Come, Follow Me
Maachị 30–Eprel 5. “Ọ Ga-eloba Ọnwụ niime Mmeri”: Ista


“Maachị 30–Eprel 5. ‘Ọ Ga-eloba Ọnwụ niime Mmeri’: Ista,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

“Maachị 30–Eprel 5. ‘Ọ Ga-eloba Ọnwụ niime Mmeri,’” Bianụ, Soro M: Agba Ochie 2026

Ili nke Jizọs tọgbọrọ n’efu

Ngosipụta nke ili tọgbọrọ n’efu

Maachị 30–Eprel 5: “Ọ Ga-eloba Ọnwụ niime Mmeri”

Ista

Ndụ nke Jizọs Kraịst “dị n’etiti agụgụala ụmụ mmadụ niile” (“Kraịst Ahụ Dị ndụ: Ama nke Ndị Ozi,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Gịnị ka nke ahụ pụtara? N’otu ụzọ, ọ pụtara na ndụ nke Onye Nzọpụta na-emetụta akara aka ebighị ebi nke onye ọbụla biworo ma ọ bụ ga-ebirịrị ndụ. I nwekwara ike kwuo na Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraịst, na Ista Sọnde mbụ ahụ, na-ejikọ ndị niile nke Chineke gburugburu agụgụala: ndị ahụ a mụrụ tupu Mbilite n’ọnwụ Ya tụrụ anya ya n’okwukwe (lee Jekọb 4:4), ma ndị ahụ a mụrụ mgbe ọ gasịrị leghachiri anya na ya n’okwukwe. Dị ka anyị na-agụ nkọwapụta na amụma niile nke Agba Ochie, anyị anaghị ahụ nnọọ aha Jizọs Kraịst, mana anyị na-ahụ aka ebe nke okwukwe ndị kwere ekwe mgbe gboo niime ma na-enwe agụụ maka Mezaya na Onye Mgbapụta ha. Ya mere anyị ndị akpọkuru i cheta Ya nwere ike nwee mmetụta njikọ ha na ndị ahụ na-atụ anya Ya. Niihi n’ezie Jizọs Kraịst eburuwo ajọọ omume nke anyị niile” (Aịzaya 53:6; okwu agbakwunyere), ma niime Kraịst ka a ga-eme ihe niile adị ndụ” (1 Ndị Kọrịnt 15:22; okwu agbakwunyere).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Ndị amụma mgbe gboo na oge ugbu a na-agba ama nke aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta.

Ọtụtụ edereede ndị dị niime Agba Ochie na-arụaka na-ije ozi na aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta. Tebuul dị nʻokpuru depụtara ụfọdụ edereede ndị a. Dị ka ị na-agụ amaokwu ndị a, kedụ mmetụta ndị na-abịara gị banyere Onye Nzọpụta?

Agba Ochie

Ama Ọhụrụ

Agba Ochie

Zakaraya 9:9

Ama Ọhụrụ

Matiu 21:1–11

Agba Ochie

Zakaraya 11:12–13

Ama Ọhụrụ

Matiu 26:14–16; 27:3–8

Agba Ochie

Aịzaya 53:4

Ama Ọhụrụ

Matiu 8:16–17; 26:36–39

Agba Ochie

Aịzaya 53:7

Ama Ọhụrụ

Mak 14:60–61

Agba Ochie

Abụ ọma 22:16.

Ama Ọhụrụ

Jọn 19:17–18; 20:25–27

Agba Ochie

Abụ ọma 22:18

Ama Ọhụrụ

Matiu 27:35

Agba Ochie

Abụ ọma 69:21

Ama Ọhụrụ

Matiu 27:34, 48

Agba Ochie

Abụ ọma 108:22

Ama Ọhụrụ

Matiu 21:42

Agba Ochie

Aịzaya 53:9, 12

Ama Ọhụrụ

Matiu 27:57–60; Mak 15:27–28

Agba Ochie

Aịzaya 25:8

Ama Ọhụrụ

Mak 16:1–6; Luk 24:6

Agba Ochie

Daniel 12:2

Ama Ọhụrụ

Matiu 27:52–53

Amụma ndị na-akuzi banyere Onye Nzọpụta dị nnọọ ukwuu karịa ma doo anya niime Akwụkwọ nke Mọmọn. Tulee otu okwukwe gị sị nwete mgbam ume site n’edereede dị ka ndị a: 1 Nifaị 11:31–33; 2 Nifaị 25:13; Mozaya 3:2–11; Alma 7:10–13.

Ndị amụma ụbọchị ikpeazụ na-aganiihu ịgba aka ebe pụrụ iche banyere Jizọs Kraịst na ozi aja mgbaghara mmehie Ya. Dị ka ị na-ege ntị nye ọgbakọ zuru ọha ngwụcha izu ụka Ista nke a, detuo ama niile nke Kraịst ndị ị nụrụ. Kedụ ihe ha na-akuziri gị banyere Ya?

akara ngosi semịnarị
Jizọs Kraịst na-enye m udo na ọńụ.

Ista bụ oge obi ụtọ, niihi na ọ bụ oge a na-eme mmemme Aja mgbaghara mmehie na Mbilite n’ọnwụ nke Onye Nzọpụta. Ma otu ọ dị, ọbụna nʻoge Ista, e nwere ọtụtụ ndị mmadụ na-ańụrị ọńụ niihi ọtụtụ ebumnuuche dị iche iche. Kedụ ihe i nwere ike ime iji gbasaa udo na ọńụ nke Onye Nzọpụta na Ista nke a?

Otu echiche bụ ịchọta ozi ndị dị niime akwụkwọ nsọ banyere udo na ọńụ Jizọs Kraịst na-enye, dị ka ndị a: Abụ ọma 16:8–11; 30:2–5; Aịzaya 12; 25:8–9; 40:28–31; Jọn 14:27; 16:33; Alma 26:11–22. Tulee otu i nwere ike i si kesaa ozi ndị a gị na ndị ọzọ. Ịma atụ, ikekwe i nwere ike mepụta kaadị Ista iji kesaa, nke gbakwasara ụkwụ nʻozi ndị a. Jiri ekpere mara banyere onye kwesịrị ịnata ekele Ista gị. I nwekwara ike kpebie ikesa ozi gị na soshịal midia, ebe ọtụtụ ndị mmadụ nwere ike ịhụ ha.

Abụ banyere Kraịst na Mbilite n’ọnwụ, dị ka “O Biliwo!” (Abụ, no. 199), nwekwara ike nyere anyị aka nwete mmetụta udo na ọńụ na Ista. Chọọ maka nkebiokwu ndị dị niime abụ nke ahụ, nʻuche nke gị, na-enwete ọńụ nke Ista.

Lee kwa Jeffrey R. Holland, “Ọbụghị dị ka Ụwa si Enye,” Liahona, Me 2021, 35–38; Mark S. Palmer, “Mwute Anyị Ka A Ga-atụgharị Ịghọ Ọńụ,” Liahona, Me 2021, 88–90.

Jizọs na-ekele Meri na mpụta ebe ili Ya

Gịnị Mere I ji Ebe akwa, site n’aka Simon Dewey (uju)

Niihi Aja mgbaghara mmehie Ya, Jizọs Kraịst nwere ike iji nyere m aka merie mmehie, ọnwụ, mnwale, na adịghị ike niile.

Ebe a bụ ihe omume nke nwere ike inyere gị aka hụta ọtụtụ ngọzi ndị na-abịa site na Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya. Gụọ akwụkwọ nsọ dị n’okpuru banyere ihe Jizọs Kraịst nyeere anyị aka merie. Gbalịa ịhazi edereede niile niime katigori ndị a: mmehie, ọnwụ, mnwale niile, na adịghị ike niile (ụfọdụ edereede nwere ike daba karịa n’otu katigori). Dị ka ị na-agụ, kedụ mmetụta ndị i na-enwe banyere ike nke Onye Nzọpụta?

Kedụ otu i ga-esi akọwara otu enyi onye na-abụghị Kristian ihe mere Jizọs Kraịst si dịrị gị mkpa? Ozi nke Okenye Ahmad S. Corbitt “Ị Maara Ihe Mere Mụ onwe m dị ka Kristian Si Kwere na Kraịst?Liahona, Me 2023, 119–21) pụrụ inye aka.

Lee kwa Reyna I. Aburto, “Ili Enweghị Mmerị Ọbụla,” Liahona, Me 2021, 85–87; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist,” “Mbilite n’ọnwụ,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

Jizọs Kraịst kwụrụ ụgwọ kachasị ibe ya maka nzọpụta m.

Kedụ ihe ị na-amụta site na amaokwu ndị sotere banyere ụgwọ Jizọs Kraịst kwụrụ maka nzọpụta gị: Aịzaya 53:3–5; Mozaya 3:7; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:16–19? Kedụ ụgwọ Nna nke Eluigwe kwụrụ? (lee Jọn 3:16).

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Jizọs Kraịst tara ahụhụ ma nwụọ maka m.

  • Izu ụka nke Ista bụ oge dị mma iji kuziere ụmụ gị banyere ihe Onye Nzọpụta meere anyị niime Getsemani na n’elu obe. I nwere ike bido site na-igosi ha foto niile n’okpuru ma na-ikwe ha kwuo okwu banyere ihe na-eme na foto ndị ahụ. Mgbe ụmụ gị na-ele anya na foto niile, i nwere ike gụọ amaokwu niile na-akọwa ihe omume ndị a (lee Matiu 26:36–46; 27:35–50; Luk 22:39–46; Jọn 19:16–30). Ụmụ gị nwere ike chọpụta nkọwa ndị dị niime foto niile ha na-anụ niime amaokwu ndị ahụ.

oyiyi abụọ nke Jizọs nʻebe Getsemani na n’elu obe etikọra ọnụ

N’aka ekpe: Kraịst niime Getsemane, site n’aka Harry Anderson. N’aka nri: Mkpọgbu n’obe, site n’aka Harry Andersen

  • Kedụ otu esi gọzie anyị niihi aja nke Jizọs chụrụ maka anyị? Nyere ụmụ gị aka chọọ maka mkpụrụokwu niile na nkebiokwu niile na-aza ajụjụ nke a niime Aịzaya 53:4–12; Alma 7:11–13; na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:16–19. Kesaara onye n’ibe ya otu o si emetụta gị banyere Onye Nzọpụta mgbe ị gụsịrị akwụkwọ nsọ ndị a.

Jizọs Kraịst bilitere n’ọnwụ niihi m.

  • I nwere ike jiri ihe omume nke izu ụka nke a ma ọ bụ foto ndị ọzọ dị niime ndepụta nke a iji kọọrọ ụmụ gị akụkọ nke Mbilite n’ọnwụ (lee kwa “Jizọs E Bilitewo,” niime Akụkọ Agba Ochie niile, 139-44). Mgbe ahụ kwe ụmụ gị kọghachiri gị akụkọ ahụ.

  • Tulee otu i ga-esi enyere ụmụ gị aka chọta ọńụ niime Kraịst na Ista nke a. Ịma atụ, unu nwere ike gụkọta otu abụ Ista masịrị, dị ka “Kraịst Onyenwe anyị E Bilitewo Taa” (Abụ, no. 200) ma ọ bụ “Getsemanị” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Ịchọta egwu ndị ọzọ banyere Mbilite n’ọnwụ, i nwere ike chọọ na index nke Abụ na Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị. Gị na ụmụ gị nwere ike kesaara ibe unu ihe mere egwu ndị a ji amasị gị na otu o si emetụta gị mgbe ị na-agụ ha. Gịnị mere egwu ndị a si akuziri anyị banyere Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst?

Ụmụntakịrị nwere ike nwete mmetụta Mmụọ mana nwere ike nwee mkpa ịmata ike mmetụta Ya. “Kuziere ụmụntakịrị banyere ụzọ ndị dị iche iche Mmụọ si ekwuru anyị. Nyere ha aka mata olu Ya dị ka Ọ na-agwa ha okwu. Nke a ga-enyere ha aka mụta agwa nke ịchọ na ime ihe na mkpughe nke onwe oge ndụ ha niile” (Ikuzi ihe n’Ụzọ nke Onye nzọpụta, 32). Ịma atụ, dị ka ị na-agụ egwu niile banyere Onye Nzọpụta gị na ụmụ gị, lee anya na foto niile maka Ya, ma ọ bụ gụọ akụkọ niile banyere Ya, kesaara ibe unu mmetụta ime mmụọ niile unu nwetere.

  • Ọba akwụkwọ Ozi ọma nwere nchịkọta nke vidiyo niile nke Ista nke ụmụ gị nwere ike inwe ọn̄ụ na ya. Ikekwe i nwere ike kwe ha ịhọrọ otu ile. Jụọ ha ihe ha mụrụ banyere Jizọs Kraịst site na vidiyo ahụ. I nwekwara ike rịọ ha ịchịkọta ozi nke vidiyo ahụ n’otu ahịrịokwu.

Ndị amụma na-agba ama nke Jịzọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya.

  • Dị ka gị na ụmụ gị na-elekọ ọgbakọ zuru ọha ọnụ na Ista nke a, nyere ha aka mata mgbe ndị aka ebe pụrụ iche nke Onye Nzọpụta na-agba ama nke Mbilite n’ọnwụ. Elemanya i nwere ike mepụta otu egwuregwu nke ya—kpọkuo ha iguzoro oge ọbụla ha nụrụ mkpụrụokwu dị ka Ista ma ọ bụ Aja mgbaghara mmehie ma ọ bụ Mbilite n’ọnwụ. Kesaara ibe unu ihe mere i jiri nwee obi ekele maka ama nke ndị amụma dị ndụ maka Onye Nzọpụta.

Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.

agba etere nke Jizọs mgbe Mbilite n’ọnwụ gasịrị

Niihi Ebumnuche Nke a, site n’aka Youngsung Kim. Oyiyi nke a si nʻaka havenlight.com

Ihuakwụkwọ ihe omume Praịmarị: Jizọs bilitere n’ọnwụ niihi m