bụghị niihi ume nke onwe ha—ma ọ bụna nke Mosis ma ọ bụ nke Joshua—mana niihi na Onyenwe anyị Chineke gị nọnyeere gị ebe ọbụla ọ bụ ị na-aga” (Joshua 1:9). Mgbe anyị nwere osimiri nke onwe anyị ịgafe na mgbidi niile ịkụda, ihe ndị dị ịtụnaanya nwere ike ime niime ndụ anyị niihi na “Onyenwe anyị ga-eme ihe ebube dị iche iche nʻetiti [anyị]” (Joshua 3:5).
Maka nchịkọta nke akwụkwọ nke Jenesis, lee “Joshua, akwụkwọ nke” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Joshua 1:1–9
Chineke ga-anọnyere m dị ka m na-agba mbọ ikwesị ntụkwasị obi na Ya.
Tụgharịa uche ihe o nwere ike ịdị ka nye Joshua ịbụ onye akpọrọ ịnọchi Mosis. Mata ihe Onyenwe anyị kwuru niime Joshua 1:1-9 iji gbaa ya ume. Chee banyere aka mgba ndị siri ike ị na-agabiga; gịnị dị niime amaokwu ndị a na-enye mgba ume.
Aha ahụ Joshua (Yehoshua ma ọ bụ Yeshua na Hibru) pụtara “Jehova na-azọpụta.” Ma aha ahụ Jizọs bịara site na Yeshua. Ya mere dị ka ị na-agụ banyere Joshua, tụlee ọrụ ya na-idu ụmụ Izrel gafee Osimiri Jodan ma baa niime ala e kwere na nkwa. Kedụ otu ozi ya jiri yie ihe Kraịst na-emere anyị?
Joshua 1:8
Okwu Chineke nwere ike mee ụzọ m agaa nke ọma.
Dị ka Ọ gbara Joshua ume, Onyenwe anyị nyere ndụmọdụ niime Joshua 1:8 banyere akwụkwọ nsọ, ma ọ bụ “okwu nke iwu ahụ.” Na-itụle nnukwu ọrụ nke Joshua, kedụ ihe mere ndụmọdụ nke a jiri baa uru kachasịa?
Mgbe Onyenwe anyị na-akpọku anyị ịgụ akwụkwọ nsọ, Ọ na-ejikarị okwu ndị gafere naanị ịgụ agụ. Ọ nakwa ekwe nkwa nnukwu ngọzi. Tebuulu dị n’okpuru nwere ike nyee aka chọpụta ọkpụkpọ oku ndị a na ngọzi ndị ekwere na nkwa:
|
Ọkpụkpọ oku |
Ngọzi ndị ekwere nkwa | |
|---|---|---|
|
Joshua 1:8 | Ọkpụkpọ oku Tụgharịa uche ụtụtụ na abalị | Ngọzi ndị ekwere nkwa
|
Ọkpụkpọ oku
| Ngọzi ndị ekwere nkwa
| |
Ọkpụkpọ oku
| Ngọzi ndị ekwere nkwa
| |
Ọkpụkpọ oku
| Ngọzi ndị ekwere nkwa Mee nke ọma n’ala ahụ | |
Ọkpụkpọ oku
| Ngọzi ndị ekwere nkwa
| |
Ọkpụkpọ oku
| Ngọzi ndị ekwere nkwa
| |
|
Russell M. Nelson,“Nụrụ Ya,” Liahona, May 2020, nkeji ahịrị ikpeazụ dị na ihu akwụkwọ 89 | Ọkpụkpọ oku
| Ngọzi ndị ekwere nkwa
|
Kedụ otu Onyenwe anyị siworo mezuo nkwa ndị a niime ndụ gị? Ugbu a nwere ike bụrụ oge dị mma inyochagharị omume ọmụmụ akwụkwọ nsọ gị. Kedụ ihe na-aga nke ọma? Kedụ mmetụta i na-enwe mkpatemmụọ ime iji nwee nhụmiihe niile bara uru n’okwu Chineke?
Lee kwa “Dị ka M Na-enyochagharị Akwụkwọ nsọ Dị Nsọ,” Abụ, no. 277.
Joshua 2
Ma okwukwe ma ọrụ niile dị mkpa maka nzọpụta.
Ndị Kristian Ama Ọhụrụ hụrụ Rahab dị ka ihe atụ nke ike nke ma okwukwe ma ọrụ niile (lee Ndị Hiburu 11:31; Jemis 2:25). Dị ka ị na-agụ Joshua 2, tụlee ọrụ okwukwe na ọrụ nke Rahab na-ịzọpụta onwe ya, ezi na ụlọ ya, na ndị ọgba nke Ndị Izrel. Kedụ ihe nke a na-akuziri gị banyere otu okwukwe gị niime Kraịst na ọrụ gị nwere ike imetụta onwe gị na ndị ọzọ?
Rahab nọ na ọnụ mpio ya. Na-echere Nkwa, site n’aka Elspeth Young (nkọwa)
Joshua 3–4
Site n’okwukwe niime Jizọs Kraịst, e nwere m ike nwee nhụmiihe “ihe ịtụnaanya niile” nke Chineke.
Onyenwe anyị rụrụ ọrụ ebube dị iche iche n’etiti ndị Ya dị ka O duru ha baa niime ala e kwere na nkwa, ma O pụrụ imere gị ụdị ihe ahụ. Ebe a bụ ụfọdụ ajụjụ iji duo ọmụmụ ihe gị nke Joshua 3-4:
-
Gịnị mere i jiri na-eche na Ndị Izrel kwesịrị ido onwe ha nsọ tupu ha agafee Osimiri Jodan? (lee Joshua 3:5).
-
Mata na osimiri ahụ kewara naanị mgbe “ndị nchụaja zọnyere ụkwụ … n’ọnụ mmiri ahụ” (Joshua 3:13, 15). Gịnị kpatara nke a jiri dị iriba ama?
-
Ọtụtụ emume ndị ọzọ dị iriba ama mere na Osimiri Jodan—lee 2 Ndị Eze 2:6–15; 5:1–14; na Mak 1:9–11. Kedụ njikọ ndị ị na-ahụ n’etiti ihe omume ndị a?
-
Kedụ otu Onyenwe anyị siworo na-arụ “ọrụ ebube dị iche iche” niime ndụ gị? (Joshua 3:5). Kedụ otu i nwere ike iji nwee nhụmiihe—ma ọ bụ mata—ọrụ ebube ndị ahụ karịkwuo? (iji maa atụ, lee Joshua 3:17).
Joshua 6–8
Nrube isi na-edubata ike nke Chineke niime ndụ m.
Joshua 6-8 na-ede maka agha niile nʻala niile nke Jeriko na Ai. Dị ka ị na-agụ isi akwụkwọ ndị a, tụlee otu i si alụ agha ọnwụnwa (iji maa atụ, lee Joshua 7:10–13). Gịnị ka ị na-amụta banyere otu Chineke nwere ike iji nyere gị aka na gịnị ka ị chọrọ iji nwete ike Ya? Ịma atụ, kedụ ihe na-emetụta gị banyere nkuzi niile nke Onyenwe anyị maka iwere Jeriko? (lee Joshua 6:1–5) Elemaanya nkọwapụta nke dị niime Joshua 7 ga-akpatemmụọ gị ikpebi ma “e nwere ihe abụrụ ọnụ” niime ndụ gị nke i kwesịrị iwepụ (Joshua 7:13).
Joshua 23–24
“Họrọ gị taa onye ị ga-ejere ozi.”
Nkuzi ikpeazụ niile nke Joshua nye ndị Izrel niime Joshua 23–24 gụnyere ịdọ aka na ntị ndị dị mkpa, ndụmọdụ, na ngọzi ndị ekwere nkwa. Elemaanya i nwere ike depụta ihe ịchọtara. Ịtụle ihe niile ndị Izrel gabigaworo, gịnị mere i jiri na-eche na Joshua họọrọ ịgwa ha ihe ndị a na ngwụcha nke ndụ ya? Kedụ ihe ị na-achọta na-akpatemmụọ gị “ịrapara na Onyenwe anyị”? (Joshua 23:8).
Lee kwa Dale G. Renlund, “Họrọ Gị n’Ụbọchi Nke a,” Liahona, Nov. 2018, 104–6.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Joshua 1–4; 6
“Kwudosie ike ma nwee ezi mgbam ume.”
