Ọgọst 31–Septemba 6. ‘Ka Ihe Niile Na-eku Ume Too Onyenwe anyị’: Abụ ọma 102–103; 110–119; 127–128; 135–139; 146–150,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
Ọgọst 31–Septemba 6. ‘Ka Ihe Niile Na-eku Ume Too Onyenwe anyị,’” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Nlọghachi Dị Nsọpụrụ, site n’aka Kelsy na Jesse Lightweave
Ọgọst 31–Septemba 6: “Ka Ihe Niile Na-eku Ume Too Onyenwe anyị”
Abụ ọma 102–103; 110; 116–119; 127–128; 135–139; 146–150
Aha odịnala Ndị Ju maka akwụkwọ Abụ ọma bụ Tehillim, okwu ndị Hibru nke pụtara “otuto.” O yiri ka esi eti mkpu hallelujah (nke pụtara “toonụ Jehova” ma ọ bụ “toonụ Onyenwe anyị”). Ọ bụrụ na ịnwere ohere ịhọrọ otu mkpụrụokwu ga-achịkọta isi ozi nke Abụ ọma, otuto ga-abụ ezi nhọrọ. Ụfọdụ abụ ọma nwere niime ha mkpọku bụ dam inye “Onyenwe anyị otuto” (lee kacha nke Abụ ọma 146–50), ma ha niile na-akpali ife ofufe na inye otuto. Abụ ọma na-akpọku anyị ịnakwere ike nke Onyenwe anyị, ebere Ya, na ihe ndị dị ukwuu nke O meworo. Anyị agaghị ma ọlị akwụghachinwu Ya ụgwọ maka ihe ọbụla niime nke a, mana anyị nwere ike ito Ya. Otuto ahụ nwere ike dịrị nʻụdi dị iche iche maka ndị dị iche iche–ọ nwere ike ịgụnye ịbụ abụ, ịkpe ekpere, ma ọ bụ ịgba ama. Ọ na-edubakarị na mkpebi dị omimi nʻebe Onyenwe anyị nọ na isoro nkuzi Ya niile. Ihe ọbụla “toonụ Onyenwe anyị” pụtara na niime ndụ gị, ịnwere ike chọta mkpate mmụọ ịme ya dị ka ị na-agụ ma na-atule Abụ ọma.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Abụ ọma 102–3; 116
Onyenwe anyị pụrụ ịkasi m obi nʻoge ntaram ahụhụ m.
Hụba ama otu Abụ ọma 102:1–11 si akọwa mmetụta niile nke nchegbu na mmadụ ịnọ naanị ya nke na-abịakarị mgbe enwere ihe ndị ịma aka. Ikekwe gị ma ọ bụ ndị ọzọ ị maara enwewo nhụmịhe ụdị mmetụta ahụ. Dị ka ị na-agụ Abụ ọma 102:12–28; 103; 116, chọọ nkebiokwu ndị na-enye gị obisike iji “kpọkuo aha Onyenwe anyị” nʻoge mnwale gị niile (Abụ ọma 116:13). Ọ nwere ike masị gị ịīnye akara, buo nʻisi, ma ọ bụ kesara ndị ọzọ nkebiokwu ndị na-enye gị olileanya na Ya.
Lee kwa Aịzaya 25:8; Ndị Hibru 2:17–18; Alma 7:11–13; Camille N. Johnson, “Kraịst Bụ Enyemaka,” Liahona, Me 2023, 81–83; “Kedụ Ebe M Ga-Ele Anya Maka Udo?” (Abụ niile, no. 129).
Carl Heinrich Bloch (1834–1890), Kraịst Na-agwọ Onye Ọrịa n’ebe Betesda,1883, mmanụ n’elu canvas, 100 ¾ x 125 ½ inches. Mbarị Nkaọkpụ nke Mahadum Brigham Young, azụrụ jiri ego ndị Jack R. Na Meri Lois Wheatley wetere, 2001.
Abụ ọma 110; 118
Jizọs Kraist mezuru amụma niile sitere na Abụ ọma.
Abụ ọma ahụ nwere ọtụtụ ederede na-arụtụ aka na ndụ na ije ozi nke Jizọs Kraịst. N’ebe a bụ ọmụmatụ ole ma ole:
-
Abụ ọma 110:1–4 (lee Matiu 22:41–45; Ndị Hibru 5:4–10; 6:20)
-
Abụ ọma 118:22 (lee Matiu 21:42; Ọrụ 4:10–11; 1 Pita 2:7)
-
Abụ ọma 118:25–26 (lee Matiu 21:9)
Kedụ ihe amaokwu ndị a na-akuziri gị banyere Jizọs Kraịst? Gịnị mere o ji dị mkpa imata nke a banyere Ya?
Abụ ọma 119
Okwu nke Chineke ga-edebe m nʻụzọ Ya.
Abụ ọma 119 nwere ọtụtụ nkebiokwu ndị na-atụnyere ndụ anyị na njem ịlaghachikwuru Nna nke Eluigwe. Dị ka ị na-agụ, chọọ maka mkpụrụokwu ndị dị ka “jee ije,” “ụzọ,” “okporo ụzọ,” “ụkwụ,” na “wagharịa.” Tulee njem ndụ nke onwe gị—ebe ị gaworo, ebe ị nọ ugbua, na ebe ị na-aga. Kedụ ihe ị na-amụta site na abụ ọma nke a banyere gị ịlaghachi ebe obibi? Gịnị ka ị mụtaworo site na-ileanya nʻụzọ nke ndị ọzọ? Dị ka abụ ọma nke a kwuru, gịnị ka Chineke weteworo iji nyere gị aka nọrọ n’ụzọ Ya?
Chee maka otu oge mgbe isoro otu ụzọ ma ọ bụ otu map nyeere gị aka mee njem ruo ebe ọzo nʻudo. Gịnị ka nhụmiihe ahụ na-akuziri gị banyere isoro ụzọ nke Chineke?
N’ọtụtu akwụkwọ nsọ ndị ọzọ, Onyenwe anyị na Ndị amụma Ya na-ekwu maka otu ụzọ. N’ebe a bụ omụmatụ ole ma ole. Tulee ịchọgharị amaokwu ndị a na idedata ma ọ bụ kesara ndị ọzọ ihe ịmutara.
|
Akwụkwọ nsọ |
Ihe m na-amụta banyere ụzọ ahụ eji erute Chineke |
|---|---|
Akwụkwọ nsọ Ilu 04:11–19 | |
Akwụkwọ nsọ Matiu 7:13–14 | |
Akwụkwọ nsọ | |
Akwụkwọ nsọ | |
Akwụkwọ nsọ | |
Akwụkwọ nsọ |
Kedụ otù eziokwu ndị a si enyere gị aka nọgide nʻụzọ nke Chineke?
Olee nghọta ndị agbakwụnyere ịnwere ike ịmụta sitere na ndụmọdụ nke a si nʻaka Onyeisi Russell M. Nelson?
“Ọ bụrụ na njem nke oge ndụ anyị ga-eme nke ọma, anyị kwesịrị isoro odudu si nʻigwe. Onyenwe anyị sịrị, ʻLekwasịnụ m anya n’echiche ọbụla; enwela obi abụọ, atụla egwuʻ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:36]. Ma Onye ode Abụ ọma dere ʻOkwu gị bụ oriọna nye ụkwụ m, na ihè nye ụzọ ụkwụ mʻ [Abụ ọma 119:105]. …
“Nime njem ndụ gị, ị ga-ezute ọtutụ ihe mgbochi ma ị ga-eme ụfọdụ njehie. Odudu si na akwukwọ nsọ na-enyere gị aka ịmata mperi ma mee mgbazi dabara adaba. Ị na-akwụsị ị ga nʻụzọ ahụ nʻezighi ezi. Ị ga-akpachara anya mụọ maapụ okporo ụzọ akwụkwọ Nsọ. Emesịa ị ga-aganiihu ime nchegharị na nkwụghachi achọrọ iji banye “ụzọ nke dị gịrịgịrị ma dịkwa mkpafa nke na eduba na ndụ ebighị ebiʻ [2 Nifaị 31:18]” (“Ibi ndụ Site na Odudu nke Akwụkwọ nsọ,” Ensign, Nov. 2000, 17).
Lee kwa Dieter F. Uchtdorf, “Nwa Mmefu ahụ na Ụzo ahụ Nke Na-eduru nʻEbe obibi,” Liahona, Nov. 2023, 86–88.
Abụ ọma 134–36
Onyenwe anyị dị ike karịa arụsị ọbụla.
Hụba ama ihe mere, dị ka Abụ ọma 135:15–18kwuru, o ji bụrụ nzuzu ịtụkwasị obi na chi ụgha niile. Kedụ ihe enwere ike iji nwaa gị ka ịtụkwasị obi na ihe yiri arụsị? Ị nwere ike depụta ihe ndị Onyenwe anyị nwere ike ime, dị ka otu ndị ode abụ ọma mere nime Abụ ọma 134–36. Kedụ ihe ndị dị ike O meworo gị?
Abụ ọma 139
Onyenwe anyị maara obi m.
Kedụ ihe ndị ị chọtara niime Abụ ọma 139 na-enyere gị aka ghọta na Onyenwe anyị mara maka gị—echiche na omume gị niile, ume na adịghị ike gị niile? Kedụ otu eziokwu nke a si emetụta ndụ gị na nhọrọ gị niile?
Abụ ọma 146–50
“Toonụ Onyenwe anyị.”
