“Eprel 13–19. ‘Guzoro Kwem, ma Hụ Nzọpụta nke Onyenwe anyị’: Ọpụpụ 14-18,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Eprel 13–19. ‘Guzoro Kwem, ma Hụ Nzọpụta nke Onyenwe anyị,’” Bianụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Epril 13-19: “Guzoro Kwem, ma Hụ Nzọpụta nke Onyenwe anyị”
Ọpụpụ 14–18
Ọnya mara Ndị Izrel. Osimiri Uhe nọ nʻotu aka, ma ndị otù agha Fero nọ na-abịa nʻike nʻike nʻaka nke ọzọ. Mgbapụ ha site na Ijipt, ka o diiri ka, ọ gaghị anọgide. Mana Chineke nwere ozi maka Ndị Izrel nke Ọ chọrọ ka ha cheta ruo ọtụtụ ndudugandu: “Unu atụkwala egwu. … Onyenwe anyị ga-alụrụ gị ọgụ” (Ọpụpụ 14:13–14).
Kemgbe oge ahụ, mgbe ndị nke Chineke nwere mkpa okwukwe na mgbam ume, ha akọwo akụkọ nke a. Mgbe Nifaị naara achọ ịkpate mmụọ nke ụmụnne ya ndị nwoke, ọ sịrị, “Ka anyị sie ike dị ka Mosis; niihi na n’ezie ọ gwara mmiri niile nke Osimiri Uhe ma ha kewara ebe a na ebe a, ma ndị nna nna anyị ha gafere, site na ndọkpụ n’agha, na-ala akọrọ” (1 Nifaị 4:2). Mgbe Eze Limhi chọrọ ka ndị ya adọkpụụrụ n’agha i “buli isi [ha] elu, ma ńụrịa,” o cheteere ha otu akụkọ nke a kwa (Mozaya 7:19). Otu ahụkwa ka Alma mere, mgbe ọ chọrọ ịgba ama nye nwa ya nwoke maka ike nke Chineke (lee Alma 36:28). Ma mgbe ọnya dịrị ka ọ mara anyị—mgbe anyị nwere mkpa nwa obere okwukwe iji “hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị”—anyị pụrụ icheta otu “Onyenwe anyị siri zọpụta Izrel ụbọchị ahụ” (Ọpụpụ 14:13, 30).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ọpụpụ 14; Ọpụpụ 15:1–21
Onyenwe anyị pụrụ ịrụ “nnukwu ọrụ” niime ndụ m.
Dị ka ị na-agụ Ọpụpụ 14:1–10, chee otu o nwere ike ịdịrị ndị Izrel dị ka ha hụrụ otu ndị agha Fero na-abịaru nso. Elemaanya i chere na i nwere mkpa ọrụ ebube iji nyaa ndụ aka mgba siri ike ị na-ezute. Kedụ ihe ị na-achọta niime Ọpụpụ 14:13-31 na akpate mmụọ gị ịchọ ike nke Chineke niime ndụ gị? Tụgharịa uche otu i siworo hụ ike Ya n’oge gara aga. Gịnị ka ị mụtaworo banyere Ya site na nhụmiihe ndịa?
Ọpụpụ 15:1-19 bụ otu egwu otuto nke Ndị Izrel gụrụ mgbe Onyenwe anyị kewachara Osimiri Uhe. Kedụ nkebiokwu ndị dị niime egwu nke a ị na-achọta kachasị baara gị uru? Ikekwe e nwere otu abụ inwere mmetụta ịgụ mgbe Onyenwe anyị mewooro gị ihe dị ịtụnanya, dị ka “Onye Mgbapụta nke Izrel” (Abụ, no. 6). Tulee ịgụ ma ọ bụ ịge ntị nye ya dị ka akụkụ nke ofufe gị taa.
Lee kwa Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 8:2–3.
Ọpụpụ 15:22–27; 16:1–15; 17:1–7
Onyenwe anyị pụrụ ime ihe ndị na-akụ ilu a dịrị ụtọ.
Ị na-agụ banyere njem nke Izrel nwere ike duba gị iche banyere ihe ndị dị niime ndụ gị nke yiri “ihe dị ilu” dị ka mmiri niile nke Marah (lee Ọpụpụ 15:23-27). Kedụ otu Onyenwe anyị siworo mee ihe ndị na-elu ilu niime ndụ gị a dịrị ụtọ? Kedụ uru nhụmiihe ndị a meworo niime ndụ gị?
Ị ga-ahụta ịma atụ ndị ọzọ nke nhụmiihe ilu maka ndị Izrel niime Ọpụpụ 16 na 17. Ọ ga-abụ ihe ọnwụnwa ịkatọ ntamụ ma ọ bụ mkpesa ha, mana dị ka ị na-agụ, tulee nʻuche ma imewokwa otu ụdị ihe ahụ. Kedụ ihe ị na-amụta site na nhụmiihe niile nke ndị Izrel nwere ike inyere gị aka belata itamu ntamu ma tụkwasị obi na Chineke karịa? Kedụ ihe amaokwu ndị a na-akuziri gị banyere Chineke?
Lee kwa 2 Nefi 2:11–12.
Ndị Izrel na-ekpokọta manna. Neo-gothic fresco, Trnava (uju)
Ọpụpụ 16
Onyenwe anyị na-enye m ọzụzụ ime mmụọ kwa ụbọchị.
Ebe anyị niile kwesịrị iri nri, Onyenwe anyị mgbe na mgbe na-atụnyere ihe ime mmụọ niile nye nri. Chọọ maka mmụta ime mmụọ Ya niile niime nhụmiihe niile ndị Izrel nwere ha na manna niime Ọpụpụ 16. Ịma atụ, kedụ ihe ị na-achọta niime nkuzi niile nke Onyenwe anyị niime Ọpụpụ 16:16, 19, 22–26 nke dabara na ọzụzụ ime mmụọ gị?
Ịchọpụta ihe mmụta ndị ọzọ Onyenwe anyị nwere ike chọọ gị ịmụta site n’ọrụ ebube nke a, tụgharịa uche ajụjụ ndị dị ka ndị a:
-
Gịnị ka Onyenwe anyị nyere m nke dị ka manna kwa ụbọchị nke O nyere ndị Izrel?
-
Gịnị ka m nwere ike ime nke dị ka ikpokọta manna?
I nwere ike chọta nghọta agbakwunyere nʻotu vidiyo ma ọ bụ abụọ ndị a: “Achịcha Kwa ụbọchị: Nsoro,” “Achịcha Kwa ụbọchị: Nhụmiihe,” na “Achịcha Kwa ụbọchị: Mgbanwe” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma).
Daily Bread: Pattern
Daily Bread: Experience
Daily Bread: Change
Chee maka ihe ndị ọzọ, ewezuga iri nri, nke i na-eme ụbọchị niile. Gịnị mere a ga-eji eme ụfọdụ ihe kwa ụbọchị iji nwee isi? Kedụ ihe na-akpate mmụọ gị ime iji chọọ nhụmiihe ime mmụọ niile kwa ụbọchị?
Lee kwa Dieter F. Uchtdorf, “Mweghachite Kwa Ụbọchị,” Liahona, Nov. 2021, 77–79; “Mweghachite Kwa Ụbọchị” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Daily Restoration
Ọpụpụ 17:1–7
Jizọs Kraịst bụ nkume ime mmụọ m na mmiri m dị ndụ.
Chee maka Onye Nzọpụta dị ka ị na-agụ Ọpụpụ 17:1-7. Kedụ otu Jizọs Kraịst si dịrị ka nkume nye gị? (lee Abụ ọma 62:6–7; Helaman 5:12). Kedụ otu O si dịrị ka mmiri? (lee Jọn 4:10–14; 1 Ndị Kọrịnt 10:1–4; 1 Nifaị 11:25).
Chọọ maka ihe mkpanaka ndị na-agba ama nke Kraịst. Mgbe ọbụla akwụkwọ nsọ kọwara ihe ndị nwere ike ịbụ ọdịmara nke Jizọs Kraịst, dị ka Ọpụpụ 17:1-7 na-eme, o nwere ike bụrụ ohere maka ihe ọmụmụ mkpanaka. Ị na-ele ma ọ bụ na-emetụ nkume ma ọ bụ mmiri n’aka nwere ike mee ya adị mfe ịghọta otu ihe mkpanaka ndị a si dịrị ka Jizọs Kraịst. Ọ bụrụ na i nwere ike webata ọtụtụ uche na-ịmụ ihe, ọ ga-adịkwu mma ma nwee ike na-emetụta.
Ọpụpụ 17:8–16; 18:13–26
Ndị na-eso ụzọ na-enyere ibe ha aka “buru ibu” nke ịrụ ọrụ nke Onyenwe anyị.
E nwere ike nwee oge ndị dị niime ndụ gị mgbe i nwere ike mata dị ka Mosis—mgbe ndị ọzọ dabeere na gị, mana “aka gị dị ka ihe dị arọ” (Ọpụpụ 17:12). Mgbe ọzọ, i nwere ike dịrị ka Erọn, Hur, na Jethro, ndị kwadoro Mosis. Tinye onwe gị n’ọnọdụ nke onye ọbụla niime ndị a dị ka ị na-agụ Ọpụpụ 17:8–16; 18:13–26, ma hụ ihe Onyenwe anyị na-akuziri gị banyere ọrụ Ya.
Lee kwa Mozaya 4:27; 18:8–9.
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ọpụpụ 14:5–22
Onyenwe anyị pụrụ ịrụ “nnukwu ọrụ” niime ndụ m.
-
Mgbe Onyenwe anyị kewara Osimiri Uhie ahụ, Mosis na ndị Izrel hụrụ otu ịdị ike Ọ dị. Kwe ụmụ gị inyere gị aka chee otu ụzọ na-enye obi ụtọ iji gosipụtagharịa akụkọ ahụ site na Ọpụpụ 14:5–22 (lee kwa “Mmemme Ngabiga” niime Akụkọ nille nke Agba Ochie, 70–74). Ikekwe i nwere ike hazie oche ma ọ bụ blanket niile ma “kewaa” ha dị ka Osimiri Uhie ahụ. Emesịa i nweziri ike kesaara ibe unu otu i siworo hụ ike nke Chineke niime ndụ gị.
2:54The Passover
-
Gịnị ka Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 8:2–3 gbakwunyere na nghọta gị nke akụkọ dị niime Ọpụpụ 14? Tulee ịgwa ụmụ gị banyere otu nhụmiihe mgbe Mmụọ Nsọ gwara gị ihe niime uche ma ọ bụ obi gị, ma kpọkuo ha ikwu banyere nhụmiihe nke ha. Unu nwere ike gụọ otu egwu banyere Mmụọ Nsọ, dị ka “Kwe Ka Mmụọ Nsọ Duo” (Abụ, no. 143).
Ọpụpụ 15:22–25
Onyenwe anyị pụrụ ime ihe ndị dị ilu dịrị ụtọ.
-
Ikekwe gị na ụmụ gị nwere ike ńụọ ihe dị ụtọ na ihe na-elu ilu mgbe unu na-amụkọta Ọpụpụ 15:22–25 ọnụ. Kedụ otu Onye Nzọpụta siworo mee ihe ndị “na-elu ilu” niime ndụ anyị “dịrị ụtọ”?
Ọpụpụ 15:23–25; 16:14–15; 17:1–6
Jizọs bụ Mmiri nke Ndụ m, Achịcha nke Ndụ m, na Oke nkume M.
-
Dị ka gị na ụmụ gị na-agụ Ọpụpụ 15:23–25; 16:14–15; 17:1–6, kwe ha inyere gị aka chọta mkpanaka iji nyee aka kọọ akụkọ nke ọbụla—dị ka alaka (iji gwọọ mmiri dị na Marah), otu udu ma ọ bụ otu ite (iji mejuo manna), na otu nkume (maka mmiri dị na Horeb). Kedụ ihe akụkọ ndị a na-echetere anyị banyere ihe Jizọs Kraịst na-emere anyị? Dị ka akụkụ mkparịta ụka unu, i nwere ike gụọ Matiu 7:24–27; Jọn 4:10–14; 6:29–35, 48–51; Helaman 5:12; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77, 79.
Onye nọ Niihu Chineke, site n’aka Joseph Brickey (nkọwa)
Ọpụpụ 17:8–16; 18:13–26
E nwere m ike nyee aka “buru ibu” nke ịrụ ọrụ nke Onyenwe anyị.
-
Dị ka unu na-agụ Ọpụpụ 17:8–16, i nwere ike kpọkuo otu nwata iwelite aka ya elu n’ikuku. Mgbe ike gwụrụ nwa ahụ, ụmụaka ndị ọzọ nwere ike nye aka, otu ahụ Erọn na Hur siri nyere Mosis aka. Gịnị ka akụkọ nke a na-akuzi banyere otu anyị ga-esi enye aka mee alaeze nke Chineke abụrụ ihe gara nke ọma. I nwekwara ike gụọ Ọpụpụ 18:13–26 ma kwukọrịta bnayere oke na ọrụ ndị dị arọ nke ndị na-eje ozi niime ngalaba ukwu unu. Gịnị ka unu nwere ike ime taa iji nyere ndị ndu Nzukọ nsọ aka, dị nnọọ ka Erọn na Hur siri nyere onye amụma Mosis aka?
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.