“Septemba 14–20. ‘Chineke bụ Nzọpụta M’: Aịzaya 1-12,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)
“Septemba 14–20. ‘Chineke bụ Nzọpụta M,ʻ” Bịanụ, Soro M: Agba Ochie 2026
Onye amụma Aịzaya Buru amụma Ọmụmụ nke Kraịst, site n’aka Harry Anderson
Septemba 14–20: “Chineke bụ Nzọpụta M”
Aịzaya 1–12
Ọbụrụgodi na ugbua bụ mgbe mbụ ị na-agụ akwụkwọ nke Aịzaya, ịnwere ike ịhụ edereede ndị na-ada ka ihe ịnuworo na mbụ. Nke ahụ bi niihi na abịa niime ndị amụma nke Agba Ochie niile, Aịzaya bụ otu niime onye akacha n̄omie nʻakwụkwọ ndị ọzọ nke akwụkwọ nsọ, gụnyekwa site na Onye Nzọpụta Nʻonwe Ya. Okwu niile nke Aịzaya na-apụtakarị ugboro ugboro niime abụ na egwu ndị ọzọ dị nsọ.
Kedụ ihe kpatara eji en̄omikarị Aịzaya? Nʻezie otu ihe mere bụ na Aịzaya nwere onyinye maka ikwuputa okwu Chineke nʻụzo doro anya ma nʻasụsu na-enweghi nchefu. Mana ọ karịrị ihe ahụ. Aịzaya akpalitewo ọtụtụ ndị amụma ruo ọtụtụ ndudugandu nihi na eziokwu ndị ọ kụziri gafere ndudugandu nke ya (na-agbata 740 ruo na 701 Tupu Amụọ Kraịst). Ọ dere maka nnukwu ọrụ mgbapụta nke Chineke nke karịrị otu mba ma ọ bụ otu oge. Site na Aịzaya, Nifaị mụtara na ya na ndị ya, nagbanyeghi na ha ekewawo site na Izrel ndị ọzọ, ka bụkwa akụkụ nke ndị ọgbụgba ndụ nke Chineke. Na Aịzaya, ndị odee Agba Ọhụrụ chọtara amụma ndị gbasara Mezaya ahụ nke emezuru nihu anya ha. Ma niime Aịzaya, Josef Smith chọtara mkpatemmụọ maka ọrụ ụbọchị ikpeazụ nke ịkpọkọta Izrel na iwulite Zayọn. Mgbe ị na-agụ Aịzaya, kedụ ihe ndị ị ga-achọta?
Maka ihe ndị ọzọ banyere Aịzaya na ihe odide ya, lee “Aịzaya” niime Ọkọwa okwu Baịbụl. Maka ozi ndị ọzọ banyere oge mgbe Aịzaya nọ ndụ, lee 2 Ndị Eze15–20 na Ihe e mere 26–32.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Aịzaya 1–12
Okwu niile nke Aịzaya ka a ga-emezurịrị.
Onye Nzọpụta kuziri na “ihe nile nke o kwuru adịwo ma ga-adị, ọbụna dịka okwu nile nke o kwuru siri dị” (3 Nifaị 23:3). Dị ka ị na-agụ akwụkwọ nke Aịzaya, tulee i depụta chaatị nke amụma niile jiri isiokwu dị ka ndị a: ụbọchị ndụ nke Aịzaya, Ozi anụ ahụ nke Onye Nzọpụta, na Ụbọchi ikpeazụ ndị a. Hụba ama na ọtụtụ amụma nke Aịzaya ka emezuru karịa nʻotu ụzọ (lee Ọkọwa okwu Baịbụl, “Aịzaya”)
Onyeisi Dallin H. Oaks kuziri: “Akwụkwọ nke Aịzaya juputara na ọtụtụ amụma nke yiri ka ọ nwere mmezu dị ọtụtụ. Otu niime ha dị nnọọ ka ọ gbasara ndi ụbọchị nke Aịzaya ma ọ bụ ọnọdụ niile nke ndudugandu na-esote. Ihe nkọwa nke ọzọ, ọtụtụ mgbe na-egosị ọdịmara, yiri ka ọ na-arụtụ aka na ihe ndị mere nʻetiti oge, mgbe ebibiri Jerusalem ma achụsasịa ndị ya mgbe akpọgbusịrị Ọkpara nke Chineke nʻobe. Rute ugbua nkọwa ọzọ ma ọ bụ mmezu nke otu amụma ahụ yiri ka ọ metụtara ihe omume niile so Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta. Eziokwu na ọtụtụ niime amụma ndị a nwere ike inwe ọtụtụ nkọwa na-egosi mkpa ọ dị anyị ịchọ mkpughe sitere na Mmụọ Nsọ iji nyere anyị aka tapịa ha” (“Ọgụgu Akwụkwọ nsọ na Mkpughe,” Ensign, Jan. 1995, 8).