Dị ka ị na-agụ abụ ọma ikpeazụ nke otuto ndị a, chee maka ịhe kpatara ịkwesịrị iji too Onyenwe anyị. Gịnị mere o jiri dị mkpa ito Ya? Kedụ ụfọdụ ụzọ ndị ị nwere ike i ji too Ya?
Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Abụ ọma 102:1–2
Onyenwe anyị na-akasị m obi ma na-enye m olileanya.
-
Gị ma ọ bụ otu niime ụmụ gị nwere ike gụọ Abụ ọma 102:1–2, na-achọ otu Onyenwe anyị ji nyere anyị aka nʻoge ihe isiike anyị. Kedụ otu anyị nwere ike iji chọta enyemaka Ya? I nwekwara ike kesaara ibe unu oge niile ahụ mgbe ịchọsiri enyemaka ike ma nwee mmetụta na Chineke nụrụ ekpere gị.
Abụ ọma 119:105
Okwu Chineke dị ka ihè.
-
Ụmụ gị nwere ike nwee mmasị na-ikwu banyere otu ọ dị ka ya ịnọ niime ebe gbara ọchịchịrị. Ma ọ bụ ha nwere ike kparịta ụka ihe ndị rara ahụ ịme niime ebe gbara ọchịchịrị. Ị nwere ike kpọkuo ha ịme otu ihe mgbe ha mechiri anya ha, ihe dị ka ise ihe osise. Kedụ ihe anyị na-amụta site na Abụ ọma 119–105 banyere ihè na okwu nke Chineke?
-
Chọọ otu ihe Nna nke Eluigwe nyeworo anyị iji nyere anyị aka nọrọ nʻụzo Ya niime amaokwu ndị na-esote: Abụ ọma 119:47–48; 119:105; 1 Nifaị 11:25; 2 Nifaị 31:20. Kedụ ihe anyị nwere ike ime iji nọrọ nʻụzọ nke Chineke?
-
Ọ nwere ike masị ụmụ gị ịle foto maka ihe niile ekwuru niime Abụ ọma 119:105. Ha nwere ike hazie foto niile ahụ nʻusoro dị ka ha na-agụ amaokwu ahụ. Unu nwekwara ike kwekọrịta ukwe ọnụ nke yiri ya, ụdị dị ka “Kuziere M Ije ije Nʻihè ahụ” (Akwụkwọ Ukwe nke Ụmụntakịrị, 177) ma ọ bụ ““Aga M Eje ije Mụ na Jizọs” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma).
Abụ ọma 139:1–3, 23–24
Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst mara m ma hụ m naanya.
-
Tulee idepụta nkenke ihe ndị ị maara banyere nke ọbụla niime ụmụ gị. Dị ka ị na-agụpụta ndepụta ahụ wayọ wayọ, gwa ụmụ gị ka ha chee onye ị na-akọwa. Emesịa, mgbe unu gụsịkọtara Abụ ọma 139:1–3 ọnụ, ịnwere ike depụta ihe ndị Nna nke Eluigwe na Jizọs maara banyere anyị.
-
Depụta okwu ndị nke Abụ ọma 139:23–24 nʻelu mpempe akwụkwọ ma ọ bụ na bọọdụ. Kpọkuo ụmụ gị ikanye ahịri nʻokpuru okwu na-akọwa ihe ndị Chineke nwere ike ịmere anyị. Gịnị mere anyị ga-eji achọ ka Chineke mee ihe ndị a?
Abụ ọma 146:1, 5–9
Enwere m ike ito Onyenwe anyị.
-
Ikekwe ụmụ gị nwere ike kesaa nhụmiihe ha maka mgbe otuonye toro ha ma ọ bụ gwa ha na ha rụrụ ọrụ dị mma. Kesaa ụfọdụ ihe ndị dị mma sitere na Abụ ọma146:6–9 nke Onyenwe anyị meworo (nyere ụmụ gị aka ghọta okwu ndị a na-amachaghị ama). Kpọkuo ụmụ gị ikwu banyere ihe ndị ọzọ O meworo maka anyị. Kedu otu anyi nwere ike isi too Ya maka ihe ndị ahụ?
Mụta nʻebe obibi; kesara ndị ọzọ. Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo na ebe obibi kwesịrị ịbụ “isi ebe ọmụmụ ihe nke ozi ọma.” (“Ị Bụ Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a Eji Amaatụ,” Liahona, Nov. 2018, 13). Gịnị ka i nwere ike ime nʻizu ụka nke a iji mee ka ọmụmụ Abụ ọma nke onwe ma ọ bụ nke ezi na ụlọ dikwuo omimi? Mgbe ịmụsiworo, tulee ịkesara ndị ọzọ ịhe ịmụtara na mmetụta ịnwere. Ịnwere ike mee ka nʻoge mkparịta ụka, site nʻedereede ahọọrọ ma ọ bụ soshial midiya, ma ọ bụ na nzukọ nsọ.
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .