Come, Follow Me
Me 4–10. “E Nupukwala isi megide Onyenwe anyị, Ọ bụghị ma Ịtụ Egwu”: Ọnụọgụgụ 11–14; 20–24; 27


“Me 4–10. ‘E Nupukwala isi megide Onyenwe anyị, Ọ bụghị ma Ịtụ Egwu: Ọnụọgụgụ 11–14; 20–24; 27,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Me 4–10. ‘E Nupukwala isi megide Onyenwe anyị, Ọ bụghị ma Ịtụ Egwu,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026

foto nke Wadi Rum

Ọzara dị nso na Sinai Peninsula

Me 4–10: “E Nupukwala isi megide Onyenwe anyị, Ọ bụghị ma Ịtụ Egwu”

Ọnụọgụgụ 11–14; 20–2427

Ọbụna n’ụkwụ, ọ gaghị ewe afọ 40 ime njem site na alaịkpa nke Sinai ruo ala e kwere na nkwa na Kenan. Mana otu ahụ bụ ogologo oge ụmụ Izrel ga-agazurịrị—ọ bụghị ịme njem dị ogologo nke ụkwụ kama ịme njem dị ogologo nke ime mmụọ: njem nke dị n’etiti onye ha bụụrụ na onye ha nwere ike ịbụ dị ka ndị ọgbụgba ndụ nke Chineke.

Akwụkwọ nke Ọnụọgụgụ na-akọwa ụfọdụ ihe ndị mere n’oge afọ 40 ndị ahụ, gụnyere ihe ọmụmụ niile ụmụ Izrel kwesịrị ịmụta tupu ịbanye ala e kwere na nkwa. Ha mụrụ ihe banyere i kwesị ntụkwasị obi nye ụmụ odibo nke Onyenwe anyị (lee Ọnụọgụgụ 12). Ha mụrụ banyere ịtụkwasị obi n’ike nke Onyenwe anyị, ọbụna mgbe ọdịniihu yiri ihe na-enweghị olileanya (lee Ọnụọgụgụ 13–14). Ma ha mụrụ na enweghi okwukwe na-ewete mmerụ ahụ ime mmụọ, mana ha nwere ike chegharịa ma lekwasị Onye Nzọpụta anya maka ọgwụgwọ (lee Ọnụọgụgụ 21:4–9).

Anyị niile dị ka ndị Izrel n’ụzọ ụfọdụ. Anyị ma ihe ọ dị ka ya ịnọ niime alaịkpa ime mmụọ, na ihe mmụta niile ha mụtara nwere ike inyere anyị aka kwadoo ịbanye ala e kwere anyị na nkwa: ndụ ebighị ebi anyị na Nna nke Eluigwe.

Maka nchịkọta nke akwụkwọ Ọnụọgụgụ, lee “Ọnụọgụgụ” niime Ọkọwa okwu Baịbụl.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Ọnụọgụgụ 11:11–17, 24–2912

Mkpughe dị adị nye onye ọbụla, mana Chineke na-edu Nzukọ nsọ Ya site na onye amụma Ya.

Niime Ọnụọgụgụ 11:11–17, 24–29, mata nsogbu Mosis zutere na azịza Chineke tụpụtara. Kedụ ihe i chere Mosis chere mgbe o kwuru na ya tụrụ anya “na ndị nke Onyenwe anyị niile bụụrụ ndị amụma”? (amaokwu 29). Dị ka ị na-atụgharị nʻuche ajụjụ nke a, chọọ azịza ndị e nwere ike ịhụ n’ozi nke Onyeisi Russell M. Nelson “Mkpughe maka Nzukọ nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị” (Liahona, Me 2018, 93–96).

Ị na-ekwu na anyị niile nwere ike ịnata mkpughe, kosiladị, apụtaghị na anyị niile nwere ike idu ndị nke Chineke otu Mosis siri mee. Ihe omume dị niime Ọnụọgụgụ 12 mere nke a e doo anya. Kedụ mkpachara anya ndị ị na-ahụ niime isiokwu nke a? Kedụ ihe i chere Onyenwe anyị chọrọ gị ịghọta banyere mkpughe nke onwe na isoro onye amụma Ya?

Lee kwa 1 Nifaị 10:17; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 28:1–7; Dallin H. Oaks, “Ụzọ Abụọ nke Mkparịta ụka,” Liahona, Nov. 2010, 83–86.

Lekwasị anya n’ihe kachasị mkpa. Ụfọdụ ndị mmadụ ka ọ na-agwụ ike site n’ihe ọgụgụ kwa izu ụka ndị atụpụtara niime Bịanụ, Soro M. Dị ka ị na-enyocha ndepụta niile, soro Mmụọ ahụ. Tulee mkpa niile nke onwe gị na mkpa niile nke ndị i nwere ike ị na-akuziri. Ịghọta na itinye n’ọrụ n’uju otu ụkpụrụ niime otu izu ụka nwere ike nyekwuo aka karịa ịgụ isiokwu dị iche iche na nkịtị.

Ọnụọgụgụ 12:3

“Mosis dịịrị nwayọọ n’obi nke ukwuu.”

Ụfọdụ ndị nwere ịtụnaanya ịmata na Mosis, nnukwu onye ndu onye guzooro niihu Fero ma rụọ ọrụ ebube ndị dị ịtụnaanya jiri ike nke Onyenwe anyị, dịkwaara “nwayọọ n’obi nke ukwuu” (Ọnụọgụgụ 12:3). Kedụ ihe ọ pụtara ịdị nwayọọ n’obi? Tụlee ịmụ nkọwa nke Okenye David A. Bednar dị niime “Dị Nwayọọ n’obi ma Dị Umueala n’obi” (Liahona, Me 2018, 30–33) ma ọ bụ “Nwayọọ n’obi, Ịdị Nwayọọ n’obi” niime Odudu ruo Akwụkwọ nsọ (Ọba akwụkwọ Ozi ọma).

Kedụ ihe ị na-amụta site n’ọmụmaatụ ịdị nwayọọ n’obi nke Mosis niime Ọpụpụ 18:13–25; Ọnụọgụgụ 11:26–29; Ọnụọgụgụ 12; Ndị Hibru 11:24–27; na Mosis 1:10–11? I nwekwara ike tụgharịa uche otu Onye Nzọpụta siri gosi ịdị nwayọọ n’obi (lee Matiu1:29; 27:11–14; Luk 22:41–42; Jọn 13:4–5). Gịnị ka ọmụmaatụ ndị a na-akuziri gị?

Ọnụọgụgụ 13–14

Site nʻokwukwe niime Onyenwe anyị, e nwere m ike inwe olileanya maka ọdịniihu.

Dị ka ị na-agụ Ọnụọgụgụ 13–14, gbalịa itinye onwe gị n’ọnọdụ ụmụ Izrel. Gịnị mere i jiri na-eche na ha chọburu “ịlaghachi niime Ijipt”? (Ọnụọgụgụ 14:3). Kedụ otu i ga-esi akọwa “mmụọ” nke ọzọ Kaleb nwere? (Ọnụọgụgụ 14:24). Kedụ ihe ndị na-amasị gị banyere okwukwe nke Kaleb na Joshua, ma kedụ otu i nwere ike isi etinye ọmụmaatụ ha n’ọnọdụ ndị ị na-ezute?

Mosis na ụfọdụ ndị ọgba nkè nke ndị Izrel

Mmadụ iri niime ndị ọgba nke ndị Izrel naara atụ egwu; Joshua na Kaleb nwere okwukwe. Joshua na Kaleb: Ndị Ọgba nke nwere Nrube isi, site n’aka Douglas Klauba. © Lifeway Collection/licensed site na goodsalt.com

Ọnụọgụgụ 21:4–9

akara ngosi semịnarị
Ọ bụrụ ma m lekwasị Jizọs Kraịst anya n’okwukwe, O nwere ike ịgwọ m niime mmụọ.

