“Jun 15–21. ‘Agha Ahụ Bụ nke Onyenwe anyị”: 1 Samuel 17–18; 24–26; 2 Samuel 5–7,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Jun 15–21. ‘Agha Ahụ Bụ nke Onyenwe anyị’,” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Devid na Golayat, site nʻaka Steve Nethercott
Jun 15–21: “Agha Ahụ Bụ nke Onyenwe anyị”
1 Samuel 17–18; 24–26; 2 Samuel 5–7
Kemgberịị ebo niile nke Izrel binyeworo nʻala ahụ e kwere na nkwa, ndị Filipaị anọworịị bụrụ ihe iyi egwu nye nchekwa ha. Onyenwe anyị anapụtawo ha ọtụtụ mgbe n’oge gara aga, mana ugbua ndị okenye nke Izrel na-asị, “Anyị ga-enwe eze … [ga]-aga anyị niihu ma lụọ agha anyị niile” (1 Samuel 8:19–20). Ya mere e tere Sọl mmanụ. Ma ya mere mgbe nnukwu mmadụ ahụ Golayat na-atụ egwu bubara ịma aka ya ruo n’otu ndị agha dị iche iche nke Izrel, Sọl—dị ka otu ndị agha ya fọdụrụ—naara atụ “oke egwu” (1 Samuel 17:11). Otu ụbọchị, ọ bụghị eze Sọl bụ onye zọpụtara Izrel mana nwantakịrị nwoke dị umeala a na-akpọ Devid, onye na-eyighị ngwa nchekwa mana yiri okwukwe niime Onyenwe anyị nke ihe enweghị ike idupu. Agha nke a gosịrị Izrel, na onye ọbụla onye nwere agha ime mmụọ niile ịlụ, na “Onyenwe anyị anaghị eji mma agha na ube azọpụta” ma na “agha ahụ bụ nke Onyenwe anyị” (1 Samuel 17:47).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
1 Samuel 17
Site na enyemaka nke Onyenwe anyị, e nwere m ike imeri aka mgba ọbụla.
Akụkọ Devid na Golayat bụ otu niime akụkọ ndị a maara ama niime akwụkwọ nsọ. Nʻezie, anyị na-elekwasịkarị anya na Devid. Mana oge nke a, dị ka ị na-amụ 1 Samuel 17, tụleekwa okwu nke ndị ọzọ niime isi nke a (lee ndepụta dị nʻokpuru). Kedụ ihe ị na-amụta banyere ha na ebumnuuche ha? Kedụ ihe ị na-amụta banyere Devid? Kedụ otu o siri dị iche?
-
Golayat: amaokwu ndịa 8–10, 43–44
-
Eliab: amaokwu 28
-
Sọl: amaokwu 33
-
Devid: amaokwu ndịa 26, 32, 34–37, 39, 45–47
Akụkọ gị, agbanyeghị amachaghị ya nke ọma dị ka nke Devid, nʻezie ga-agụnye aka mgba ndị ha ka Golayat imeri na ohere niile iji nwee okwukwe niime Onyenwe anyị. Gịnị ka ọmụmaatụ nke Devid kuziiri gị banyere ịgabiga mkpagbu dị niime akụkọ gị? I nwekwara ike gụọ ozi nke Onyeisi Camille N. Johnson “Kpọkuo Kraịst ka O Duo Akụkọ Gị” (Liahona, Nov. 2021, 80–82) buru otu niime aka mgba gị niile nʻuche. Chọọ azịza niile nye ajụjụ niile dị ka ndị a: Kedụ otu Onyenwe anyị si na-achọ m ịhụta aka mgba m niile? Kedụ otu O siworo nyere m aka nʻoge gara aga? Kedụ otu m ga-esi egosi na m tụkwasịrị obi na Ya ide akụkọ m?
E nwere ike i maraworịị na enwere isiokwu dị mwute ole ma ole nʻebe ngwụcha akụkọ nke Devid (lee, ịma atụ, 2 Samuel 11). Ọ bụrụ na i nwere ohere inye Devid ndụmọdụ mgbe agha ya na Golayat gasịrị, gịnị ka ị ga-ekwu? Kedụ otu ndụmọdụ nke a si emetụta ndụ gị?
Lee kwa “Onyenwe anyị Ga-anapụta M” (vidiyo), Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.
The Lord Will Deliver Me
1 Samuel 17:26–50
Otu onye nwere okwukwe niime Kraịst nwere ike ime ihe dị iche.
Na mgbakwunye nye aka mgba nke onwe niile, anyị nakwa ezute nsogbu ndị dị ukwuu, dị mgbagwoju anya na-emetụta ụwa dum. Mgbe ike niile nke ekwensu na-agbakọta ọnụ ịlụ agha megide ike niile nke ihe ọma (1 Samuel 17:1), anyị nwere ike tụgharịa uche otu mgbalị nke onwe anyị nwere ike ime ihe dị iche. Kedụ ihe ị na-ahụ niime akụkọ nke Devid na-enye gị olile anya?
Lee kwa “Ka Anyị Niile Gaaniihu,” Abụ, no. 243.
Ezigbo Enyi na Nsọpụrụ nke Onwe, site nʻaka Wilson Ong (nkọwa)
1 Samuel 18
“Jonathan hụrụ [Devid] naanya dị ka mkpụrụ obi nke onwe ya.”
Dị ka ị na-agụ 1 Samuel 18, tụgharịa uche igosi ndịiche nʻetiti Sọl na nwa ya nwoke Jonathan (onye, ọ bụrụ ma ọbụghị maka Devid, nwere ike chewo na ọ ga-abụ eze na-esote). Kedụ otu Sọl na Jonathan siri akpasị ọganiihu nke Devid agwa? Kedụ ihe i nwere ike ịmụta site na nhụmiihe nke a?
Kedụ ihe ị na-ahụta niime akparam agwa niile na omume niile nke Jonathan na-echetere gị maka Jizọs Kraịst?
“Tụnyere onwe gị akwụkwọ nsọ” (1 Nifaị 19:23). Akwụkwọ nsọ na-ewete nnukwu ohere niile iji mụta site na mkpali niile na omume nke ndị mmadụ dị ka Devid, Jonathan, na Sọl. Ị ga-amata na ọ dịghị onye dị niime akwụkwọ nsọ na-enweghị ntụpọ. Ya mere dị ka ị na-agụ, iji maatụ, banyere nhọrọ niile nke Devid kwesịrị ntụkwasị obi, dị njikere ịmụtakwa ihe site na mmejọ ya niile. Ime otu ahụ nwere ike inyere anyị aka chọpụta adịghị ike niile dị niime onwe anyị ma “mụọtakwuo ịma ihe karịa [ndị ọzọ] mawooro” (Mọmọn 9:31).
1 Samuel 24–26
Mgbaghara bụ ezigbo ụzọ ruo udo na ọgwụgwọ.
Niime 1 Samuel 24–26, chọọ maka ihe mmụta ndị banyere mpako, mgbaghara, na njide onwe onye. I nwekwara ike tụlee ịgụ ozi nke Okenye Mark A. Bragg “Nchekube yiri nke Kraịst” dị ka akụkụ nke ọmụmụ ihe gị (Liahona, Me 2023, 60-63). Kedụ otu Devid, Abigail, na ndị ọzọ si egosipụta—ma ọ bụ daa igosipụta—nchekwube yiri nke Kraịst nʻisi ndị a? Kedụ ohere ndị ị nwere ike iji gosi nchekwube yiri nke Kraịst?
Ozi Nwanne nwanyị Kristen Yee “Ịma mma maka Ntụ: Ụzọ Ọgwụgwọ nke Mgbaghara” (Liahona, Nov. 2022, 36–39) nwere ike nyere gị aka mụọ 1 Samuel 25. Kedụ otu Abigail si dịrị ka Jizọs Kraịst?
2 Samuel 5:17–25
Onyenwe anyị pụrụ inye m nduzi.
Ọbụna mgbe Devid merisịrị Golayat, nsogbu ya niile ya na ndị Filipaị agwụbeghị. Dị ka ị na-agụ 2 Samuel 5:17–25, tụlee otu ọmụmaatụ nke Devid nwere ike iji nyere gị aka nʻịma aka ndị ị na-ezute (lee kwa 1 Samuel 23:2, 10–11; 30:8; 2 Samuel 2:1). Kedụ otu esiworo gọzie gị site na ime ihe na mkpughe ị nataworo?
2 Samuel 7
Gịnị bụ “ụlọ” ahụ nke Onyenwe anyị kwere nkwa nye Devid?
Mgbe Devid kwuru iwu ụlọ, nke pụtara tempụl, maka Onyenwe anyị (lee 2 Samuel 7:1-3), Onyenwe anyị zara na nwa nwoke nke Devid ga-ewu ya (lee verses 12–15; lee kwa 1 Ihe e mere 17:1–15). Onyenwe anyị kwukwara na Ya otu aka ahụ ga-ewuru Devid “ụlọ” nke pụtara ụmụ ụmụ, ma na ocheeze ya ga-anọgide ruo ebighị ebi (lee 2 Samuel 7:11, 16, 25–29; Abụ ọma 89:3–4, 35–37). Nkwa nke a ka emezuru niime Jizọs Kraịst, Eze Ebighị ebi anyị, onye bụ onye agbụrụ nke Devid (lee Matiu 1:1; Luk 1:32–33; Jọn 18:33–37).
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
1 Samuel 17:20–54
Okwukwe niime Jizọs Kraịst nwere ike inyere m aka nwee mgbam ume.
-
I nwere ike na-achọ iji “Devid na Golayat” niime Akụkọ niile nke Agba Ochie, 112-16, ji nyere ụmụ gị aka mara nke ọma ihe mere niime 1 Samuel 17:20-54. Mgbe ahụ i nwere ike kwe ha ịkọgharị akụkọ ahụ jiri foto niile ma ọ bụ eserese ahịrị dị niime ndepụta nke a. Jụọ ha ihe ha chere Onyenwe anyị na-achọ ka ha mụta site nʻakụkọ nke a.
2:36David and Goliath
-
Gị na ụmụ gị nwekwara ike depụta ụfọdụ aka mgba ndị siri ezigbo ike ha nwere ike izute nʻoge ndụ ha. Emesịa nyere ha aka chọta ihe ndị Devid kwuru nwere ike nyere ha aka na aka mgba ndị a (lee 1 Samuel 17:26, 32, 34–37, 45–47). Kesaa otu Jizọs Kraịst siworo nyere gị aka nʻoge aka mgba niile.
-
Ụmụ gị nwere ike zọrọ ije dị ka na ha bụ Devid na-aga ịlụso Golayat ọgụ mgbe ha na-agụ otu egwu banyere inwe obisike, dị ka “Aga m Agbasịike” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 162).
1 Samuel 18:1–4
Ezigbo ndị enyi nwere ike ịbụ ngọzi sitere nʻaka Chineke.
-
Kedụ otu i nwere ike i si nyere ụmụ gị aka mụta ihe site na ịbụ enyi nke Jonathan na Devid? Otu ụzọ ga-abụ inye nwa nke ọbụla Akwụkwọ Ukweọ ejiri kpụọ obi, otu iji nọchite Devid ma nke ọzọ iji nọchite Jonathan. Mgbe ahụ gụkọta nkebiokwu ole ma ole sitere na 1 Samuel 18:1–4 nke na-ekwusike ịhụnaanya enyi abụọ ndị a nwere maka ibe ha. Ụmụ gị nweziri ike dee ma ọ bụ see nʻelu akwụkwọ obi ha otu ha nwere ike i si egosi otu enyi ha ịhụnaanya.
2 Samuel 5:19, 23
Ọ bụrụ ma m chọọ odudu, e nwere m ike ịrịọ Nna nke Eluigwe.
-
Niime isiokwu ndị a, Devid ghọrọ eze nke Izrel. O nwere ike bụrụ ihe ọn̄ụ nye ụmụ gị ime ka aga asị na ha bụ eze ma ọ bụ eze nwanyị. Kedụ iwu ndị ha nwere ike ime? Kedụ ebe ha ga-aga maka enyemaka? Nyere ụmụ gị aka chọpụta na mgbe Devid chọrọ enyem aka, o “rịọrọ,” ma ọ bụ kpee ekpere, maka azịza niile. Ịma atụ, dị ka ị na-agụ 2 Samuel 5:19, 23, kpọkuo umụ gị ige ntị maka mkpụrụ okwu ahụ “rịọrọ” na ịfụkọ ogweaka ha mgbe ha nụrụ ya. Gịnị mere Devid ga-eji chọọ enyemaka nke Onyenwe anyị n’ọrụ ọhụrụ ya?
-
Gwa ibe unu banyere oge niile mgbe i kpere ekpere maka enyemaka nke Nna nke Eluigwe. Kedụ ndịiche o mere na inwere Ya ịnyere gị aka?
2 Samuel 7:16–17
Jizọs Kraịst bụ Eze Ebighị ebi m.
-
Ndị eze anyị gụrụ banyere ha niime Agba Ochie ha niile nwere ntụpọ, ma alaeze ha niile bibiri ebibi. Mana Jizọs Kraist bụ eze zuru oke ma ga-achị ruo mgbe ebighị ebi. I nwere ike nyere ụmụ gị aka chọpụta nke a site na-ịgụkọta ọnụ ihe onye amụma Nathan gwara Eze Devid niime 2 Samuel 7:16–17. Kedụ otu alaeze nke Devid si abịa na ngwụcha? Nyere ụmụ gị aka chọta ma gụọ edereede akwụkwọ nsọ nke na-akuzi na Jizọs Kraist, onye agbụrụ Devid bụ Eze anyị, dị ka Luk 1:32–33; Jọn 18:33–37; na Mkpughe 19:16. Kedụ otu Jizọs si dịrị iche site na eze niile nke ụwa? Kedụ otu anyị na-esi asọpụrụ Jizọs Kraist dị ka Eze Ebighị ebi anyị?
Maka ihe ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.