-
Nke a bụ otu ụzọ iji nyere ụmụ gị aka “kwudosie ike ma nwee ezi mgbam ume” (Joshua 1:6) site na Jizọs Kraịst. Kpọkuo ha ịchọta nkebiokwu nke ekwugharịrị niime Joshua 1:6, 9, na 18, ma dedata ya ma ọ bụ bụrụ ya n’isi. Nyere ụmụ gị aka chee maka ọnọdụ niile ebe ha nwere ike inwe mkpa ozi nke a, dị nnọọ ka Joshua mere. I nwekwara ike nyochakọtagharịa ọnụ ụfọdụ akụkọ ndị dị niime Joshua 1–4; 6 (lee kwa “Joshua Onye amụma” na “Rahab na ndị Ọgba nke” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 85–91). Kedụ otu ndị mmadụ niime akụkọ ndị a siri gosi obisike na mgbam ume niime Onyenwe anyị?
2:59Joshua the Prophet
1:39Rahab and the Spies
Joshua 1:8
Ịmụ akwụkwọ nsọ na-ewetere m ngọzi niile.
-
Ị na-agụ Joshua 1:8 nwere ike kpatemmụọ ụmụ gị ịgụ akwụkwọ nsọ n’onwe ha. Nyere ha aka chọta okwu ndị dị niime amaokwu ndịa na-akuziri ha otu na ihe mere anyị kwesịrị ịgụ akwụkwọ nsọ. Ha nwere ike chọọ maka otu ụdị ihe niime 1 Nifaị 15:23–24; 2 Nifaị 31:20; 32:3; Jekọb 4:6; Helaman 3:29–30. I nwekwara ike nyere ha aka mee ma mepụta atụmatụ ịgụ akwụkwọ nsọ.
Joshua 3–4
Aga m emerịrị baptizim iji banye n’alaeze eluigwe.
-
I nwere ike jiri akụkọ nke ndị Izrel na-agafe Osimiri Jodan dị ka ọdịmara nke baptizim—ịhapụ ndụ ochie anyị niime alaịkpa na ịmalite nke ọhụrụ na mmekọrịta ọgbụgba ndụ gị na Chineke. Ya mere dị ka ị na-agụkọta Joshua 3-4 ọnụ (ma ọ bụ “Joshua Onye Amụma” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 85-89), i nwekwara ike lee anya na foto nke Jizọs a na-eme baptizim ma kọwaa na e mere Jizọs baptizim nʻotu osimiri ahụ ndị Izrel gafere. I nweziri ike gụọ otu egwu dị ka “Baptizim” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 100-101). Kesaara ibe unu otu ime baptizim si dịrị ka mmalite ndụ ọhụrụ n’alaeze nke Jizọs Kraịst.
2:59Joshua the Prophet
Joshua 24:15
A pụrụ m ịhọrọ ijere Jizọs Kraist ozi.
-
Kedụ ihe i nwere ike ime iji nyere ụmụ gị aka ịhọrọ isoro Jizọs Kraịst, dị ka Joshua kpọkuru ndị Izrel ime? I nwere ike kpọkuo ha i:
-
Buru n’isi nkebiokwu dị nta sitere Joshua 24:15. Gbaa mbọ ime ya ihe obi ụtọ maka ụmụ gị. Nomba nke mkpụrụokwu ha buru n’isi nwere ike dabere n’afọ ole ha gbara.
-
Chọta akụkọ niile banyere ndị họọrọ ijere Jizọs Kraịst ozi. Ha nwere ike lee anya niime magazin Friend, Akwụkwọ Nka Ozi ọma, ma ọ bụ Akụkọ Agba Ochie niile na akwụkwọ akụkọ ndị ọzọ.
-
Ọnọdụ ngosi egwuregwu nke ha nwere ike họrọ isoro ma jeere Onye Nzọpụta ozi.
-
Jiri ihe omume dị iche iche. “Ụmụntakịrị niile dị iche, ma dị ka ha na-etolite, mkpa ha ga-agbanwe. Idị na-agbanwe usoro nkuzi gị ga-enyere gị aka zute mkpa dị iche iche” (Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Onye Nzọpụta, 31).
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend