Come, Follow Me
Septemba 21–27. “Ọrụ dị Ịtụnaanya na ihe Iju anya”: Aịzaya 13–14; 22; 24–30; 35


Septemba 21–27. ‘Ọrụ dị Ịtụnaanya na ihe Iju anya”’: Aịzaya 13–14; 22; 24–30; 35,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Agba Ochie 2026 (2026)

Septemba 21–27. ʻỌrụ dị Ịtụnaanya na ihe Iju anya,ʻ” Bịanụ, Soro M: 2026

Chineke na Jizọs Kraịst pụtakwuru Joseph Smit dị nta.

Ọdọ osisi Dị Nsọ, site n’aka Brent Borup

Septemba 21– 27: “Ọrụ dị Ịtụnaanya na ihe Iju anya”

Aịzaya 13–14; 22; 24–3035

Otu ihe Onyenwe anyị na-agwa ndị amụma ka ha mee bụ ịdọ aka na ntị banyere nsonazụ niile nke mmehie. Maka ndị amụma Agba Ochie, mgbe na mgbe nke a na-abụkarị ịgwa ndị ọchịchị nke nnukwu alaeze na ha kwesịrị ịchegharị. Ọ bụ ọrụ dị egwu, mana Aịzaya atụghị ụjọ, ma ịdọ aka na ntị ya niile nye alaeze niile nke ụbọchị ya—gụnyekwara Izrel, Judah, na mba ndị ọzọ gbara ha gburugburu—bụ naatụghị egwu (lee Aịzaya 13–23).

Ka osila dị, Aịzaya nwekwara ozi nke olile-anya. Ọbunadị na mbibi ndị ahụ eburu nʻamụma dakwasịrị alaeze ndịa, Aịzaya hụrụ ọhụ nke ohere maka mweghachite na ịmegharị ọhụrụ. Onyenwe anyị ga-akpọku ndị Ya ịloghachikwute Ya. Ọ ga-eme ka “ala akọrọ ahụ … abụrụkwa ọdọ mmiri, ma ala akpịrị kpọro nkụ ga-aghọ isi iyi jupụtara na mmiri” (Aịzaya 35:7). Ọ ga-arụ “ọrụ dị ịtụnaanya na ihe iju anya” (Aịzaya 29:14), weghachiri Izrel ngọzi niile Ọ kweworo ha na nkwa. Ma Aịzaya ma ọ bụ onye ọzọ dị ndụ nʻoge ahụ biri ndụ ịhụ ọrụ nke a dị ịtụnaanya. Mana anyị na-ahụ ya taa. Nʻezie, anyị bụ akụkụ ya.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Aịzaya 13:1–11, 19–22; 14:1–20

Mpako na Ihe nke ụwa ga-ada

Nʻụbọchị ndụ nke Aịzaya, Babịlọn bụụrụ nnukwu obodo nwere onye ọchịchị dị ike. Ugbua Babịlọn bụzi agụgụala oge ochie. Nihi ya gịnị mere ozi Aịzaya nye Babịlọn, na Aịzaya 13–14, ji dịịrị anyị mkpa taa? Nihi na Babịlọn bụ ọdịmara mpako, anyaukwu, na mmehie, ihe ndị gbakwara anyị gburugburu taa. Chee maka ihe ngosi ọdịmara nke a dị ka ị na-agụ Aịzaya 13:1–11, 19–22; 14:1–20. Ị nwere ike tulee ajụjụ ndị dị ka ndị a:

  • Kedụ myiri ndị ị na-ahụ nʻetiti mpako nke eze ndị Babịlọn na mpako nke Setan? (lee Aịzaya 14:4–20; Mozis 4:1–4). Kedụ ịdọ aka na ntị ndị ị na-achọta maka onwe gị niime amaokwu ndị a?

  • Kedu otu Onye Nzọpụta si arọpụta “ezumike site na mwute gị, na site na ụjọ gị”? (Aịzaịah 14:3).

Jizọs bilitere nʻọnwu na-apụtakwute Meri nʻakụkụ ili Ya

“Ọ ga-eloba ọnwụ na mmeri” (Aịzaya 25:8).

Aịzaya 22:22–23; 24:21–23; 25:6–8; 26:19; 28:16

Jizọs Kraịst bụ Mezaya ahụ ekwere na nkwa.

Nkuzi niile nke Aịzaya na-arụtụkarị aka nʻozi nke Onye Nzọpụta, gụnyekwara aja mgbaghara Ya, Mbilite n’ọnwụ, na Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ. Kedụ ụfọdụ akụkụ nke ozi Ya na-abịa nʻuche dị ka ị na-agụ amaokwu ndịa: Aịzaya 22:22–23; 24:21–23; 25:6–8; 26:19; 28:16? Kedụ amaokwu ndị ọzọ ị na-achọta na-echetara gị maka Onye Nzọpụta?

Nye ndị na-amụ ihe ohere iji gbaa ama banyere Jizọs Kraịst. “Ị bụ onye nkuzi nke ozi ọma Jizọs Kraịst pụtara ịnyere ndị ọzọ aka ghọta ma dabere nʻelu nkuzi Ya, ike mgbapụta Ya, na ịhụnaanya Ya zuru oke” (Nkuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye Nzọpụta,8). Otu ụzọ dị mfe ime nke a oge ọbụla ị na-akụzi ihe bụ ịjụ ajụjụ dị ka “Gịnị ka ịchọtara niime akwụkwọ nsọ nʻizu ụka nke a nke kuziiri gị otu ihe banyere Onye Nzọpụta?” Emesịa kwee ka ndị na-amụ ihe kesaa nhụmihe ha ma gbaa okwukwe ibe ha ume.

Aịzaya 24:1–12; 28:1–8; 29:7–13; 30:8–14

Isi nʻebe Onyenwe anyị nọ pụọ na-ewete ihe egwu nke ime mmụọ.

Site na ebere Ya, Onyenwe anyị zitere Aịzaya ịdọ ndị ọgbụgba ndụ aka na ntị na ha na-esi nʻebe Ọ nọ na-akpafu. Lee ma ị ga-ahụ ihe iriba ama ịdọ aka na ntị nke ime mmụọ banyere nke a niime Aịzaya 24:5; 29:13; 30:8–12. Gịnị mere agwa na omume ndị ahụ jiri dịrị egwu nke ime mmụọ?

Iji dọọ aka na ntị maka nsonazụ niile nke isi nʻebe Onyenwe anyị nọ pụọ, Aịzaya jiri ụfọdụ ihe atụ agaghị echefu echefu. Dị ka ị na-amụ ha, jụọ onwe gị otu isi nʻebe Onyenwe anyị nọ pụọ ji dịrị ka:

  • Ụwa dị mwute, tọgbọrọ chakoo (Aịzaya 24:1–12).

  • Ịn̄ụbiga mmanya okè (Aịzaya 28:7-8).

  • Agụrụ na akpịrị ịkpọ nkụ (Aịzaya 29:7-10).

  • Mgbidi ma ọ bụ arịa tipịara etipịa (Aịzaya 30:13–14).

Kedụ ihe mere o ji dịrị gị mkpa ịnọrọ Onyenwe anyị nso?

Aịzaya 29; 30:18–2635

akara ngosi semịnarị
Onyenwe anyị nwere ike ịweghachi ihe furu efu ma ọ bụ tipiara etipịa.

Enwewo mgbe ihe fụnarịrị gị nke ịchere na ị gaghị ahụ ya ọzọ? Ma ọ bụ ihe tipịara, ma gị na-echegbu na enweghi ike imezi ya ma ọlị. Mgbe anyị si nʻebe Onyenwe anyị nọ pụọ, Setan chọrọ kʻanyị chee na anyị enweghị ike aloghachi ọzọ ma ọ bụ nata ọgwụgwọ. Otu osila dị, Aịzaya kọwara ụfọdụ ihe dị ịtụnaanya Onyenwe anyị ga-eme iji nyere anyị aka lọghachikwute Ya. Kedụ ihe ị na-amụta site na Aịzaya 29:13–24; 30:18–2635 banyere Onyenwe anyị, ịhụnaanya Ya, na ike Ya? Ikekwe ịnwere ike ịchọta otu nkebiokwu niime edereede ndịa nke na-enye gị olile anya mgbe ịchọrọ ọgwụgwọ. Ị nwekwara ike lebaanya nʻozi nke Nwanne nwanyị Amy A. Wright “Kraịst Na-agwọ Nke ahụ Tipịara etipịa,” (Liahona, Me 2022, 81–84).

Otu ụzọ Onyenwe anyị si egosi ike na ebere Ya bụ site na Mweghachite nke ozi ọma Ya? Aịzaya 29 jupụtara na ọtụtụ ederede nke nwere myiemetụ ya na ihe omume niile nke Mweghachite. Iji maatụ:

Nʻuche nke gị, gịnị mere “ịtụnaanya” na “ihe iju anya” (Aịzaya 29:14) jiri bụrụ ezigbo okwu iji kọwaa Onyenwe anyị dị ka ọ na-eweghachi ozi ọma Ya? Olee otu i nwere ike isi nyee aka mezuo amụma ndị ahụ banyere Mweghachite? Maka nchepụta ndị ọzọ, lebaanya nʻozi nke Okenye Gerrit W. Gong, “Mba Niile, Ala Ụmụnna niile, na Ire niile” (Liahona, Nov. 2020, 38-41).

Lee kwa “Mweghachite nke Ozi ọma nke Jizọs Kraịst nʻUju: Ịma Ọkwa Emume ncheta Narị Afọ Abụọ nye Ụwa” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma); “Chi Abọọla,” Abụ, no 1.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa .

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Aịzaya 14:3; 25: 8–9; 28:16

Jizọs Kraịst nwere ike ịzọpụta m site na mmehie na ọnwụ.

  • Kedụ otu ị ga-esi enyere ụmụ gị aka hụ Onye Nzọpụta niime edereede niile nke Aịzaya? Ịnwere ike nyere ha aka chọta nkebiokwu niile na-echetara ha maka Ya niime Aịzaya 14:3; 25:8; ma ọ bụ 28:16. Ha nwekwara ike doo nhatanha amaokwu ndịa sitere na Aịzaya ha na amaokwu ndị ọzọ na-akụzi banyere Onye Nzọpụta, dị ka Matiu 11:28–30; 1 Ndị Kọrịnt 15:53–57; Hilaman 5:12. Kedụ ihe ndị dị ukwuu nke Onyenwe anyị meworo maka anyị?

  • Mgbe unu gụkọtasịrị Aịzaya 25:8–9 ọnụ, unu nwere ike lee anya na foto niile nke Onye Nzọpụta nọ na Getsemani, nʻelu obe, na mgbe Mbilite n’ọnwụ Ya gasịrị. Kwe ka ụmụ gị kwuo okwu banyere ihe na-eme na foto ndị ahụ na ihe kpatara ha jiri hụ Jizọs naanya ma “na-an̄ụrị nime nzọpụta ya” (amaokwu nke 9).

  • Ịnwere ike họrọ ịgwa ụmụ gị banyere mwute ahụ ịnwetere mgbe onye ịhụrụ naanya nwụrụ. Gbaa ama maka nkasị obi ị natara niihi Jizọs Kraịst. Ikekwe ụmụ gị nwere ike see otu ihu na-ebe akwa ma emesịa hichapụ anya mmiri ahụ dị ka unu na-agụkọta Aịzaya 25:8 ọnụ.

Jizọs Kraịst na Getsemene

Uche Gị Mee, site nʻaka Ken Spencer

Aịzaya 25:4–6

Jizọs na-enye m “nchekwa site n’oké ebili mmiri.”

  • Enwewo mgbe gị na ụmụ gị nwetere nhụmihe nke ngọzi nke ebe mgbaba nʻoge oke ebili mmiri ma ọ bụ ndo nʻụbọchị ekpom ọkụ ọkọchị? Ma ọ bụ enwewo mgbe iriri nri dị ụtọ mgbe agụrụ na-agụ gị? Kwuo maka nhụmihe ndịa dị ka unu na-agụ Aịzaya 25:4-6. Kedụ otu Jizọs jiri dị ka ihe ndị a?

Aịzaya 29:11–18, 24

Mweghachite nke ozi ọma ahụ bụ “ọrụ dị ịtụnaanya.”

  • Dị ka gị na ụmụ gị na-agụ Aịzaya 29:14, kesaara ha okwu ndị ọzọ nke nkọwa ya bụ otu ụdị ihe dị ka “ịtụnaanya” na “ihe ijuanya.” Kwe ka ha nyere gị aka chọta mkpanaka ma ọ bụ foto ndị na-anọchite anya ụfọdụ ọrụ dị ịtụnaanya nke Onyenwe nʻụbọchi ikpeazụ ndị a. Ihe ndị a nwere ike gụnye otu kọpị nke Akwụkwọ nke Mọmọn, otu foto nke tempụl, ma ọ bụ foto nke Ọhụ nke Mbụ ahụ (enwere otu nọ na mbido nke ndepụta nke a). Emesịa ụmụ gị nwere ike họrọ otu ihe ma kwuo ihe mere o jiri dị ịtụnaanya nye ha.

  • Otu egwu banyere Mweghachite nke ozi ọma nwekwara ike ịgakọ ya na Aịzaya 29, ụdị dị ka “Nʻoge Udummiri ahụ Na-acha ka olaedo” (Akwụkwọ Ukwe Ụmụntakịrị, 88). Ma ikekwe otu nhụmihe nke onwe nwere ike nyere ụmụaka ahụ aka ghọta ihe mweghachite pụtara. Na-ịmatụ, gị na ụmụ gị nwere ike kwuo okwu banyere otu ihe nke fụnarịrị gị na otu i si chota ya. Nyere ụmụ gị aka tụnyere ihe nke a na Mweghachite nke ọzi ọma. Dị ka Aịzaya 29: 13-15kwuru, gịnị mere Mweghachite ahụ jiri dịrị anyị mkpa? Olee ọrụ ndị dị ịtụnaanya nke Onyenwe anyị na-eme iji weghachi ozi ọma Ya? (lee peeji ihe omume nke izu ụka nke a).

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend .

Jizọs Kraịst nọ n’elu obe

Mkpọgbu n’obe Ahụ, site nʻaka Carl Heinrich Bloch, nọ na Mbarị Nkaọkpụ Frederiksborg maka Agụgụala Ala

Ihu akwụkwọ ihe omume ndị Praịmarị: Mweghachite nke oziọma ahụ bụ “ọrụ dị ịtụnaanya.”