Ndị amụma Akwụkwọ nke Mọmọn maara akụkọ dị niime Ọnụọgụgụ 21:4–9 ma ghọta mkpa ime mmụọ ya. Gụọ nkuzi ha niile banyere akụkọ nke a niime 1 Nifaị 17:40–41; Alma 33:18–22; na Helaman 8:13–15. Nke a bụ ụfọdụ ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ha dị ka ị na-eme:

  • Gịnị ka agwọ bras ahụ nwere ike ịnọchite?

  • Gịnị ka ịta arụ agwọ ahụ nọchitere?

  • Ndị Izrel bịara “[lee] agwọ bras” (Ọnụọgụgụ 21:9) ahụ inwete ọgwụgwọ. Gịnị mere i jiri na-eche ụfọdụ ndị mmadụ jụrụ ajụ ile anya? E nwewo mgbe ihe yiri ya meworo gị?

  • Kedụ ihe i kpatere mmụọ gị ime iji n’uju “lekwasị anya na Ọkpara nke Chineke jiri okwukwe” ma nwete ọgwụgwọ? (Helaman 8:15).

Ịgụ edereede ndị a nwere ike chetere gị maka oge ndị ọzọ niime akwụkwọ nsọ mgbe ndị mmadụ kwesịrị ilekwasị anya ha na Kraịst. Ịma atụ, tụnyere ozi nke Ọnụọgụgụ 21:4–9 ya na Matiu 14:25–31 na 1 Nifaị 8:24–28 (lee kwa foto niile dị na ngwụcha ndepụta izu ụka nke a). Kedụ ihe na-agbalị ịdọpụ anyị site na Kraịst? Kedụ otu O si agọzi ndị mmadụ na-elekwasị anya na Ya?

Lee kwa “Jizọs, Ezi echiche nke Gị” (Abụ, no. 141).

Ọnụọgụgụ 22–24

E nwere m ike i soro uche nke Chineke, ọbụrụgodu na ndị ọzọ nwaa ịkwagide m ịghara ime ya.

Mgbe Balak, eze nke Moab, matara na ndị Izrel nọ nso, ọ ziri ozi maka Balaam, nwoke a maara maka ikwuputa ngọzi niile na abụmọnụ niile. Balak chọbuuru ya ịbụ ndị Izrel ọnụ. Mata otu Balak si gbalịa ikwagide Balaam (lee Ọnụọgụgụ 22:5–7, 15–17), ma chee banyere ọnwụnwa niile i nwere ike izute iji megide uche nke Chineke. Kedụ ihe na-amasị gị banyere azịza niile nke Balaam niime Ọnụọgụgụ 22:18, 38; 23:8, 12, 26; 24:13? Na mwute, Balaam n’ikpeazụ dabara na nkwagide ma rara Izrel nye (lee Ọnụọgụgụ 31:16; Juudu 1:11). Tụgharịa uche otu i nwere ike iji nọgide kwesị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị na-agbanyeghị nkwagide sitere n’aka ndị ọzọ

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ọnụọgụgụ 11:4–10

E nwere m ike inwe obi ekele maka ihe Chineke nyeworo m.

  • Jụọ ụmụ gị ma ha chete ụfọdụ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ iji nyere ndị Izrel aka (lee “Ọrịa Mkpochapụ nke Ijipt” na “Mmemme Ngabiga” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 67–74). Mgbe ahụ i nwere ike chịkọtara ha ya ọnụ Ọnụọgụgụ 11:4–10, na-ekwusi ike na ndị Izrel echefuwo ngọzi ha niile ma nọọrọ na-eme mkpesa. Kedụ ngọzi ndị anyị na-echefukarị mgbe ụfọdụ?

  • Dị ka unu na-agụ ma ọ bụ na-ege ntị nye otu egwu banyere obi ekele, dị ka “Gụkọọ Ngọzi Gị niile” (Abụ, no. 241), ụmụ gị nwere ike see foto eserese ngọzi niile nke Onyenwe anyị nyeworo ha.

Ọnụọgụgụ 12

Onyenwe anyị chọrọ ka m soro onye amụma Ya.

  • Idubata Ọnụọgụgụ 12, i nwere ike gwa ụmụ gị na obi adịghị Onyenwe anyị ụtọ n’ebe Erọn na Miriam nọ, nwanne nwoke na nwanne nwanyị nke Mosis. Kpọkuo ha ịgụ Ọnụọgụgụ 12:1–8 iji chọtapụta ihe kpatara ya. Tụlee iji Akwụkwọ Nka Ozi ọma iji nyere ụmụ gị aka chọta ọmụmaatụ nke ndị mmadụ dị niime akwụkwọ nsọ ndị kwanyeere onye amụma nke Onyenwe anyị ugwu ma agọzie ha. Kedụ otu esi gọzie anyị mgbe anyị sooro onye amụma nke Onyenwe anyị?

Ọnụọgụgụ 21:6–9

E nwere m ike ilekwasị anya na Jizọs Kraist.

  • I nwere ike jiri “Mozis na Agwọ brass ahụ” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 83–84, iji nyere ụmụ gị aka mụta ihe mere niime Ọnụọgụgụ 21:6–9. Kedụ otu agwọ bra ahụ si dịrị ka Jizọs Kraịst? (lee Jọn 3:14–15). Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ iji akwụkwọ kpụpụta agwọ ma na-ede n’elu ya ihe ndị dị mfe ha nwere ike ime iji “lekwasị anya na Ọkpara Chineke site nʻokwukwe” (Helaman 8:15).

    1:2

    Moses and the Brass Serpent

  • Ụmụ ndị tọrọ nwere ike họrọ otu niime akwụkwọ nsọ ndị a sotere ma kesaa ihe ọ na-agbakwunye na nghọta ha nke akụkọ ahụ: 1 Nifaị 17:41; Alma 33:18–20; Helaman 8:13–15; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:36.

agwọ bras ahụ

Agwọ Bronz, site n’aka Brent Evans

Ọnụọgụgụ 22–24

E nwere m ike i soro uche nke Chineke, ọbụna ọ bụrụ ma ndị ọzọ nwaa ịkwagide m ịghara ime ya.

  • Chịkọta Ọnụọgụgụ 22:1–18 maka ụmụ gị, na-ekwusi ike otu Balaam siri jụ ịbụ ndị nke Chineke ọnụ, ọbụna agbanyeghị Balak, eze nke Moab, nyere ya ugwu na akụ na ụba. Emesịa i nwere ike nyere ụmụ gị aka chọgharịa amaokwu ndị a sotere maka nkebiokwu ndị ha chere gosiri na Balaam chọbuuru isoro Chineke: Ọnụọgụgụ 22:18; 23:26; 24:13. Ikekwe ụmụ gị nwere ike họrọ otu nkebiokwu masịrị ha ma dee ya n’elu kaadị iji nyere ha aka cheta irubere Onyenwe anyị isi.

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.

oyiyi etikọtara ọnụ na-egosi Jizọs n’elu obe, agwọ bra ahụ, Jizọs na-enyere Pita aka jee ije n’elu mmiri, ọhụ nke Lihaị

Aka ekpe n’elu: Mkpọgbu n’obe nke Jizọs. Aka nri n’elu: Mosis na Agwọ Bras ahụ, site n’aka Judith Mehr. Aka ekpe n’ala: Onye mmezu nke Okwukwe, site n’aka Kelsy na Jesse Lightweave. Aka nri n’ala: Nrọ nke Lihaị, site n’aka Jerry Thompson

Ihu akwụkwọ ihe omume Prịamarị: E nwere m ike ilekwasị anya na Jizọs Kraist