“Eprel 6–12. ‘Cheta Ụbọchị Taa, Nke Unu Pụtara site Ijipt’: Ọpụpụ 7–13,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Eprel 6–12. ‘Cheta Ụbọchị Taa, Nke Unu Pụtara site Ijipt,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Ngosipụta nke Mosis na Erọn niime ụlọ ikpe Fero, site n’aka Robert T. Barrett
Epril 6-12: “Cheta Ụbọchị Taa, Nke Unu Pụtara site Ijipt”
Ọpụpụ 7–13
Ọrịa mkpochapụ kwuru ọrịa mkpochapụ kpagburu Ijipt, mana Fero ka jụkwara ịtọghapụ ndị Izrel. Ma otu ọ dị Chineke garaniihu igosipụta ike Ya ma nye Fero ohere niile iji nabata “na Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị” na “enweghị onye dị ka m niime ụwa niile” (Ọpụpụ 7:5; 9:14). Ka ọ dịgodị, Mosis na ndị Izrel nwere ike bụrụ na ha ejiwo ịtụnaanya na-ele ngosipụta niile nke ike nke Chineke niihi ha. N’ezie ihe iriba ama ndị a na-aganiihu kwadoro okwukwe ha niime Chineke ma gbaa ịdị njikere ha ume isoro onye amụma nke Chineke. Emesịa, mgbe ọrịa mkpochapụ nke itolu gasịrị ma na-emeghi ka ndị Izrel nwere onwe ha, ọ bụ ọrịa mkpochapụ nke iri—ọnwụ nke nwa mbụ, gụnyere nwa mbụ nke Fero—nke mesịrị kwụsị ndọkpụ n’agha ahụ. Nke a yiri ihe dabara adaba niihi nʻọnọdụ ọbụla nke ndọkpụ n’agha ime mmụọ, e nwere n’ezie naanị otu ụzọ iji gbapụ. Ọ bụ naanị aja nke Jizọs Kraịst, Nwa mbụ—ọbara nke Nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ—ga-azọpụta anyị.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ọpụpụ 7–11
E nwere m ike ịhọrọ ka ime obi m dị nrọ.
Ke olileanya, uche gị emegideghị uche nke Chineke ma ọlị dị ka Fero mere. Ka ọ dị, anyị niile nwere oge mgbe obi anyị adịghị nro dị ka ha kwesịrị ịdị. Kedụ ihe metụrụ gị nʻobi banyere azịza niile Fero nyere maka ọrịa mkpochapụ niile niime Ọpụpụ 7:14–25; 8:5–32; 9:1–26; 10:12–29; 12:29–33? Mata nkọwapụta dị niime Ntụgharị asụsụ nke Ọpụpụ 7:3, 13; 9:12.
Gịnị mere “isi ike” ji bụrụ ezigbo nkọwa nke obi nke Fero? Tulee ihe ị na-amụta site na amaokwu ndị a banyere inwe obi dị nrọ: 1 Nifaị 2:16; Mozaya 3:19; Alma 24:7–8; 62:41; Ita 12:27. Dị ka ị na-agụ banyere nsọnazu niile nke mkpọchi obi Fero, tụgharịa uche ọnọdụ nke obi gị. Kedụ mgbanwe ndị metụtara gị ime?
Ọpụpụ 12:1–42
Jizọs Kraịst nwere ike ịzọpụta m niihi Aja mgbaghara mmehie Ya.
Naanị ụzọ ga-eme ka ndị Izrel ghara izute ọrịa mkpochapụ nke iri ahụ, akọwara niime Ọpụpụ 11:4-5, bụ isoro kpọmkwem ntuziaka niile Onyenwe anyị nyere Mosis niime Ọpụpụ 12, ntọaja a maara dị ka Emume Ngabiga. Emume Ngabiga na-akuziri anyị ihe jiri ọdịmara na dị ka nnọọ Onyenwe anyị napụtara ndị Izrel site n’agbụ niime Ijipt, O nwekwara ike napụta anyị site na agbụ nke mmehie. Iji nyochaa ihe nnọchianya a niime Ọpụpụ 12:1-42, i nwere ike jiri chaatị dị ka nke a:
|
Ọdịmara |
Mpụtara ndị pụrụ omume |
Ozi nke Chineke nye m |
|---|---|---|
Ọdịmara Mbido nke ọnwa niile (amaokwu 2; Onyenwe anyị nyere Ndị Izrel iwu iji mmemme nke a iji mee mmalite nke kalenda ha). | Mpụtara ndị pụrụ omume Nke a gaara abụ mmalite ọhụrụ maka Izrel. Ha gara abụ ndị “a mụrụ ọzọ.” | |
Ọdịmara Nwa atụrụ (amaokwu ndịa 3–5). | Mpụtara ndị pụrụ omume Lee Jọn 1:29; 6:54; 1 Pita 1:19. | |
Ọdịmara Ọbara nke nwa atụrụ n’ọnụ ụzọ niile (amaokwu ndịa 7, 13, 23). | Mpụtara ndị pụrụ omume Lee Mozaya 4:2; Alma 12:11. | |
Ọdịmara Achịcha Na-ekoghị eko (amaokwu ndịa 8, 15, 19–20). | Mpụtara ndị pụrụ omume Koro eko, ma ọ bụ yeast, nwere ike bụrụ ọdịmara nke ihe arụ niihi na ọ naghị egbu oge emebi. Lee Matiu 16:6–12; Jọn 6:35. | |
Ọdịmara Mgbọrọgwụ ilu niile (amaokwu 8). | Mpụtara ndị pụrụ omume Ihe ncheta nke ịkụ ilu nke mmehie na ndọkpụ n’agha. Lee Ọpụpụ 1:14; Mosis 6:55. | |
Ọdịmara Iri nri ọsọ ọsọ, yiri uwe ịpụ (amaokwu 11). | Mpụtara ndị pụrụ omume Ọdịmara nke ngwa ngwa ịhapụ ndọkpụ n’agha nke mmehie. Lee Jenesis 39:12; 2 Timoti 2:22. | |
Ọdịmara Onye mbibi (amaokwu ndịa 13, 23). | Mpụtara ndị pụrụ omume | |
Ọdịmara Ndị Izrel ka enyere mnwere onwe (amaokwu ndịa 29–32). | Mpụtara ndị pụrụ omume | |
Kedụ ihe ọzọ ị na-achọta niime nkuzi niile na ọdịmara niile nke Emume ngabiga nke na-echetere gị maka Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya? Gịnị ka ọdịmara ndị a na-atụpụtara gị banyere otu esi anata ngọzi niile nke Aja mgbaghara mmehie Ya?
Bịakwutenu Kraịst site na-ịchọpụta ọdịmara niile na-agba ama maka Ya. “Ihe niile,” ka Onyenwe anyị mara ọkwa, “ka e kere ma mee iji gbaa aka ebe maka m” (Mosis 6:63; lee kwa 2 Nifaị 11:4). Niime Ọpụpụ 12, ọdịmara niile dị ka nwa atụrụ, ọbara, achịcha na-ekoghị eko, ọrụ ebube niile, na nnapụta ha niile na-atụaka na Kraịst. “Ozugbo anyị ghọtara otu mkpanaka ndị a si metụta Onye Nzọpụta, ha nwere ike kuziere anyị maka ike na njirimara Ya niile” (Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye nzọpụta, 7).
Na Ncheta nke M, site n’aka Walter Rane
Ọpụpụ 12:14–17, 24–27; 13:1–16
Oriri nsọ na-enyere m aka cheta nnapụta m site na Jizọs Kraịst.
Onye Nzọpụta nyere Ndị Izrel iwu i na-eme Emume ngabiga kwa afọ iji nyere ha aka cheta na Ọ napụtawo ha, ọbụna mgbe ndọkpụ n’agha ha mesịrị bụrụ ihe ncheta dị anya. Dị ka ị na-agụ nkuzi Ya niile dị niime Ọpụpụ 12:14–17, 24–27; 13:1–16, chee banyere ihe ị na-eme iji cheta ngọzi niile nke Chineke maka gị. Kedụ otu ị ga-eji chekwaa ncheta ahụ “site na ndudugandu gị niile”? (lee Ọpụpụ 12:14, 26–27).
Kedụ myiri niile ị na-ahụ nʻetiti oriri Ngabiga na oriri nsọ ahụ? Kedu ihe i nwere ike ime iji “na-echeta Jizọs Kraịst mgbe niile”? (Moronaị 4:3; 5:2).
I nwekwara ike tụgharịa uche ihe ndị ọzọ Onyenwe anyị chọrọ gị icheta; lee, ịma atụ, Helaman 5:6–12; Moronaị 10:3; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 3:3–5, 10; 18:10; 52:40.
Lee kwa Kevin W. Pearson, “Ị ka Dị Njikere?,” Liahona, Nov. 2022, 67–69; “Na-echeta Ya mgbe niile” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Na Ncheta nke Onye Akpọgburu Nʻobe,” Abụ, no. 190.
Always Remember Him
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ọpụpụ 7–11
Onyenwe anyị nwere ike n’ihe niile.
-
Ọrịa mkpochapụ ndị akọwara niime Ọpụpụ 7-11 gosiri Ndị Ijipt na Ndị Izrel na Onyenwe anyị nwere nnukwu ike. Onyenwe anyị ga-enyere ụmụ gị aka nʻoge ndụ ha niile mgbe ha nwere okwukwe n’ike Ya. Iji nyere ha aka mụta ihe site na akụkọ nke a, i nwere ike nye nwa nke ọbụla mpempe akwụkwọ ekewara na nkeji 10, ma kpọkuo ha ise ihe osise nke ọrịa mkpochapụ niille akọwara niime amaokwu ndịa: Ọpụpụ 7:17–18; 8:1–4; 8:16–17; 8:20–22; 9:1–6; 9:8–9; 9:22–23; 10:4–5; 10:21–22; 11:4–7 (lee kwa “Ọrịa Mkpochapụ nke Ijipt” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 67–69). Gụkọọ Ọpụpụ 7:5 na 9:14 ọnụ iji kọwaa ihe mere Onyenwe anyị ji zite ọrịa mkpochapụ ndị ahụ.
2:3The Plagues of Egypt
-
Kesaara ụmụ gị otu Onyenwe anyị siworo gosi gị “na ọ dịghị onye dị ka [Ya] niime ụwa niile” (Ọpụpụ 9:14). Kwe ha ikesa otu ha siri mara na Onyenwe anyị dị ike.
Ọpụpụ 8:28–32; 9:7
Onyenwe anyị pụrụ inyere m aka nwete obi dị nro.
-
Inyere ụmụ gị aka hụta nʻuche ihe ọ pụtara inwe obi dị nro, o nwere ike bụrụ ihe ọńụ igosi ha ihe mkpanaka siri ike, dị ka nkume, na ihe ọzọ dị nro ma na-amị mmiri, dị ka sapo. I nwekwara ike wụọ mmiri nʻelu ihe mkpanaka ndị a iji gosi otu dị mfe obi dị nro si anabata okwu Onyenwe anyị. I nweziri ike gụkọọ amaokwu ole ma ole na-akọwa otu Fero siri zaghachi ọrịa mkpochapụ niile Onyenwe anyị zitere (lee Ọpụpụ 8:28–32; 9:7). Kedụ ihe mkpanaka niime ndị a nke kachasị nọchite obi na agwa nke Fero? Gịnị ka ọ pụtara inwe obi dị nro? (lee Mozaya 3:19).
-
Gị na ụmụ gị nwere ike depụta ụfọdụ omume nwere ike igosi mgbe i nwere obi kpọrọ nkụ (ịma atụ, iji okwu ndị na-adịghị mma ma ọ bụ adịghị njikere ikesa). Kedụ otu anyị ga-esi egosi Onyenwe anyị na anyị na-achọ inwe obi dị nro?
Ọpụpụ 12:1–13
Oriri nsọ pụrụ inyere m aka cheta Jizọs.
-
Emume ngabiga kuziiri Ndị Izrel ịtụanya maka Onye Nzọpụta na aja Ọ chụrụ maka anyị. Dị ka ị na-enyochagharịkọta Ọpụpụ 12:1-13 ọnụ, nyere ụmụ gị aka hụta njikọ ndị dị n’etiti uju niile nke Emume ngabiga na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst (lee kwa “Emume Ngabiga” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 70-74). Ịma atụ, kedụ otu Jizọs ji dịrị ka nwa atụrụ akọwara niime amaokwu nke 5?
2:54The Passover
-
Taa, anyị na-eri oriri nsọ iji cheta aja nke Jizọs. I nwere ike gosi ụmụ gị foto nke oriri nsọ ma kwuo okwu banyere otu emume nsọ nke a si enyere anyị aka cheta Jizọs Kraịst. I nwere ike nyere ụmụ gị aka chọta mkpụrụokwu ahụ “cheta” dị niime ekpere oriri nsọ (lee Moronaị 4-5). Ma ọ bụ gụkọta ọnụ abụ banyere oriri nsọ kacha mmasị, ma nyere ụmụ gị aka mata mmetụta nke udo ha nwere mgbe ha na-eche banyere Onye Nzọpụta. Kedụ otu anyị nwere ike iji chọọ mmetụta ahụ mgbe anyị riri oriri nsọ?
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.