Ịghọta Aịzaya Onye Nzọpụta kwuru, “Chosie ihe ndị a ike; niihi na ịdị ukwuu ka okwu niile nke Aịzaya dị” (3 Nifaị 23:1; lee kwa amaokwu ndịa 2–3). Otu ọ dị nye ọtụtụ ndị, Aịzaya nwere ike raa ahụ ịghọta. Nchepụta ndị a na-esote nwere ike ịnye aka:
-
Tulee ọdịmara niile na mbụrụ niile Aịzaya jiri.
-
Jụọ onwe gị, “Kedụ ihe m na-amụta banyere Jizọs Kraịst?” (lee 1 Nifaị 19:23).
-
Chọọ isiokwu nille nke dịrị ka ọ dị mkpa nʻoge anyị.
-
Jiri enyemaka niile nke ọmụmụ ịhe, dị ka nkọwa okwu, ihe odide ala ala peeji, nkọwada isi isiokwu niile, na Odudu nye Akwụkwọ nsọ niile.
Aịzaya 1; 3–5
Ndị amụma na-adọ aka na ntị banyere mmehie ma na-ekwe nkwa olileanya site na nchegharị.
Dị ka ndị amụma oge niile, Aịzaya esepụghị aka na-ịdọ ndị mmadụ aka na ntị banyere ọnọdụ ime mmụọ ha. Dị ka ị na-agụ Aịzaya 1; 3; 5, lee anya maka nkebiokwu ndị na-akọwa otu ndụ nke ime mmụọ ndị mmadụ si wee dị (lee, na-ịmatụ, Aịzaya 1:2–4, 21–23; 3:9, 16–17; 5:11–12, 20–23). Kedụ nsogbu ndị yiri nke ahụ ị na-ahụ n’oge anyị? Ị nwekwara ike chọọ amaokwu ndị na-adọ aka na ntị banyere nsonazụ nile nke ọnọdụ ime mmụọ nke ndị Izrel (ụdị dị ka Aịzaya 1:7; 3:17–26; 5:5–7, 13–15).
Na mgbakwụnye ịdọ aka na ntị ndị ahụ, Aịzaya nyere ozi olile anya maka mgbapụta na-abịa site na Onye Nzọpụta (lee, na-ịma atụ, Aịzaya 1:16–19, 25–27; 3:10; 4). Kedụ ihe ị na-amụta banyere Onyenwe anyị site nʻozi ndị a? Kedu otu ozi nke Onyenwe anyị dị niime amaokwu ndịa jiri dịrị iche nʻihe Setan chọrọ kʻanyị kwere?
Dị ka Aịzaya, ndị amụma taa na-adọ anyị aka na ntị banyere mmehie na nsonazụ ha niile, ma ha na-arọpụtara anyị ozi olile anya site na Jizọs Kraịst. Kedụ ọmụmaatụ ndị i nwere ike icheta? Ị nwere ike nwee mmasị ịnyochagharị ozi nke si na ọgbakọ zuru ọha gara aga, na-achọ ụdị ịdọ aka na ntị na nkwa ndị ahụ.
Aịzaya 2; 4; 11–12
Chineke ga-arụ nnukwu ọrụ n’ụbọchị ikpeazụ ndị a.
Ọtụtụ n’ime amụma Aịzaya nwere nkọwa akpọrọ aha maka ụbọchị anyị. Ị chọta ha, lee anya na ọdịniihu ngwaa (ụdị dị ka “ga-adị” ma ọ bụ “ga-aga”). Na-ịmatụ, lee anya maka ngwaa ndị a dị ka ị na-agụ Aịzaya 2; 4; 11–12. Ị nwere ike ọbụna gbalịa idochigharị ha jiri ngwaa ugbu a (dị ka bụ ma ọ bụ na-aga). Kedụ amụma ndị kachasị akpatemmụọ gị? Kedụ ihe ị na-amụta site na amụma ndịa banyere Zayọn, iwu tempụl, na mkpọkọta Izrel?
Aịzaya 2:2–3 kacha dịrị nnọọ mkpa maka Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a. Kedụ otu esi na-emezu amụma ndịa? Kedụ ihe ị na-amụta banyere “ụzọ niile” na “okpọrọ ụzọ niile” nke Onyenwe anyị niime ụlọ Ya? (amaokwu 3).
Lee kwa Aịzaya 5:26; “Nʻelu elu Ugwu ukwu ahụ ,” Abụ, no. 5.
Aịzaya 6
Ndị amụma ka akpọrọ site nʻaka Chineke
Na Aịzaya 6, Aịzaya kọgharịrị ọkpụkpọ okù ya ịbụ onye amụma. Dị ka ị na-agụ isi nke a, kedụ ihe na-emetụta obi gị banyere nhụmihe nke Aịzaya? Kedụ otu isi nke a si emetụta ụzọ iji eche echiche banyere Onyenwe anyị, ndị amụma Ya, na ọrụ akpọrọ ha ịrụ?
“Niihi na amụworo anyị otu nwa, enyewo anyị otu nwa nwoke” (Aịzaya 9:6).
Aịzaya 7–9
Chineke kwere nkwa izite Jizọs kraịst ịbụ Onye Nzọpụta anyị.
Nʻoge ije ozi nke Aịzaya, Izrel na Syria kwekọrịtara ijikọta ndị agha ha iji chekwaa onwe ya megide Asirịa. Izrel na Syria chọburu ịmanye Ahaz, eze nke Judah, ka o soro ha. Mana Aịzaya buru amụma na njikọ ndị agha ahụ agaghị enwe isi ma nye Ahaz ndụmọdụ ka ọ tụkwasị obi na Onyenwe anyị. (Aịzaya 7:7–9; 8:12–13).
Nʻoge ahụ Aịzaya na-enye Ahaz ndụmọdụ, o bukwara ọtụtụ amụma ndị ọzọ ama ama, ụdị ndị a na-ahụ niime Aịzaya 7:14; 8:13–14; 9:2, 6–7. Ihe ọ bụla amụma ndị a pụtara nye Ahaz, o doro anya na ha gbasara Jizọs Kraịst (lee kwaa Matiu 1:21–23; 4:16; 21:44; Luk 1:31–33). Gịnị mere “Imanuel” jiri bụrụ ezigbo etutu aha maka Onye Nzọpụta? (lee Matiu 1:23). Kedụ otu O si bụrụ “Onye ndụmọdụ” ma ọ bụ “Onyeisi Udo” nye gị? (Aịzaịah 9:7). Kedụ ihe ọzọ ị na-amụta banyere Onye Nzọpụta site na amaokwu ndị a?
Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Aịzaya 1:2–4, 16–19
Niihi Jizọs Kraịst, enwere m ike ịchegharị ma dịrị ọcha.
-
Na Aịzaya 1:2–4, gị na ụmụ gị nwere ike chọta ihe ndị kpatara Onyenwe anyị ji nweghi obi ụtọ nʻebe ndị ahụ nọ. Hụba ama atụ eji tụnyere ya na ụmụ anụmanụ na amaokwu 3—onye bụ “nnaukwu” anyị? Kedụ otu anyị ga-esi egosi na anyị maara Ya?
-
Ijiri anya nke uche hụ Isaiah 1:16–18, gị na ụmụ gị nwere ike lee anya nʻihe na-acha uhie uhie na ihe na-acha ezigbo ọcha. Ma ọ bụ ikekwe unu nwere ike rụkọta ọrụ onụ iji saa otu ihe. Kedụ otu anyị ga-esi bụrụ ndị na-adịghị ọcha niime mmụọ? Kedụ otu Jizọs si enyere anyị aka ịdi ọcha? Kedụ ihe anyị na-amụta banyere Onye Nzọpụta site na amaokwu ndị a? Kesaara ụmụ gị ihe ichere banyere Ya na ihe Ọ meworo maka gị.
Aizaya 2:2-4
Na tempụl, ana m amụta ihe banyere Jizọs Kraịst.
-
Aịzaya hụrụ ọhụ maka oge mgbe “ugwu ukwu nke ụlọ nke Onyenwe anyị” ga-adọrọ mmasị ndị mmadụ site na “mba niile” (Aịzaya 2:2). Kedụ otu i nwere ike i si nyere ụmụ gị aka nwee obi ụtọ banyere ị ga nʻụlo nke Onyenwe anyị? Ị nwere ike kpọkuo ha ịse otu ihe osise nke ebe obibi ha. Emesịa gụkọtanụ Aịzaya 2:2ọnụ, ma kpọkuo ha ise otu ihe osise nke “ụlọ nke Onyenwe anyị,” nke bụ tempụl. Gụkọtanụ Aịzaya 2:3 ọnụ. Kpọkuo ha ịgbakwụnye niime ihe osise ha ọtụtụ mmadụ na-abịa na tempụl, gụnyekwara ndị ezi na ụlọ ha.
-
I nwekwara ike gụkọta Aịzaya 2:2–3 ọnụ ma chọpụta otu ihe na akpatemmụọ gị na ụmụ gị ịga tempụl. Emesịa, mgbe agụkọtasịrị Aịzaya 2:4 ọnụ, unu nwere ike kparịta ụka otu tempụl si ewetere ha udo. Tulee ịgụ otu egwu gbasara tempụl, dị ka “Ọ Na-Amasị m Ị Hụ Tempụl” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 95). Nyere ụmụ gị aka chọta mkpụrụokwu ndị dị niime egwu ahụ ndị na-akuzi ihe tempụl bụ na ihe anyị na-eme ebe ahụ.
Salt Lake Tempụl
Aịzaya 7:14; 9:6–7
Jizọs Kraist bịara nʻụwa ị bụ Onye Nzọpụta m.
-
Iji dubata amụma niile nke Aịzaya banyere Kraịst, gị na ụmụ gị nwere ike kwuo maka etutu aha nke ndị mmadụ, dị ka onyeisi, bishọp, ma ọ bụ onye nkuzi. Kedụ ihe etutu aha ndị a na-agwa anyị banyere ndị a? Nyere ụmụ gị aka chọta etutu aha niile nke Jizọs Kraịst niime Aịzaya 7:14 na 9:6–7 (lee kwa ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a. Kedụ ihe etutu aha nke ọbụla na-akụzi banyere Ya? Kedụ ihe ọzọ anyị na-amụta banyere Jizọs Kraịst site na amaokwu ndị a?
-
Ị nwekwara ike kesara ụmụ gị “Aịzaya Onye amụma ahụ” (niime Akụkọ niile nke Ama Ochie, 150–51). Kwụsịtụ mgbe na mgbe ịju ihe Aịzaya maara maka Jizọs Kraịst ọtụtụ afọ tupu amụọ Ya. Emesịa ịnwekwara ike jiri Matiu 1:21–23; Luk 1:31–33 iji kwuo okwu banyere otu amụma niile nke Aịzaya niime Isaiah 7:14; 9:6–7 jiri bịa na mmezu.
1:18Isaiah the Prophet
Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .