“Eprel 20–26. ‘Ihe Niile nke Onyenwe anyi Kwuworo Anyi Ga-eme’: Ọpụpụ 19–20; 24; 31–34,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Eprel 20–26. ‘Ihe Niile nke Onyenwe anyi Kwuworo Anyi Ga-eme,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Mosis na Mbadamba nkume niile, site n’aka Jerry Harston (nkọwa)
Eprel 20–26: “Ihe Niile nke Onyenwe anyi Kwuworo Anyi Ga-eme”
Ọpụpụ 19–20; 24; 31–34
Na-agbanyeghị ụmụ Izrel atamuworịị ma dagharịa mgbe gara aga, mgbe Mosis gụrụ iwu ahụ nʻUgwu Sinai, ha gbara ndụ nke a: “Ihe niile nke Onyenwe anyi kwuworo anyi ga-eme, ma rube isi” (Ọpụpụ 24:7). Chineke mesịrị kpọọ Mosis n’elu ugwu ukwu ahụ, na-agwa ya ka o wuo tabanakụl “ka M wee biri n’etiti ha” (Ọpụpụ 25:8).
Mana dị ka Mosis nọ n’elu ugwu ukwu ahụ na-amụ otu Ndị Izrel nwere ike inwe nnọnyere nke Chineke n’etiti ha, kama Ndị Izrel nọọrọ n’ala ugwu ukwu na-akpụ arụsị apịrị apị nke ọlaedo iji fee ofufe kama. Ngwa ngwa ha kwesiworo nkwa nke “enweghị chi ọbụla ọzọ,” ha “dapụrụ ngwa ngwa” site na nkwa ha (Ọpụpụ 20:3; 32:8; lee kwa Ọpụpụ 24:3). Ọ bụụrụ ntụgharị dị ịtụnanya, mana anyị ma site na nhụmiihe na okwukwe na mkpebi nwere ike mgbe ụfọdụ bụrụ ihe enweghị ndidi, ịtụ egwu, ma ọ bụ obi abụọ na-emegide. Dị ka anyị na-achọ nnọnyere nke Onyenwe anyị niime ndụ anyị, ọ dị mma ịmata na Onyenwe anyị ahapụghị Izrel mgbe ochie ma Ọ gaghị ahapụ anyị na ndị anyị hụrụ naanya—niihi na Ọ dị “obi ebere ma ju na amara, ogologo ntachi obi, ma juputa na-ịdịmma na eziokwu” (Ọpụpụ 34:6).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ọpụpụ 19:3–6
Ndị ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị bụ akụ nye Ya.
Onyeisi Russell M. Nelson kuziri: “Niime Agba Ochie, okwu Hibru ahụ site nʻebe esi tụgharịa peculiar bụ segullah, nke pụtara ‘arịa e jiri kpọrọ ihe,’ ma ọ bụ ‘akụ.’ … Na ụmụ odibo nke Onyenwe anyị ịmata anyị dị ka ndị ya pụrụ iche bụ ekele ija mma nke nsoro kachasị elu” (“Ụmụ nke Ọgbụgba ndụ,” Ensign, Me 1995, 34). Kedụ otu okwu Onyeisi Nelson niile si metụta ụzọ ị si aghọta ihe Ọpụpụ 19:3–6? Kedụ otu Onyenwe anyị siworo gosi gị na O jiri gị kpọrọ ihe?
Ọpụpụ 19:10–11, 17
Nhụmiihe niile dị nsọ na-achọ ime akwado.
Onyenwe anyị gwara Mosis na ụmụ Izrel kwesịrị ka akwadoo ha tupu ha “ezute Chineke” (Ọpụpụ 19:10–11, 17) ma debe ọgbụgba ndụ Ya na ha (lee Ọpụpụ 19:5). Kedụ otu i si akwado maka nhụmiihe ime mmụọ niile, gụnyere oriri nsọ na emume nsọ niile nke tempụl? Kedụ otu anyị nwere ike i si nyere ndị ọzọ aka kwado? Gịnị ka ị na-amụta banyere nkwado site na Luk 6:12–13; Inọs 1:2–6; Alma 17:2–3?
Ugwu ukwu nke a dị na Ijipt ka e kwetere na ọ bụ nnọọ Ugwu Sinai kemgbe gboo.
Ọpụpụ 20:1–17
Nrube isi nye iwu nsọ niile nke Chineke na-ewete ngọzi niile.
Mgbe ndị Izrel gbakọtara nʻala nke Ugwu Sinai, ha nụrụ olu nke Chineke ka ọ na-enye Iwu nsọ Iri ahụ (lee Ditronomị 4:12-13). Ndị a, n’ezie, abụghị naanị iwu nsọ niile nke Chineke—e nwere ọtụtụ ndị ọzọ dị niime akwụkwọ nsọ. Ya mere dị ka ị na-agụ Ọpụpụ 20:1-17, jụọ onwe gị ihe mere Chineke jiri kwusie ike iri ndị a kpọm kwem. Ebe a bụ tebulu ọmụmaatụ i nwere ike iji mee ihe dị ka ị na-atụgharị uche mkpa Iwu nsọ Iri dị niime ndụ gị:
|
Iwu nsọ |
Ya mere, Onyenwe anyị na-arịọ m i … |
Ngọzi ndị na-abịa site na-ibi ndụ iwu nsọ nke a |
|---|---|---|
-
Kedụ otu idebe iwu nsọ iri ndị a ji enyere gị aka debe nnukwu iwu nsọ abụọ Jizọs nyere niime Matiu 22:34–40?
-
Gịnị bụ ihe ndị enwere ike ịnwa gị idebe tupu Chineke? Kedụ ngọzi ndị i hụworo site na-itinye Chineke mbụ?
-
Kedụ otu i ga-esi azaghachi nye onye si na-enyere Iwu nsọ Iri ogologo oge gara aga ma na ọ dabaghị taa? Kedụ ọmụmaatụ ndị sitere na ndụ gị ị ga-ekesa dị ka akụkụ nke nzaghachi gị? Kedụ otu abụ ahụ “Otu Ịdị Nwayọọ ka Iwụ Chineke dị” (Abụ, no. 125) si emetụta otu i si akọwa iwu nsọ niile nke Chineke nye ndị ọzọ?
-
Kedụ otu Onyenwe anyị siworo mezuo nkwa dị niime Ọpụpụ 20:6 niime ndụ gị?
Lee kwa “Nnukwu Iwu nsọ—Hụ Onyenwe anyị Naanya,” niime Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Ezra Taft Benson (2014), 37–45; Dallin H. Oaks, “Ọ Dịghị Chi Ndị Ọzọ,” Liahona, Nov. 2013, 72–75; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Iwu nsọ niile,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Ọpụpụ 24:1–11
Ịgba ndụ na-egosi njikere m irube isi nye iwu nke Chineke.
Dị ka ị na-agụ Ọpụpụ 24:3-8, tụgharịa uche n’ọgbụgba ndụ ndị i gbaworo gị na Chineke. Ebe ọgbụgba ndụ nke Izrel gụnyere ntọaja niile dị iche site n’ihe Chineke chọrọ taa, i nwere ike mata ụfọdụ myiri niile. Ịma atụ, amaokwu ndịa 4, 5, na 8 kpọrọ ebe nchụaja, aja anụmanụ niile, na ọbara. Kedụ ihe ihe ndị a nwere ike ịnọchite, na kedụ otu ha siri metụta ọgbụgba ndụ gị?
Ọpụpụ 32–34
Mmehie bụ ịtụgharị site na Chineke; nchegharị bụ ịtụgharị chee ihu na Ya ma pụọ site na ihe ọjọọ.
Gbalịa itinye onwe gị n’ọnọdụ nke Ndị Izrel—ị nọ niime alaịkpa, Mosis apụwo ruo ụbọchị 40, ma nzute ha na ndị Kenan maka ala e kwere na nkwa dị n’ọdịniihu gị (lee Ọpụpụ 32:1-8). Gịnị mere i jiri na-eche na ndị Izrel chọrọ arụsị ọlaedo akpụrụ akpụ? Kedụ ihe na-akpatemmụọ gị banyere arịrịọ nke Mosis nye Onyenwe anyị niime Ọpụpụ 33:11–17?
Ebe mmehie nke ndị Izrel siri ike, akụkọ nke a gụnyekwara otu ozi nke ebere na mgbaghara nke Chineke. Gịnị ka Ọpụpụ 34:1–10 na-akuziri gị banyere Onye Nzọpụta? (lee Ọpụpụ 32:30–32; Mozaya 14:4–8; 15:9; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:3–5).
Ọpụpụ 31:13–16
Ụbọchị izuike bụ ihe iriba ama.
Onyeisi Russell M. Nelson kọwara: “N’afọ mgbe m na-emebeghi agadi, a mụrụ m ọrụ nke ndị ọzọ ndị chịkọtaworo ndepụta niile nke ihe ndị a ga-eme na ihe ndị agaghị eme n’Ụbọchị izuike. Ọ bụghị tutu ruo mgbe e mesịrị ka m mụtara site n’akwụkwọ nsọ na omume m na agwa m n’Ụbọchị izuike gụnyere ihe ihe iriba ama n’etiti mụ na Nna m nke Eluigwe [lee Ọpụpụ 31:13; Izikiel 20:12, 20]. Site na nghọta ahụ, e nweghịkwa m mkpa ndepụta niile nke ihe a ga-eme na ndị agaghị eme. Mgbe oruru ime mkpebi ma otu ihe omume ọ dabara adaba ma ọ dabaghị maka Ụbọchị izuike, a jụrụ m nnọọ onwe m, ‘Kedụ ihe iriba ama m chọrọ inye Chineke?’ Ajụjụ ahụ mere nhọrọ m niile banyere Ụbọchị izuike ekwe nghọta nke ọma” (“Ụbọchị izuike Bụ Ihe Ọńụ,” Liahona, Me 2015, 130). Tụgharịa uche nʻihe iriba ama ị chọrọ inye Chineke site na ndebe gị nke Ụbọchị ezumiike.
Ọpụpụ 34:1–4
Gịnị bụ ndịiche dị n’etiti mbadamba okwute abụọ ahụ nke Mosis mere?
Mgbe Mosis gbadatara site n’ugwu ukwu ahụ, ọ wetara iwu e dere n’elu mbadamba okwute niile. Mgbe ọ matasịrị na ndị Izrel emebiwo ọgbụgba ndụ ha, Mosis kụwara mbadamba ndị ahụ (lee Ọpụpụ 31:18; 32:19). Emesịa, Chineke enye Mosis iwu imepụta mbadamba nkume abụọ ọzọ ma weghachi ha nʻugwu ukwu ahụ (lee Ọpụpụ 34:1-4). Ntụgharị asụsụ Joseph Smith nke Ọpụpụ 34:1-2 (niime appendix Baịbụl) mere ka o doo anya na mbadamba nkume abụọ nke mbụ ahụ gụnyere emume nsọ niile nke “usoro dị nsọ,” nke Chineke ma ọ bụ Ọkwa nchụaja Melkizedek. Okwute nke abụọ gụnyere “iwu gbasara iwu nsọ anụ ahụ.” Nke a bụ iwu dịtụ nta enyere site “n’ọkwa nchụaja dịtụ nta” (lee Ọgbụgba ndụ niile 84:17–27), nke kwesịrị ikwado ndị Izrel maka iwu kacha elu na ọkwa nchụaja kacha elu ka ha wee nwee ike banye niihu Chineke.
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ọpụpụ 20:3–17
Chineke na-enye m iwu nsọ niile niihi na Ọ chọrọ ka m nwee obi ụtọ.
-
Kedụ otu ị ga-esi eme ọmụmụ ihe banyere Iwu nsọ Iri ihe na-enye obi ụtọ nye ụmụ gị? Dị ka ị na-agụkọta Ọpụpụ 20:3-17 ọnụ, kwe ụmụ gị nyere gị aka chọta ma ọ bụ see otu foto iji nọchite anya Iwu nsọ Iri nke ọbụla. Emesịa ụmụ gị nwere ike n’otu n’otu na-ahọrọ foto na ekwu okwu banyere otu ha nwere ike iji bie ndụ iwu nsọ ahụ. Kesaara ibe unu otu ibi ndụ iwu nsọ ahụ si ewetere unu obi ụtọ.
-
I nwekwara ike gụọ otu egwu dị ka “Debe Iwu nsọ niile” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 146-47). Nyere ụmụ gị aka chọta mkpụrụokwu ndị dị niime egwu ahụ iji kuziere ha ihe mere Chineke si na-achọ ka anyị debe iwu nsọ Ya niile.
Mgbe ụmụntakịrị kesara nhụmiihe ime mmụọ niile, ama ha na-eto eto. Ajụjụ ndị ị na-ajụ nwere ike gbaa ụmụ gị ume ikesa otu o si emetụta ha banyere Onye Nzọpụta na otu ibi ndụ ozi ọma siworo gọzie ha (lee Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Onye Nzọpụta, 32). Mgbe ha na-eme nke a, ha na-agba ama. Tụgharịa uche otu i nwere ike iji mee nke a dị ka unu na-akparịta ngọzi niile na-abịa site na-ibi ndụ Iwu nsọ Iri ahụ.
Ọpụpụ 20:12
Onyenwe anyị chọrọ ka m sọpụrụ ndị nne na nna m.
-
Nyere ụmụ gị aka mụta nkebiokwu a “Sọpụrụ nna gị na nne gị” (Ọpụpụ 20:12). Ị nwere ike ịchọrọ ịkọwa na ị “sọpụrụ” mmadụ nwere ike pụta igosi nkwanye ugwu nye ha ma ọ bụ inwetere ha obi ụtọ. Gịnị ka Jizọs mere iji sọpụrụ nne Ya nke anụ ahụ na Nna Ya nke Eluigwe? (lee Luk 2:48–51; Jọn 19:26–27). Elemaanya ụmụ gị nwere ike n’otu n’otu mee ejije ihe ndị ha nwere ike ime iji sọpụrụ ndị nne na nna ha, ebe ụmụaka ndị ọzọ na-anwa ịkọta ihe ha na-eme.
Ọpụpụ 31:13, 16–17
Ịsọpụrụ Ụbọchị ezumiike bụ ihe iriba ama nke ịhụnaanya m maka Onyenwe anyị.
-
Ụmụ gị nwere ike nwee mmasị ile ọmụmaatụ niile nke ihe iriba ama—dị ka akara ndị nke okporo ụzọ ma ọ bụ akara ndị dị n’elu ụlọ. Gịnị bụ ebumnuuche ihe iriba ama niile? Ụmụ gị nweziri ike chọta mkpụrụokwu ahụ “ihe iriba ama” niime Ọpụpụ 31:13, 16–17. Gịnị mere Onyenwe anyị jiri kwuo na ọ bụ ihe iriba ama n’etiti anyị na Ya? Kesaara ibe unu ụfọdụ ụzọ ndị gị na ezi na ụlọ gị si na-agbalị iji gosi ịhụnaanya unu maka Onyenwe anyị n’Ụbọchị izuike.
Ngosipụta nke Mosis bu Iwu nsọ Iri ahụ, site n’aka Sam Lawlor (uju)
Ọpụpụ 32:1–8, 19–24; 34:6–7
Agaghị m “adapụ” site n’ụzọ nke Chineke.
-
Tụlee ojiji “Mosis nọ n’elu Ugwu Sinai” (niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 77–82) iji nyere ụmụ gị aka mụọ akụkọ dị niime Ọpụpụ 32:1–8, 19–24. Gịnị kpatara na o zighị ezi maka ndị Izrel ife akpụrụ akpụ ofufe kama ife Chineke?
2:55Moses on Mount Sinai
-
O nwere ike bụrụ ihe obi ụtọ imepụta ụzọ n’ala (ma ọ bụ chọta otu dị nso n’ebe obibi gị) iji gosipụta okwu ndị a sitere na Ọpụpụ 32:8: “Ha adapụwo ọsọ ọsọ site n’ụzọ ahụ.” Mgbe ha na-eje ije n’ụzọ ahụ, ụmụ gị nwere ike kwuo okwu banyere ọnwụnwa niile anyị na-ezute ịdapụ site na Chineke. Kedụ ihe na-enyere anyị aka nọgide n’ụzọ nke Chineke—ma laghachi na ya ma ọ bụrụ na anyị akpafuwo? (lee Ọpụpụ 34:6-7).
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.